< Numbers 29 >

1 “‘In the seventh month, on the first day of the month, you shall have a holy convocation; you shall do no regular work. It is a day of blowing of trumpets to you.
“‘Ụbọchị unu ga-egbu opi ike ga-adị nʼabalị mbụ nke ọnwa asaa nʼafọ ọbụla. Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke mmadụ niile. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.
2 You shall offer a burnt offering for a pleasant aroma to Yahweh: one young bull, one ram, seven male lambs a year old without defect;
Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụ aja nsure ọkụ a ga-eji otu oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ. Nke a bụ aja na-adị Onyenwe anyị ezi mma, ma na-esi ya isi ụtọ.
3 and their meal offering, fine flour mixed with oil: three tenths for the bull, two tenths for the ram,
Aja mkpụrụ ọka ka a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ, nʼisi oke ehi ahụ, lita anọ na ọkara, nʼisi ebule,
4 and one tenth for every lamb of the seven lambs;
na lita abụọ, nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla.
5 and one male goat for a sin offering, to make atonement for you;
Tinyere otu mkpi a ga-eji chụọ aja maka mkpuchi mmehie unu.
6 in addition to the burnt offering of the new moon with its meal offering, and the continual burnt offering with its meal offering, and their drink offerings, according to their ordinance, for a pleasant aroma, an offering made by fire to Yahweh.
Aja ndị a niile bụ nke a ga-etinye nye nʼaja nsure ọkụ a na-achụ kwa ọnwa, na aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, ha na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e depụtara. Ha bụ aja ihe oriri a na-achụrụ Onyenwe anyị, aja nwere isisi dị ụtọ.
7 “‘On the tenth day of this seventh month you shall have a holy convocation. You shall afflict your souls. You shall do no kind of work;
“‘Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa ahụ, unu ga-enwekwa nzukọ dị nsọ. Unu ga-ebudata onwe unu nʼala. O nweghịkwa ụdị ọrụ ọbụla unu ga-arụ.
8 but you shall offer a burnt offering to Yahweh for a pleasant aroma: one young bull, one ram, seven male lambs a year old, all without defect;
Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ, nke isisi ya na-atọ ya ụtọ. A ga-eji otu nwa oke ehi, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja a.
9 and their meal offering, fine flour mixed with oil: three tenths for the bull, two tenths for the one ram,
Aja mkpụrụ ọka ga-eso ya. A ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ aja nwa oke ehi ahụ. Jiri lita ụtụ ọka anọ na ọkara chụọ aja ebule,
10 one tenth for every lamb of the seven lambs;
jirikwa lita ụtụ ọka abụọ chụọ aja nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla.
11 one male goat for a sin offering, in addition to the sin offering of atonement, and the continual burnt offering, and its meal offering, and their drink offerings.
Tinyekwa otu mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie. A ga-atụkwasị nke a nʼaja mkpuchi mmehie a na-achụ, tinyere aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ niile.
12 “‘On the fifteenth day of the seventh month you shall have a holy convocation. You shall do no regular work. You shall keep a feast to Yahweh seven days.
“‘Nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa asaa, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke ụmụ Izrel niile. Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmalite mmemme abalị asaa nʼihu Onyenwe anyị.
13 You shall offer a burnt offering, an offering made by fire, of a pleasant aroma to Yahweh: thirteen young bulls, two rams, fourteen male lambs a year old, all without defect;
Cheenụ onyinye a na-enye site nʼọkụ nʼihu Onyenwe anyị nke isisi ya na-atọ ya ụtọ, jirinụ oke ehi iri na atọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị na-enweghị ntụpọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, chụọ aja nsure ọkụ.
14 and their meal offering, fine flour mixed with oil: three tenths for every bull of the thirteen bulls, two tenths for each ram of the two rams,
A ga-atụkwasịkwa aja mkpụrụ ọka nke e ji lita ụtụ ọka isii na ọkara gwakọta ya na mmanụ, nʼisi otu nʼime oke ehi iri na atọ ndị ahụ niile. Lita anọ na ọkara nʼisi otu ebule nʼime ebule abụọ ndị ahụ,
15 and one tenth for every lamb of the fourteen lambs;
ma lita abụọ nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla.
16 and one male goat for a sin offering, in addition to the continual burnt offering, its meal offering, and its drink offering.
Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha.
17 “‘On the second day you shall offer twelve young bulls, two rams, and fourteen male lambs a year old without defect;
“‘Nʼụbọchị abụọ nke mmemme a, a ga-eji oke ehi iri na abụọ, ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
18 and their meal offering and their drink offerings for the bulls, for the rams, and for the lambs, according to their number, after the ordinance;
Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha, bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
19 and one male goat for a sin offering, in addition to the continual burnt offering, with its meal offering and their drink offerings.
Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
20 “‘On the third day: eleven bulls, two rams, fourteen male lambs a year old without defect;
“‘Nʼụbọchị nke atọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri na otu, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
21 and their meal offering and their drink offerings for the bulls, for the rams, and for the lambs, according to their number, after the ordinance;
Ihe ga-eso aja oke ehi na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
22 and one male goat for a sin offering, in addition to the continual burnt offering, and its meal offering, and its drink offering.
Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
23 “‘On the fourth day ten bulls, two rams, fourteen male lambs a year old without defect;
“‘Nʼụbọchị nke anọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
24 their meal offering and their drink offerings for the bulls, for the rams, and for the lambs, according to their number, after the ordinance;
Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
25 and one male goat for a sin offering; in addition to the continual burnt offering, its meal offering, and its drink offering.
Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha.
26 “‘On the fifth day: nine bulls, two rams, fourteen male lambs a year old without defect;
“‘Nʼụbọchị nke ise nke mmemme a, ị ga-ewere ụmụ oke ehi itoolu, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
27 and their meal offering and their drink offerings for the bulls, for the rams, and for the lambs, according to their number, after the ordinance,
Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
28 and one male goat for a sin offering, in addition to the continual burnt offering, and its meal offering, and its drink offering.
Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
29 “‘On the sixth day: eight bulls, two rams, fourteen male lambs a year old without defect;
“‘Nʼụbọchị nke isii nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi asatọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
30 and their meal offering and their drink offerings for the bulls, for the rams, and for the lambs, according to their number, after the ordinance,
Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
31 and one male goat for a sin offering; in addition to the continual burnt offering, its meal offering, and the drink offerings of it.
Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
32 “‘On the seventh day: seven bulls, two rams, fourteen male lambs a year old without defect;
“‘Nʼụbọchị nke asaa nke mmemme ahụ, were ụmụ oke ehi asaa, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
33 and their meal offering and their drink offerings for the bulls, for the rams, and for the lambs, according to their number, after the ordinance,
Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
34 and one male goat for a sin offering; in addition to the continual burnt offering, its meal offering, and its drink offering.
Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
35 “‘On the eighth day you shall have a solemn assembly. You shall do no regular work;
“‘Nʼụbọchị nke asatọ ndị Izrel niile ga-enwe oke nzukọ. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.
36 but you shall offer a burnt offering, an offering made by fire, a pleasant aroma to Yahweh: one bull, one ram, seven male lambs a year old without defect;
Chụọ aja nsure ọkụ, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ. Ị ga-eji otu nwa oke ehi, otu ebule na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla, chụọ ya.
37 their meal offering and their drink offerings for the bull, for the ram, and for the lambs, shall be according to their number, after the ordinance,
Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
38 and one male goat for a sin offering, in addition to the continual burnt offering, with its meal offering, and its drink offering.
Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
39 “‘You shall offer these to Yahweh in your set feasts—in addition to your vows and your free will offerings—for your burnt offerings, your meal offerings, your drink offerings, and your peace offerings.’”
“‘Tinyere onyinye a na-enye dịka nkwa e kwere si dị, na onyinye afọ ofufu unu, unu ga-akwadoro Onyenwe anyị onyinye ndị a nʼoge mmemme a kara aka unu: aja nsure ọkụ unu, onyinye mkpụrụ ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ na aja udo.’”
40 Moses told the children of Israel according to all that Yahweh commanded Moses.
Ya mere Mosis gwara ụmụ Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ịgwa ha.

< Numbers 29 >