< Job 5 >

1 “Call now; is there any who will answer you? To which of the holy ones will you turn?
“Kpọọ oku ma ị chọọ, ma onyekwanụ ga-aza gị? Ole ndị dị nsọ ị ga-agbakwuru?
2 For resentment kills the foolish man, and jealousy kills the simple.
Oke iwe na-egbu onye nzuzu, ekworo na-egbu onye na-enweghị uche.
3 I have seen the foolish taking root, but suddenly I cursed his habitation.
Mụ onwe m ahụla onye nzuzu ka ọ na-agba mgbọrọgwụ, mana mberede, abụrụ ụlọ ya ọnụ.
4 His children are far from safety. They are crushed in the gate. Neither is there any to deliver them,
Ụmụ ya na-anọpụ anya site nʼebe nchebe dị, a na-azọpịa ha nʼọnụ ụzọ ama, ọ dịkwaghị onye na-anapụta ha.
5 whose harvest the hungry eat up, and take it even out of the thorns. The snare gapes for their substance.
Onye agụụ na-agụ na-eripịa ihe o wetara nʼubi; ọ na-ewere ihe ubi ndị a ọ bụladị site nʼetiti ogwu; akụnụba ya ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ga-achụso.
6 For affliction does not come out of the dust, neither does trouble spring out of the ground;
Nʼihi na ọnọdụ ọjọọ adịghị esite nʼala pupụta, ma ọ bụkwanụ nsogbu adịghịkwa esite nʼala walite.
7 but man is born to trouble, as the sparks fly upward.
Kama, a mụrụ mmadụ nye nsogbu, dịka ire ọkụ si esite nʼọkụ a kwanyere na-amali elu.
8 “But as for me, I would seek God. I would commit my cause to God,
“Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke; ya ka m ga-akọsara ihe niile.
9 who does great things that cannot be fathomed, marvelous things without number;
Nʼihi na Chineke na-arụ ọrụ ịtụnanya karịrị nghọta, ọrụ ebube nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.
10 who gives rain on the earth, and sends waters on the fields;
Ọ bụ ya na-enye elu ụwa mmiri ozuzo, ma na-ezigakwa mmiri nʼubi niile.
11 so that he sets up on high those who are low, those who mourn are exalted to safety.
Ọ na-ebuli ndị dị ala elu, na-emekwa ka ndị na-eru ụjụ nọ nʼebe a na-echebe ha.
12 He frustrates the plans of the crafty, so that their hands cannot perform their enterprise.
Ọ na-emebi nzube niile nke ndị aghụghọ, ka aka ha ghara imezu ihe ha zubere.
13 He takes the wise in their own craftiness; the counsel of the cunning is carried headlong.
Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile, mee ka atụmatụ ndị aghụghọ bụrụ ihe e kpochapụrụ.
14 They meet with darkness in the day time, and grope at noonday as in the night.
Ọchịchịrị na-abịakwasị ha nʼoge ehihie, nʼetiti ehihie ha na-asọ ìsì dịka ndị nọ nʼọchịchịrị nke abalị;
15 But he saves from the sword of their mouth, even the needy from the hand of the mighty.
Ọ na-azọpụta ndị mkpa na-akpa, site na mma agha dị ha nʼọnụ, ọ na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị dị ike.
16 So the poor has hope, and injustice shuts her mouth.
Ya mere, ndị ogbenye na-enwe olileanya, ikpe ezighị ezi na-emechikwa ọnụ ya.
17 “Behold, happy is the man whom God corrects. Therefore do not despise the chastening of the Almighty.
“Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ Chineke na-adọ aka na ntị; ya mere, ajụla ịdọ aka na ntị nke Onye pụrụ ime ihe niile.
18 For he wounds and binds up. He injures and his hands make whole.
Nʼihi na ọ na-etihịa mmadụ ahụ ma na-ekechikwa ọnya ha; Ọ na-eti mmadụ ihe, ma aka ya na-agwọkwa.
19 He will deliver you in six troubles; yes, in seven no evil will touch you.
Ọ ga-anapụta gị site nʼụzọ nsogbu isii, mee ka ihe ọjọọ hapụ irute gị na nsogbu nke asaa.
20 In famine he will redeem you from death; in war, from the power of the sword.
Ọ ga-echebe gị ka ị hapụ ịnwụ nʼoge ụnwụ; chebekwa gị ka mma agha hapụ ịmetụ gị nʼoge agha.
21 You will be hidden from the scourge of the tongue, neither will you be afraid of destruction when it comes.
Ị ga-abụ onye a na-echebe site na nkwutọ nke ire ndị ga-ekwutọ gị. Ị gaghị atụkwa egwu mgbe mbibi bịara.
22 You will laugh at destruction and famine, neither will you be afraid of the animals of the earth.
Ị ga-achị ọchị nʼoge ụnwụ na nʼoge mbibi, ị gaghị atụkwa egwu ajọ anụ ọhịa dị iche iche.
23 For you will be allied with the stones of the field. The animals of the field will be at peace with you.
Nʼihi na gị na nkume niile dị nʼọhịa ga-agba ndụ, gị na anụ ọhịa ga-anọkwa nʼudo.
24 You will know that your tent is in peace. You will visit your fold, and will miss nothing.
Ị ga-amata na ụlọ ikwu gị dị nʼudo; ị ga-agụkọ ihe niile i nwere chọpụta na o nweghị nke na-efu efu.
25 You will know also that your offspring will be great, your offspring as the grass of the earth.
Ị ga-amata na ụmụ gị ga-adị ọtụtụ, matakwa na ụmụ ụmụ gị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka ahịhịa dị nʼala.
26 You will come to your grave in a full age, like a shock of grain comes in its season.
Ị ga-aba nʼili gị mgbe i mere nnọọ ezigbo agadi, dịka ọka a ghọrọ mgbe oge ya ruru.
27 Behold, we have researched it. It is so. Hear it, and know it for your good.”
“Anyị enyochaala ihe a, hụ na ọ bụ eziokwu. Ya mere nụrụ ya, ma jiri ya rụọ ọrụ na ndụ gị.”

< Job 5 >