< Jeremiah 49 >

1 Of the children of Ammon. The LORD says: “Has Israel no sons? Has he no heir? Why then does Malcam possess Gad, and his people dwell in its cities?
Nke a dịrị ndị Amọn: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ na Izrel enweghị ụmụ ndị ikom? Izrel o nweghị onye nnweta ihe o nwere? Gịnị mere Molek ji nweta obodo Gad? Gịnị mere ndị ya ji bichie obodo ya niile?
2 Therefore behold, the days come,” says the LORD, “that I will cause an alarm of war to be heard against Rabbah of the children of Ammon, and it will become a desolate heap, and her daughters will be burnt with fire; then Israel will possess those who possessed him,” says the LORD.
Ma ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka a nụ ụda iti mkpu agha, nke a ga-eti megide Raba, obodo ndị Amọn. A ga-eme ya ka ọ ghọọ mkputamkpu ebe. A ga-esurekwa ya ọkụ, ya na obodo nta niile gbara ya gburugburu. Mgbe ahụ Izrel ga-achụpụkwa ndị ahụ niile chụpụrụ ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
3 “Wail, Heshbon, for Ai is laid waste! Cry, you daughters of Rabbah! Clothe yourself in sackcloth. Lament, and run back and forth amongst the fences; for Malcam will go into captivity, his priests and his princes together.
“Kpọọ mkpu akwa, gị Heshbọn, nʼihi na ebibiela Ai! Tisienụ mkpu akwa ike unu ndị bi na Raba! Yirinụ uwe mkpe unu, tiekwanụ aka nʼobi nʼihi iru ụjụ; gbagharịanụ nʼogige mgbidi obodo unu, nʼihi na a ga-adọta Molek nʼagha, buru ya na ndị nchụaja ya na ndịisi ọchịchị ya gaa mba ọzọ.
4 Why do you boast in the valleys, your flowing valley, backsliding daughter? You trusted in her treasures, saying, ‘Who will come to me?’
Gịnị mere unu ji anya isi nʼihi ndagwurugwu nke na-amị mkpụrụ hiri nne, gị ada nwanyị na-ekwesighị ntụkwasị obi, onye ntụkwasị obi ya dị nʼakụnụba ya, gị onye na-asị, ‘Onye ga-ebuso m agha?’
5 Behold, I will bring a terror on you,” says the Lord, GOD of Hosts, “from all who are around you. All of you will be driven completely out, and there will be no one to gather together the fugitives.
Aga m esite nʼaka ndị niile gbara gị gburugburu mee ka oke egwu bịakwasị gị,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara ya, “A ga-achụpụ onye ọbụla nʼime unu. Ọ dịkwaghị onye ga-achịkọta ndị ahụ niile gbapụrụ agbapụ.
6 “But afterward I will reverse the captivity of the children of Ammon,” says the LORD.
“Ma mgbe e mesịrị, aga m emekwa ka ndị Amọn laghachikwa nʼala ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
7 Of Edom, the LORD of Hosts says: “Is wisdom no more in Teman? Has counsel perished from the prudent? Has their wisdom vanished?
Nke dịrị Edọm: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Ọ pụtara na onye amamihe adịghịkwa na Teman? Okwu ndụmọdụ ọ gwụla nʼọnụ ndị nwere nghọta? Amamihe ha o reela ure?
8 Flee! Turn back! Dwell in the depths, inhabitants of Dedan; for I will bring the calamity of Esau on him when I visit him.
Chigharịanụ gbalaga, unu ndị bi na Dedan. Gaa zoonụ onwe unu nʼọgba nkume miri emi, nʼihi na aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị Ịsọ, nʼoge ahụ m ga-ata ya ahụhụ.
9 If grape gatherers came to you, would they not leave some gleaning grapes? If thieves came by night, wouldn’t they steal until they had enough?
Ọ bụrụ na ndị na-aghọrọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị, ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole? Ọ bụrụkwa na ndị ohi abịa nʼabalị, ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-akwakọrọ?
10 But I have made Esau bare, I have uncovered his secret places, and he will not be able to hide himself. His offspring is destroyed, with his brothers and his neighbours; and he is no more.
Ma aga m agba Ịsọ ọtọ. Aga m ekpughe ebe nzuzo ya niile ka ọ ghara izobe onwe ya. Ụmụ ya na ndị ikwu ya, tinyere ndị ya na ha dị na mma na ndị agbataobi ya, ga-ala nʼiyi. Ya mere, ọ dịghịkwa onye ga-asị,
11 Leave your fatherless children. I will preserve them alive. Let your widows trust in me.”
‘Hapụnụ ụmụ mgbei unu niile, nʼihi na mụ onwe m ga-edebe ha ndụ. Ndị inyom unu niile ndị di ha nwụrụ nwere ike ịtụkwasị m obi.’”
12 For the LORD says: “Behold, they to whom it didn’t pertain to drink of the cup will certainly drink; and are you he who will altogether go unpunished? You won’t go unpunished, but you will surely drink.
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụrụ na e mere ka ndị ahụ na-ekwesighị ịṅụ ihe dị nʼiko ahụ ṅụọ ya, a ga-esi aṅaa ghara ịta gị ahụhụ? A ghaghị ịta gị ahụhụ; ị ghakwaghị ịṅụ site nʼiko ahụ.”
13 For I have sworn by myself,” says the LORD, “that Bozrah will become an astonishment, a reproach, a waste, and a curse. All its cities will be perpetual wastes.”
“Eji m onwe m ṅụọ iyi, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, na Bozra ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe ịta ụta, na ihe ịbụ ọnụ. Obodo ya niile ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.”
14 I have heard news from the LORD, and an ambassador is sent amongst the nations, saying, “Gather yourselves together! Come against her! Rise up to the battle!”
Anụla m ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị. E zipụla onyeozi ka ọ ga mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị, “Chịkọtaanụ onwe, megide ya. Bilikwanụ maka ibu agha!”
15 “For, behold, I have made you small amongst the nations, and despised amongst men.
Ugbu a, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche, ihe nlelị na-ebe mmadụ nọ.
16 As for your terror, the pride of your heart has deceived you, O you who dwell in the clefts of the rock, who hold the height of the hill, though you should make your nest as high as the eagle, I will bring you down from there,” says the LORD.
Ịdị egwu gị nke na-eyinye ndị mmadụ egwu, na nganga nke obi gị eduhiela gị, gị onye na-ebi na mgbawa niile nke nkume dị elu, gị onye ji ebe niile dị elu nke ugwu nʼaka ya. A sịkwarị na i wuo akwụ gị nʼebe dị elu, dịka ebe ugo ga-ewu akwụ ya, aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
17 “Edom will become an astonishment. Everyone who passes by it will be astonished, and will hiss at all its plagues.
“Edọm ga-aghọ ihe iju anya. Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya, ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile.
18 As in the overthrow of Sodom and Gomorrah and its neighbour cities,” says the LORD, “no man will dwell there, neither will any son of man live therein.
Dịka a kwaturu Sọdọm na Gọmọra, ya na obodo niile gbara ya gburugburu. Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ; nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
19 “Behold, he will come up like a lion from the pride of the Jordan against the strong habitation; for I will suddenly make them run away from it, and whoever is chosen, I will appoint him over it. For who is like me? Who will appoint me a time? Who is the shepherd who will stand before me?”
“Aga m esi nʼala ya chụpụ Edọm nʼotu ntabi anya, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ. Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka ya? Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu? Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?”
20 Therefore hear the counsel of the LORD, that he has taken against Edom, and his purposes that he has purposed against the inhabitants of Teman: Surely they will drag them away, the little ones of the flock. Surely he will make their habitation desolate over them.
Nʼihi nke a, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Edọm, nụrụkwa ihe o zubere megide ndị bi na Teman. A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ, ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a.
21 The earth trembles at the noise of their fall; there is a cry, the noise which is heard in the Sea of Suf.
Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda ha; iti mkpu akwa ha ga-adakwa ụda ruo nʼOsimiri Uhie.
22 Behold, he will come up and fly as the eagle, and spread out his wings against Bozrah. The heart of the mighty men of Edom at that day will be as the heart of a woman in her pangs.
Lee, otu ugo ga-efeli elu, fedatakwa. Ọ ga-agbasapụ nku ya kpuchie ala Bozra niile. Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bu dike nʼagha nʼEdọm ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme.
23 Of Damascus: “Hamath and Arpad are confounded, for they have heard evil news. They have melted away. There is sorrow on the sea. It can’t be quiet.
Nke dịrị Damaskọs: “Ụjọ ejula Hamat na Apad obi, nʼihi na ha anụla akụkọ ọjọọ. Ha adaala mba, nọọkwa nʼoke echiche dịka osimiri nke ebili na-amagharị nʼelu ya.
24 Damascus has grown feeble, she turns herself to flee, and trembling has seized her. Anguish and sorrows have taken hold of her, as of a woman in travail.
Damaskọs aghọọla onye ike gwụrụ. Ọ tụgharịala ịgbapụ ọsọ, ma ọma jijiji ejidela ya. Oke obi ụfụ na ihe mgbu ejidesiela ya aka ike, dịka obi ụfụ na ihe mgbu nke na-ejide nwanyị ime na-eme.
25 How is the city of praise not forsaken, the city of my joy?
Gịnị mere na-agbahapụbeghị obodo ahụ a maara aha ya, bụ obodo ahụ nke ihe ya na-atọ obi m ụtọ?
26 Therefore her young men will fall in her streets, and all the men of war will be brought to silence in that day,” says the LORD of Hosts.
Nʼezie, ụmụ okorobịa nọ nʼime ya ga-ada nʼokporoụzọ niile, a ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
27 “I will kindle a fire in the wall of Damascus, and it will devour the palaces of Ben Hadad.”
“Aga m esunye mgbidi Damaskọs ọkụ. Ọkụ ahụ ga-eripịakwa ebe e wusiri ike nke Ben-Hadad.”
28 Of Kedar, and of the kingdoms of Hazor, which Nebuchadnezzar king of Babylon struck, The LORD says: “Arise, go up to Kedar, and destroy the children of the east.
Banyere Keda na alaeze Hazọ, nke Nebukadneza eze Babilọn busoro agha: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Bilienụ gaa buso Keda agha. Bibiekwanụ ndị ahụ niile bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.
29 They will take their tents and their flocks. they will carry away for themselves their curtains, all their vessels, and their camels; and they will cry to them, ‘Terror on every side!’
A ga-adọta ụlọ ikwu ha, na igwe ewu na atụrụ ha nʼagha. A ga-ebukọrọkwa ụlọ mgbochi ha niile, ya na ngwongwo na ịnyịnya kamel ha niile. Ndị mmadụ ga-etikwa mkpu sị ha, ‘Oke egwu dị nʼakụkụ niile!’
30 Flee! Wander far off! Dwell in the depths, you inhabitants of Hazor,” says the LORD; “for Nebuchadnezzar king of Babylon has taken counsel against you, and has conceived a purpose against you.
“Gbalaganụ ọsịịsọ. Jeenụ nọdụ nʼime ọgba nkume niile miri emi, unu ndị niile bi na Hazọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. Nebukadneza eze Babilọn atụọla atụmatụ megide unu, o chepụtakwala ụzọ ọ ga-esi megide unu.
31 Arise! Go up to a nation that is at ease, that dwells without care,” says the LORD; “that has neither gates nor bars, that dwells alone.
“Bilienụ, gaa buso mba ahụ agha, bụ mba ahụ na-ebi na ntụkwasị obi,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mba nke na-enweghị ibo ọnụ ụzọ, maọbụ mkpọrọ e ji akpọchi ya, mba ahụ nke ndị ya na-ebiri naanị onwe ha.
32 Their camels will be a booty, and the multitude of their livestock a plunder. I will scatter to all winds those who have the corners of their beards cut off; and I will bring their calamity from every side of them,” says the LORD.
Ịnyịnya kamel ha ga-abụ ihe a ga-akwata nʼagha, ọtụtụ igwe ehi ha ga-abụkwa ihe a ga-alụta nʼagha. Aga m efesa ha nye ifufe, bụ ndị niile nọ ebe dị anya, bụ ndị ahụ niile na-akpụchapụ agịrị isi egedege ihu ha. Aga m emekwa ka ihe ọjọọ si nʼakụkụ niile bịakwasị ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
33 Hazor will be a dwelling place of jackals, a desolation forever. No man will dwell there, neither will any son of man live therein.”
“Mgbe ahụ, Hazọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa. Ọ ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi. O nweghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ, nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.”
34 The LORD’s word that came to Jeremiah the prophet concerning Elam, in the beginning of the reign of Zedekiah king of Judah, saying,
Nke a bụ okwu Onyenwe anyị ndị ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Elam, mgbe Zedekaya eze Juda bidoro ọchịchị ya.
35 “The LORD of Hosts says: ‘Behold, I will break the bow of Elam, the chief of their might.
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, aga m agbaji ụta nke Elam, bụ ụta ahụ ha ji anya isi na ọ bụ ebe ike ha dị.
36 I will bring on Elam the four winds from the four quarters of the sky, and will scatter them towards all those winds. There will be no nation where the outcasts of Elam will not come.
Aga m esite nʼakụkụ anọ nke mbara eluigwe zite oke ifufe anọ, nke ga-abịa megide Elam. Aga m efesa ha nye oke ifufe anọ ndị a, ndị ga-ebufu ha buga ha na mba niile dị iche iche, ọ dịghị obodo a na-agaghị ahụ ndị Ilam a dọtara nʼagha.
37 I will cause Elam to be dismayed before their enemies, and before those who seek their life. I will bring evil on them, even my fierce anger,’ says the LORD; ‘and I will send the sword after them, until I have consumed them.
Aga m etipịa Elam nʼihu ndị iro ha, e, nʼihu ndị ahụ na-achọsi ndụ ya ike. Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ha, meekwa ka oke iwe m dị ọkụ bịakwasị ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ tutu ruo mgbe m mere ka ha niile gwụsịa.
38 I will set my throne in Elam, and will destroy from there king and princes,’ says the LORD.
Aga m edo ocheeze m nʼElam, bibiekwa eze ya na ndịisi ọchịchị ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
39 ‘But it will happen in the latter days that I will reverse the captivity of Elam,’ says the LORD.”
“Ma nʼikpeazụ, nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa, aga m eweghachite akụnụba niile nke Elam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

< Jeremiah 49 >