< Deuteronomy 6 >

1 Now these are the commandments, the statutes, and the ordinances, which the LORD your God commanded to teach you, that you might do them in the land that you go over to possess;
Ndị a bụ iwu, na ụkpụrụ, na ikpe niile nke Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nyere m nʼiwu ka a kuziere unu ka unu debe, nʼala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta.
2 that you might fear the LORD your God, to keep all his statutes and his commandments, which I command you—you, your son, and your son’s son, all the days of your life; and that your days may be prolonged.
Ihe e ji nye iwu ndị a bụ ka unu na ụmụ unu, na ụmụ ụmụ unu, tụọ egwu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, site nʼidebe iwu ya, ogologo ndụ unu niile. Ọ bụrụ na unu emee ya, unu ga-enwe ndụ ogologo.
3 Hear therefore, Israel, and observe to do it, that it may be well with you, and that you may increase mightily, as the LORD, the God of your fathers, has promised to you, in a land flowing with milk and honey.
Nụrụ Izrel ma lezie anya nʼirube isi, ka ihe gaara unu nke ọma, ka unu baa ụba nke ukwuu nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, ọ bụladị dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha kwere unu na nkwa.
4 Hear, Israel: The LORD is our God. The LORD is one.
Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu.
5 You shall love the LORD your God with all your heart, with all your soul, and with all your might.
Were obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na uche gị na ike gị niile, hụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya.
6 These words, which I command you today, shall be on your heart;
Iwu ndị a m na-enye gị taa ka ị ga-eme ka ọ dịrị gị nʼobi.
7 and you shall teach them diligently to your children, and shall talk of them when you sit in your house, and when you walk by the way, and when you lie down, and when you rise up.
Ị ga-akụziri ya ụmụ gị. Kwuo okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ ala nʼụlọ gị, mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.
8 You shall bind them for a sign on your hand, and they shall be for frontlets between your eyes.
Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu.
9 You shall write them on the door posts of your house and on your gates.
Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụzọ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị.
10 It shall be, when the LORD your God brings you into the land which he swore to your fathers, to Abraham, to Isaac, and to Jacob, to give you, great and goodly cities which you didn’t build,
Mgbe Onyenwe anyị Chineke ga-akpọbata unu nʼala ahụ ọ ṅụrụ iyi nye nna nna unu ha, bụ Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, na inye unu, ala sara mbara nke jupụtara nʼobodo unu na-ewughị,
11 and houses full of all good things which you didn’t fill, and cisterns dug out which you didn’t dig, vineyards and olive trees which you didn’t plant, and you shall eat and be full;
na ụlọ ihe ọma dị iche iche jupụtara nʼime ya nke unu na-azụghị, na olulu mmiri unu na-egwughị nʼonwe unu, na ubi vaịnị na ọtụtụ osisi oliv unu na-amaghị ndị kụrụ ha, mgbe unu riri ihe rijuo afọ,
12 then beware lest you forget the LORD, who brought you out of the land of Egypt, out of the house of bondage.
leruonu anya, ka unu ghara ichefu Onyenwe anyị, onye mere ka unu site nʼala Ijipt pụta, bụ ala ebe unu bụ ohu.
13 You shall fear the LORD your God; and you shall serve him, and shall swear by his name.
Onyenwe anyị bụ Chineke gị, ka ị ga-atụ egwu, naanị ya ka ị ga-efe ofufe, ọ bụkwa aha ya ka ị ga-eji ṅụọ iyi.
14 You shall not go after other gods, of the gods of the peoples who are around you,
Unu agbasola chi ndị ọzọ, bụ chi ndị niile a gbara unu gburugburu na-efe.
15 for the LORD your God amongst you is a jealous God, lest the anger of the LORD your God be kindled against you, and he destroy you from off the face of the earth.
Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu, onye nọ nʼetiti unu, bụ Chineke ekworo. Ọ ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide unu, ọ ga-ekpochapụkwa unu site nʼelu ụwa.
16 You shall not tempt the LORD your God, as you tempted him in Massah.
Anwala Onyenwe anyị, bụ Chineke gị ọnwụnwa, dịka unu nwara ya na Masa.
17 You shall diligently keep the commandments of the LORD your God, and his testimonies, and his statutes, which he has commanded you.
Lezienụ anya hụ na unu debere iwu niile na ụkpụrụ niile, na ihe ama niile Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu.
18 You shall do that which is right and good in the LORD’s sight, that it may be well with you and that you may go in and possess the good land which the LORD swore to your fathers,
Meenụ ihe ziri ezi, na nke dị mma nʼanya Onyenwe anyị, ka ihe niile gaara unu nke ọma, ka unu nweekwa ike ịbanye, ma nweta ezi ala ahụ Onyenwe anyị ji ịṅụ iyi kwee nna nna unu ha na nkwa.
19 to thrust out all your enemies from before you, as the LORD has spoken.
Ka unu chụpụkwa ndị iro unu niile site nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị nʼonwe ya kwuru.
20 When your son asks you in time to come, saying, “What do the testimonies, the statutes, and the ordinances, which the LORD our God has commanded you mean?”
Nʼoge na-abịa, mgbe nwa nwoke gị ga-ajụ gị sị, “Gịnị bụ isi ihe ama ndị a, na ụkpụrụ ndị a, na iwu ndị a Onyenwe anyị Chineke anyị nyere unu?”
21 then you shall tell your son, “We were Pharaoh’s slaves in Egypt. The LORD brought us out of Egypt with a mighty hand;
Ị ga-aza ya sị, “Anyị bụrị ndị ohu Fero nʼala Ijipt, ma site nʼike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị kpọpụtara anyị site nʼala Ijipt.
22 and the LORD showed great and awesome signs and wonders on Egypt, on Pharaoh, and on all his house, before our eyes;
Nʼihu anyị, Onyenwe anyị zipụrụ ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche na ihe ebube dị iche iche, dị ukwuu jọọkwa njọ nʼahụ Ijipt na eze Fero nakwa ndị ụlọ ya niile.
23 and he brought us out from there, that he might bring us in, to give us the land which he swore to our fathers.
Ma o mere ka anyị site nʼIjipt pụta, ịkpọbata na inye anyị ala ahụ o ji ịṅụ iyi kwee nna nna anyị ha na nkwa.
24 The LORD commanded us to do all these statutes, to fear the LORD our God, for our good always, that he might preserve us alive, as we are today.
Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji nye anyị iwu ka anyị debe ụkpụrụ ndị a niile, na-atụ Onyenwe anyị Chineke anyị egwu, ka anyị bụrụ ndị ihe ga-agara nke ọma ụbọchị niile, ndị a na-edebe ndụ, dịka ọ dị taa.
25 It shall be righteousness to us, if we observe to do all these commandments before the LORD our God, as he has commanded us.”
Ọ bụrụ na anyị elezie anya debe iwu ndị a niile Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị, dịka o nyere anyị nʼiwu, anyị ga-abụ ndị na-ejegharị nʼezi omume.”

< Deuteronomy 6 >