< Mark 7 >

1 Then the Pharisees and some of the scribes gathered together to him, having come from Jerusalem.
Mgbe ndị Farisii na ụfọdụ ndị ozizi iwu sitere Jerusalem bịa gbara ya gburugburu,
2 Now when they saw some of his disciples eating bread with defiled, that is unwashed, hands, they found fault.
ha hụrụ na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ji aka na-adịghị ọcha, ya bụ aka a na-akwọghị akwọ, na-eri nri.
3 (For the Pharisees and all the Jews do not eat unless they wash their hands and forearms, holding to the tradition of the elders.
Ndị Farisii na ndị Juu niile adịghị eri nri ma ọ bụrụ na ha akwọghị aka, nʼihi na ha na-ejigidesi aka ike nʼozizi na omenaala nke ndị okenye.
4 They do not eat when they come from the marketplace unless they bathe themselves, and there are many other things which they have received to hold to: washings of cups, pitchers, bronze vessels, and couches.)
Mgbe ọbụla ha si nʼahịa lọta, ha adịghị eri nri ma ọ bụghị ma ha sachara onwe ha. Ha na-edebekwa ọtụtụ omenaala ndị ọzọ dị ka ịsacha iko, na ite mmiri na ketụlụ.
5 The Pharisees and the scribes asked him, “Why do not your disciples walk according to the tradition of the elders, but eat their bread with unwashed hands?”
Ya mere ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebi nʼusoro omenaala ndị okenye. Karịa iji aka na-adịghị ọcha rie nri ha?”
6 He answered them, “Well did Isaiah prophesy of you hypocrites, as it is written, ‘This people honors me with their lips, but their heart is far from me.
Ọ sịrị ha, “Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu; dị ka e dere ya sị, “‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.
7 They worship me in vain, teaching as doctrines the commandments of men.’
Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu, ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’
8 “For you set aside the commandment of God, and hold tightly to the tradition of men—the washing of pitchers and cups, and you do many other such things.”
Unu atụfuola iwu Chineke ma jidesiekwa aka ike nʼomenaala nke mmadụ.”
9 He said to them, “Full well do you reject the commandment of God, that you may keep your tradition.
Ma ọ gwakwara ha sị, “Unu nwere ụzọ dị mma nʼanya unu nke unu ji wezuga iwu Chineke ma were omenaala unu dochie nʼọnọdụ ya.
10 For Moses said, ‘Honor your father and your mother;’ and, ‘He who speaks evil of father or mother, let him be put to death.’
Nʼihi na Mosis sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nne maọbụ nna ya ka e gbuo ya.’
11 But you say, ‘If a man tells his father or his mother, “Whatever profit you might have received from me is Corban,”’” that is to say, given to God,
Ma unu na-asị, na ọ bụrụ na mmadụ asị nne ya maọbụ nna ya, ‘Ihe ọbụla bụ nke ị gara erite nʼaka m bụ kọban,’ (nke pụtara onyinye dịrị Chineke).
12 “then you no longer allow him to do anything for his father or his mother,
Nʼụzọ dị otu a, unu na-akwagide ndị mmadụ ka ha hapụ inyere nne na nna ha aka.
13 making void the word of God by your tradition which you have handed down. You do many things like this.”
Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme okwu Chineke ka ọ bụrụ ihe efu, site nʼomenaala unu nke unu nyefere nʼaka ndị ọzọ. Ọ dịkwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị ka nke a unu na-eme.”
14 He called all the multitude to himself and said to them, “Hear me, all of you, and understand.
Ọzọkwa, ọ kpọrọ igwe mmadụ ahụ sị ha, “Geenụ m ntị onye ọbụla, ma ghọtakwanụ nke a.
15 There is nothing from outside of the man that going into him can defile him; but the things which proceed out of the man are those that defile the man.
Ọ dịghị ihe ọbụla banyere nʼime mmadụ pụrụ imerụ mmadụ, kama ihe na-emerụ mmadụ bụ ihe ahụ na-esite nʼime ya na-apụta.”
16 If anyone has ears to hear, let him hear!”
Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.
17 When he had entered into a house away from the multitude, his disciples asked him about the parable.
Mgbe ọ hapụrụ igwe ndị mmadụ ahụ banye nʼime ụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya maka ilu a.
18 He said to them, “Are you also without understanding? Do not you perceive that whatever goes into the man from outside cannot defile him,
Ọ sịrị ha, “Unu ọ ka dị ka ndị na-enweghị nghọta? Ọ bụ unu aghọtaghị na ihe ọbụla banyere nʼime mmadụ apụghị imerụ ya.
19 because it does not go into his heart, but into his stomach, then into the latrine, making all foods clean?”
Nʼihi na ihe dị otu a anaghị abanye nʼobi ha, kama ọ na-abanye nʼime afọ ha, si nʼebe ahụ a nyụpụ ya nʼụlọ nsị.” (Site nʼikwu otu a, o mere ka ihe oriri niile dị ọcha.)
20 He said, “That which proceeds out of the man, that defiles the man.
Ọ sịkwara, “Ọ bụ ihe sitere nʼime mmadụ pụta na-emerụ ya.
21 For from within, out of the hearts of men, proceed evil thoughts, adulteries, sexual sins, murders, thefts,
Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ọjọọ niile si apụta, ya na ịkwa iko niile dị iche iche, izu ohi, igbu mmadụ,
22 covetings, wickedness, deceit, lustful desires, an evil eye, blasphemy, pride, and foolishness.
ịkwa iko nke ndị nwere di na nwunye, ọchịchọ ịdọtara onwe gị ihe ndị ọzọ nwere, ekworo, aghụghọ niile, adịghị ọcha niile, inwe anya ụfụ nʼebe ndị ọzọ nọ, nkwulu niile, nganga na enweghị uche ọbụla.
23 All these evil things come from within and defile the man.”
Ihe ọjọọ ndị a niile na-esite nʼime mmadụ a pụta. Ha bụkwa ihe na-emerụ mmadụ.”
24 From there he arose and went away into the borders of Tyre and Sidon. He entered into a house and did not want anyone to know it, but he could not escape notice.
Ọ hapụrụ ebe ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa. Nʼebe ahụ ọ banyere nʼime otu ụlọ. Ma o nwekwaghị ike izo onwe ya, nʼagbanyeghị na ọ chọghị ka a mata na ọ nọ ebe ahụ.
25 For a woman whose little daughter had an unclean spirit, having heard of him, came and fell down at his feet.
Ngwangwa, otu nwanyị nwere otu nwa nwanyị ntakịrị nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya nụrụ maka ya, ọ bịara daa nʼụkwụ ya.
26 Now the woman was a Greek, a Syrophoenician by race. She begged him that he would cast the demon out of her daughter.
Nwanyị a bụ onye Griik a mụrụ nʼakụkụ Sairo-Fonisia. Ọ rịọrọ ya ka ọ chụpụrụ ya mmụọ ọjọọ ahụ bi nʼime nwa ya nwanyị.
27 But Jesus said to her, “Let the children be filled first, for it is not appropriate to take the children’s bread and throw it to the dogs.”
Ọ sịrị ya, “Hapụ ka ụmụntakịrị buru ụzọ rie ihe, nʼihi na o zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta.”
28 But she answered him, “Yes, Lord. Yet even the dogs under the table eat the children’s crumbs.”
Ma ọ zaghachiri ya sị, “Onyenwe m, ma ụmụ nkịta na-erikwa iberibe nri ụmụntakịrị si na tebul tụpụ nʼala.”
29 He said to her, “For this saying, go your way. The demon has gone out of your daughter.”
Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Nwanyị, ị zara nke ọma, nʼihi ọsịsa gị, laa, mmụọ ọjọọ ahụ ahapụla nwa gị nwanyị ugbu a.”
30 She went away to her house, and found the child having been laid on the bed, with the demon gone out.
Ọ laghachiri nʼụlọ ya, hụ nwantakịrị ahụ ka o dina nʼelu ihe ndina, mmụọ ọjọọ ahụ apụọkwala.
31 Again he departed from the borders of Tyre and Sidon, and came to the sea of Galilee through the middle of the region of Decapolis.
Emesịa, ọ hapụrụ akụkụ Taịa gabiga Saịdọn bịaruo nʼosimiri Galili ruo nʼobodo ndị dị na Dekapọlịs.
32 They brought to him one who was deaf and had an impediment in his speech. They begged him to lay his hand on him.
Ha duteere ya otu nwoke ntị chịrị, nke na-asụkwa oke nsụ. Ha rịọrọ ya ka o bikwasị ya aka.
33 He took him aside from the multitude privately and put his fingers into his ears; and he spat and touched his tongue.
O duuru ya pụọ nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, rụnye ya mkpịsịaka nʼime ntị ya abụọ. Mgbe ahụ ọ gbụpụkwara ọnụ mmiri metụkwa ya aka nʼire.
34 Looking up to heaven, he sighed, and said to him, “Ephphatha!” that is, “Be opened!”
O leliri anya nʼeluigwe sụọ ude sị ya, “Ef fata,” nke pụtara “Meghee!”
35 Immediately his ears were opened, and the impediment of his tongue was released, and he spoke clearly.
Ngwangwa, ntị ya meghere, a tọpụkwara ire ya, ọ malite ikwu okwu nke ọma.
36 He commanded them that they should tell no one, but the more he commanded them, so much the more widely they proclaimed it.
Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla, ma mgbe ọ na-eme nke a ha gara nʼihu na-akọsa ya ebe niile.
37 They were astonished beyond measure, saying, “He has done all things well. He makes even the deaf hear and the mute speak!”
Ọ tụrụ ha nʼanya nke ukwuu, ha kwuo sị, “O meela ihe niile nke ọma. Ọ na-eme ka ọ bụladị ndị ntị chiri nụ ihe, ma mee ka ndị ogbi kwuo okwu.”

< Mark 7 >