< Numbers 19 >

1 The Lord told Moses and Aaron,
Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
2 “This is a legal regulation the Lord has ordered, saying, ‘Tell the Israelites to bring you a red cow without defects which has never been yoked.
“Ndị a bụ ụkpụrụ dị nʼiwu ahụ Onyenwe anyị nyere. Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara gị nwa nne ehi na-acha uhie uhie nke na-enweghị ntụpọ, na nke ụdọ yoku na-agabeghị nʼolu ya.
3 Hand it over to Eleazar the priest, and he will take it outside the camp and have it slaughtered before him.
Nye ya Elieza onye nchụaja, ka ọ kpụrụ ya pụọ nʼazụ ogige, ebe otu onye ga-egbu ya mgbe ọ nọ na-ele ya anya.
4 Eleazar the priest will put some of its blood on his finger and sprinkle it seven times towards the entrance of the Tent of Meeting.
Elieza bụ onye nchụaja ga-arụrụ ụfọdụ nʼime ọbara ya na mkpịsịaka ya, fesa ya na ncherita ihu ụlọ nzute ahụ ugboro asaa.
5 Then the cow must be burned as he watches All of it is to be burned—its skin, meat, and blood, as well as its excrement.
Mgbe ahụ, onye ọzọ ga-akpọ nwa nne ehi ahụ ọkụ mgbe Elieza nọkwa na-ele ya anya. Ọ ga-akpọ akpụkpọ ya, anụ ya, ọbara na mgbịrị afọ ya ọkụ.
6 The priest shall throw cedar wood, hyssop, and crimson thread on the burning cow.
Onye nchụaja ga-ewere osisi sida, na osisi hisọp, na ogho uhie, tụba ha nʼetiti ebe ahụ a kpọrọ nwa nne ehi ahụ ọkụ.
7 Then the priest shall wash his clothes and his body in water, and after that he may enter the camp, but he will remain unclean until the evening.
Emesịa, onye nchụaja ahụ ga-asacha uwe niile o yi; sakwaa ahụ ya. Ọ ga-alọghachikwa azụ nʼime ogige ahụ ebe ọ ga-anọ dịka onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.
8 The person who burned the cow shall also wash his clothes and his body in water, and he too will remain unclean until the evening.
Onye ahụ kpọrọ nwa ehi ahụ ọkụ aghaghị ịsa uwe ya niile, sakwaa ahụ ya. Ọ ga-anọkwa ọnọdụ onye na-adịghị ọcha ruo anyasị.
9 Then a man who is clean shall collect the ashes of the cow and keep them in a clean place outside the camp. They are to be kept by the Israelites to prepare the water of purification which is for purifying from sin.
“Mgbe ahụ, onye nke dị ọcha, ga-ekpokọta ntụ ozu nwa nne ehi ahụ, wụnye ya nʼebe dị ọcha nʼazụ ogige ahụ. Ebe ahụ ka nzukọ Izrel ga-edebe ya maka ikporo wụnye na mmiri e ji asachapụ adịghị ọcha. Ọ bụ maka nsacha pụọ na mmehie.
10 The man who collected the ashes of the cow shall also wash his clothes, and he will remain unclean until the evening. This is a permanent rule for the Israelites and for the foreigner that lives with them.
Ma onye ahụ ga-ekpokọta ntụ nsure ọkụ nwa nne ehi ahụ aghaghị ịsa uwe ya niile, sakwaa ahụ ya, nọkwaa dịka onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi. Iwu a ga-adịgidere ndị Izrel na ndị ọbịa binyere ha site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
11 If you touch a dead body you will be unclean for seven days.
“Onye ọbụla metụrụ ozu mmadụ aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.
12 You must purify yourself with the water of purification on the third day and on the seventh day, and then you will be clean. But if you don't purify yourself on the third and seventh days, you won't be clean.
Ha aghaghị iji mmiri e ji asachapụ adịghị ọcha saa ahụ ha nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Mgbe ahụ, ha ga-adị ọcha. Ma ọ bụrụ na ha asaghị ahụ ha nʼụbọchị nke atọ nakwa nʼụbọchị nke asaa, ha ga-anọgide bụrụ ndị na-adịghị ọcha ọ bụladị mgbe ụbọchị asaa ahụ gafesịrị.
13 If you touch a dead body and don't purify yourself you make the Tabernacle of the Lord unclean and must be expelled from Israel. You are still unclean because the water of purification hasn't been sprinkled on you, and your uncleanness remains.
Onye ọbụla metụrụ ozu mmadụ aka ma ọ saghị ahụ ya dịka usoro a si dị, o merụọla ebe nsọ Onyenwe anyị. A ga-ewezuga onye dị otu a site nʼetiti ndị Izrel. Ebe ọ bụ na a wụsaghị ya mmiri nsacha ahụ; ọ ga-anọgide bụrụ onye na-adịghị ọcha.
14 The following regulation applies when a person dies in a tent. Everyone who comes into the tent and everyone who is already in the tent will be unclean for seven days.
“Mgbe mmadụ nwụrụ nʼụlọ ikwu, ndị a ga-abụ iwu unu ga-eso. Ndị nọ nʼime ụlọ ikwu ahụ mgbe ọ nwụrụ na onye ọbụla banyere nʼụlọ ikwu ahụ, ga-abụ ndị na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.
15 Any open container there that doesn't have a closed lid is unclean.
Ihe ọbụla nke ghere oghe, nke na-enweghị ihe mkpuchi eriri e ji kechie elu ya, ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.
16 If you're out in the open and you touch someone who has been killed by the sword or who has died naturally, or if you touch a human bone or a grave, then you'll be unclean for seven days.
“Onye gara nʼọhịa metụ onye e gburu nʼagha aka, maọbụ onye nwụrụ nʼụzọ ọzọ dị iche, ma ọ bụkwanụ metụ ọkpụkpụ, maọbụ ili onye nwụrụ anwụ aka, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.
17 This is the process for the purification if you are unclean. Take some of the ashes of the burnt offering for purification, and put them in a jar with fresh water.
“Ma banyere onye ahụ na-adịghị ọcha, kporo ntụ site nʼime aja mmehie ahụ a kpọrọ ọkụ, tinye ya nʼime ite, wụkwasị ya mmiri e si nʼiyi na-eru eru kute.
18 A man who is clean shall take some hyssop and dip it in the water. Then sprinkle the tent and everything inside it, and everybody who was there. He would also need to sprinkle you if you who touched a bone, or a grave, or someone who has died or has been killed.
Mgbe ahụ, nwoke nke nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha ga-ewere ụfọdụ hisọp, denye ya na mmiri ahụ fesaa ya nʼime ụlọ ikwu ahụ, na ngwongwo niile e ji dozie ụlọ ahụ, na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ọ ga-efesakwa ya nʼahụ onye ọbụla metụrụ ọkpụkpụ, maọbụ onye e gburu egbu, maọbụ onye nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ ili aka.
19 The man who is clean is to sprinkle you both on the third day and on the seventh day. After you are purified on the seventh day, you must wash your clothes and yourself in water, and that evening you'll be clean.
Nwoke ahụ dị ọcha ga-efesakwa ndị ahụ rụrụ arụ nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Nʼụbọchị nke asaa ka ọ ga-eme ka ha dị ọcha. Ndị ahụ a na-edo ọcha ga-asa uwe ha mmiri, saa ahụ ha, nʼuhuruchi ụbọchị ahụ ka ha ga-adị ọcha.
20 But if you don't purify yourself, you will be expelled from the Israelites, because you have made the Tabernacle of the Lord unclean. The water of purification hasn't been sprinkled on you, and you remain unclean.
Ma ọ bụrụ na ndị ahụ merụrụ onwe ha e doghị onwe ha ọcha, aghaghị iwepụ ha site nʼetiti ọgbakọ Izrel. Nʼihi na ha merụrụ ebe nsọ Onyenwe anyị. E fesakwaghị ha mmiri nke ịdị ọcha nʼahụ, nke mere na ha adịghị ọcha.
21 This is a permanent rule for the everyone. The man who sprinkles the water of purification must wash his clothes, and anyone who touches the water of purification will be unclean until the evening.
Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide mgbe ebighị ebi. “Nwoke ahụ na-efesa mmiri ahụ e ji edo mmadụ ọcha, aghaghị ịsacha uwe ya niile. Onye ọbụla metụrụ mmiri nke ịdị ọcha ahụ aka, ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.
22 Anything the unclean person touches will be unclean, and anyone who touches it will be unclean until the evening.”
Ihe ọbụla kwa onye na-adịghị ọcha metụrụ aka, ga-aghọ ihe na-adịghị ọcha, onye ọbụla metụkwara ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.”

< Numbers 19 >