< Psalms 50 >

1 A psalm of Asaph. The Lord, the Almighty God, speaks! He summons everyone on earth, from the east to the west.
Abụ Ọma Asaf. Onyenwe anyị, Chineke, Onye kachasị chi niile, ekwuola okwu ma kpọkọta ụwa niile, site na ọwụwa anyanwụ ruo na ọdịda ya.
2 God shines out of Mount Zion, perfect in beauty.
Chineke na-enwupụta dịka ìhè, site na Zayọn, nke zuruoke nʼime ịma mma.
3 Our God arrives, and does not stay quiet. Fire flames before him, burning everything up; a violent storm rages around him.
Chineke anyị na-abịa, ọ gaghị emechikwa ọnụ; ọkụ na-erepịa erepịa dị nʼihu ya, oke ifufe na-efesi ike gbakwara ya gburugburu.
4 He summons the heavens above and the earth to witness the judgment of his people.
Ọ na-akpọku eluigwe na ụwa ka o kpee ndị ya ikpe: Ọ na-asị,
5 “Bring me those who trust in me—those who confirmed the agreement with me through sacrifice.”
“Chikọtaranụ m ndị m e doro nsọ, bụ ndị mụ na ha ji ịchụ aja gbaa ndụ.”
6 The heavens declare his decisions are right, for God himself is the judge. (Selah)
Eluigwe na-ekwupụta ezi omume ya, nʼihi na Chineke nʼonwe ya bụ onye ikpe. (Sela)
7 “My people, listen to what I have to say. I am bringing charges against you, Israel. I am God, your God!
“Nụrụnụ, ndị m, m ga-ekwukwa, Izrel, aga m agba ama megide unu, Abụ m Chineke, Chineke unu.
8 I'm not complaining about your sacrifices or burnt offerings that you offer all the time.
Anaghị m abara unu mba nʼihi ịchụ aja unu, na aja nsure ọkụ unu nke na-adị m nʼihu oge niile.
9 I do not require bulls from your barns or goats from your pens,
Enweghị m mkpa maka oke ehi unu site nʼụlọ anụmanụ unu maọbụ mkpi site nʼọgba igwe ewu na atụrụ unu,
10 for I own all the animals of the forest, and the cattle on a thousand hills belong to me.
nʼihi na ụmụ anụmanụ niile nke oke ọhịa bụ nke m, ha na ehi niile nọ nʼelu otu puku ugwu.
11 I know every bird of the mountains; all living things in the fields are mine.
Amaara m ụmụ nnụnụ niile nọ nʼelu ugwu niile, ihe niile e kere eke nọ nʼọhịa bụ nke m.
12 If I were hungry, I wouldn't tell you, for the earth and everything in it are mine.
Ọ bụrụ na agụụ agụọ m, agaghị m agwa gị ya, nʼihi na ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke m.
13 Do I eat the flesh of bulls or drink the blood of goats?
Ana m ata anụ oke ehi, ka ọ bụ ọbara mkpi ka m ga-aṅụ?
14 Give an offering of thanks to God; keep the promises you made to the Most High,
“Chụọrọ Chineke aja ekele, mezuo nkwa i kwere Onye kachasị ihe niile elu,
15 and call on me when you're in trouble. I will rescue you, and you will thank me.”
ma kpọkuo m nʼụbọchị nsogbu gị, aga m agbapụta unu, unu ga-enyekwa m nsọpụrụ.”
16 But to the wicked God says, “What's the point of mechanically repeating my laws or making empty promises about obeying the agreement?
Ma Chineke na-agwa ndị na-eme ihe ọjọọ okwu sị, “Olee, nkwuwa okwu unu nwere ịgụgharị iwu m, maọbụ kwupụta ọgbụgba ndụ m nʼọnụ unu?
17 You hate my discipline, and you toss my words away, leaving them behind you.
Unu kpọrọ ndụmọdụ m asị, na-atụfekwa okwu m nʼazụ unu.
18 When you see people stealing, you admire them; you associate with adulterers.
Mgbe unu hụrụ onye ohi, unu na ya na-ejikọta aka; unu na ndị na-akwa iko na-ekekọkwa oke.
19 With your mouth you say evil things; you use your tongue to spread lies.
Ọnụ unu na-eme ọsịịsọ ikwu okwu ọjọọ, okwu aghụghọ na nke rere ure na-esikwa nʼọnụ unu na-asọpụta dịka iyi.
20 You sit there and speak against your brother, slandering your own mother's son.
Unu na-ekwugide ụmụnna unu mgbe niile, na-ekwutọkwa nwanne unu nwoke.
21 I kept quiet when you did these things. You thought I was someone just like you. But now I confront you, and bring my charges against you.
Ihe ndị a ka unu mere ma agbachiri m nkịtị; unu chekwara na adị m ka unu. Ma aga m abara unu mba ma bokwaa unu ebubo unu nʼihu unu.
22 Think again, you people who dismiss God, or I will tear you apart, and no-one will be able to save you.
“Tụgharịa uche na nke a, unu ndị na-echefu Chineke, ma ọ bụghị ya, aga m adọrisi unu, ọ dịkwaghị onye ga-agbapụta unu.
23 But those who give an offering of thanks honor me, and to those who follow the right I will show them the salvation of God.”
Onye na-eji ekele achụrụ m aja, na-asọpụrụ m, ọ bụkwa onye na-edozi ụzọ ya, ka m ga-eme ka ọ hụ nzọpụta Chineke.”

< Psalms 50 >