< Job 4 >

1 Then Eliphaz the Temanite answered,
Mgbe ahụ, Elifaz onye obodo Teman zara Job sị:
2 “If someone ventures to talk with you, will you be grieved? But who can withhold himself from speaking?
“Iwe ọ ga-ewe gị ma ọ bụrụ na mmadụ agwa gị okwu? Onye kwanụ nwere ike ịnọ nʼebe a hapụ ikwu okwu?
3 Behold, you have instructed many, you have strengthened the weak hands.
Lee ka i siri nye ọtụtụ mmadụ ndụmọdụ, na ka i si mee ka ndị na-ada mba nwee ume.
4 Your words have supported him who was falling, you have made the feeble knees firm.
Okwu ọnụ gị abụrụla ihe ịgbaume nye ọtụtụ mmadụ, ị bụrụla ịgbaume nye ndị ikpere ha na-ama jijiji.
5 But now it has come to you, and you faint. It touches you, and you are troubled.
Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, ị bụrụla onye na-ada mba; nsogbu etiela gị aka, i na-ama jijiji.
6 Isn’t your piety your confidence? Isn’t the integrity of your ways your hope?
Egwu ị na-atụ Chineke ọ gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị, izi ezi nke ndụ gị abụrụkwa olileanya gị?
7 “Remember, now, who ever perished, being innocent? Or where were the upright cut off?
“Chee echiche ugbu a! Onye, bụ onye aka ya dị ọcha, nke a larala nʼiyi? Ebee ka i hụrụ ka e bibiri ndị na-eme ihe ziri ezi?
8 According to what I have seen, those who plow iniquity and sow trouble, reap the same.
Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụka na-aghọta ya dịka ihe ubi.
9 By the breath of God they perish. By the blast of his anger are they consumed.
Chineke na-ala ha nʼiyi site nʼume ọ na-ekupụta. Ọ na-esitekwa nʼoke iwe ya repịa ha.
10 The roaring of the lion, and the voice of the fierce lion, the teeth of the young lions, are broken.
Ọdụm nwere ike gbọọ ụja, maọbụ bigbọọ, ma eze ọdụm dị ike ka a gbajisiri.
11 The old lion perishes for lack of prey. The cubs of the lioness are scattered abroad.
Oke ọdụm na-ala nʼiyi site na-enweghị ihe ọ dọgbutara, ụmụ nne ọdụm niile ka a na-achụsa.
12 “Now a thing was secretly brought to me. My ear received a whisper of it.
“E mere ka okwu rute m nʼụzọ nzuzo, ntị m nụrụ ya nʼịgba izu.
13 In thoughts from the visions of the night, when deep sleep falls on men,
Nʼime nkụja nke oke nrọ nke abalị, mgbe oke ụra na-adakwasị ụmụ mmadụ,
14 fear came on me, and trembling, which made all my bones shake.
oke ụjọ na ahụ ịma jijiji dakwasịrị m, meekwa ka ọkpụkpụ niile dị nʼahụ m maa jijiji.
15 Then a spirit passed before my face. The hair of my flesh stood up.
Otu mmụọ sitere nʼihu m gafee. Ọ bụladị ajị dị m nʼahụ guzochara ọtọ nʼihi ụjọ.
16 It stood still, but I couldn’t discern its appearance. A form was before my eyes. Silence, then I heard a voice, saying,
Ọ kwụsịrị; ma apụghị m ịkọ ihe ọ bụ. Onyinyo guzooro nʼanya m, anụrụ m olu dị nro, nke kwuru sị:
17 ‘Shall mortal man be more just than God? Shall a man be more pure than his Maker?
‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke? Ọ bụladị nwoke dị ike, ọ pụrụ ịdị ọcha nʼobi karịa Onye kere ya?
18 Behold, he puts no trust in his servants. He charges his angels with error.
Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi, ọ bụrụ na ọ na-ebo ndị mmụọ ozi ya ebubo imejọ ihe,
19 How much more those who dwell in houses of clay, whose foundation is in the dust, who are crushed before the moth!
ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa, bụ ndị ntọala ha dị nʼaja, ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla.
20 Between morning and evening they are destroyed. They perish forever without any regarding it.
Site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, a na-etipịasị ha: ha na-ala nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi, ihe niile a na-agakwa dịka o si aga.
21 Isn’t their tent cord plucked up within them? They die, and that without wisdom.’
Ọ bụ na-eholiteghị eriri ụlọ ikwu ha elu, mee ka ha nwụọ na-enweghị amamihe?’

< Job 4 >