< Proverbs 25 >

1 These also are proverbs of Solomon, which the men of Hezekiah king of Judah copied out.
Ndị a bụkwa ilu Solomọn, nke ndị ozi Hezekaya eze ndị Juda dekọtara nʼakwụkwọ.
2 It is the glory of God to conceal a thing, but the glory of kings is to search out a matter.
Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu, ma nsọpụrụ ndị eze bụ ịchọpụta ala okwu.
3 As the heavens for height, and the earth for depth, so the hearts of kings are unsearchable.
Dịka ịdị elu nke eluigwe, dịka ịdị omimi nke ala, otu a ka obi ndị eze bụ ihe a na-apụghị ịchọpụta.
4 Take away the dross from the silver, and material comes out for the refiner.
Wepụ ihe ahụ niile na-ekpuchi mma ọlaọcha, onye ọkpụ ụzụ ọla ga-arụpụta efere;
5 Take away the wicked from the king’s presence, and his throne will be established in righteousness.
wezugakwa ndịisi nʼeme ajọ ihe nʼihu eze, ocheeze ya ga-eguzosikwa ike site nʼezi omume.
6 Do not exalt yourself in the presence of the king, or claim a place among great men;
Egosipụtala onwe gị nʼihu eze, ewerela ọnọdụ nʼetiti ndị oke mmadụ,
7 for it is better that it be said to you, “Come up here,” than that you should be put lower in the presence of the prince, whom your eyes have seen.
ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na ọ si gị, “Rigota nʼebe a,” karịa na o wedara gị ala nʼihu ndị oke mmadụ. Ihe iji anya gị abụọ hụ
8 Do not be hasty in bringing charges to court. What will you do in the end when your neighbor shames you?
e mekwala ngwangwa ịga nʼụlọikpe, nʼihi na ọ bụ gịnị ka ị ga-eme nʼikpeazụ ma ọ bụrụ nʼonye agbataobi gị etinye gị nʼọnọdụ ihere?
9 Debate your case with your neighbor, and do not betray the confidence of another,
Ọ bụrụ na gị na onye ọzọ enwee esemokwu, dozienụ ya nʼonwe unu, emekwala ka ndị ọzọ mata okwu nzuzo gị na onye ọzọ kwuru,
10 lest one who hears it put you to shame, and your bad reputation never depart.
ma ọ bụghị ya, onye nụrụ ya nwere ike menye gị ihere, agwa ọjọọ gị agaghị enwekwa ọgwụgwụ.
11 A word fitly spoken is like apples of gold in settings of silver.
Ndụmọdụ e nyere nʼoge kwesiri ekwesi dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo e tinyere nʼefere ọlaọcha.
12 As an earring of gold, and an ornament of fine gold, so is a wise reprover to an obedient ear.
Dịka ọlantị ọlaedo maọbụ ihe ịchọ mma nke ọlaedo mara mma ka mba onye maara ihe bụ na ntị onye na-anụ ya.
13 As the cold of snow in the time of harvest, so is a faithful messenger to those who send him; for he refreshes the soul of his masters.
Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ, dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi.
14 As clouds and wind without rain, so is he who boasts of gifts deceptively.
Onye ahụ na-adịghị emezu nkwa o kwere dịka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri.
15 By patience a ruler is persuaded. A soft tongue breaks the bone.
Nwee ndidi, nʼikpeazụ ị ga-enwe mmeri, nʼihi na ire dị nro na-agbaji ọkpụkpụ.
16 Have you found honey? Eat as much as is sufficient for you, lest you eat too much, and vomit it.
Mmanụ aṅụ ọ na-atọ gị ụtọ? Arachala ya karịa, ka ọ ghara iwetara gị ọrịa.
17 Let your foot be seldom in your neighbor’s house, lest he be weary of you, and hate you.
Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe, ka ị ghara ire ugwu gị.
18 A man who gives false testimony against his neighbor is like a club, a sword, or a sharp arrow.
Onye na-agbagịde onye agbataobi ya ama ụgha, dịka mkpọrọ osisi maọbụ mma agha, maọbụ àkụ a pịziri apịzi.
19 Confidence in someone unfaithful in time of trouble is like a bad tooth or a lame foot.
Ịtụkwasị onye aghụghọ obi nʼoge nsogbu dị ka iji eze na-eme ndakapụ ata ihe, maọbụ iji ụkwụ jiri eji agba ọsọ.
20 As one who takes away a garment in cold weather, or vinegar on soda, so is one who sings songs to a heavy heart.
Dịka onye e yipụrụ uwe nʼụbọchị oyi ụgụrụ, maọbụ iwere nnu tee nʼelu ọnya, otu a ka onye na-abụrụ onye iwe na-ewe abụ dị.
21 If your enemy is hungry, give him food to eat. If he is thirsty, give him water to drink;
Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ.
22 for you will heap coals of fire on his head, and the LORD will reward you.
Mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya, Onyenwe anyị ga-akwụghachikwa gị.
23 The north wind produces rain; so a backbiting tongue brings an angry face.
Dịka ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo, otu a ka ikwu mmadụ okwu azụ si eweta iwe.
24 It is better to dwell in the corner of the housetop than to share a house with a contentious woman.
Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu.
25 Like cold water to a thirsty soul, so is good news from a far country.
Oziọma e sitere na mba dị anya nata dị ka mmiri jụrụ oyi nye onye akpịrị na-akpọ nkụ.
26 Like a muddied spring and a polluted well, so is a righteous man who gives way before the wicked.
Onye ezi omume nke kwenyere nʼihe onye na-emebi iwu kwuru dị ka iyi a gwọrụrụ nʼisi ya.
27 It is not good to eat much honey, nor is it honorable to seek one’s own honor.
Dịka ịracha mmanụ aṅụ hie nne si jọọ njọ, otu a ka o si bụrụ ihe na-enweghị nsọpụrụ, mmadụ ịchọpụta ihe ndị ezomiri ezomi.
28 Like a city that is broken down and without walls is a man whose spirit is without restraint.
Nwoke ọbụla na-adịghị achị mmụọ ya dị ka obodo na-enweghị ndị na-eche ya nche, nke e tikpọrọ mgbidi ya etikpọ.

< Proverbs 25 >