< Proverbs 2 >

1 My son, if you will receive my words, and store up my commandments within you,
Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata okwu ọnụ m niile zobekwa iwu m niile nʼime obi gị,
2 so as to turn your ear to wisdom, and apply your heart to understanding;
tọọ ntị gị nʼala nye amamihe, wepụta obi gị inwe nghọta.
3 yes, if you call out for discernment, and lift up your voice for understanding;
E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị,
4 if you seek her as silver, and search for her as for hidden treasures;
ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha maọbụ akụ nke zoro ezo,
5 then you will understand the fear of the LORD, and find the knowledge of God.
mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke.
6 For the LORD gives wisdom. Out of his mouth comes knowledge and understanding.
Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe; nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.
7 He lays up sound wisdom for the upright. He is a shield to those who walk in integrity,
Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu, ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke.
8 that he may guard the paths of justice, and preserve the way of his holy ones.
Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso, na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso.
9 Then you will understand righteousness and justice, equity and every good path.
Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi na ihe dị mma na ezi ụzọ niile.
10 For wisdom will enter into your heart. Knowledge will be pleasant to your soul.
Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ.
11 Discretion will watch over you. Understanding will keep you,
Izuzu zuruoke ga-echebe gị, nghọta ga na-eche gị nche.
12 to deliver you from the way of evil, from the men who speak perverse things,
Amamihe ga-azọpụta gị site nʼụzọ ndị mmehie, sitekwa na mmadụ ndị okwu ha jọrọ njọ,
13 who forsake the paths of uprightness, to walk in the ways of darkness,
ndị hapụrụ ụzọ niile ziri ezi nke Chineke na-agbaso ụzọ niile nke ọchịchịrị,
14 who rejoice to do evil, and delight in the perverseness of evil,
ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, nʼihi na mmehie ha na-atọ ha ụtọ.
15 who are crooked in their ways, and wayward in their paths,
Ihe ọbụla ha na-eme gbagọrọ agbagọ, jọọkwa njọ.
16 to deliver you from the strange woman, even from the foreigner who flatters with her words,
Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna, na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu.
17 who forsakes the friend of her youth, and forgets the covenant of her God;
Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ, nke chefuru ọgbụgba ndụ ọ gbara nʼihu Chineke.
18 for her house leads down to death, her paths to the departed spirits.
Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọ nke na-eduba nʼọnwụ na nʼọkụ ala mmụọ. (questioned)
19 None who go to her return again, neither do they attain to the paths of life.
Ndị ikom niile banyere nʼụlọ ha na-ala nʼiyi. Ha adịghị alọtakwa nʼokporoụzọ nke na-eduba na ndụ.
20 Therefore walk in the way of good men, and keep the paths of the righteous.
Nʼihi nke a, ị ga-aga ije nʼụzọ ndị ezi omume, debekwa ụkwụ gị nʼokporoụzọ niile nke ndị ezi omume,
21 For the upright will dwell in the land. The perfect will remain in it.
nʼihi na ọ bụ naanị ndị ziri ezi ga-ebi nʼala ahụ, ndị na-enweghị ịta ụta ga-afọdụkwa nʼime ya.
22 But the wicked will be cut off from the land. The treacherous will be rooted out of it.
Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ site nʼala ahụ, ọ bụkwa ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi ka a ga-ewezuga na ya.

< Proverbs 2 >