< Acts 23 >

1 Then Paul, gazing intently at the council, said, “Noble brothers, I have spoken with all good conscience before God, even to this present day.”
Mgbe Pọl legidere ndị nzukọ a anya, ọ sịrị, “Ụmụnna m, mụ onwe m ejirila ezi akọnuche bie ndụ m niile nʼihu Chineke ruokwa ụbọchị taa.”
2 And the high priest, Ananias, instructed those who were standing nearby to strike him on the mouth.
Nke a mere, Ananayas onyeisi nchụaja nyere iwu ka ndị nọ ya nso tie ya aka nʼọnụ.
3 Then Paul said to him: “God shall strike you, you whitewashed wall! For would you sit and judge me according to the law, when, contrary to the law, you order me to be struck?”
Ma Pọl, sịrị ya, “Otu a ka Chineke ga-esi tie gị, gị mgbidi e tere nzu. Ụdị onye ikpe dị aṅaa ka ị bụ i ji na-emebi iwu nʼonwe gị site nʼinye iwu ka e si otu a tie m ihe?”
4 And those who were standing nearby said, “Are you speaking evil about the high priest of God?”
Ndị guzo ya nso sịrị, “Ị na-ekwutọ onyeisi nchụaja Chineke?”
5 And Paul said: “I did not know, brothers, that he is the high priest. For it is written: ‘You shall not speak evil of the leader of your people.’”
Ma Pọl sịrị, “Aghọtaghị m, ụmụnna m na ọ bụ onyeisi nchụaja. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ekwula okwu ọjọọ ọbụla megide onye na-achị ndị nke gị.’”
6 Now Paul, knowing that one group were Sadducees and the other were Pharisees, exclaimed in the council: “Noble brothers, I am a Pharisee, the son of Pharisees! It is over the hope and resurrection of the dead that I am being judged.”
Mgbe Pọl chọpụtara na otu ụzọ nʼime nzukọ ahụ bụ ndị otu Sadusii, ebe ndị ọzọ bụkwa ndị Farisii, o tiri mkpu nʼime nnọkọ ahụ sị, “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii na nwa ndị Farisii. A na-ekpe m ikpe taa nʼihi olileanya m nwere na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.”
7 And when he had said this, a dissension occurred between the Pharisees and the Sadducees. And the multitude was divided.
Mgbe o kwusiri nke a esemokwu dapụtara nʼetiti ndị Farisii na ndị Sadusii. Ọgbakọ ahụ kewara.
8 For the Sadducees claim that there is no resurrection, and neither angels, nor spirits. But the Pharisees confess both of these.
Nʼihi na ndị Sadusii na-asị na mbilite nʼọnwụ maọbụ mmụọ ozi maọbụ mmụọ ọbụla adịghị. Ma ndị Farisii kweere nʼihe ndị a niile.
9 Then there occurred a great clamor. And some of the Pharisees, rising up, were fighting, saying: “We find nothing evil in this man. What if a spirit has spoken to him, or an angel?”
Mkpọtụ malitere na-ada ike ike. Ụfọdụ ndị ozizi iwu so nʼotu ndị Farisii biliri ọtọ malite ịrụ ụka nʼoke olu sị, “Anyị ahụghị ihe ọjọọ nʼebe nwoke a nọ, ma gịnịkwa ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ, maọbụ mmụọ ozi gwara ya okwu?”
10 And since a great dissension had been made, the tribune, fearing that Paul might be torn apart by them, ordered the soldiers to descend and to seize him from their midst, and to bring him into the fortress.
Esemokwu a bịara karịa, nke mere na onyeisi ọchịagha tụrụ egwu na ha ga-adọkasị Pọl. Ọ gwara ndị agha ya ka ha banye were ike kpọpụta ya, ziga ya nʼogige ndị agha.
11 Then, on the following night, the Lord stood near him and said: “Be constant. For just as you have testified about me in Jerusalem, so also it is necessary for you to testify at Rome.”
Nʼabalị ya, Onyenwe anyị bịakwutere ya sị, “Nwee obi ike, dịka i si gbaa ama banyere m na Jerusalem, ị ghaghị ịgbakwara m ama na Rom.”
12 And when daylight arrived, some of the Jews gathered together and bound themselves with an oath, saying that they would neither eat nor drink until they had killed Paul.
Nʼụtụtụ echi ya ụfọdụ ndị Juu zukọtara gbaa izu, ṅụọkwa iyi na ha agaghị eri nri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu Pọl.
13 Now there were more than forty men who had taken this oath together.
Ndị zukọtara gbaa izu ọjọọ a karịrị iri mmadụ anọ.
14 And they approached the leaders of the priests, and the elders, and they said: “We have sworn ourselves by an oath, so that we will taste nothing, until we have killed Paul.
Ha jekwuuru ndịisi nchụaja ha na ndị okenye, sị ha, “Anyị kwekọtara ịhapụ iri maọbụ ịṅụ ihe ọbụla tutu ruo mgbe anyị gburu Pọl.
15 Therefore, with the council, you should now give notice to the tribune, so that he may bring him to you, as if you intended to determine something else about him. But before he approaches, we have made preparations to put him to death.”
Ugbu a, unu na nzukọ zienụ onyeisi ọchịagha ka ọ kpọpụtara unu ya. Meenụ ka unu na-achọ ịjụpụtasị eziokwu nʼọnụ ya nakwa itule ikpe ya nke ọma. Anyị dị njikere igbu ya nʼụzọ tupu ọ bịaruo unu nso.”
16 But when Paul’s sister’s son had heard of this, about their treachery, he went and entered into the fortress, and he reported it to Paul.
Ma nwa nwanne nwanyị Pọl nụrụ maka izuzu ọjọọ a. Ọ banyere nʼogige ndị agha kọọrọ Pọl.
17 And Paul, calling to him one of the centurions, said: “Lead this young man to the tribune. For he has something to tell him.”
Pọl kpọrọ otu nʼime ndịisi agha ahụ gwa ya, “Biko kpọrọ nwokorobịa a gaa nʼebe ọchịagha nọ, o nwere okwu dị mkpa ọ chọrọ ịgwa ya.”
18 And indeed, he took him and led him to the tribune, and he said, “Paul, the prisoner, asked me to lead this young man to you, since he has something to say to you.”
Ọ kpọọrọ ya jekwuru onyeisi agha, sị. “Pọl, onye mkpọrọ, kpọrọ m rịọ m ka m kpọtara gị nwokorobịa a nʼihi na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa gị.”
19 Then the tribune, taking him by the hand, withdrew with him by themselves, and he asked him: “What is it that you have to tell me?”
Onyeisi agha ahụ duuru ya nʼaka ya gaa nʼakụkụ ọzọ jụọ ya, “Gịnị bụ ihe ị chọrọ ịkọrọ m?”
20 Then he said: “The Jews have met to ask you to bring Paul tomorrow to the council, as if they intended to question him about something else.
Ọ sịrị, “Ndị Juu ụfọdụ ekwekọrịtala ịrịọ gị ka ị kpọpụta Pọl echi na nzukọ ụlọ ikpe. Ha ga-eme dịka ha nwere ihe dị mkpa ha chọrọ ịjụta ya.
21 But truly, you should not believe them, for they would ambush him with more than forty men from among them, who have bound themselves by an oath neither to eat, nor to drink, until they have put him to death. And they are now prepared, hoping for an affirmation from you.”
Ma aṅala ha ntị. Nʼihi na ihe karịrị iri mmadụ anọ na-ezo onwe ha na-eche inwude ya. Ndị a gbara ndụ na ha agaghị eri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu ya. Ha adịla njikere, ihe a na-eche bụ mkpebi gị nye arịrịọ ha.”
22 And then the tribune dismissed the young man, instructing him not to tell anyone that he had made known these things to him.
Ọchịagha ahụ zilagara nwokorobịa ahụ site nʼinye ya iwu, “Emekwala ka onye ọbụla mata na ị bịara gwa m ihe dị otu a.”
23 Then, having called two centurions, he said to them: “Prepare two hundred soldiers, so that they may go as far as Caesarea, and seventy horsemen, and two hundred spearmen, for the third hour of the night.
Mgbe e mesịrị, ọ kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndịisi agha nye ha iwu sị, “Gaanụ jikere narị ndị agha abụọ, na iri mmadụ asaa ndị na-agba ịnyịnya, tinyere narị ndị ikom abụọ ndị na-ama ùbe, ndị ga-aga Sizaria nʼelekere itoolu nke abalị a.
24 And prepare beasts of burden to carry Paul, so that they may lead him safely to Felix, the governor.”
Nyekwa Pọl ịnyịnya nke ọ ga-agba, ka e nwee ike duru ya gakwuru Feliks bụ gọvanọ nʼudo.”
25 For he was afraid, lest perhaps the Jews might seize him and kill him, and that afterwards he would be falsely accused, as if he had accepted a bribe. And so he wrote a letter containing the following:
O dere akwụkwọ nʼolu dị otu a:
26 “Claudius Lysias, to the most excellent governor, Felix: greetings.
Klọdiọs Lisias, Na-edegara Feliks onye nsọpụrụ na-adịrị, onye na-achị akụkụ a. Ana m ekele gị.
27 This man, having been apprehended by the Jews and being about to be put to death by them, I rescued, overwhelming them with soldiers, since I realized that he is a Roman.
Ndị Juu jidere nwoke a chọọ igbu ya, ma mgbe m nụrụ na ọ bụ onye Rom, mụ na ndị agha m bịara napụta ya nʼaka ha.
28 And wanting to know the reason that they objected to him, I brought him into their council.
Achọrọ m ịmata ihe mere ha ji ebo ya ebubo, nʼihi ya eduuru m ya gaa nʼọgbakọ ndị okenye ha.
29 And I discovered him to be accused about questions of their law. Yet truly, nothing deserving of death or imprisonment was within the accusation.
Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe banyere iwu ha. Nʼeziokwu, o nweghị ihe ọbụla kwesiri iji tụọ ya mkpọrọ maọbụ ọnwụ nʼime ebubo ahụ.
30 And when I had been given news of ambushes, which they had prepared against him, I sent him to you, notifying his accusers also, so that they may plead their accusations before you. Farewell.”
Mgbe a gwara m banyere izuzu a na-agba megide nwoke a, ezitere m gị ya nʼegbughị oge. Enyekwara m ndị niile na-ebo ya ebubo iwu, ka ha bịa nʼihu gị kpee ọnụ ha.
31 Therefore the soldiers, taking Paul according to their orders, brought him by night to Antipatris.
Ya mere, nʼabalị ahụ, ndị agha dubatara Pọl na Antipatris dịka e nyere ha nʼiwu.
32 And the next day, sending the horsemen to go with him, they returned to the fortress.
Nʼechi ya, ha hapụrụ ya na ndị na-agba nʼelu ịnyịnya ka ha duru ya gawa, ebe ha laghachiri nʼogige ndị agha.
33 And when they had arrived at Caesarea and had delivered the letter to the governor, they also presented Paul before him.
Mgbe ha bịarutere Sizaria, ha nyere onyeisi obodo ahụ akwụkwọ ozi, ma kpọnyekwa ya Pọl.
34 And when he had read it and had asked which province he was from, realizing that he was from Cilicia, he said:
Gọvanọ ahụ gụrụ akwụkwọ ozi ahụ, jụọ ya akụkụ ala o si pụta. Mgbe ọ matara na ọ bụ onye Silisia,
35 “I will hear you, when your accusers have arrived.” And he ordered him to be kept in the praetorium of Herod.
ọ sịrị ya, “Aga m enye okwu gị ezigbo ohere mgbe ndị na-ebo gị ebubo bịara.” O nyekwara iwu ka e debe ya nʼobi Herọd nʼaka ndị nche.

< Acts 23 >