< 2 Samuel 18 >

1 David numbered the people who were with him, and set captains of thousands and captains of hundreds over them.
Devid gụkọtara ndị ya na ha so ma họpụta ndịisi agha. Doo ụfọdụ ka ha chịa ọtụtụ puku ndị agha, ụfọdụ ka ha chịa ọtụtụ narị ndị agha.
2 David sent forth the people, a third part under the hand of Joab, and a third part under the hand of Abishai the son of Zeruiah, Joab's brother, and a third part under the hand of Ittai the Gittite. The king said to the people, "I will surely go forth with you myself also."
Devid zipụrụ ndị agha ya, otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nʼokpuru Joab, Ọ họpụtakwara Abishai, nwanne Joab, nwa Zeruaya, ka ọ chịa otu ụzọ. Ma otu ụzọ nke fọdụrụ ka o tinyere nʼaka Itai onye Gat. Eze gwara ndị agha ahụ sị, “Mụ onwe m ga-edu unu gaa agha.”
3 But the people said, "You must not go out, for if we retreat, no one will care about us. If half of us die, no one will care about us. But you are worth ten thousand of us. Therefore it is better now if you support us in the city."
Ma ndị ikom ahụ sịrị, “Ị gaghị apụkwa ọzọ nʼihi na ọ bụrụ na anyị atụgharịa bido ịgba ọsọ, ọ bụrụkwa na otu ọkara nʼime anyị anwụọ, nke ahụ agaghị emetụ ha nʼobi. Naanị gị ka ha na-achọ. Ị dịkwa mkpa karịa puku ndị agha iri. Ọ ga-akara anyị mma ugbu a ka ị na-ezitere anyị inyeaka site nʼime obodo.”
4 The king said to them, "I will do what seems best to you." The king stood beside the gate, and all the people went out by hundreds and by thousands.
Eze zara nʼikpeazụ sị, “Ihe ọbụla dị mma nʼanya unu ka m ga-eme.” Ya mere, eze guzoro nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dịka ndị ikom ya niile na-apụ nʼusu nke ọtụtụ narị, nakwa nʼusu nke ọtụtụ puku.
5 The king commanded Joab and Abishai and Ittai, saying, "Deal gently for my sake with the young man, even with Absalom." And all the people were listening when the king commanded all the captains concerning Absalom.
Eze nyere ndịisi agha ya, bụ Joab, Abishai na Itai, iwu sị ha, “Bikonu, nʼihi m, werenụ nwayọọ nʼebe nwokorobịa ahụ bụ Absalọm nọ.” Ndị agha niile nụkwara mgbe eze nyere ndịisi niile iwu a banyere Absalọm.
6 So the people went out into the field against Israel: and the battle was in the forest of Ephraim.
Ndị agha Devid si nʼobodo pụọ izute ndị Izrel nʼagha. Alụrụ agha a nʼọhịa Ifrem.
7 The people of Israel were struck there before the servants of David, and there was a great slaughter there that day of twenty thousand men.
Ndị agha Devid tigbukwara ndị agha Izrel. Ha gburu iri puku ndị agha abụọ nʼụbọchị ahụ.
8 For the battle there spread over the entire region, and the forest devoured more people that day than the sword devoured.
Agha ahụ gbasara nʼelu ala ahụ niile. Ndị nwụrụ nʼọhịa nʼetiti ụmụ Izrel karịrị ndị e gburu egbu.
9 And Absalom happened to meet the servants of David. And he was riding on his mule, and the mule went under the thick boughs of a great oak, and his head caught hold of the oak, and he was left hanging between the sky and earth; and the mule that was under him went on.
Absalọm zutere ndị agha Devid. Ọ na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ya nʼoge a, dịka ịnyịnya ahụ sitere nʼokpuru osisi ook ukwu dị nʼọhịa ahụ na-agbafee, agịrị isi ya konyere nʼalaka osisi ahụ, tụhịkọtaakwa, nke mere na ọ kwụrụ nʼetiti eluigwe na ala. Ma ịnyịnya ya gbaara na-aga.
10 And a certain man saw it, and told Joab, and said, "Look, I saw Absalom hanging in an oak."
Otu nʼime ndị ikom ahụ hụrụ ya, kọọrọ Joab, “Lee, ahụrụ m Absalọm ebe ọ kwụ nʼelu osisi ook.”
11 Joab said to the man who told him, "Look, you saw it, and why did you not strike him there to the ground? I would have given you ten pieces of silver, and a belt."
Joab sịrị nwoke ahụ onye gwara gị, “Gịnị, ị hụrụ ya? Gịnị mere i tigbughị ya ka o ruo nʼala nʼebe ahụ? Mgbe ahụ, agaara m enye gị shekel ọlaọcha iri, na belịt a na-enye onye bụ dike nʼagha.”
12 The man said to Joab, "Though I should receive a thousand pieces of silver in my hand, I still wouldn't put forth my hand against the king's son; for in our hearing the king commanded you and Abishai and Ittai, saying, 'Protect the young man Absalom for my sake.'
Ma nwoke ahụ zara sị, “A sịkwarị na e nyere m puku ọlaọcha nʼaka m a, agaraghị m egbu ya. Nʼihi na anyị niile nụrụ mgbe eze na-agwa gị na Abishai na Itai sị, ‘Lezienụ anya banyere nwokorobịa bụ Absalọm, nʼihi m.’
13 Otherwise if I had dealt falsely against his life (and there is no matter hidden from the king), then you yourself would have set yourself against me."
A sị na m gburu ya, ọ ga-abụ imegide eze. Ọ ga-emesiekwa chọpụta onye mere ya. Ma gị onwe gị agaraghị apụta kwuchite ọnụ m.”
14 Then Joab said, "I'm not going to wait like this with you." He took three darts in his hand, and thrust them through the heart of Absalom, while he was yet alive in the midst of the oak.
Joab sịrị, “Ọ bụghị otu a ka m ga na-eche nʼihu gị.” Ya mere, ọ chịịrị ùbe atọ nʼaka ya, dubaa ha nʼobi Absalọm, mgbe Absalọm ka dị ndụ makwụrụ nʼelu osisi ook.
15 Ten young men who bore Joab's armor surrounded and struck Absalom, and killed him.
Ụmụ okorobịa iri ndị na-ebu ihe agha Joab gbara Absalọm gburugburu, tigbuo ya.
16 Joab blew the trumpet, and the people returned from pursuing after Israel; for Joab held back the people.
Emesịa, Joab fụrụ opi ike nke mere ka ndị agha Devid na-achụ ndị Izrel kwụsị ịchụ ha ọsọ, nʼihi na Joab kwụsịrị ha.
17 They took Absalom, and cast him into the great pit in the forest, and raised over him a very great heap of stones. Then all Israel fled everyone to his tent.
Ha buuru ozu Absalọm tụba ya nʼolulu ukwu dị nʼoke ọhịa ahụ, werekwa nkume tụọ ya nʼelu. Ndị agha Izrel niile gbalara nʼụlọ ha.
18 Now Absalom in his lifetime had taken and reared up for himself the pillar, which is in the King's Valley; for he said, "I have no son to keep my name in memory." He called the pillar after his own name; and it is called Absalom's monument, to this day.
Nʼoge Absalọm dị ndụ, o wuuru onwe ya ogidi ncheta. O wuru ogidi a na Ndagwurugwu Eze, nʼihi na o chere nʼime onwe ya sị, “Enweghị m nwa nwoke ga-aza aha m.” Ya mere, ọ gụrụ ogidi ahụ aha nke ya onwe ya. Ọ bụkwa Ogidi Absalọm ka a na-akpọ ya ruo taa.
19 Then Ahimaaz the son of Zadok said, "Let me now run, and bear the king news, how that the LORD has avenged him of his enemies."
Mgbe ahụ, Ahimaaz, nwa Zadọk, bịakwutere Joab sị ya, “Biko, ka m gbara ọsọ gaa zie eze oziọma a, na Onyenwe anyị azọpụtala ya site nʼaka ndị iro ya.”
20 Joab said to him, "You shall not be the bearer of news this day, but you shall bear news another day. But today you shall bear no news, because the king's son is dead."
Ma Joab zara sị ya, “Ọ bụghị gị ga-ezi eze ozi taa. I nwere ike ime ya mgbe ọzọ, ma ọ bụghị taa, nʼihi na nwa eze nwụrụ.”
21 Then Joab said to the Cushite, "Go, tell the king what you have seen." The Cushite bowed himself to Joab, and ran.
Joab gwara otu nwoke onye Kush sị ya, “Gaa gwa eze ihe ị hụrụ.” Nwoke ahụ kpọrọ isiala, gbapụ ọsọ.
22 Then Ahimaaz the son of Zadok said yet again to Joab, "But come what may, please let me also run after the Cushite." Joab said, "Why do you want to run, my son, since that you will have no reward for the news?"
Ahimaaz nwa Zadọk rịọkwara Joab ọzọ sị ya, “Otu ọbụla o si dị, biko kwere ka m gbaso onye Kush a.” Ma Joab zara sị, “Nwa m nwoke, gịnị mere i ji chọọ ị ga? I nweghị ozi ọbụla ị ga-ezi nke ga-ewetara gị ụgwọ ọrụ.”
23 And he said, "But come what may, I will run." He said to him, "Run." Then Ahimaaz ran by the way of the Plain, and outran the Cushite.
Ọ rịọrọ sị, “Otu ọbụla o si dị, hapụ m ka m gaa.” Nʼikpeazụ Joab kwenyere sị ya, “Ọ dị mma, gbara ọsọ gaa.” Ahimaaz sitere nʼụzọ dị mkpụmkpụ nke gafere obosara ala Jọdan buru nwoke Kush ahụ ụzọ gbaruo.
24 Now David was sitting between the two gates, and the watchman went up to the roof of the gate to the wall and lifted up his eyes and looked and saw a man was running alone towards him.
Devid nọ nʼọnụ ụzọ ama nʼoge a. Mgbe onye nche rigoruru nʼelu mgbidi ebe ọ na-anọ, ọ hụrụ otu nwoke ka ọ na-agba ọsọ naanị ya.
25 And the watchman called out, and told the king. And the king said, "If he is alone, there is good news in his mouth." And he came closer and closer.
Onye nche ahụ kpọrọ Devid oku gwa ya na o nwere onye na-abịa. Ma eze zara ya sị, “Ọ bụrụ naanị ya, o nwere oziọma.” Mgbe onyeozi ahụ na-abịaru nso,
26 And the watchman saw another man running. And the watchman above the gate called out, and said, "Look, another man running alone." And the king said, "He also brings good news."
onye nche ahụ lepụkwara anya hụ otu nwoke ọzọ ka o ji ọsọ na-abịa naanị ya. Ọ kpọkwara oku ọzọ sị, “Onye ọzọ na-abịakwa.” Eze zara sị, “Onye ahụ ga-enwekwa oziọma.”
27 The watchman said, "I think the running of the first one is like the running of Ahimaaz the son of Zadok." The king said, "He is a good man, and comes with good news."
Onye nche ahụ zara sị, “Onye nke mbụ na-abịa dị ka Ahimaaz, nwa Zadọk,” Eze zara sị, “Ọ bụ ezi mmadụ, ọ bụkwa oziọma ka o ji na-abịa.”
28 And Ahimaaz came near and said to the king, "All is well." He bowed himself before the king with his face to the earth, and said, "Blessed is the LORD your God, who has delivered up the men who lifted up their hand against my lord the king."
Mgbe ahụ, Ahimaaz kpọrọ eze oku sị, “Udo!” Ọ kpọrọ isiala nye eze. Kpuokwa ihu ya nʼala sị, “Ngọzị na-adịrị Onyenwe anyị Chineke gị. Onye nke mebiri nzube ndị ahụ niile weliri aka imegide onyenwe m bụ eze.”
29 The king said, "Is it well with the young man Absalom?" And Ahimaaz answered, "When Joab, the king's servant, sent your servant off, I saw a great commotion, but I do not know what it was."
Eze jụrụ ya sị, “Oleekwanụ maka nwokorobịa ahụ bụ Absalọm? Ọ nọkwa nʼudo?” Ahimaaz zara sị, “Mgbe Joab zipụrụ ohu eze, na mụ onwe m, oke ụzụ dị, ma amaghị m ihe kpatara ya.”
30 The king said, "Turn aside, and stand here." He turned aside, and stood still.
Eze gwara ya sị, “Chere nʼebe a.” Ahimaaz chigharịrị chere.
31 Look, the Cushite came. And he said, "News for my lord the king; for the LORD has avenged you this day of all those who rose up against you."
Mgbe ahụ, onye Kush ahụ bịarutere sị, “Onyenwe m bụ eze, nụrụ oziọma a. Taa Onyenwe anyị ekpepụtala gị site nʼịnapụta gị nʼaka ndị niile biliri imegide gị.”
32 The king said to the Cushite, "Is it well with the young man Absalom?" The Cushite answered, "May the enemies of my lord the king, and all who rise up against you to do you harm, be as that young man is."
Eze jụrụ onye Kush ahụ, “Nwokorobịa ahụ bụ Absalọm, ọ nọkwa nʼudo?” Onye Kush ahụ zaghachiri, “Ka ndị iro onyenwe m bụ eze na ndị niile na-ebili imejọ gị dị ka nwokorobịa ahụ!”
33 The king was much moved, and went up to the room over the gate, and wept. As he went, he said, "My son Absalom. My son, my son Absalom. I wish I had died for you, Absalom, my son, my son."
Okwu a metụrụ eze nʼahụ nke ukwuu, o biliri rigoo nʼụlọ nke dị nʼọnụ ụzọ ama, nọdụ nʼebe ahụ kwaa akwa. Ọ nọ na-akwa akwa mgbe ọ na-aga, na-eti mkpu akwa na-asị, “O, nwa m, Absalọm! O nwa m, nwa m, Absalọm. A sịkwarị na m nwụrụ nʼọnọdụ gị! O, Absalọm nwa m, nwa m oo!”

< 2 Samuel 18 >