< Exodus 7 >

1 The LORD said to Moses, “Behold, I have made you as God to Pharaoh; and Aaron your brother shall be your prophet.
Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Emeela m gị ka ị dịrị ka Chineke nʼebe Fero nọ. Nwanne gị Erọn ga-abụkwa onye amụma gị.
2 You shall speak all that I command you; and Aaron your brother shall speak to Pharaoh, that he let the children of Israel go out of his land.
Ị ga-agwa Erọn ihe niile m gwara gị. Ọ ga-ekwukwa ha nʼihu Fero, rịọọ ya ka o kwere ka ụmụ Izrel hapụ ala Ijipt.
3 I will harden Pharaoh’s heart, and multiply my signs and my wonders in the land of Egypt.
Ma aga m eme ka obi Fero sie ike. Ọ bụ ezie na m ga-eme ọtụtụ ihe ịrịbama nʼihe ebube nʼala Ijipt,
4 But Pharaoh will not listen to you, so I will lay my hand on Egypt, and bring out my armies, my people the children of Israel, out of the land of Egypt by great judgements.
ma Fero agaghị ege unu ntị. Mgbe ahụ aga m eme ka aka m bịakwasị Ijipt. Aga m esite nʼoke ọrụ nke ikpe ọmụma dị oke egwu, mee ka ndị m, Izrel, dịka usuu ha niile si dị, site nʼala Ijipt pụọ.
5 The Egyptians shall know that I am the LORD when I stretch out my hand on Egypt, and bring the children of Israel out from amongst them.”
Ndị Ijipt ga-amata nʼezie na m bụ Onyenwe anyị, mgbe m setịpụrụ aka nʼIjipt, ma site nʼetiti ha kpọpụta ụmụ Izrel.”
6 Moses and Aaron did so. As the LORD commanded them, so they did.
Mosis na Erọn mere dịka Onyenwe anyị nyere ha iwu.
7 Moses was eighty years old, and Aaron eighty-three years old, when they spoke to Pharaoh.
Nʼoge a, mgbe ha gwara Fero okwu, Mosis agbaala iri afọ asatọ. Ma Erọn agbaala iri afọ asatọ na atọ.
8 The LORD spoke to Moses and to Aaron, saying,
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị,
9 “When Pharaoh speaks to you, saying, ‘Perform a miracle!’ then you shall tell Aaron, ‘Take your rod, and cast it down before Pharaoh, and it will become a serpent.’”
“Mgbe Fero ga-agwa unu okwu sị, ‘Meenụ ihe ebube.’ Ị ga-agwa Erọn okwu sị ya, ‘Were mkpanaka gị tụpụ ya nʼala nʼihu Fero.’ Ọ ga-aghọ agwọ.”
10 Moses and Aaron went in to Pharaoh, and they did so, as the LORD had commanded. Aaron cast down his rod before Pharaoh and before his servants, and it became a serpent.
Mgbe ahụ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero mee dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu. Erọn tụpụrụ mkpanaka ya nʼala nʼihu Fero na ndị ozi ya. Ọ ghọrọ agwọ.
11 Then Pharaoh also called for the wise men and the sorcerers. They also, the magicians of Egypt, did the same thing with their enchantments.
Ma Fero kpọkọtara ndị maara ihe, na ndị mgbaasị, na ndị majiki nọ nʼIjipt. Ha bịara mee ụdị ihe ịrịbama ahụ Mosis na Erọn mere site nʼihe nzuzo nke akaọrụ ha.
12 For they each cast down their rods, and they became serpents; but Aaron’s rod swallowed up their rods.
Onye ọbụla nʼime ha tụpụrụ mkpanaka ya, nke ghọkwara agwọ. Ma mkpanaka ahụ Erọn tụpụrụ, nke ghọrọ agwọ, loro mkpanaka ndị ahụ niile ndị Ijipt tụpụrụ.
13 Pharaoh’s heart was hardened, and he didn’t listen to them, as the LORD had spoken.
Fero nyịchiri obi ya, mee ka o sie ike. O geghị Erọn na Mosis ntị dịka Onyenwe anyị kwuru.
14 The LORD said to Moses, “Pharaoh’s heart is stubborn. He refuses to let the people go.
Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Obi Fero siri ike. Ọ bụ nke a mere o ji na-aga nʼihu na-ajụ ka ndị m laa.
15 Go to Pharaoh in the morning. Behold, he is going out to the water. You shall stand by the river’s bank to meet him. You shall take the rod which was turned to a serpent in your hand.
Ma otu ọ dị; nʼisi ụtụtụ echi, jekwuru Fero tupu ọ gaa nʼosimiri. Guzoro nʼakụkụ osimiri Naịl, jidekwa mkpanaka ahụ ghọrọ agwọ nʼaka gị.
16 You shall tell him, ‘The LORD, the God of the Hebrews, has sent me to you, saying, “Let my people go, that they may serve me in the wilderness. Behold, until now you haven’t listened.”
Ị ga-agwa Fero sị, ‘Onyenwe anyị, Chineke ndị Hibru, ezitela m ka m gwa gị sị, hapụ ndị m ka ha gaa nʼọzara fee m ofufe. Tutu ruo ugbu a, ị jụrụ ige ntị.’
17 The LORD says, “In this you shall know that I am the LORD. Behold: I will strike with the rod that is in my hand on the waters which are in the river, and they shall be turned to blood.
Ugbu a Onyenwe anyị kwuru nke a sị, ‘Ị ga-amata site na nke a na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. Aga m ewere mkpanaka a nke m ji nʼaka tie nʼosimiri Naịl. Ọ ga-agbanwe ghọọ ọbara.
18 The fish that are in the river will die and the river will become foul. The Egyptians will loathe to drink water from the river.”’”
Azụ niile dị nʼime ya ga-anwụ. Osimiri ahụ ga-esikwa isi dịka ihe rere ure. Nke a ga-eme ka ọ bụrụ ihe rara ahụ nye ndị Ijipt ịṅụ mmiri site na ya.’”
19 The LORD said to Moses, “Tell Aaron, ‘Take your rod, and stretch out your hand over the waters of Egypt, over their rivers, over their streams, and over their pools, and over all their ponds of water, that they may become blood. There will be blood throughout all the land of Egypt, both in vessels of wood and in vessels of stone.’”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn ka o setịpụ mkpanaka ya nʼelu mmiri niile dị nʼIjipt. Nke a metụtara osimiri ha niile, mmiri ntakịrị ha niile, ọdọ mmiri ha niile, na ebe niile ha na-echekọta mmiri. Ọbara ga-ejupụta ebe niile nʼIjipt, ite mmiri na ite aja na ite osisi niile.”
20 Moses and Aaron did so, as the LORD commanded; and he lifted up the rod, and struck the waters that were in the river, in the sight of Pharaoh, and in the sight of his servants; and all the waters that were in the river were turned to blood.
Mosis na Erọn mere dị ka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu ime. Nʼihu Fero na ndịisi ọrụ ya, Erọn weliri mkpanaka ya tie ya nʼelu mmiri dị nʼosimiri Naịl. Nʼotu ntabi anya, mmiri ahụ gbanwere ghọọ ọbara.
21 The fish that were in the river died. The river became foul. The Egyptians couldn’t drink water from the river. The blood was throughout all the land of Egypt.
Ka azụ dị nʼime mmiri Naịl nwụsịrị, mmiri ahụ malitere na-esi isi ọjọọ, nke mere ka ndị Ijipt hapụ inwe ike ịṅụ mmiri sitere na ya. Ọbara jupụtakwara nʼala Ijipt niile.
22 The magicians of Egypt did the same thing with their enchantments. So Pharaoh’s heart was hardened, and he didn’t listen to them, as the LORD had spoken.
Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ka mmiri chaa ọbara ọbara. Nke a mere ka Fero nyịchie obi ya. Ọ ṅaghị Mosis na Erọn ntị, dịka Onyenwe anyị gwara ha na ọ ga-eme.
23 Pharaoh turned and went into his house, and he didn’t even take this to heart.
Fero tụgharịrị laghachi nʼụlọeze ya, na-echeghị echiche banyere ihe niile ahụ e mere.
24 All the Egyptians dug around the river for water to drink; for they couldn’t drink the river water.
Ya mere, ndị Ijipt niile gwuru olulu mmiri nʼakụkụ osimiri ahụ ịchọ mmiri ọṅụṅụ ebe ha na-enweghị ike ịṅụ mmiri sitere nʼosimiri Naịl.
25 Seven days were fulfilled, after the LORD had struck the river.
Ụbọchị asaa gasịrị, site nʼụbọchị Onyenwe anyị tichara ihe otiti ahụ na Naịl.

< Exodus 7 >