< 2 Samuel 10 >

1 After this, the king of the children of Ammon died, and Hanun his son reigned in his place.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze ndị Amọn nwụrụ. Hanọn nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2 David said, “I will show kindness to Hanun the son of Nahash, as his father showed kindness to me.” So David sent by his servants to comfort him concerning his father. David’s servants came into the land of the children of Ammon.
Mgbe ahụ, Devid chere sị, “Aga m egosi Hanọn nwa Nahash obi ebere dịka nna ya si gosi m obi ebere.” Ya mere, Devid zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kasịe ya obi nʼihi ọnwụ nna ya. Mgbe ndị ikom Devid rutere nʼala ndị Amọn,
3 But the princes of the children of Ammon said to Hanun their lord, “Do you think that David honours your father, in that he has sent comforters to you? Hasn’t David sent his servants to you to search the city, to spy it out, and to overthrow it?”
ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na Devid eziteghị ha ịbịakwute gị, naanị ka ha bịa mee nledo nʼobodo a, nyochapụta ya ma kwatuo ya?”
4 So Hanun took David’s servants, shaved off one half of their beards, and cut off their garments in the middle, even to their buttocks, and sent them away.
Nʼihi nke a, Hanọn jidere ndị ozi Devid nʼike, kpụchapụ otu mpaghara afụọnụ nwoke ọbụla, bipụkwa uwe mwụda ha nʼetiti ike ha, zilaga ha.
5 When they told David this, he sent to meet them, for the men were greatly ashamed. The king said, “Wait at Jericho until your beards have grown, and then return.”
Mgbe a gwara Devid ihe mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha gaa zute ndị ikom ahụ, nʼihi na e mere ha ihe ihere nʼebe ọ dị ukwuu. Eze sịrị, “Nọdụnụ na Jeriko ruo mgbe afụọnụ unu tolitere, mgbe ahụ unu ga-alọta.”
6 When the children of Ammon saw that they had become odious to David, the children of Ammon sent and hired the Syrians of Beth Rehob and the Syrians of Zobah, twenty thousand footmen, and the king of Maacah with one thousand men, and the men of Tob twelve thousand men.
Ma mgbe ndị Amọn chọpụtara na ha abụrụla ihe ịsọ oyi nʼebe Devid nọ, ha gara goo iri puku ndị agha abụọ ji ụkwụ eje site nʼAram, Bet-Rehob nakwa Zoba. Ha gokwara eze Maaka ya na puku ndị ikom, tinyekwara iri puku ndị ikom na puku abụọ ọzọ site nʼala Tob.
7 When David heard of it, he sent Joab and all the army of the mighty men.
Mgbe Devid nụrụ nke a, o zipụrụ Joab na ndị agha ya niile bụ dike na dimkpa nʼagha.
8 The children of Ammon came out, and put the battle in array at the entrance of the gate. The Syrians of Zobah and of Rehob and the men of Tob and Maacah were by themselves in the field.
Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha. Ma ndị Aram, ndị si Zoba na Rehob, na ndị ikom Tob na Maaka, nọpụrụ onwe ha na mbara ala.
9 Now when Joab saw that the battle was set against him before and behind, he chose of all the choice men of Israel and put them in array against the Syrians.
Mgbe Joab hụrụ na agha dị megide ya nʼihu na azụ, ọ họpụtara ụfọdụ ndị ọkachamara site nʼetiti ndị agha Izrel, doo ha nʼusoro izute ndị Aram.
10 The rest of the people he committed into the hand of Abishai his brother; and he put them in array against the children of Ammon.
O tinyere ndị ikom fọdụrụ nʼokpuru ọchịchị Abishai, nwanne ya, zipụkwa ha izute ndị Amọn nʼagha.
11 He said, “If the Syrians are too strong for me, then you shall help me; but if the children of Ammon are too strong for you, then I will come and help you.
Joab sịrị, “Ọ bụrụ na ndị agha Aram akarịa m ike, pụta bịa nyere m aka; ma ọ bụrụkwanụ na ndị Amọn akarịa gị ike, aga m apụta bịa napụta gị.
12 Be courageous, and let’s be strong for our people and for the cities of our God; and may the LORD do what seems good to him.”
Nwee obi ike, ka anyị lụọ ọgụ a dịka ndị dị ike, nʼihi ndị anyị, na obodo niile nke Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị meekwa ihe dị mma nʼanya ya.”
13 So Joab and the people who were with him came near to the battle against the Syrians, and they fled before him.
Mgbe ahụ, Joab na ndị agha so ya bịara nso ibuso ndị Aram agha, ha sitere nʼihu ha gbapụ ọsọ.
14 When the children of Ammon saw that the Syrians had fled, they likewise fled before Abishai, and entered into the city. Then Joab returned from the children of Ammon and came to Jerusalem.
Mgbe ndị Amọn hụrụ ka ndị Aram na-agbapụ ọsọ, ha onwe ha gbakwara ọsọ nʼihu Abishai, gbaba nʼime obodo. Ya mere, Joab sitere nʼịlụso ndị Amọn agha lọghachi, bịa na Jerusalem.
15 When the Syrians saw that they were defeated by Israel, they gathered themselves together.
Mgbe ndị Aram hụrụ na ndị Izrel tigburu ha; ha lara, chịkọtaa onwe ha ọnụ.
16 Hadadezer sent and brought out the Syrians who were beyond the River; and they came to Helam, with Shobach the captain of the army of Hadadezer at their head.
Hadadeza mere ka a kpọta ndị Aram site nʼofe ọzọ nke Osimiri Yufretis. Ha gara Hilam, ha na ọchịagha ndị agha Hadadeza, a na-akpọ Shobak, onye na-edu ha.
17 David was told that; and he gathered all Israel together, passed over the Jordan, and came to Helam. The Syrians set themselves in array against David and fought with him.
Mgbe a gwara Devid banyere nke a, ọ chịkọtara ndị Izrel niile, gafee Jọdan, jeruo Hilam. Ndị Aram doro usoro agha ha izute Devid, lụsokwaa ya agha.
18 The Syrians fled before Israel; and David killed seven hundred charioteers of the Syrians and forty thousand horsemen, and struck Shobach the captain of their army, so that he died there.
Ma ha sitere nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, Devid gburu narị ndị ikom asaa na-anya ụgbọ agha nke ịnyịnya na-adọkpụ. Gbukwaa iri puku ndị agha anọ na-eji ụkwụ eje. O tidara Shobak, bụ ọchịagha ndị agha ha, ọ nwụọ nʼebe ahụ.
19 When all the kings who were servants to Hadadezer saw that they were defeated before Israel, they made peace with Israel and served them. So the Syrians were afraid to help the children of Ammon any more.
Mgbe ndị eze niile nọ nʼokpuru ọchịchị Hadadeza hụrụ na Izrel etigbuola ha, ha mere ka ha na ndị Izrel dịrị nʼudo, bụrụkwa ndị nọ nʼokpuru ha. Ya mere, ndị Aram tụrụ egwu inyere ụmụ Amọn aka ọzọ.

< 2 Samuel 10 >