< Psalms 111 >

1 Praise the LORD. I will give thanks to the LORD with my whole heart, in the council of the upright, and in the congregation.
Toonu Onyenwe anyị! Aga m eji obi m niile jaa Onyenwe anyị mma nʼime nzukọ ndị ụzọ ha ziri ezi na nʼime ọgbakọ ukwuu.
2 The LORD's works are great, pondered by all those who delight in them.
Ọrụ niile Onyenwe anyị na-arụ dị ukwuu; ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha.
3 His work is honor and majesty. His righteousness endures forever.
Ọrụ ya jupụtara nʼebube na ịma mma, ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
4 He has caused his wonderful works to be remembered. The LORD is gracious and merciful.
O meela ka e cheta ọrụ ebube ya niile; Onyenwe anyị bụ onye amara na onye ọmịiko.
5 He has given food to those who fear him. He always remembers his covenant.
Ọ na-egboro ndị na-atụ egwu ya mkpa ihe oriri; ọ na-echetakwa ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
6 He has shown his people the power of his works, in giving them the heritage of the nations.
O gosila ndị ya ike nke ọrụ ya niile, site nʼinye ha ala niile nke ndị mba ọzọ.
7 The works of his hands are truth and justice. All his precepts are sure.
Ọrụ aka ya niile bụ ihe kwesiri ekwesi na ikpe ziri ezi; ụkpụrụ ya niile bụ ihe kwesiri ntụkwasị obi.
8 They are established forever and ever. They are done in truth and uprightness.
E hiwere ha ịdị ruo mgbe niile ebighị ebi, ha bụ ihe e mere nʼikwesị ntụkwasị obi na izi ezi.
9 He has sent redemption to his people. He has ordained his covenant forever. His name is holy and awesome.
O wetaara ndị ya mgbapụta; o meela ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike ruo ebighị ebi, aha ya dị nsọ dịkwa oke egwu.
10 The fear of the LORD is the beginning of wisdom. All those who do his work have a good understanding. His praise endures forever.
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe; ndị niile na-edebe ụkpụrụ ya nwere ezi nghọta. Otuto ya na-adị ruo mgbe ebighị ebi.

< Psalms 111 >