< Obadiah 1 >

1 The vision of Obadiah. This is what the Lord GOD says about Edom. We have heard news from the LORD, and an ambassador is sent amongst the nations, saying, “Arise, and let’s rise up against her in battle.
Ọhụ nke Ọbadaya hụrụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere Edọm. Anyị anụla ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị, e zipụla onyeozi ka ọ gaa mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị, “Bilikwanụ ka anyị gaa buo agha megide ya.”
2 Behold, I have made you small amongst the nations. You are greatly despised.
“Lee, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche; ị ga-abụ ihe a na-elelị anya nke ukwuu.
3 The pride of your heart has deceived you, you who dwell in the clefts of the rock, whose habitation is high, who says in his heart, ‘Who will bring me down to the ground?’
Nganga nke obi gị eduhiela gị, gị onye bi na mgbawa niile nke nkume dị elu, onye ebe obibi ya dị nʼebe dị oke elu. Gị onye na-ekwu nʼime obi ya, ‘Onye ga-akpụdata m nʼala?’
4 Though you mount on high as the eagle, and though your nest is set amongst the stars, I will bring you down from there,” says the LORD.
A sịkwarị na i felie elu dịka ugo, ọ bụrụkwa na ị kpaa akwụ gị nʼetiti kpakpando, aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
5 “If thieves came to you, if robbers by night—oh, what disaster awaits you—wouldn’t they only steal until they had enough? If grape pickers came to you, wouldn’t they leave some gleaning grapes?
“Ọ bụrụ na ndị ohi abịakwute gị, e, ọ bụrụ na ndị na-apụnara mmadụ ihe abịakwute gị nʼetiti abalị, lee, ụdị mbibi na-echere ịdakwasị gị! Ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-ezuru? Ọ bụrụ na ndị na-aghọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị, ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole?
6 How Esau will be ransacked! How his hidden treasures are sought out!
Ma lee ka e si nyochapụtachaa ebe niile Ịsọ debere akụ ya, lekwaa ka e si chịkọrọ akụ ya niile bụ nke zoro ezo!
7 All the men of your alliance have brought you on your way, even to the border. The men who were at peace with you have deceived you, and prevailed against you. Friends who eat your bread lay a snare under you. There is no understanding in him.”
Ndị enyi gị niile aghọgbuola gị, nwee ike imegide gị, ndị gị na ha na-adị na mma achụrụla gị ruo nʼoke ala; ndị gị na ha na-erikọ nri gị ga-esiri gị ọnya igbudu, ma ị gaghị achọpụta ya.
8 “Won’t I in that day”, says the LORD, “destroy the wise men out of Edom, and understanding out of the mountain of Esau?
“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “ọ bụ na mụ agaghị ala ndị oke amamihe niile nọ nʼEdọm nʼiyi, bụ ndị nwere mmụọ nghọta nọ nʼugwu Ịsọ?
9 Your mighty men, Teman, will be dismayed, to the end that everyone may be cut off from the mountain of Esau by slaughter.
Ndị gị bụ dike nʼagha, o Teman, ka ụjọ ga-eri. Onye ọbụlakwa nọ nʼugwu Ịsọ niile, ka a ga-egbuda nʼagha.
10 For the violence done to your brother Jacob, shame will cover you, and you will be cut off forever.
Nʼihi na i gbuola ma mesokwa nwanne gị bụ Jekọb ihe ike. Ihere ga-ekpuchi gị; a ga-alakwa gị nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.
11 In the day that you stood on the other side, in the day that strangers carried away his substance and foreigners entered into his gates and cast lots for Jerusalem, even you were like one of them.
Nʼụbọchị ahụ, ị nọọrọ onwe gị, na-ele ndị ọbịa ka ha na-akwakọrọcha akụnụba ya, sitekwa nʼọnụ ụzọ ama ya gafee fee nza iji kerie Jerusalem. Ị dịkwa ka otu onye nʼime ha.
12 But don’t look down on your brother in the day of his disaster, and don’t rejoice over the children of Judah in the day of their destruction. Don’t speak proudly in the day of distress.
Ma ị garaghị eleda nwanne gị anya nʼụbọchị nsogbu ya, ị garaghị aṅụ ndị Juda nʼụbọchị ahụ e bibiri ha. Ị garaghị anyara ha isi nʼụbọchị ahụ ha nọ na nsogbu.
13 Don’t enter into the gate of my people in the day of their calamity. Don’t look down on their affliction in the day of their calamity, neither seize their wealth on the day of their calamity.
I kwesighị isite nʼọnụ ụzọ ama ndị m zọọ ije nʼụbọchị ha nọ na nsogbu, o zighị ezi na i ga-enwe obi aṅụrị nʼoge ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, nʼụbọchị ha nọ na nsogbu, maọbụ jiri aka ike pụnara ha akụ ha nʼụbọchị nsogbu ha.
14 Don’t stand in the crossroads to cut off those of his who escape. Don’t deliver up those of his who remain in the day of distress.
I kwesighị ịnọchi na ngalaba ụzọ igbu ndị na-agbapụ ọsọ ndụ, maọbụ were ndị ha fọdụrụ ndụ nyefee ha nʼaka ndị iro ha, nʼụbọchị nsogbu ha.
15 For the day of the LORD is near all the nations! As you have done, it will be done to you. Your deeds will return upon your own head.
“Ụbọchị nke Onyenwe anyị dị nso nye mba niile. Dịka i si mee ndị ọzọ, otu ahụ ka a ga-eme gị; ihe i metara ga-adị gị nʼisi.
16 For as you have drunk on my holy mountain, so all the nations will drink continually. Yes, they will drink, swallow down, and will be as though they had not been.
Dịka i si site nʼugwu nsọ m ṅụọ ihe ọṅụṅụ otu a ka mba niile gbara gị gburugburu ga-esi ṅụọ ma na-adagharị. Ha ga-aṅụ, ṅụọ, ma ọ gaghị adị ha ka o nwere ihe ha na-aṅụ.
17 But in Mount Zion, there will be those who escape, and it will be holy. The house of Jacob will possess their possessions.
Ma nʼugwu Zayọn ndị gbara ọsọ ndụ ga-afọdụ, ọ ga-adị nsọ, ụlọ Jekọb ga-enwetakwa ihe nketa ha ọzọ.
18 The house of Jacob will be a fire, the house of Joseph a flame, and the house of Esau for stubble. They will burn amongst them and devour them. There will not be any remaining to the house of Esau.” Indeed, the LORD has spoken.
Ụlọ Jekọb ga-abụ ọkụ, ụlọ Josef ga-abụkwa ire ọkụ: ma ụlọ Ịsọ ga-aghọkwa ukwu ọka. Ha ga-esunyekwa ha ọkụ ma rechapụ ya. Ọ dịkwaghị ndị ga-afọdụ ndụ site nʼụlọ Ịsọ.” Onyenwe anyị ekwuola ya.
19 Those of the South will possess the mountain of Esau, and those of the lowland, the Philistines. They will possess the field of Ephraim, and the field of Samaria. Benjamin will possess Gilead.
Mgbe ahụ, ndị bi na Negev ga-ebichi nʼugwu ugwu Ịsọ, ndị si na Shefela ga-enwekọta ala ndị Filistia. Ha ga-anọchi ala ubi niile nke ndị Ifrem na nke Sameria. Ndị Benjamin ga-enwetakwa Gilead.
20 The captives of this army of the children of Israel, who are amongst the Canaanites, will possess even to Zarephath; and the captives of Jerusalem, who are in Sepharad, will possess the cities of the Negev.
Ụmụ Izrel gbara ọsọ ndụ gaa na Hala, ga-enweta, bido nʼala Fonisia ruo Zarefat. Ndị ahụ e mere ka ha si Jerusalem gaa biri na Sefarad, ga-enwetakwa obodo niile nke Negeb.
21 Saviours will go up on Mount Zion to judge the mountains of Esau, and the kingdom will be the LORD’s.
Ndị nnapụta ga-agbago nʼugwu Zayọn maka ịchị ugwu Ịsọ niile. Mgbe ahụ alaeze niile ga-abụkwa nke Onyenwe anyị.

< Obadiah 1 >