< Psalms 72 >

1 By Solomon. God, give the king your justice; your righteousness to the royal son.
Abụ nke Solomọn. O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze. Nyekwa nwa eze ezi omume gị.
2 He will judge your people with righteousness, and your poor with justice.
Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị, jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu.
3 The mountains shall bring prosperity to the people. The hills bring the fruit of righteousness.
Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba; ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume.
4 He will judge the poor of the people. He will save the children of the needy, and will break the oppressor in pieces.
Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ, zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa; ọ ga-egwepịa onye mmegbu.
5 They shall fear you while the sun endures; and as long as the moon, throughout all generations.
Ka ọ dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide, dịka ọnwa na-adịgidekwa ruo ọgbọ niile.
6 He will come down like rain on the mown grass, as showers that water the earth.
Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ, dịka mmiri ozuzo na-ede elu ala.
7 In his days, the righteous shall flourish, and abundance of peace, until the moon is no more.
Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa; ịba ụba ga-ejupụta ebe niile ruo mgbe ọnwa agaghị adịkwa.
8 He shall have dominion also from sea to sea, from the River to the ends of the earth.
Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri, na-esite nʼiyi ukwu. ruo na nsọtụ niile nke ụwa
9 Those who dwell in the wilderness shall bow before him. His enemies shall lick the dust.
Ebo niile ndị bi nʼọzara ga-akpọ isiala nye ya, ndị iro ya niile ga-abụ ndị e wedara nʼala.
10 The kings of Tarshish and of the islands will bring tribute. The kings of Sheba and Seba shall offer gifts.
Ndị eze Tashish na mba niile dị nʼebe dị anya, ga-atụ ụtụ wetara ya; e, ọ bụladị ndị eze si Sheba na Seba, ga-ewetara ya ọtụtụ onyinye.
11 Yes, all kings shall fall down before him. All nations shall serve him.
Ndị eze niile ga-akpọ isiala nye ya, mba niile ga-ejekwara ya ozi.
12 For he will deliver the needy when he cries; the poor, who has no helper.
Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya. Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka.
13 He will have pity on the poor and needy. He will save the souls of the needy.
Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa, ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ.
14 He will redeem their soul from oppression and violence. Their blood will be precious in his sight.
Ọ ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike, nʼihi na ndụ ha dị oke ọnụahịa nʼanya ya.
15 He will live; and Sheba’s gold will be given to him. Men will pray for him continually. They will bless him all day long.
Ka ọ dị ogologo ndụ! Ka e nye ya ọlaọcha e wetara na Sheba. Ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere mgbe niile, ma gọziekwa ya ogologo ụbọchị niile.
16 Abundance of grain shall be throughout the land. Its fruit sways like Lebanon. Let it flourish, thriving like the grass of the field.
Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a; ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile. Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn; ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa.
17 His name endures forever. His name continues as long as the sun. Men shall be blessed by him. All nations will call him blessed.
Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide. A ga-esite na ya gọzie mba niile, a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi.
18 Praise be to the LORD God, the God of Israel, who alone does marvelous deeds.
Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel, onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche.
19 Blessed be his glorious name forever! Let the whole earth be filled with his glory! Amen and amen.
Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi; ka ụwa niile jupụta nʼebube ya.
20 This ends the prayers by David, the son of Jesse.
Nke a bụ ọgwụgwụ ekpere Devid nwa Jesi.

< Psalms 72 >