< Joshua 2 >

1 Joshua the son of Nun secretly sent two men out of Shittim as spies, saying, “Go, view the land, including Jericho.” They went and came into the house of a prostitute whose name was Rahab, and slept there.
Joshua nwa Nun sitere na Shitim zipụ ndị nnyopụta abụọ na nzuzo sị ha, “Gaanụ leta otu ihe si aga nʼala ahụ, karịsịa nʼobodo Jeriko.” Ha gara nʼobodo ahụ baa nʼụlọ nwanyị akwụna aha ya bụ Rehab nọọ ọnọdụ nʼebe ahụ.
2 The king of Jericho was told, “Behold, men of the children of Israel came in here tonight to spy out the land.”
Ma otu onye gwara eze Jeriko okwu sị, “Lee, ụfọdụ ụmụ ndị ikom Izrel batara obodo a nʼabalị inyochapụta ala anyị.”
3 Jericho’s king sent to Rahab, saying, “Bring out the men who have come to you, who have entered into your house; for they have come to spy out all the land.”
Mgbe eze Jeriko nụrụ okwu a, o zigaara Rehab ozi sị, “Kpọpụta ndị ikom ahụ batara nʼụlọ gị nʼihi na ha bịara iledo ala anyị.”
4 The woman took the two men and hid them. Then she said, “Yes, the men came to me, but I didn’t know where they came from.
Ma nwanyị ahụ zoro mmadụ abụọ ahụ. Mgbe ndị ahụ e ziri ozi bịarutere, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ eziokwu na ndị ikom ahụ bakwutere m, ma amaghị m ebe ha si bịa.
5 About the time of the shutting of the gate, when it was dark, the men went out. Where the men went, I don’t know. Pursue them quickly. You may catch up with them.”
Ma ha apụọlarị. Ha hapụrụ obodo a mgbe a na-achọ imechi ọnụ ụzọ ama, nʼoge ọchịchịrị bidoro ịgba. Amaghị m ebe ha gara. Ma, nʼuche m, ọ bụrụ na unu achụso ha ọsọ ọsịịsọ unu nwere ike ijide ha.”
6 But she had brought them up to the roof, and hidden them under the stalks of flax which she had laid in order on the roof.
(Nʼeziokwu ọ bụ Rehab nʼonwe ya mere ka mmadụ abụọ ahụ rigoro nʼelu ụlọ ebe o zoro ha nʼokpuru ahịhịa flakisi ọ wụsara nʼebe ahụ.)
7 The men pursued them along the way to the fords of the Jordan River. As soon as those who pursued them had gone out, they shut the gate.
Ya mere, ndị ikom ahụ pụrụ na-achụ ndị nnyopụta ahụ nʼakụkụ ụzọ gara ngabiga Jọdan. Ma ngwangwa ha pụrụ, e mechiri ọnụ ụzọ ama e si abata obodo ahụ.
8 Before they had lain down, she came up to them on the roof.
Ma tupu ndị nnyopụta ahụ edina ala ịrahụ ụra nʼabalị ahụ, Rehab rịgokwuru ha,
9 She said to the men, “I know that Yahweh has given you the land, and that the fear of you has fallen upon us, and that all the inhabitants of the land melt away before you.
gwa ha sị, “Ama m na Onyenwe anyị enyela unu ala a, marakwa na oke ụjọ nke egwu unu adakwasịla anyị, nke mere na ndị niile bi nʼime ala a na-agbaze nʼegwu nʼihi unu,
10 For we have heard how Yahweh dried up the water of the Red Sea before you, when you came out of Egypt; and what you did to the two kings of the Amorites, who were beyond the Jordan, to Sihon and to Og, whom you utterly destroyed.
nʼihi na anyị anụla otu Onyenwe anyị si mee ka mmiri dị nʼOsimiri Uhie taa nʼihi unu, mgbe unu si nʼIjipt pụta. Anyị nụkwara ihe unu mere Saịhọn, na Ọg, bụ eze abụọ ndị Amọrị, ndị bi nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, otu unu si bibie ha, gbuchapụ ndị niile bi nʼala ahụ.
11 As soon as we had heard it, our hearts melted, and there wasn’t any more spirit in any man, because of you: for Yahweh your God, he is God in heaven above, and on earth beneath.
Ma mgbe anyị nụrụ ihe ndị a, obi anyị gbazere nʼihi ụjọ, mmụọ onye ọbụla dara mba nʼihi unu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa.
12 Now therefore, please swear to me by Yahweh, since I have dealt kindly with you, that you also will deal kindly with my father’s house, and give me a true sign;
“Ugbu a, ebe ọ bụ na m emeelara unu ebere, jirinụ Onyenwe anyị ṅụọrọ m iyi na unu ga-emere ezinaụlọ m ebere. Gosinụ m ihe ịrịbama nʼeziokwu,
13 and that you will save alive my father, my mother, my brothers, and my sisters, and all that they have, and will deliver our lives from death.”
na unu ga-emekwa ka ndụ nna m, na nne m, na ụmụnne m ndị ikom na ndị inyom, na ndị ezinaụlọ ha niile dịrị, na unu ga-anapụta anyị site nʼọnwụ.”
14 The men said to her, “Our life for yours, if you don’t talk about this business of ours; and it shall be, when Yahweh gives us the land, that we will deal kindly and truly with you.”
Ndị ikom ahụ kwere ya nkwa sị, “Ndụ anyị lara ndụ unu. Ọ bụrụ na ị gbaghị anyị ama, anyị ga-egosi gị obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi mgbe Onyenwe anyị ga-enye anyị ala a.”
15 Then she let them down by a cord through the window; for her house was on the side of the wall, and she lived on the wall.
Ụlọ Rehab dị nʼakụkụ mgbidi obodo ahụ. O ji ụdọ site na oghereikuku wedata ndị ikom abụọ ahụ.
16 She said to them, “Go to the mountain, lest the pursuers find you. Hide yourselves there three days, until the pursuers have returned. Afterward, you may go your way.”
Ọ gwakwara ha sị, “Gbalaganụ nʼugwu, zoonụ onwe unu nʼebe ahụ ụbọchị atọ, tutu ndị ahụ na-achọ unu alaghachi azụ. Mgbe ahụ, unu nwere ike ịpụta laghachi ebe unu si bịa.”
17 The men said to her, “We will be guiltless of this your oath which you’ve made us to swear.
Ndị ahụ gwara ya sị, “Iyi a i mere ka anyị ṅụọ agaghị adị ire megide anyị,
18 Behold, when we come into the land, tie this line of scarlet thread in the window which you used to let us down. Gather to yourself into the house your father, your mother, your brothers, and all your father’s household.
ma ọ bụrụ na nʼụbọchị ahụ anyị ga-abata ala a, i wereghị ụdọ ahụ na-acha uhie uhie kenye ya na oghereikuku i si wedata anyị, ma ọ bụrụkwa na ịkpọbataghị nʼụlọ gị nna gị, na nne gị, na ụmụnne gị ndị ikom, na ndị ezinaụlọ gị niile.
19 It shall be that whoever goes out of the doors of your house into the street, his blood will be on his head, and we will be guiltless. Whoever is with you in the house, his blood shall be on our head, if any hand is on him.
Ọ bụrụ na onye ọbụla esite nʼụlọ gị pụọ nʼezi, ọbara ya agaghị adị anyị nʼisi, anyị agaghị abụkwa ndị ikpe mara. Ma ikpe ọmụma dịrị anyị ma ọ bụrụ nʼihe ọbụla emee onye ọbụla gị na ya so nọdụ nʼime ụlọ.
20 But if you talk about this business of ours, then we shall be guiltless of your oath which you’ve made us to swear.”
Ma ọ bụrụ na ị gbaa anyị ama, ọ dịkwaghị iwu ji anyị imezu iyi a i mere ka anyị ṅụọrọ gị.”
21 She said, “Let it be as you have said.” She sent them away, and they departed. Then she tied the scarlet line in the window.
Rehab zara sị ha, “Dịka okwu niile unu kwuru si dị, otu a ka ọ ga-adị.” O zilagara ha. Ha pụkwara gaara onwe ha. Ma Rehab kekwasịrị ụdọ uhie uhie ahụ nʼọnụ oghereikuku ụlọ ya.
22 They went and came to the mountain, and stayed there three days, until the pursuers had returned. The pursuers sought them all along the way, but didn’t find them.
Ndị ikom abụọ ahụ gara zoo onwe ha nʼugwu ahụ. Ha nọrọ ụbọchị atọ nʼebe ahụ dịka Rehab gwara ha, tutu ndị ahụ na-achụ ha laghachiri nʼobodo Jeriko. Ndị a chọọrọ ha gaa ebe niile, nʼokporoụzọ niile, ma ha ahụghị ha.
23 Then the two men returned, descended from the mountain, crossed the river, and came to Joshua the son of Nun. They told him all that had happened to them.
Emesịa, mmadụ abụọ ahụ e zipụrụ iledo ala ahụ anya sitere nʼebe ha zoro onwe ha rịpụta, gafee osimiri Jọdan, laghachi nʼebe ụmụ Izrel nọ. Ha bịara kọọrọ Joshua nwa Nun otu ha si gaa ije ha.
24 They said to Joshua, “Truly Yahweh has delivered all the land into our hands. Moreover, all the inhabitants of the land melt away before us.”
Ha gwara Joshua sị, “Nʼezie, Onyenwe anyị enyela anyị ala ahụ niile, nʼihi na ndị niile bi nʼala ahụ na-atụ anyị ụjọ.”

< Joshua 2 >