< James 1 >

1 James, servant of God and of our Lord Jesus Christ, to the twelve tribes of the dispersion, greetings.
Jemis, nwaodibo Chineke na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Na-edegara agbụrụ iri na abụọ ndị gbasara nʼelu ụwa niile akwụkwọ ozi a: Ndeewonụ!
2 My brothers, when you have fallen into various trials, consider everything a joy,
Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nʼọṅụ mgbe ọbụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu.
3 knowing that the proving of your faith exercises patience,
Nʼihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachiobi unu na-enwe ohere ito eto.
4 and patience brings a work to perfection, so that you may be perfect and whole, deficient in nothing.
Ka nguzosike unu pụta ìhè, ka unu zuo oke ma nwezuokwa ihe niile, na-adịghị ihe ọbụla nke ga-akọ unu.
5 But if anyone among you is in need of wisdom, let him petition God, who gives abundantly to all without reproach, and it shall be given to him.
Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya.
6 But he should ask with faith, doubting nothing. For he who doubts is like a wave on the ocean, which is moved about by the wind and carried away;
Ma rịọọ nʼokwukwe na-enweghị obi abụọ, nʼihi na onye na-enwe obi abụọ dị ka ebili mmiri oke osimiri mgbe ikuku na-ebugharị ya.
7 then a man should not consider that he would receive anything from the Lord.
Onye dị otu ahụ ekwesighị ile anya na ọ ga-esite nʼaka Onyenwe anyị nata ihe ọbụla.
8 For a man who is of two minds is inconstant in all his ways.
Nʼihi na mmadụ dị otu a bụ onye ihu abụọ, onye na-adịghị eguzo nʼotu ebe nʼihe ọbụla ọ na-eme.
9 Now a humble brother should glory in his exaltation,
Ka nwanna ọbụla bụ ogbenye ṅụrịa ọṅụ, mgbe ọbụla e weliri ya elu.
10 and a rich one, in his humiliation, for he will pass away like the flower of the grass.
Ka onye bụ ọgaranya mgbe a na-eme ka ọ nọdụ ya dị ala, nʼihi na ndị bara ụba ga-akpọnwụ dị ka okoko osisi.
11 For the sun has risen with a scorching heat, and has dried the grass, and its flower has fallen off, and the appearance of its beauty has perished. So also will the rich one wither away, according to his paths.
Nʼihi na mgbe ọbụla anwụ waliri chasie ike, wepụta okpomọkụ, ọ na-eme ka ahịhịa kpọnwụọ, ka okoko osisi daa nʼala, mma ya agwụsịakwa. Nʼotu aka ahụ, onye ahụ bara ụba ga-akpọnwụ ọ bụladị mgbe ọ na-ejegharị nʼime ije ozi ya.
12 Blessed is the man who suffers temptation. For when he has been proven, he shall receive the crown of life which God has promised to those who love him.
Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya.
13 No one should say, when he is tempted, that he was tempted by God. For God does not entice toward evils, and he himself tempts no one.
Ka onye ọbụla hapụ ị sị, mgbe a na-anwa ya, “Ọ bụ Chineke na-anwa m ọnwụnwa a.” Nʼihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ, ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọbụla ka o mee ihe ọjọọ.
14 Yet truly, each one is tempted by his own desires, having been enticed and drawn away.
Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nʼọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya.
15 Thereafter, when desire has conceived, it gives birth to sin. Yet truly sin, when it has been consummated, produces death.
Ọchịchọ ahụ, mgbe ha bara ụba nʼime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe mmehie bara ụba, ọ na-eduba nʼọnwụ.
16 And so, do not choose to go astray, my most beloved brothers.
Ekwela ka onye ọbụla duhie unu ụmụnna m.
17 Every excellent gift and every perfect gift is from above, descending from the Father of lights, with whom there is no change, nor any shadow of alteration.
Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. Ọ na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya.
18 For by his own will he produced us through the Word of truth, so that we might be a kind of beginning among his creatures.
Nʼihi imezu nzube ya, o sitere nʼokwu ya bụ eziokwu mụọ anyị. O mekwara nke a ka anyị bụrụ ụmụ mbụ nke ihe o kere eke.
19 You know this, my most beloved brothers. So let every man be quick to listen, but slow to speak and slow to anger.
Unu aghaghị icheta nke a ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya. Ka onye ọbụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu, ma bụrụkwa onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ.
20 For the anger of man does not accomplish the justice of God.
Nʼihi na iwe nke mmadụ anaghị arụpụta ezi omume nke Chineke.
21 Because of this, having cast away all uncleanness and an abundance of malice, receive with meekness the newly-grafted Word, which is able to save your souls.
Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ niile na ihe ọbụla dị njọ nke fọdụrụ nʼime ndụ unu. Ma jirinụ obi umeala nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nʼobi unu, nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụobi unu.
22 So be doers of the Word, and not listeners only, deceiving yourselves.
Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ naanị, na-arafu onwe ha, kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru.
23 For if anyone is a listener of the Word, but not also a doer, he is comparable to a man gazing into a mirror upon the face that he was born with;
Nʼihi na onye ọbụla na-ege ntị nʼokwu ọbụla ma hapụ iji ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke na-ele ihu ya nʼenyo.
24 and after considering himself, he went away and promptly forgot what he had seen.
O lesịa onwe ya pụọ, o chefuo ihe ihu ya yiri ma nwa oge nta gasịa.
25 But he who gazes upon the perfect law of liberty, and who remains in it, is not a forgetful hearer, but instead a doer of the work. He shall be blessed in what he does.
Ma nwoke ahụ nọgidesịrị ike na-ele anya nʼime iwu ahụ zuruoke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, ee, nwoke ahụ na-aga nʼihu ile na ime ihe iwu ahụ kwuru, hapụkwa ichefu ya, ka a ga-agọzi nʼihe niile ọ na-eme.
26 But if anyone considers himself to be religious, but he does not restrain his tongue, but instead seduces his own heart: such a one’s religion is vanity.
Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka maọbụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru.
27 This is religion, clean and undefiled before God the Father: to visit orphans and widows in their tribulations, and to keep yourself immaculate, apart from this age.
Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke Nna anyị na-anabata dịka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị mmerụ, bụ nke a, ilekọta ndị na-enweghị nne na nna, na ndị di ha nwụrụ nʼime nsogbu ha na idebe onwe anyị nʼenweghị ntụpọ site nʼaka ndị ụwa.

< James 1 >