< Exodus 21 >

1 Now these are the judgments which thou shalt set before them.
“Ndị a bụ iwu ị ga-edebe nʼihu ha.
2 If thou buy an Hebrew servant, six years he shall serve: and in the seventh he shall go out free for nothing.
“Ọ bụrụ na ị goro ohu onye Hibru, ọ ga-agbara gị odibo afọ isii. Ma nʼafọ nke asaa, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya laakwa nʼakwụghị ụgwọ ọbụla.
3 If he come in by himself, he shall go out by himself: if he be married, then his wife shall go out with him.
Ọ bụrụ na sọọsọ ya bịara, sọọsọ ya ga-ala, ma ọ bụrụ na o nwere nwunye tupu ọ bụrụ ohu, ya na nwunye ya ga-eso ala.
4 If his master give him a wife, and she bear him sons or daughters; the wife and her children shall be her master’s, and he shall go out by himself.
Ọ bụrụ na nna ya ukwu kpọnyere ya nwunye onye mụtaara ya ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, nwanyị ahụ na ụmụ ya ga-abụ nke nna ya ukwu, naanị nwoke ahụ ga-enwere onwe ya.
5 But if the servant shall plainly say, I love my master, my wife, and my children; I will not go out free:
“Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị, nʼezie, ‘Ahụrụ m onyenwe m na nwunye m na ụmụ m nʼanya, achọghị m inwere onwe,’
6 then his master shall bring him unto God, and shall bring him to the door, or unto the door post; and his master shall bore his ear through with an awl; and he shall serve him for ever.
mgbe ahụ, onyenwe ya ga-eduru ya bịakwute Chineke. Mgbe ọ kpọbatasịrị ya nʼọnụ ụzọ, onyenwe ya ga-eji agịga dupuo ntị ya. Malite nʼoge ahụ, ọ ga-abụkwa ohu ya ruo ọgwụgwụ ndụ ya.
7 And if a man sell his daughter to be a maidservant, she shall not go out as the menservants do.
“A sị na nwoke eree nwa ya nwanyị dịka ohu, agaghị ala otu ndị ohu nwoke si ala.
8 If she please not her master, who hath espoused her to himself, then shall he let her be redeemed: to sell her unto a strange people he shall have no power, seeing he hath dealt deceitfully with her.
Ọ bụrụ na ihe nwanyị ahụ amasịkwaghị onyenwe ya, onye họọrọ ya nye onwe ya, onyenwe ya ga-ekwere ka a gbapụta ya. Ma ọ gaghị eresi ya ndị ọbịa. Nʼihi na onyenwe ya emeela nwanyị ahụ ihe ọjọọ mgbe ọ jụrụ na ọ gaghị alụkwa ya ọzọ.
9 And if he espouse her unto his son, he shall deal with her after the manner of daughters.
Ọ bụrụ na ọ chọrọ ka nwa ya nwoke lụọ ya dịka nwunye ya, ọ ga-emeso ya dịka omenaala si kwado e si emeso ndị bụ nwaada.
10 If he take him another [wife]; her food, her raiment, and her duty of marriage, shall he not diminish.
Ọ bụrụkwa na ọ lụta ya dịka nwunye nke aka ya, mesịakwa lụta nwunye ọzọ, ọ gaghị akwụsị inye ya uwe maọbụ ihe oriri. Ọ gaghị agọnarịkwa ya ihe ọbụla kwesiri ya dịka nwunye.
11 And if he do not these three unto her, then shall she go out for nothing, without money.
Ọ bụrụ na o mereghị ohu nwanyị a ihe ndị a, nwanyị a pụrụ ịhapụ ya gaara onwe ya na-akwụghị ụgwọ ọbụla. Mgbe ahụ, ọ ga-enwerekwa onwe ya.
12 He that smiteth a man, so that he die, shall surely be put to death.
“Ọzọkwa, ọ bụrụ na mmadụ etigbuo mmadụ ibe ya, aghaghị ime ka onye dị otu a nwụọ.
13 And if a man lie not in wait, but God deliver [him] into his hand; then I will appoint thee a place whither he shall flee.
Ma ọ bụrụ na o mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụkwa na Chineke kwagidere omume dị otu a, mgbe ahụ, a ga-ahọpụtara ya ebe ọ ga-agbaga, jee zere ndụ.
14 And if a man come presumptuously upon his neighbour, to slay him with guile; thou shalt take him from mine altar, that he may die.
Ọ bụrụkwa na onye ọbụla akpachara anya jiri aghụghọ gbuo mmadụ ibe ya, a ga-adọpụta ya, ọ bụladị site nʼebe ịchụ aja m, gbuo ya.
15 And he that smiteth his father, or his mother, shall be surely put to death.
“Ọ bụrụ na onye ọbụla etie nna ya maọbụ nne ya ihe, a ghaghị ime ka onye dị otu a nwụọ.
16 And he that stealeth a man, and selleth him, or if he be found in his hand, he shall surely be put to death.
“Onye ọbụla tọọrọ mmadụ ibe ya, ma o rere ya nʼahịa, maọbụ na a chọpụtara ya nʼaka ya, a ga-eme ka onye dị otu a nwụọ.
17 And he that curseth his father, or his mother, shall surely be put to death.
“Aghaghị ime ka onye ọbụla ga-akpọ nna ya maọbụ nne ya iyi nwụọ.
18 And if men contend, and one smiteth the other with a stone, or with his fist, and he die not, but keep his bed:
“Ọ bụrụ na mmadụ abụọ alụọ ọgụ ma otu nʼime ha ewere nkume maọbụ osisi tie onye nke ọzọ. Ọ bụrụ na ọ nwụghị, kama na o merụrụ ahụ, dinaakwa nʼihe ndina ya,
19 if he rise again, and walk abroad upon his staff, then shall he that smote him be quit: only he shall pay for the loss of his time, and shall cause him to be thoroughly healed.
ọ bụrụ na onye ahụ ebilie were mkpara ya na-ejegharị, ikpe agaghị ama onye ahụ tiri ya ihe, kama ọ ga-akwụ ụgwọ ihe onye ahụ ji gwọọ onwe ya, na oge onye ahụ o tiri ihe ji nọọ nʼihe ndina, ruo mgbe ahụ ya ga-adị mma.
20 And if a man smite his servant, or his maid, with a rod, and he die under his hand; he shall surely be punished.
“Ọ bụrụ na ohu ọbụla anwụọ site nʼihe otiti nke onyenwe ya tiri ya, ma ohu ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị, a ga-adọ onyenwe ya aka na ntị site nʼinye ya ntaramahụhụ.
21 Notwithstanding, if he continue a day or two, he shall not be punished: for he is his money.
Otu ọ dị, ọ bụrụ na ohu ahụ dị ndụ nʼụbọchị mbụ, maọbụ nʼụbọchị nke abụọ, a gaghị enye onyenwe ya ntaramahụhụ nʼihi na ohu ahụ bụ akụ ya.
22 And if men strive together, and hurt a woman with child, so that her fruit depart, and yet no mischief follow: he shall be surely fined, according as the woman’s husband shall lay upon him; and he shall pay as the judges determine.
“Ọ bụrụ na mmadụ abụọ esite nʼịlụ ọgụ ha merụọ nwanyị dị ime ahụ, mee ka ime ahụ pụọ, ma nwanyị ahụ emerụghị nnukwu ahụ, di nwanyị ahụ ga-anara site nʼaka onye ahụ merụrụ nwunye ya ahụ ihe niile ọbụla o kwuru na a ga-akwụ ya, bụkwa nke ndị na-ekpe ikpe kpebiri.
23 But if any mischief follow, then thou shalt give life for life,
Ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ a nwụọ nʼihi mmerụ ahụ ahụ e merụrụ ya, a ga-eme ka nwoke ahụ merụrụ ya ahụ nwụọ.
24 eye for eye, tooth for tooth, hand for hand, foot for foot,
Ọ bụrụ na ọ bụ anya ka a kụkpọrọ, anya nʼọnọdụ anya. Ọ bụrụkwa otu eze ka e tipụrụ, eze nʼọnọdụ eze. Otu ahụ kwa, aka nʼọnọdụ aka, ụkwụ nʼọnọdụ ụkwụ.
25 burning for burning, wound for wound, stripe for stripe.
Ịda ọkụ nʼọnọdụ ịda ọkụ, ọnya mma, nʼọnọdụ ọnya mma, ihe otiti nʼọnọdụ ihe otiti.
26 And if a man smite the eye of his servant, or the eye of his maid, and destroy it; he shall let him go free for his eye’s sake.
“Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla esite nʼihe otiti o tiri ohu ya kụkpọọ ya anya, a ga-eme ka ohu ahụ nwere onwe ya, maọbụ ohu nwoke maọbụ ohu nwanyị, nʼihi na o jirila anya ya gbara onwe ya.
27 And if he smite out his manservant’s tooth, or his maidservant’s tooth; he shall let him go free for his tooth’s sake.
Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla etipụ eze ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, a ga-eme ka ohu ahụ nwere onwe ya nʼihi eze ya nke e tipụrụ.
28 And if an ox gore a man or a woman, that they die, the ox shall be surely stoned, and his flesh shall not be eaten; but the owner of the ox shall be quit.
“Ọ bụrụ na ehi ejiri mpi ya sọda mmadụ si otu a mee ka onye ahụ nwụọ, a ga-atụgbu ehi ahụ na nkume. Mmadụ ọbụla agaghị erikwa anụ ehi ahụ. Ma a ga-agụ onyenwe ehi ahụ dịka onye ikpe na-amaghị.
29 But if the ox were wont to gore in time past, and it hath been testified to his owner, and he hath not kept him in, but that he hath killed a man or a woman; the ox shall be stoned, and his owner also shall be put to death.
Ọ bụrụ na ehi ahụ na-asọkarị ndị mmadụ mpi mgbe niile, agaghị eri anụ ya. Kama, ọ bụrụ na adọọla onyenwe ya aka na ntị banyere ehi ahụ ọtụtụ oge, ma o meghị ihe ọbụla banyere ya, a ga-eme ka ehi ahụ na onyenwe ya nwụọ.
30 If there be laid on him a ransom, then he shall give for the redemption of his life whatsoever is laid upon him.
Ma ọ bụrụ na ndị nwe mmadụ achọọ ka a kwụọ ha ụgwọ kama igbu onyenwe ehi ahụ, ndị ikpe ga-ekpebi ego ole onyenwe ehi ga-akwụ ha.
31 Whether he have gored a son, or have gored a daughter, according to this judgment shall it be done unto him.
Otu a ka a ga-esikwa kpee ikpe nke ga-apụta ma ọ bụrụ na ehi asọda nwokorobịa maọbụ nwaagbọghọ ọbụla.
32 If the ox gore a manservant or a maidservant; he shall give unto their master thirty shekels of silver, and the ox shall be stoned.
Kama ọ bụrụ na ehi asọda ohu nwoke maọbụ ohu nwanyị, onyenwe ehi ahụ ga-akwụ onyenwe ohu ahụ iri mkpụrụ ọlaọcha atọ. Emesịa, a ga-eji nkume tugbuo ehi ahụ.
33 And if a man shall open a pit, or if a man shall dig a pit and not cover it, and an ox or an ass fall therein,
“Ọ bụrụ onye ọbụla meghere olulu maọbụ gwuo olulu, ghara imechi ya, nke mere na ehi mmadụ maọbụ ịnyịnya ibu adaba nʼime ya,
34 the owner of the pit shall make it good; he shall give money unto the owner of them, and the dead [beast] shall be his.
onye ahụ gwuru olulu ahụ ga-akwụ onyenwe anụ ụlọ ahụ ọnụọgụgụ ego o jiri zụta ya. Mgbe ahụ ọ ga-eburu ozu anụ ahụ nwụrụ anwụ.
35 And if one man’s ox hurt another’s, that he die; then they shall sell the live ox, and divide the price of it; and the dead also they shall divide.
“Ọ bụrụ na oke ehi mmadụ emerụọ oke ehi onye ọzọ ahụ, emesịa ehi dị otu a anwụọ, a ga-ere ehi nke dị ndụ, kewaa ego ya ụzọ abụọ. Otu a kwa, a ga-ekewa ehi nke nwụrụ anwụ, nye mmadụ abụọ ahụ otu ụzọ otu ụzọ.
36 Or if it be known that the ox was wont to gore in time past, and his owner hath not kept him in; he shall surely pay ox for ox, and the dead [beast] shall be his own.
Ọ bụrụ na amaara na oke ehi ahụ na-asọ mpi mgbe niile nʼoge gara aga, ma onyenwe ya emeghị ihe ọbụla banyere ya, ọ ga-akwụzu ụgwọ ehi ahụ nwụrụ anwụ. Emesịa ehi ahụ nwụrụ anwụ ga-abụrụ nke ya.

< Exodus 21 >