< Amos 9 >

1 I saw the Lord standing beside the altar, and he said, “Strike the tops of the pillars, that the thresholds may shake. Break them in pieces on the head of all of them. I will kill the last of them with the sword. Not one of them will flee away. Not one of them will escape.
Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ guzo nʼakụkụ ebe ịchụ aja, ọ sịrị, “Tie ọnụ ogidi ndị a ihe, ruo mgbe mbata ọnụ ụzọ ha niile mara jijiji. Tipịasịa ha nʼisi mmadụ niile; aga m ejikwa mma agha gbuo ndị niile fọdụrụ. Ọ dịghị onye ga-agbapụ, ọ dịkwaghị onye ga-ewezuga onwe ya.
2 Though they dig into Sheol, there my hand will take them; and though they climb up to heaven, there I will bring them down. (Sheol h7585)
Ọ bụrụ na ha egwuo ala ruo nʼala mmụọ, site nʼebe ahụ ka aka m ga-esi dọlie ha, ọ bụrụkwa na ha arịgoruo ime eluigwe, site nʼebe ahụ ka m ga-esi wedata ha nʼala. (Sheol h7585)
3 Though they hide themselves in the top of Carmel, I will search and take them out from there; and though they be hidden from my sight in the bottom of the sea, there I will command the serpent, and it will bite them.
Ọ bụrụkwa na ha ezoo onwe ha nʼelu Kamel nʼebe ahụ ka m ga-esi chọpụta ha, kpụrụ ha, a sịkwa na ha ezoo onwe ha nʼala oke osimiri, nʼebe ahụ ka m ga-enye ajụala nke mmiri iwu ka ọ taa ha.
4 Though they go into captivity before their enemies, there I will command the sword, and it will kill them. I will set my eyes on them for evil, and not for good.
Ọ bụrụ na a dọta ha nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ, nʼebe ahụ aga m enye mma agha iwu ka o gbuo ha. “Aga m elekwasị ha anya m abụọ nʼihi ime ha ihe ọjọọ, ọ bụghị ihe ọma.”
5 For the Lord, the GOD of Armies, is he who touches the land and it melts, and all who dwell in it will mourn; and it will rise up wholly like the River, and will sink again, like the River of Egypt.
Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-emetụ ala aka mee ka ọ gbazee, ime ka ndị niile bi nʼala ruo ụjụ; ala ya niile bilie na-ebili dịka mmiri nke osimiri Naịl, nke na-emesịakwa dajụọ dịka mmiri Ijipt.
6 It is he who builds his rooms in the heavens, and has founded his vault on the earth; he who calls for the waters of the sea, and pours them out on the surface of the earth—the LORD is his name.
Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile, na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa. Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku, ma na-awụsa ha nʼala, aha ya bụ Onyenwe anyị.
7 Are you not like the children of the Ethiopians to me, children of Israel?” says the LORD. “Haven’t I brought up Israel out of the land of Egypt, and the Philistines from Caphtor, and the Syrians from Kir?
“Ọ bụ na unu ndị Izrel adịghị ka ndị Kush nʼebe m nọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ọ bụ na-esighị m nʼala Ijipt kpọpụta Izrel, site na Kafto kpọpụta ndị Filistia, ma kpọpụtakwa ndị Aram site na Kia?
8 Behold, the eyes of the Lord GOD are on the sinful kingdom, and I will destroy it from off the surface of the earth, except that I will not utterly destroy the house of Jacob,” says the LORD.
“Nʼezie, anya Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị nʼahụ alaeze ahụ nke na-emehie. Aghaghị m ịla ya nʼiyi, kpochapụ ya site nʼelu ụwa, naanị na m agaghị ebibicha ụlọ Jekọb kpamkpam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
9 “For behold, I will command, and I will sift the house of Israel among all the nations as grain is sifted in a sieve, yet not the least kernel will fall on the earth.
“Ma lee, mụ onwe m gaje inye iwu, aga m ayọgharị ụlọ Izrel nʼetiti mba niile dịka e si ayọgharị ọka nʼime nyọ, ma ọ dịghị otu mkpụrụ ọka nʼime ya nke ga-ada nʼala.
10 All the sinners of my people will die by the sword, who say, ‘Evil won’t overtake nor meet us.’
Ma ndị mmehie ahụ niile nọ nʼetiti ndị m, ndị ahụ na-asị, ‘Mbibi agaghị erute anyị, anyị agaghị ezute ya, aghaghị ịnwụ site na mma agha.’
11 In that day I will raise up the tent of David who is fallen and close up its breaches, and I will raise up its ruins, and I will build it as in the days of old,
“Nʼụbọchị ahụ, “aga m emekwa ka ụlọ ikwu Devid dara ada guzoziekwa. Aga m emezi akụkụ ya niile gbajiri agbaji, mee ka akụkụ ya niile dakpọsịrị adakpọsị guzozie dịka ọ dị na mbụ. Aga m ewugharịkwa ya, mee ka ọ dịrị ka ọ dị na mbụ.
12 that they may possess the remnant of Edom and all the nations who are called by my name,” says the LORD who does this.
Ka ha nwee ike inweta ndị fọdụrụ nʼEdọm tinyere mba niile dị iche iche bụ nke a kpọkwasịrị aha m.” Otu a ka Onyenwe anyị onye ga-emezu ihe ndị a niile kwubiri ya.
13 “Behold, the days come,” says the LORD, “that the plowman shall overtake the reaper, and the one treading grapes him who sows seed; and sweet wine will drip from the mountains, and flow from the hills.
“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Mgbe onye na-akọ ubi ga-agafe onye na-ewe ihe ubi, onye na-agha mkpụrụ ka onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị ga-agafekwa. Mmanya ọhụrụ ga-esitekwa nʼelu ugwu na-atapụta, ọ ga-esitekwa nʼugwu nta niile na-asọpụta.
14 I will bring my people Israel back from captivity, and they will rebuild the ruined cities, and inhabit them; and they will plant vineyards, and drink wine from them. They shall also make gardens, and eat their fruit.
Aga m emekwa ka ndị m bụ Izrel site nʼobodo a dọtara ha nʼagha lọta. “Ha ga-ewugharị obodo niile tọgbọrọ nʼefu, birikwa nʼime ha. Ha ga-akụ ubi vaịnị a gbara ogige, ṅụọkwa mmanya si na ya. Ha ga-arụkwa ubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya.
15 I will plant them on their land, and they will no more be plucked up out of their land which I have given them,” says the LORD your God.
Aga m akụ Izrel nʼala ha. A gaghị ehopukwa ha ọzọ site nʼala ahụ bụ nke m nyere ha.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Chineke unu kwuru.

< Amos 9 >