< Job 39 >

1 “Do you know the time when the mountain goats give birth? Do you watch when the doe bears fawns?
“Ị maara mgbe ewu ọhịa bi nʼelu ugwu ji amụ nwa? O nweela mgbe ị ji hụ nne ele ka ọ na-amụpụta nwa ya?
2 Can you count the months that they fulfil? Or do you know the time when they give birth?
Ị na-agụkọ ọnwa ole afọ ime ha na-adị tupu ha amụọ nwa ha. Ị maara oge ha na-amụ ụmụ ha?
3 They bow themselves. They bear their young. They end their labour pains.
Ha na-amakpuru ala mụpụta nwa ha. Ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ha ebiekwa.
4 Their young ones become strong. They grow up in the open field. They go out, and don’t return again.
Ụmụ ha na-eto nʼọhịa gbasiekwa ike. Ha na-apụ, ha adịghị alaghachikwute ha ọzọ.
5 “Who has set the wild donkey free? Or who has loosened the bonds of the swift donkey,
“Onye na-eme ka ịnyịnya ibu ọhịa nwere onwe ya? Onye na-atọpụ agbụ e kere ya?
6 whose home I have made the wilderness, and the salt land his dwelling place?
Nke m nyere ala ihe na-adịghị ka ọ bụrụ ebe obibi ha, ala nnu ahụ ka ọ bụrụ ụlọ ha.
7 He scorns the tumult of the city, neither does he hear the shouting of the driver.
Ụzụ dị nʼobodo adịghị emetụta ya, ọ naghị anụkwa mbigbọ nke onye na-achị ya.
8 The range of the mountains is his pasture. He searches after every green thing.
Elu ugwu niile bụ ebe ịkpa nri ya, ebe ahụ ka ọ na-achọpụta ahịhịa ndụ ọbụla.
9 “Will the wild ox be content to serve you? Or will he stay by your feeding trough?
“Ị nwere ike ime ka atụ jeere gị ozi? Ị nwere ike ime ka ọ nọdụ nʼabalị nʼụlọ ebe ị na-azụ anụ ụlọ gị nri?
10 Can you hold the wild ox in the furrow with his harness? Or will he till the valleys after you?
Ị nwere ike ime ka atụ rụọra gị ọrụ nʼubi gị? Ọ ga-akpụgharịrị gị ọgụ ị ji akọ ala?
11 Will you trust him, because his strength is great? Or will you leave to him your labour?
Ị ga-atụkwasị ya obi nʼihi na ike ya hiri nne? Ị ga-ahapụrụ ya ọrụ ndị ahụ siri ike ka ọ rụọ?
12 Will you confide in him, that he will bring home your seed, and gather the grain of your threshing floor?
I nwere ike ịtụkwasị ya obi ka o gaa bulatara gị ọka site nʼebe ịzọcha ọka gị?
13 “The wings of the ostrich wave proudly, but are they the feathers and plumage of love?
“Enyi nnụnụ na-eji ọṅụ gbasapụ nku ya, ma a pụghị iji nku ya tụnyere nku na abụba nke ụgbala.
14 For she leaves her eggs on the earth, warms them in the dust,
Ọ na-eyi akwa ya nʼala ma hapụ ha ka uzuzu kpoo ha ọkụ.
15 and forgets that the foot may crush them, or that the wild animal may trample them.
Ọ naghị emetụ ya nʼobi na ụkwụ nwere ike ịzọpịa ha maọbụ na anụ ọhịa nwere ike zọrie ha.
16 She deals harshly with her young ones, as if they were not hers. Though her labour is in vain, she is without fear,
Ọ na-emeso ụmụ ya ihe ike dịka a ga-asị na ha abụghị nke ya, ọ dịghị emetụta ya na ndọgbu nʼọrụ ya nwere ike i bụ nʼefu, ma ọ dịghị atụ egwu.
17 because God has deprived her of wisdom, neither has he imparted to her understanding.
Nʼihi na Chineke ekenyeghị ya amamihe maọbụ kenye ya oke na inwe uche.
18 When she lifts up herself on high, she scorns the horse and his rider.
Ma ọ na-agbalite ọsọ. Mgbe ọbụla ọ gbasara nku ya ịgba ọsọ, ọ na-achị ịnyịnya na onye na-agba ịnyịnya ọchị.
19 “Have you given the horse might? Have you clothed his neck with a quivering mane?
“Ọ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya, ka ọ bụ gị mere ka ajị ogologo ahụ o nwere dịrị nʼolu ya?
20 Have you made him to leap as a locust? The glory of his snorting is awesome.
Ị na-eme ya ka ọ wụgharịa dịka igurube, were ebube nke ịmapụ imi ya na-eyinye ihe oke egwu?
21 He paws in the valley, and rejoices in his strength. He goes out to meet the armed men.
Ọ na-azọ ụkwụ gam gam nʼala, ọ na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ike ya, ọ na-apụ izute agha na-atụghị egwu.
22 He mocks at fear, and is not dismayed, neither does he turn back from the sword.
Ọ na-achị ihe egwu ọchị, ụjọ ọbụla anaghị atụ ya; ọ naghị esi na mma agha wezuga onwe ya.
23 The quiver rattles against him, the flashing spear and the javelin.
Akpa àkụ na-ayọgharị nʼakụkụ ya, ya na ùbe na arụa na-egbu maramara.
24 He eats up the ground with fierceness and rage, neither does he stand still at the sound of the trumpet.
Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eripịa ala. Mgbe ọ nụrụ ụda opi ike, ọ naghị eguzo otu ebe.
25 As often as the trumpet sounds he snorts, ‘Aha!’ He smells the battle afar off, the thunder of the captains, and the shouting.
Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eti mkpu sị, ‘Ahaa!’ Site nʼebe dị anya ka ọ na-anụ isisi agha. Ọ na-aṅụrịkwa ọṅụ maka iti mkpu nke ndị ọchịagha nʼoge agha.
26 “Is it by your wisdom that the hawk soars, and stretches her wings towards the south?
“Ọ bụ site nʼamamihe gị ka egbe ji efego nʼelu, gbasaakwa nku ya gaa nʼebe ndịda?
27 Is it at your command that the eagle mounts up, and makes his nest on high?
Ọ bụ gị nyere ugo iwu ifeli elu ma wuo akwụ ya nʼebe dị elu?
28 On the cliff he dwells and makes his home, on the point of the cliff and the stronghold.
Nʼelu nkume dị elu ka ọ na-ebi nọọkwa ọnọdụ abalị; ọwara nkume dị elu bụ ebe e wusiri ike ya.
29 From there he spies out the prey. His eyes see it afar off.
O bụ site nʼebe ahụ ka ọ na-esi enyochapụta ihe ọ ga-eburu.
30 His young ones also suck up blood. Where the slain are, there he is.”
Ụmụ ya na-amịchakwa ọbara, nʼihi na ebe ọ na-aga bụ ebe ọbụla ọ ga-ahụ ihe e gburu egbu.”

< Job 39 >