< Psalms 103 >

1 By David. Praise Yahweh, my soul! All that is within me, praise his holy name!
Abụ Ọma Devid. Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya.
2 Praise Yahweh, my soul, and don’t forget all his benefits,
Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; echefukwala mmeso ọma ya niile,
3 who forgives all your sins, who heals all your diseases,
ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; na-agwọkwa gị ọrịa gị niile,
4 who redeems your life from destruction, who crowns you with loving kindness and tender mercies,
onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze,
5 who satisfies your desire with good things, so that your youth is renewed like the eagle’s.
onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile, ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo.
6 Yahweh executes righteous acts, and justice for all who are oppressed.
Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ezi omume, na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu.
7 He made known his ways to Moses, his deeds to the children of Israel.
O mere ka Mosis mata ụzọ ya, mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche:
8 Yahweh is merciful and gracious, slow to anger, and abundant in loving kindness.
Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara. Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya.
9 He will not always accuse; neither will he stay angry forever.
Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta;
10 He has not dealt with us according to our sins, nor repaid us for our iniquities.
ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị, ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị.
11 For as the heavens are high above the earth, so great is his loving kindness toward those who fear him.
Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ.
12 As far as the east is from the west, so far has he removed our transgressions from us.
Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ, otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ.
13 Like a father has compassion on his children, so Yahweh has compassion on those who fear him.
Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ, otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,
14 For he knows how we are made. He remembers that we are dust.
nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ aja.
15 As for man, his days are like grass. As a flower of the field, so he flourishes.
Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa, ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa,
16 For the wind passes over it, and it is gone. Its place remembers it no more.
ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa, adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya.
17 But Yahweh’s loving kindness is from everlasting to everlasting with those who fear him, his righteousness to children’s children,
Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya. Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha,
18 to those who keep his covenant, to those who remember to obey his precepts.
nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi.
19 Yahweh has established his throne in the heavens. His kingdom rules over all.
Onyenwe anyị emeela ka ocheeze ya guzosie ike nʼeluigwe, alaeze ya na-achị ihe niile.
20 Praise Yahweh, you angels of his, who are mighty in strength, who fulfill his word, obeying the voice of his word.
Toonu Onyenwe anyị, unu ndị mmụọ ozi ya, unu ndị dị ike ndị na-eme ihe ọ chọrọ, na-erubere okwu ya isi.
21 Praise Yahweh, all you armies of his, you servants of his, who do his pleasure.
Toonu Onyenwe anyị unu usuu ndị agha ya niile; unu ndị na-ejere ya ozi, ndị na-eme uche ya.
22 Praise Yahweh, all you works of his, in all places of his dominion. Praise Yahweh, my soul!
Toonu Onyenwe anyị, ọrụ aka ya niile nʼebe ọbụla ọ na-achị. Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.

< Psalms 103 >