< Psalms 4 >

1 For the Chief Musician; on stringed instruments. A Psalm by David. Answer me when I call, God of my righteousness. Give me relief from my distress. Have mercy on me, and hear my prayer.
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nke a na-eji ụbọ akwara akpọ. Zaa m mgbe m na-akpọku gị Chineke m, gị onye ezi omume; Napụta m site nʼihe mgbu m, meere m ebere, nụrụkwa ekpere m.
2 You sons of men, how long shall my glory be turned into dishonor? Will you love vanity and seek after falsehood? (Selah)
Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere? Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie? (Sela)
3 But know that the LORD has set apart for himself him who is godly; The LORD will hear when I call to him.
Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya; ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya.
4 Stand in awe, and do not sin. Search your own heart on your bed, and be still. (Selah)
Maanụ jijiji, unu emehiekwala; mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu; nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. (Sela)
5 Offer the sacrifices of righteousness. Put your trust in the LORD.
Tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi unu, chụkwaranụ ya aja ezi omume.
6 Many say, “Who will show us any good?” LORD, let the light of your face shine on us.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ, “Onye pụrụ imere anyị ihe ọma?” Ma Onyenwe anyị, biko mee ka ìhè nke ihu gị mụkwasị anyị.
7 You have put gladness in my heart, more than when their grain and their new wine are increased.
Were ọṅụ mejupụta obi m karịa mgbe mkpụrụ ubi, ya na mmanya ọhụrụ ha bara ụba nke ukwuu.
8 In peace I will both lay myself down and sleep, for you alone, LORD, make me live in safety.
Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo, nʼihi na ọ bụ naanị gị Onyenwe anyị, na-eme ka m nọrọ na-enweghị ihe egwu ọbụla.

< Psalms 4 >