< Joshua 17 >

1 This was the allocation to the tribe of Manasseh, Joseph's firstborn son. Machir was Manasseh's firstborn son who was the father of Gilead. Because Machir had been an excellent fighter, Gilead and Bashan had already been allocated to him.
Nke a bụ oke e kenyere ndị ebo Manase, bụ ọkpara Josef, ya bụ Makia ọkpara Manase, onye bụ nna nna ndị Gilead. Onye natara ala Gilead na Bashan, nʼihi na ndị agbụrụ Makia bụ dike nʼagha.
2 The allocation was for the rest of the tribe of Manasseh, to the families of Abiezer, Helek, Asriel, Shechem, Hepher, and Shemida. These were the male descendants of Manasseh, the son of Joseph, by families.
Ya mere, oke a dịịrị ndị fọdụrụ nʼebo Manase dịka ezinaụlọ ha si dị. Agbụrụ Abieza, Helek, Asriel, Shekem, Hefa na Shemida. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom agbụrụ Manase, nwa Josef, dịka ikwu ha si dị.
3 But Zelophehad, son of Hepher, son of Gilead, son of Machir, son of Manasseh, had no sons. He only had daughters, whose names were Mahlah, Noah, Hoglah, Milcah, and Tirzah.
Ma Zelofehad, nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, amụtaghị ụmụ ndị ikom kama ọ mụtara naanị ụmụ ndị inyom, ndị aha ha bụ nke a: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza.
4 They approached Eleazar the priest, Joshua the son of Nun, and the leaders, and told them, “The Lord ordered Moses to give us an allocation of land along with our brothers.” So Joshua allotted land to them along with their brothers, as the Lord had ordered.
Ndị inyom ndị a bịakwutere Elieza, onye nchụaja na Joshua nwa Nun, nʼihu ndị ndu ụmụ Izrel niile sị ha, “Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya kenye anyị ala nke anyị, dịka o si kenye ụmụ ndị ikom ikwu anyị.” Ya mere, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu, Joshua nyere ha ihe nketa ruuru ha nʼetiti ụmụnne nna ha, dịka ndị ọzọ si keta.
5 Consequently Manasseh received ten shares of land beside the land of Gilead and Bashan on the other side of the Jordan,
Manase chịtara ala oke iri, tinyere Gilead, na Bashan nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan,
6 because the daughters of the tribe of Manasseh received an allocation along with the sons. (The land of Gilead had been allotted to the rest of the descendants of Manasseh).
nʼihi na e mere ka ndị inyom Manase keta oke nʼetiti ndị ikom ebo Manase. Ala fọdụrụ na Gilead bụ ndị ikom ebo Manase nwe ya.
7 The boundary of the tribe of Manasseh ran from Asher to Michmethath, near Shechem, then south to the spring of Tappuah.
Oke ala ebo Manase gbatịrị site nʼAsha ruo na Mikmetat, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Shekem. Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ndịda site nʼebe ahụ tinyere ndị bi nʼala En-Tapụọa.
8 The land around Tappuah was allocated to Manasseh, but the town of Tappuah, which was on the border of Manasseh's land, was allocated to Ephraim.
Ala dị gburugburu Tapụọa bụ ala ebo Manase, ma obodo Tapụọa nʼonwe ya, nke dị nʼoke ala ebo Manase, bụ obodo ebo Ifrem.
9 From there the boundary ran down to the valley of Kenah. South of the valley some of the towns belonged to Ephraim among the towns of Manasseh. The boundary ran along the north side of the valley and ended at the sea.
Oke ala ụmụ Manase gbatịrị ga ndịda ruo na mmiri iyi Kana. Ụfọdụ obodo ndị Ifrem dị nʼebe ahụ, nʼetiti obodo ndị Manase, kama oke ala ndị Manase nʼakụkụ ugwu iyi ahụ kwụsịrị nʼosimiri Mediterenịa.
10 To the south the land belonged to Ephraim, and to the north, to Manasseh. The sea is the boundary. The boundary to the north was with Asher, and with Issachar to the east.
Ala dị na ndịda bụ nke e kenyere Ifrem, ma ala mgbago ugwu bụ nke Manase. Ala ndị Manase gbatịrị ruo nʼosimiri Mediterenịa ma ha na ndị Asha nwekọrọ oke ala nʼakụkụ ugwu, ebe ha na ndị Isaka nwere oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.
11 The following towns with their associated villages were allocated to Manasseh but lay within the land of Issachar and Asher: Beth-shan, Ibleam, Dor (on the coast), Endor, Taanach, and Megiddo.
Manase ka e nyere obodo ndị a, nke dị nʼala e nyere Isaka na Asha: obodo Bet-Shan, na Ibleam, na Doa, na Endoa, na Teanak, na Megido, na obodo nta niile gbara ha gburugburu. Obodo nke atọ bụ Nafọt.
12 But the descendants of Manasseh could not take possession of these towns because the Canaanites were determined to go on occupying the land.
Ma ụmụ Manase enweghị ike ịchụpụ ndị Kenan bi nʼobodo ndị ahụ, nʼihi na ndị Kenan nọgidere bichie obodo ndị a.
13 However, later on, when the Israelites grew strong enough, they made the Canaanites do forced labor—but they did not drive them out.
Ma nʼikpeazụ, mgbe ụmụ Izrel ghọrọ ndị dị ike, ha achụpụghị ndị Kenan niile bi nʼobodo ndị a kpamkpam, kama ha mere ka ha bụrụ ndị na-ejere ụmụ Izrel ozi, dịka ndị ohu ha.
14 Then the descendants of Joseph came to Joshua and asked him, “Why have you given us only one allocation—only one share of the land—when there's so many of us because the Lord has blessed us so much?”
Ma ụmụ ụmụ Josef sịrị Joshua, “Gịnị mere i ji nye anyị naanị otu ụzọ ala ka ọ bụrụ ihe nketa anyị? Ị hụrụ na Onyenwe anyị gọziri anyị mee ka ọnụọgụgụ anyị baa ụba.”
15 Joshua told them, “If there's so many of you, if the hill country of Ephraim is too small for you, then go and clear ground for yourselves from the forest in the land of the Perizzites and the Rephaim.”
Joshua zara sị ha: “Ọ bụrụ na ala ugwu ugwu Ifrem agaghị ezuru unu nʼihi na unu bara ụba nʼọnụọgụgụ, gaanụ nʼoke ọhịa sụchasịa ala, nʼime ala ndị Periz, na nke ndị Refaim.”
16 The descendants of Joseph replied, “The hill country isn't big enough for us, but the Canaanites living in the lowlands have iron chariots, both those in Beth-shan and its villages, and those in the valley of Jezreel.”
Ụmụ Josef zara Joshua sị, “Ala ugwu ugwu a agaghị ezuru anyị. Ọzọ, ndị Kenan niile bi nʼala dị larịị nwere ụgbọala igwe, ma ndị niile bi na Bet-Shan, na ụmụ obodo nta ha na ndị bikwa na Ndagwurugwu Jezril.”
17 Joshua said to the tribes of Ephraim and Manasseh, the descendants of Joseph, “Since you are so many, and you are so strong, you will be given more than just one share.
Ma Joshua zara ụmụ Josef, ya bụ, Ifrem na Manase, sị ha, “Unu dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, bụrụkwa ndị dị ike, ọ bụghị naanị otu oke ka unu ga-eketa,
18 You will be allocated the hill country in addition. Though it is forest, you will clear it and own it, from one end to the other. You will drive out the Canaanites, even though they have iron chariots, and even though they are strong.”
nʼihi na ala ugwu ugwu oke ọhịa ahụ bụkwa nke unu. Sụchaanụ ya, ruo na nsọtụ ya, ka ọ bụrụ nke unu. Ọ bụ ezie na ndị Kenan bi nʼime ya nwere ụgbọ agha igwe, bụrụkwa ndị sịrị ike, unu nwere ike ịchụpụ ha.”

< Joshua 17 >