< Joshua 19 >

1 The second lot came out for Simeon, even for the tribe of the children of Simeon according to their families. Their inheritance was in the middle of the inheritance of the children of Judah.
Ndị nke abụọ sitere nʼife nza nweta oke ha bụ ebo Simiọn dịka ikwu ha si dị. Ala ha ketara dị nʼime ala e kenyere ndị Juda.
2 They had for their inheritance Beersheba (or Sheba), Moladah,
Ihe nketa ụmụ Simiọn bụ ndị a: Bịasheba (maọbụ Sheba), Molada,
3 Hazar Shual, Balah, Ezem,
Haza Shual, Bala, Ezem,
4 Eltolad, Bethul, Hormah,
Eltolad, Betul, Homa,
5 Ziklag, Beth Marcaboth, Hazar Susah,
Ziklag, Bet-Makabot, Haza Susa,
6 Beth Lebaoth, and Sharuhen; thirteen cities with their villages;
Bet-Lebaot na Sharuhen, obodo iri na atọ na obodo nta ndị ọzọ gbara ha gburugburu.
7 Ain, Rimmon, Ether, and Ashan; four cities with their villages;
Na Ain, Rimọn, Eta na Ashan, obodo anọ na obodo nta ha,
8 and all the villages that were around these cities to Baalath Beer, Ramah of the South. This is the inheritance of the tribe of the children of Simeon according to their families.
tinyekwara obodo nta ndị ọzọ niile gbara obodo ukwu ndị a gburugburu, ruo obodo Baalat-Bịa, ya bụ (obodo Rema dị na Negev). Nke a bụ ihe nketa ebo Simiọn dịka ikwu ha si dị.
9 Out of the part of the children of Judah was the inheritance of the children of Simeon; for the portion of the children of Judah was too much for them. Therefore the children of Simeon had inheritance in the middle of their inheritance.
E sitere nʼoke ụmụ Juda wepụta oke ụmụ Simiọn, nʼihi na ihe ụmụ Juda ketara dị ukwuu karịa ihe ha kwesiri iketa. Ọ bụ nke a mere ụmụ Simiọn ji nweta ihe nketa site nʼetiti ala ndị Juda.
10 The third lot came up for the children of Zebulun according to their families. The border of their inheritance was to Sarid.
Ebo nke atọ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza bụ ebo Zebụlọn dịka ikwu ha si dị. Ala ha nwetara gbatịrị ruo Sarid.
11 Their border went up westward, even to Maralah, and reached to Dabbesheth. It reached to the brook that is before Jokneam.
Site nʼebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị gaa nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ruo Marala na Dabeshet, rukwaa iyi dị nʼihu Jokneam.
12 It turned from Sarid eastward toward the sunrise to the border of Chisloth Tabor. It went out to Daberath, and went up to Japhia.
O si na Sarid chigharịa ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ahụ ruru nʼoke ala Kislọt Teboa, gbagorokwa ruo Daberat, ruokwa Jafia.
13 From there it passed along eastward to Gath Hepher, to Ethkazin; and it went out at Rimmon which stretches to Neah.
Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo Gat Hefa, Et Kazin na Rimọn, tụgharịa nʼụzọ e si aga Nea.
14 The border turned around it on the north to Hannathon; and it ended at the valley of Iphtah El;
Nʼebe ahụ, ọ gara gburugburu nʼakụkụ ugwu ruo Hanatọn, ruokwa na Ndagwurugwu Ifta El ebe ọ sọtụrụ.
15 Kattath, Nahalal, Shimron, Idalah, and Bethlehem: twelve cities with their villages.
Obodo ndị a niile dịkwa nʼime ihe nketa ụmụ Zebụlọn: Katat, Nahalal, Shịmrọn, Idala na Betlehem. Obodo niile ndị a dị iri na abụọ, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.
16 This is the inheritance of the children of Zebulun according to their families, these cities with their villages.
Obodo ndị a niile na obodo nta ha, so nʼala ụmụ Zebụlọn nwetara dịka ihe nketa ha, dịka ikwu ha si dị.
17 The fourth lot came out for Issachar, even for the children of Issachar according to their families.
Ebo nke anọ sitere nʼife nza nweta ihe nketa ha bụ ụmụ Isaka dịka ikwu ha si dị.
18 Their border was to Jezreel, Chesulloth, Shunem,
Ala na obodo ha ketara bụ ndị a: Jezril, Kesulọt, Shunem,
19 Hapharaim, Shion, Anaharath,
Hafaraim, na Shịọn, Anaharat,
20 Rabbith, Kishion, Ebez,
Rabit, Kishiọn, Ebez na
21 Remeth, Engannim, En Haddah, and Beth Pazzez.
Remet, En-Ganim, En-Hada na Bet-Pazez.
22 The border reached to Tabor, Shahazumah, and Beth Shemesh. Their border ended at the Jordan: sixteen cities with their villages.
Oke ala ha ruru na Taboa, Shahazuma na Bet-Shemesh, ma kwụsị nʼosimiri Jọdan. Obodo ndị a niile dị iri na isii, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.
23 This is the inheritance of the tribe of the children of Issachar according to their families, the cities with their villages.
Ya mere, obodo ukwu ndị a na obodo nta ha dị nʼala ahụ ebo Isaka nwetara dịka ihe nketa ha, dị ka ikwu ha si dị.
24 The fifth lot came out for the tribe of the children of Asher according to their families.
Ebo nke ise e kenyere ala site nʼife nza bụ ụmụ Asha dịka ikwu ha si dị.
25 Their border was Helkath, Hali, Beten, Achshaph,
Ala na obodo ha ketara bụ ndị a: Helkat, Hali, Beten, Akshaf,
26 Allammelech, Amad, Mishal. It reached to Carmel westward, and to Shihorlibnath.
Alamelek, Amad na Mishal. Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ gbatịrị ruo Kamel na Shihoa-Libnat.
27 It turned toward the sunrise to Beth Dagon, and reached to Zebulun, and to the valley of Iphtah El northward to Beth Emek and Neiel. It went out to Cabul on the left hand,
O sitere nʼebe ahụ tụgharịa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ gawa Bet-Dagọn, ma ruokwa Zebụlọn na Ndagwurugwu Ifta El, ma gbagoro ruokwa Bet-Emek na Neiel. O sikwa nʼebe ahụ gafee, ruo Kabul, nʼakụkụ aka ekpe.
28 and Ebron, Rehob, Hammon, and Kanah, even to great Sidon.
Ọ gara ruo Ebrọn, Rehob, Hamọn na Kana, ruokwa ebe obodo Saịdọn gbasapụrụ.
29 The border turned to Ramah, to the fortified city of Tyre; and the border turned to Hosah. It ended at the sea by the region of Achzib;
Oke ala ahụ mere dịka ọ na-alaghachi azụ bịaruo Rema, ruokwa obodo e wusiri ike bụ Taịa, tụgharịakwa gawa Hosa pụta nʼọnụ mmiri osimiri Mediterenịa nke dị nʼakụkụ Akzib
30 Ummah also, and Aphek, and Rehob: twenty-two cities with their villages.
na Umma, Afek na Rehob. Ọnụọgụgụ obodo ndị a niile bụ iri abụọ na abụọ tinyere obodo nta ha niile.
31 This is the inheritance of the tribe of the children of Asher according to their families, these cities with their villages.
Obodo ndị a na obodo nta ha niile dị nʼala ahụ ebo Asha nwetara dịka ihe nketa, dịka ikwu ha si dị.
32 The sixth lot came out for the children of Naphtali, even for the children of Naphtali according to their families.
Ebo nke isii e nyere ihe nketa site nʼife nza bụ ebo Naftalị, dịka ikwu ha si dị.
33 Their border was from Heleph, from the oak in Zaanannim, Adami-nekeb, and Jabneel, to Lakkum. It ended at the Jordan.
Oke ala ha malitere na Helef ruo nʼosisi ukwu dị na Zaananim, Adami Nekeb na Jabneel, gafee ruo Lakum, kwụsị nʼosimiri Jọdan.
34 The border turned westward to Aznoth Tabor, and went out from there to Hukkok. It reached to Zebulun on the south, and reached to Asher on the west, and to Judah at the Jordan toward the sunrise.
Site nʼebe ahụ oke ala ha gara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ruo Aznot Tabo, site nʼebe ahụ ruo Hukọk, rute Zebụlọn na ndịda, na Asha nʼọdịda anyanwụ, ruokwa Juda nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan.
35 The fortified cities were Ziddim, Zer, Hammath, Rakkath, Chinnereth,
Obodo niile e wusiri ike e kenyere ha bụ ndị a: Zidim, Zea, Hamat, Rakat, Kineret,
36 Adamah, Ramah, Hazor,
Adama, Rema, Hazọ,
37 Kedesh, Edrei, En Hazor,
Kedesh, Edrei, En-Hazoa,
38 Iron, Migdal El, Horem, Beth Anath, and Beth Shemesh; nineteen cities with their villages.
Iron, Migdal El, Horem, Bet-Anat na Bet-Shemesh. Ya mere, ọnụọgụgụ obodo ndị a niile bụ iri na itoolu, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.
39 This is the inheritance of the tribe of the children of Naphtali according to their families, the cities with their villages.
Obodo ndị a na obodo nta ha niile ka ebo Naftalị dịka ikwu ha si dị, nwetara dịka ihe nketa ha.
40 The seventh lot came out for the tribe of the children of Dan according to their families.
Site nʼife nza ebo Dan, bụ ebo nke asaa nwetara ihe nketa dịka ikwu ha si dị.
41 The border of their inheritance was Zorah, Eshtaol, Irshemesh,
Oke ala ihe nketa ha bụ ndị a: Zora, Eshtaol, Ia-Shemesh,
42 Shaalabbin, Aijalon, Ithlah,
Shaalabin, Aijalon, Itla,
43 Elon, Timnah, Ekron,
Elọn, Timna, Ekrọn,
44 Eltekeh, Gibbethon, Baalath,
Elteke, Gibeton, Baalat,
45 Jehud, Bene Berak, Gath Rimmon,
Jehud, Bene-Berak, Gat Rimọn,
46 Me Jarkon, and Rakkon, with the border opposite Joppa.
Me-Jakọn na Rakọn, obodo dị nʼoke ala, na ncherita ihu Jopa.
47 The border of the children of Dan went out beyond them; for the children of Dan went up and fought against Leshem, and took it, and struck it with the edge of the sword, and possessed it, and lived therein, and called Leshem, Dan, after the name of Dan their forefather.
Mgbe oke ala ụmụ Dan ketara sitere nʼaka ha pụọ. Ha gara buso obodo Leshem agha merie ha, were mma agha tigbuo ndị niile bi nʼime ya, bichie ya. Ha kpọrọ obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna nna ha ochie.
48 This is the inheritance of the tribe of the children of Dan according to their families, these cities with their villages.
Obodo ndị a na obodo nta ha bụ ihe nketa ebo Dan nwetara dịka ikwu ha si dị.
49 So they finished distributing the land for inheritance by its borders. The children of Israel gave an inheritance to Joshua the son of Nun among them.
Mgbe e kechara ala ahụ niile, nye ebo ọbụla ala dịka ọnụọgụgụ ha niile si dị, ụmụ Izrel nyere Joshua, nwa Nun ihe nketa ha nʼetiti ha.
50 According to Yahweh’s commandment, they gave him the city which he asked, even Timnathserah in the hill country of Ephraim; and he built the city, and lived there.
Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola na Joshua nwere ike iwere ala ọbụla ọ chọrọ. Ya mere, ha nyere Joshua obodo Timnat Sera nke dị nʼugwu Ifrem. Joshua wugharịrị obodo ahụ biri nʼime ya.
51 These are the inheritances, which Eleazar the priest, Joshua the son of Nun, and the heads of the fathers’ houses of the tribes of the children of Israel, distributed for inheritance by lot in Shiloh before Yahweh, at the door of the Tent of Meeting. So they finished dividing the land.
Ndị a bụ oke ala nke Elieza onye nchụaja, Joshua nwa Nun na ndịisi ụlọ ebo ụmụ Izrel, kere na Shaịlo site nʼife nza nʼihu Onyenwe anyị, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ha si otu a kebie ala ahụ.

< Joshua 19 >