< Psalms 22 >

1 To the chief Musician upon Aijeleth Shahar, A Psalm of David. My God, my God, why hast thou forsaken me? why art thou so far from helping me, and from the words of my roaring?
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ nke “Nne ele nke ụtụtụ.” Abụ Ọma Devid. Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m? Gịnị mere i ji nọ ebe dị anya ịzọpụta m, nʼebe dị anya site nʼịsụ ude m niile?
2 O my God, I cry in the daytime, but thou hearest not; and in the night season, and am not silent.
O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m, nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere.
3 But thou art holy, O thou that inhabitest the praises of Israel.
Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ; ị bụ otuto ndị Izrel.
4 Our fathers trusted in thee: they trusted, and thou didst deliver them.
Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi; ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha.
5 They cried to thee, and were delivered: they trusted in thee, and were not confounded.
Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara; ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi.
6 But I am a worm, and no man; a reproach of men, and despised by the people.
Abụ m idide, abụghị m mmadụ; onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya.
7 All they that see me mock me: they shoot out the lip, they shake the head, saying,
Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị; na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị.
8 He trusted on the LORD that he would deliver him: let him deliver him, seeing he delighted in him.
“O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi; ka Onyenwe anyị bịa gbapụta ya. Ya napụta ya ebe ọ bụ na ihe ya masịrị ya.”
9 But thou art he that brought me out of the womb: thou didst make me hope when I was upon my mother’s breasts.
Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara.
10 I was cast upon thee from my birth: thou art my God from my mother’s womb.
Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị. Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m.
11 Be not far from me; for trouble is near; for there is none to help.
Anọla m ebe dị anya, nʼihi na nsogbu dị nso. Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso.
12 Many bulls have surrounded me: strong bulls of Bashan have beset me all round.
Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu; oke ehi dị ike nke Bashan gbara m gburugburu.
13 They gaped upon me with their mouths, as a ravening and a roaring lion.
Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa asaghepụla ọnụ ha megide m.
14 I am poured out like water, and all my bones are out of joint: my heart is like wax; it is melted within me.
A wụpụla m dịka mmiri, ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha. Obi m agbazela dịka mmanụ, obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m.
15 My strength is dried up like a potsherd; and my tongue cleaveth to my jaws; and thou hast brought me into the dust of death.
Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime. Ire m na-araparakwa m nʼọnụ, nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ.
16 For dogs have surrounded me: the assembly of the wicked have inclosed me: they pierced my hands and my feet.
Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu; otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu, ha adupuola m aka m na ụkwụ m.
17 I may number all my bones: they look and stare upon me.
A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ; ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchị
18 They part my garments among them, and cast lots upon my vesture.
Ha na-eke uwe m nʼetiti ha, ha sitere nʼife nza kee uwe m.
19 But be not thou far from me, O LORD: O my strength, haste thee to help me.
Ma gị, Onyenwe anyị, anọla m ebe dị anya; gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka.
20 Deliver my soul from the sword; my darling from the power of the dog.
Napụta ndụ m site na mma agha, site nʼike ụmụ nkịta, napụta ndụ m nke dị oke ọnụahịa.
21 Save me from the lion’s mouth: for thou hast heard me from the horns of the unicorns.
Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a, zọpụta m site na mpi atụ ndị a.
22 I will declare thy name to my brethren: in the midst of the congregation will I praise thee.
Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m; nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto.
23 Ye that fear the LORD, praise him; all ye the seed of Jacob, glorify him; and fear him, all ye the seed of Israel.
Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya; unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya! Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel!
24 For he hath not despised nor abhorred the affliction of the afflicted; neither hath he hid his face from him; but when he cried to him, he heard.
Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya maọbụ kwaa ya emo; o lefughị ya anya kama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya.
25 My praise shall be of thee in the great congregation: I will pay my vows before them that fear him.
Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị; aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị.
26 The meek shall eat and be satisfied: they shall praise the LORD that seek him: your heart shall live for ever.
Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha, ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ga-eto ya ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
27 All the ends of the world shall remember and turn to the LORD: and all the kindreds of the nations shall worship before thee.
Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta, ma laghachikwute Onyenwe anyị. Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche ga-akpọ isiala nʼihu ya.
28 For the kingdom is the LORD’S: and he is the governor among the nations.
Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị, ọ na-achịkwa mba niile.
29 All the prosperous of the earth shall eat and worship: all they that go down to the dust shall bow before him: and none can keep alive his own soul.
Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya; ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya; ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ.
30 A seed shall serve him; it shall be accounted to the Lord for a generation.
Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi; a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị.
31 They shall come, and shall declare his righteousness to a people that shall be born, that he hath done this.
Ha ga-ekwusa ezi omume ya nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghị nʼihi na o meela ya.

< Psalms 22 >