< Psalms 93 >

1 The LORD reigns! He is clothed with majesty! The LORD is armed with strength. The world also is established. It can’t be moved.
Onyenwe anyị bụ eze, ọ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe; Onyenwe anyị na-eyikwasị ịma mma dịka uwe, ọ dịkwa ike nke ukwuu; nʼezie, ụwa niile na-eguzosikwa ike; apụghịkwa iwezuga ya nʼọnọdụ ya.
2 Your throne is established from long ago. You are from everlasting.
Ocheeze gị eguzosiela ike siterị na mgbe ochie; ị na-adịkwa site nʼebighị ebi ruo ebighị.
3 The floods have lifted up, LORD, the floods have lifted up their voice. The floods lift up their waves.
Oke osimiri niile amaliela elu, O Onyenwe anyị; oke osimiri niile eweliela olu ha elu; ebili mmiri niile nke oke osimiri na-amali elu na-eme mkpọtụ.
4 Above the voices of many waters, the mighty breakers of the sea, the LORD on high is mighty.
Onyenwe anyị onye nọ nʼelu, dị ukwuu karịa mkpọtụ nke oke osimiri niile na-eme, ma karịakwa ụda nke ebili mmiri nke oke osimiri.
5 Your statutes stand firm. Holiness adorns your house, LORD, forever more.
Ụkpụrụ gị niile, Onyenwe anyị na-eguzosi ike; ịdị nsọ bụ ihe e ji chọọ ụlọ gị mma ruo ụbọchị na-enweghị ọgwụgwụ.

< Psalms 93 >