< Deuteronomy 34 >

1 Moses went up from the plains of Moab to Mount Nebo, to the top of Pisgah, that is opposite Jericho. Yahweh showed him all the land of Gilead to Dan,
Mgbe ahụ, Mosis sitere na mbara ala Moab rigoruo nʼelu nʼugwu Nebo, ruo nʼelu Pisga, nke dị na ncherita ihu Jeriko. Nʼebe ahụ Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ala ahụ niile anya site na Gilead ruo Dan;
2 and all Naphtali, and the land of Ephraim and Manasseh, and all the land of Judah, to the Western Sea,
ya na ala Naftalị niile nʼoke ala Ifrem, na nke Manase, na ala Juda niile ruo nʼosimiri Mediterenịa.
3 and the south, and the Plain of the valley of Jericho the city of palm trees, to Zoar.
Mosis hụkwara ala Negev, na akụkụ ala ahụ niile dị site na Ndagwurugwu Jeriko, obodo nkwụ, ruo Zoa.
4 Yahweh said to him, “This is the land which I swore to Abraham, to Isaac, and to Jacob, saying, ‘I will give it to your offspring.’ I have caused you to see it with your eyes, but you shall not go over there.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Nke a bụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee Ebraham, Aịzik na Jekọb nkwa mgbe m kwuru sị, ‘Aga m enye ya ụmụ ụmụ gị.’ Ugbu a emeela m ka i jiri anya gị hụ ya ma ị gaghị agabiga banye nʼime ya.”
5 So Moses the servant of Yahweh died there in the land of Moab, according to Yahweh’s word.
Ya mere, Mosis, onyeozi Onyenwe anyị nwụrụ nʼebe ahụ, nʼala Moab, dịka Onyenwe anyị kwuru.
6 He buried him in the valley in the land of Moab opposite Beth Peor, but no man knows where his tomb is to this day.
Onyenwe anyị liri ya na Moab, na ndagwurugwu chere ihu na Bet-Peoa, ma ruo taa, ọ dịghị onye ọbụla maara ebe ili ya dị.
7 Moses was one hundred twenty years old when he died. His eye was not dim, nor his strength gone.
Mosis gbara narị afọ na iri afọ abụọ mgbe ọ nwụrụ, ma nʼoge ahụ ike ka dị ya nʼahụ, anya ya na-ahụkwa ụzọ nke ọma.
8 The children of Israel wept for Moses in the plains of Moab thirty days, until the days of weeping in the mourning for Moses were ended.
Ụmụ Izrel ruru ụjụ nʼihi Mosis, iri ụbọchị atọ nʼobosara ala Moab, tutu ruo mgbe oge iru ụjụ na ịkwa akwa gasịrị.
9 Joshua the son of Nun was full of the spirit of wisdom, for Moses had laid his hands on him. The children of Israel listened to him, and did as Yahweh commanded Moses.
Joshua nwa Nun, jupụtara na mmụọ amamihe, nʼihi na Mosis ebikwasịla ya aka nʼisi. Ya mere, ụmụ Izrel ṅara Joshua ntị, gbasookwa iwu niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼọnụ Mosis.
10 Since then, there has not arisen a prophet in Israel like Moses, whom Yahweh knew face to face,
Ọ dịbeghị onye amụma ọzọ pụtarala nʼala Izrel niile, nke dịka Mosis, onye ya na Onyenwe anyị kparịtara ụka ihu na ihu,
11 in all the signs and the wonders which Yahweh sent him to do in the land of Egypt, to Pharaoh, and to all his servants, and to all his land,
onye mere ihe ịrịbama ndị a niile, rụọkwa ọrụ ebube niile nke Onyenwe anyị ziri ya ka o mee nʼIjipt, nʼihu Fero, na ndị ozi ya niile, nakwa nʼala ahụ niile.
12 and in all the mighty hand, and in all the awesome deeds, which Moses did in the sight of all Israel.
Nʼihi na o nwebekwaghị onye ọzọ gosirila ike dị oke egwu, maọbụ rụọ ọrụ dị oke egwu ụdị nke Mosis rụrụ nʼihu ndị Izrel niile.

< Deuteronomy 34 >