< Luke 24 >

1 Now upon the first day of the week, very early in the morning, they came unto the sepulchre, bringing the spices which they had prepared, and certain others with them.
Nʼụbọchị mbụ nke izu ụka, nʼezigbo isi ụtụtụ, ha weere mmanụ otite ahụ ha tinyere ọtụtụ ụda nke ha kwadoro gawa nʼili ahụ.
2 And they found the stone rolled away from the sepulchre.
Ha chọpụtara na e nupụla nkume e ji dochie nʼọnụ ili ahụ.
3 And they entered in, and found not the body of the Lord Jesus.
Ma mgbe ha banyere nʼime ya, ha ahụghị ahụ Onyenwe anyị Jisọs.
4 And it came to pass, as they were much perplexed thereabout, behold, two men stood by them in shining garments:
Dị ka ha nọ na mgbagwoju anya banyere nke a, nʼotu ntabi anya, ha hụrụ mmadụ abụọ yi uwe na-egbu ka amụma guzo ha nso.
5 And as they were afraid, and bowed down their faces to the earth, they said unto them, Why seek ye the living among the dead?
Ha kpudoro ihu ha nʼala nʼihi oke egwu, ma mmadụ abụọ ahụ gwara ha, “Gịnị mere unu ji na-achọ onye dị ndụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ?
6 He is not here, but is risen: remember how he spake unto you when he was yet in Galilee,
Ọ nọkwaghị nʼebe a, o biliela nʼọnwụ, chetakwanụ ihe ọ gwara unu mgbe unu na ya nọ na Galili sị,
7 Saying, The Son of man must be delivered into the hands of sinful men, and be crucified, and the third day rise again.
‘A ghaghị inyefe Nwa nke Mmadụ nʼaka ndị mmehie, a ga-akpọgidekwa ya nʼobe ma nʼụbọchị nke atọ ọ ga-esi nʼọnwụ bilie.’”
8 And they remembered his words,
Mgbe ahụ ha chetara okwu ya.
9 And returned from the sepulchre, and told all these things unto the eleven, and to all the rest.
Mgbe ha sitere nʼili ahụ lọghachi, ha kọọrọ mmadụ iri na otu ahụ na ndị ọzọ niile ihe ndị a.
10 It was Mary Magdalene, and Joanna, and Mary the mother of James, and other women that were with them, which told these things unto the apostles.
Ọ bụ Meri Magdalin, na Joana, na Meri nne Jemis na ụmụ nwanyị ndị ọzọ so ha kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya ihe a.
11 And their words seemed to them as idle tales, and they believed them not.
Ma ha ekweghị ihe ha gwara ha, nʼihi na okwu ha dị ha ka ọ bụ ihe efu.
12 Then arose Peter, and ran unto the sepulchre; and stooping down, he beheld the linen clothes laid by themselves, and departed, wondering in himself at that which was come to pass.
Ma otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ ruo nʼili ahụ, hulata ala hụ ka akwa ozu ndị ahụ tọgbọọrọ onwe ha; ọ lara na-atụgharị uche nʼime onwe ya ihe ihe ndị a pụtara.
13 And, behold, two of them went that same day to a village called Emmaus, which was from Jerusalem about threescore furlongs.
Nʼotu ụbọchị ahụ, mmadụ abụọ nʼime ha gaje nʼobodo nta a na-akpọ Emaus, nke dị ihe ruru kilomita iri na abụọ site na Jerusalem.
14 And they talked together of all these things which had happened.
Ha na-ekwurịta nʼetiti onwe ha banyere ihe niile mere.
15 And it came to pass, that, while they communed together and reasoned, Jesus himself drew near, and went with them.
Dị ka ha na-ekwu na-akparịta ụka banyere ihe ndị a, Jisọs nʼonwe ya bịara soro ha na-aga ije.
16 But their eyes were holden that they should not know him.
Ma e mechiri anya ha ịmata na ọ bụ ya.
17 And he said unto them, What manner of communications are these that ye have one to another, as ye walk, and are sad?
Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-ekwurịta nʼetiti onwe unu dị ka unu na-aga nʼụzọ.” Ha kwụsịrị ebe ahụ, gbarụọ ihu ha.
18 And the one of them, whose name was Cleopas, answering said unto him, Art thou only a stranger in Jerusalem, and hast not known the things which are come to pass there in these days?
Otu onye nʼime ha a na-akpọ Kleopas, sịrị ya, “Ị bụ onye ọbịa na Jerusalem nke mere na ị maghị ihe mere nʼime ya nʼụbọchị ndị a?”
19 And he said unto them, What things? And they said unto him, Concerning Jesus of Nazareth, which was a prophet mighty in deed and word before God and all the people:
Ọ sịrị ha, “Gịnị bụ ihe mere?” Ha sịrị ya, “Banyere Jisọs onye Nazaret! Ọ bụ onye amụma bụrụkwa onye dị ike, ma nʼokwu ma nʼomume nʼihu Chineke na mmadụ niile.
20 And how the chief priests and our rulers delivered him to be condemned to death, and have crucified him.
Na otu ndịisi nchụaja na ndị ọchịchị anyị nyefere ya ka a maa ya ikpe ọnwụ, ma kpọgbukwaa ya nʼobe.
21 But we trusted that it had been he which should have redeemed Israel: and beside all this, to day is the third day since these things were done.
Anyị nwererịị olileanya na ọ bụ ya ga-agbapụta Izrel. Nke ka nke, taa mere ya abalị atọ kemgbe ihe ndị a mere.
22 Yea, and certain women also of our company made us astonished, which were early at the sepulchre;
Tụkwasị ihe ndị a, ụfọdụ ụmụ nwanyị anyị mere ka anyị nwee ihe ịtụnanya. Ha gara nʼili ahụ nʼisi ụtụtụ a.
23 And when they found not his body, they came, saying, that they had also seen a vision of angels, which said that he was alive.
Ma ha ahụghị ahụ ya. Ha bịara kọrọ anyị na ha hụrụ ọhụ nke ndị mmụọ ozi, bụ ndị gwara ha na ọ dị ndụ.
24 And certain of them which were with us went to the sepulchre, and found it even so as the women had said: but him they saw not.
Ya mere ụfọdụ nʼime ndị otu anyị gara nʼili ahụ chọpụta na ihe niile ụmụ nwanyị a kwuru mere otu ahụ ha siri kwuo ya. Ma ha ahụkwaghị ya.”
25 Then he said unto them, O fools, and slow of heart to believe all that the prophets have spoken:
Ọ sịrị ha, “Unu bụ nnọọ ndị nzuzu! Leenụ ka o si siere unu ike ikwere ihe niile ndị amụma kwuru.
26 Ought not Christ to have suffered these things, and to enter into his glory?
Ọ bụ na o kwesighị ka Kraịst taa ahụhụ ndị a tupu ọ banye nʼebube ya?”
27 And beginning at Moses and all the prophets, he expounded unto them in all the scriptures the things concerning himself.
Ya mere, ọ kọwaara ha ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ banyere ya onwe ya malite na nke Mosis ruo na ndị amụma niile.
28 And they drew nigh unto the village, whither they went: and he made as though he would have gone further.
Mgbe ha na-eru obodo nta ahụ ha na-aga, o mere dị ka ọ na-aga nʼihu na njem ya.
29 But they constrained him, saying, Abide with us: for it is toward evening, and the day is far spent. And he went in to tarry with them.
Ma ha rịọ ya nʼebe ọ dị ukwuu sị, “Nọnyerenụ anyị nʼihi na chi ebidola iji, ụbọchị agamiekwala ugbu a.” Nʼihi ya ọ banyere ịga nọnyere ha.
30 And it came to pass, as he sat at meat with them, he took bread, and blessed it, and brake, and gave to them.
Mgbe ya na ha nọdụrụ na tebul iri nri, o were achịcha, kelee Chineke ekele, nyawaa ya were ya nye ha.
31 And their eyes were opened, and they knew him; and he vanished out of their sight.
Mgbe ahụ, e meghere anya ha, ha amata onye ọ bụ, ha ahụkwaghị ya anya ọzọ.
32 And they said one to another, Did not our heart burn within us, while he talked with us by the way, and while he opened to us the scriptures?
Mgbe ahụ, ha gwara onwe ha sị, “Ọ bụ na ọ dịghị ka ọkụ ọ na-enwu nʼobi anyị mgbe anyị na ya nọ nʼụzọ, ya na-ekpughere anyị akwụkwọ nsọ?”
33 And they rose up the same hour, and returned to Jerusalem, and found the eleven gathered together, and them that were with them,
Ha biliri ngwangwa laghachi Jerusalem. Ebe ahụ, ha hụrụ mmadụ iri na otu ahụ na ndị so ha ka ha nọkọtara nʼotu ebe,
34 Saying, The Lord is risen indeed, and hath appeared to Simon.
na-asị, “Ọ bụ eziokwu, Onyenwe anyị ebiliela, o gosila Saimọn onwe ya.”
35 And they told what things were done in the way, and how he was known of them in breaking of bread.
Mgbe ahụ, ha kọọrọ ha ihe mere nʼụzọ, ya na otu ha siri mata ya mgbe ọ nyawara achịcha.
36 And as they thus spake, Jesus himself stood in the midst of them, and saith unto them, Peace be unto you.
Mgbe ha ka na-ekwu banyere nke a, ya onwe ya guzooro nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.”
37 But they were terrified and affrighted, and supposed that they had seen a spirit.
Oke egwu tụrụ ha, obi lọkwara ha mmiri nʼihi na ha chere na ha ahụla mmụọ.
38 And he said unto them, Why are ye troubled? and why do thoughts arise in your hearts?
Ma ọ sịrị ha, “Gịnị mere ụjọ ji atụ unu, gịnị mere unu ji nwee obi abụọ?
39 Behold my hands and my feet, that it is I myself: handle me, and see; for a spirit hath not flesh and bones, as ye see me have.
Leenụ m anya nʼaka na nʼụkwụ. Ọ bụ mụ onwe m! Metụnụ m aka ka unu hụrụ, nʼihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ na ọkpụkpụ dị ka unu hụrụ m nwere.”
40 And when he had thus spoken, he shewed them his hands and his feet.
Mgbe o kwuchara nke a, o gosiri ha aka ya na ụkwụ ya.
41 And while they yet believed not for joy, and wondered, he said unto them, Have ye here any meat?
Ma dị ka o siiri ha ike ikwere nʼihi ọṅụ na oke mgbagwoju anya, ọ sịrị ha, “Ọ dị ihe oriri unu nwere ebe a?”
42 And they gave him a piece of a broiled fish, and of an honeycomb.
Ha nyere ya otu ntakịrị azụ a mịkpọrọ amịkpọ.
43 And he took it, and did eat before them.
Ma ọ naara ya rie ya nʼihu ha.
44 And he said unto them, These are the words which I spake unto you, while I was yet with you, that all things must be fulfilled, which were written in the law of Moses, and in the prophets, and in the psalms, concerning me.
Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu nọ, na ihe niile e dere nʼiwu Mosis na ndị Amụma na nʼAbụ Ọma banyere m ga-emezucha.”
45 Then opened he their understanding, that they might understand the scriptures,
Mgbe ahụ, o meghere akọnuche ha ka ha ghọta akwụkwọ nsọ.
46 And said unto them, Thus it is written, and thus it behoved Christ to suffer, and to rise from the dead the third day:
Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ihe e dere na, Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ ma sitekwa nʼọnwụ bilienʼụbọchị nke atọ.
47 And that repentance and remission of sins should be preached in his name among all nations, beginning at Jerusalem.
Na a ga-ekwusa nchegharị na mgbaghara mmehie site nʼaha ya nye mba niile, malite na Jerusalem.
48 And ye are witnesses of these things.
Unu bụ ndị akaebe nke ihe ndị a.
49 And, behold, I send the promise of my Father upon you: but tarry ye in the city of Jerusalem, until ye be endued with power from on high.
Ma lee, agaje m izitere unu ihe ahụ Nna m kwere na nkwa. Ya mere, nọrọnụ nʼime obodo ruo mgbe a ga-eyikwasị unu ike nke si nʼelu.”
50 And he led them out as far as to Bethany, and he lifted up his hands, and blessed them.
O duuru ha garuo na Betani, chilie aka ya abụọ elu gọzie ha.
51 And it came to pass, while he blessed them, he was parted from them, and carried up into heaven.
Dị ka ọ na-agọzi ha, ọ sitere nʼebe ha nọ pụọ, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe.
52 And they worshipped him, and returned to Jerusalem with great joy:
Mgbe ahụ, ha fere ya ofufe jiri oke ọṅụ laghachi na Jerusalem.
53 And were continually in the temple, praising and blessing God. Amen.
Ha nọgidere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-eto Chineke oge niile.

< Luke 24 >