< Psalm 147 >

1 Rühmet Jah, denn er ist gütig; lobsingt unserem Gott, denn er ist lieblich; es ziemt sich Lobgesang.
Toonu Onyenwe anyị! Ọ bụ ihe dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto. Ọ bụ ihe na-eweta mmasị, bụrụkwa ihe ziri ezi ito ya!
2 Jahwe baut Jerusalem wieder auf, er sammelt die Versprengten Israels.
Onyenwe anyị na-ewu Jerusalem: ọ na-akpọghachita ụmụ Izrel ndị a dọọrọ nʼagha gaa nʼala ọzọ.
3 Er heilt, die zerbrochenes Herzens sind, und verbindet ihre Wunden.
Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.
4 Er bestimmt den Sternen eine Zahl, er ruft sie alle mit Namen.
Ọ bụ ya na-ekpebi ọnụọgụgụ kpakpando niile na-akpọkwa ha nʼotu na otu.
5 Groß ist unser Herr und reich an Macht; seine Einsicht ist ohne Maß.
Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu; nghọta ya enweghị nsọtụ.
6 Jahwe hält die Gebeugten aufrecht, erniedrigt die Gottlosen bis auf den Boden.
Onyenwe anyị na-agba ndị dị umeala nʼobi ume ma ọ na-atụda ndị ajọ omume nʼala.
7 Singt Jahwe mit Danksagung, lobsingt unserem Gott auf der Zither!
Jirinụ ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ; jirinụ ụbọ akwara kpọọrọ Chineke anyị egwu.
8 Der den Himmel mit Wolken bedeckt, der Erde Regen bereitet, die Berge Gras sprossen läßt,
Ọ na-eji igwe ojii na-ekpuchi mbara eluigwe; ọ na-ewetara elu ụwa mmiri ozuzo na-eme ka ahịhịa puo nʼelu ugwu niile.
9 der dem Vieh sein Futter giebt, den jungen Raben, die zu ihm schreien.
Ọ na-enye ehi niile nri na-enyekwa ụmụ ugolọma nri mgbe ha na-ebeku ya akwa nʼihi nri.
10 Er hat nicht Lust an der Stärke des Rosses, noch an den Schenkeln des Mannes Gefallen.
Mmasị ya adịghị nʼike nke ịnyịnya, maọbụ nʼike ụkwụ nke mmadụ.
11 Jahwe hat Gefallen an denen, die ihn fürchten, die auf seine Gnade harren.
Onyenwe anyị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ.
12 Preise Jahwe, Jerusalem; rühme deinen Gott, o Zion!
O Jerusalem, jaa Onyenwe anyị mma; o Zayọn, too Chineke gị.
13 Denn er hat die Riegel deiner Thore fest gemacht, deine Kinder in dir gesegnet.
Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike, na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị.
14 Er schafft deinen Grenzen Frieden, sättigt dich mit dem besten Weizen.
Ọ na-eme ka oke ala gị nwee udo, jirikwa ọka wiiti kachasị mma nyejuo gị afọ.
15 Er sendet sein Gebot auf Erden; gar schnell läuft sein Wort.
Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile; okwu ya na-agbasa ngwangwa.
16 Er spendet Schnee wie Wolle, streut Reif wie Asche.
Ọ na-atụsa snoo nʼala dịka ajị anụ, na-efesasị igirigi snoo dịka ntụ.
17 Er wirft sein Eis wie Bissen hin; wer kann vor seinem Froste bestehen?
Ọ na-atụdata mkpụrụ mmiri ya dị ka mkpụrụ okwute. Onye pụrụ iguzogide oke ifufe oyi ya?
18 Er entsendet sein Wort und läßt sie schmelzen, läßt seinen Wind wehen, da rinnen Wasser.
Ọ na-ezipụ okwu ya na-agbaze ha; ọ na-akpalịte ikuku ya mee ka mmiri bido ịsọgharị.
19 Er that Jakob sein Wort kund, Israel seine Satzungen und Rechte.
O kpugheela okwu ya nye Jekọb, iwu ya na ụkpụrụ ya niile nye Izrel.
20 Keinem Volk hat er also gethan und seine Rechte lehrte er sie nicht. Rühmet Jah!
O mesobeghị mba ọzọ ụdị mmeso dị otu a. Ha amakwaghị iwu ya niile. Toonu Onyenwe anyị!

< Psalm 147 >