< Acts 14 >

1 In Iconium, they entered together into the synagogue of the Jews, and so spoke that a great multitude both of Jews and of Greeks believed.
Nʼobodo Aikoniọm, Pọl na Banabas banyekwara nʼụlọ nzukọ ndị Juu, kwuo okwu nʼụzọ pụrụ iche nke mere nʼọtụtụ mmadụ, ndị Juu na ndị mba ọzọ kwenyekwara.
2 But the disbelieving Jews stirred up and embittered the souls of the Gentiles against the brothers.
Ndị Juu, ndị na-anabataghị okwu ahụ, kpaliri ndị mba ọzọ mee ka mkpụrụobi ha jọọ njọ megide ụmụnna.
3 Therefore they stayed there a long time, speaking boldly in the Lord, who testified to the word of his grace, granting signs and wonders to be done by their hands.
Otu ọ dị, ha nọgidere nʼebe ahụ ogologo oge, na-ekwusakwa okwu nke Onyenwe anyị na-atụghị egwu ọbụla. Onye nke gosikwara na ọ bụ okwu amara ya ka ha na-ekwu site nʼinye ha ike ịrụ ọrụ ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche.
4 But the multitude of the city was divided. Part sided with the Jews and part with the apostles.
Ma ndị obodo ahụ kewara abụọ, ụfọdụ nʼime ha dịnyere ndị Juu. Ụfọdụ dịnyekwara ndị ozi.
5 When some of both the Gentiles and the Jews, with their rulers, made a violent attempt to mistreat and stone them,
Mgbe ndị mba ọzọ, na ndị Juu, ha na ndị ndu ha, gbara izu ime ha ihe ihere, tụọkwa ha nkume.
6 they became aware of it and fled to the cities of Lycaonia, Lystra, Derbe, and the surrounding region.
Ndị ozi ahụ matara nzube ha site nʼebe ahụ gbapụ ọsọ gbaruo nʼakụkụ Laikonia, gbaba nʼime obodo Listra na Debi na obodo nta ndị ọzọ ndị dị nʼakụkụ ebe ahụ.
7 There they preached the Good News.
Nʼebe ahụ, ha gara nʼihu na-ekwusakwa oziọma ahụ.
8 At Lystra a certain man sat, impotent in his feet, a cripple from his mother’s womb, who never had walked.
Nʼobodo Listra, o nwere otu nwoke dara ngwụrọ site nʼoge a mụrụ ya. Nwoke a ejibeghị ụkwụ ya abụọ gaa ije mgbe ọbụla.
9 He was listening to Paul speaking, who, fastening eyes on him and seeing that he had faith to be made whole,
O gere ntị mgbe Pọl na-ekwu okwu. Onye legidere ya anya hụ na ọ nwere okwukwe nke a ga-eji mee ka a gwọọ ya,
10 said with a loud voice, “Stand upright on your feet!” He leaped up and walked.
were oke olu sị, “Guzoro nʼụkwụ gị abụọ.” Nwoke ahụ wuliri elu malite ịga ije.
11 When the multitude saw what Paul had done, they lifted up their voice, saying in the language of Lycaonia, “The gods have come down to us in the likeness of men!”
Mgbe igwe mmadụ ahụ hụrụ ihe Pọl mere, ha tiri mkpu nʼasụsụ Laikonia sị, “Ndị a bụ chi bịakwutere anyị nʼụdịdị mmadụ.”
12 They called Barnabas “Jupiter”, and Paul “Mercury”, because he was the chief speaker.
Banabas ka ha kpọrọ Zeus ma kpọkwa Pọl Hamis nʼihi na ọ bụ ya bụ onye ọka okwu.
13 The priest of Jupiter, whose temple was in front of their city, brought oxen and garlands to the gates, and would have made a sacrifice along with the multitudes.
Onye nchụaja Zeus, nke ụlọ arụsị ya dị nso nʼihu obodo, kpụtara oke ehi wetakwa okoko osisi dị iche iche. Ya na igwe mmadụ ahụ chọrọ ịchụ aja nye ha nʼọnụ ụzọ ama ha.
14 But when the apostles, Barnabas and Paul, heard of it, they tore their clothes and sprang into the multitude, crying out,
Mgbe ndị ozi ahụ, Banabas na Pọl nụrụ ihe ndị a, ha dọwara uwe ha, gbara ọsọ jekwuru igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu,
15 “Men, why are you doing these things? We also are men of the same nature as you, and bring you good news, that you should turn from these vain things to the living God, who made the sky, the earth, the sea, and all that is in them;
na-asị, “Ndị ikom, gịnị ka unu na-achọ ime? Lee, anyị bụkwa mmadụ dị ka unu. Ọ bụ oziọma ka anyị wetaara unu. Anyị chọrọ ka unu site nʼịsọpụrụ ihe ndị a na-abaghị uru, bịakwute Chineke dị ndụ. Onye kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri na ihe niile dị nʼime ha.
16 who in the generations gone by allowed all the nations to walk in their own ways.
Nʼoge gara aga, ọ hapụrụ mba niile ka ha na-eme ihe masịrị ha.
17 Yet he did not leave himself without witness, in that he did good and gave you rains from the sky and fruitful seasons, filling our hearts with food and gladness.”
Nʼagbanyeghị nke a ọ hapụghị ị debere onwe ya ihe ndị ga-agbara ya akaebe, site nʼọrụ ọma ya niile. Dị ka inye unu mmiri ozuzo site nʼeluigwe, na mkpụrụ nke ala nʼoge ha. Ọ na-enyekwa unu nri na-emekwa ka obi na-atọ unu ụtọ.”
18 Even saying these things, they hardly stopped the multitudes from making a sacrifice to them.
Nʼagbanyeghị okwu ndị a, ọ rara ha ahụ igbochi igwe mmadụ ahụ ịchụrụ ha aja.
19 But some Jews from Antioch and Iconium came there, and having persuaded the multitudes, they stoned Paul and dragged him out of the city, supposing that he was dead.
Ma ndị Juu sitere nʼAntiọk na Aikoniọm bịara kpalie obi igwe mmadụ ahụ. Nʼihi ya, ha tụrụ Pọl nkume, dọkpụrụ ya pụọ nʼobodo, chee na ọ nwụọla.
20 But as the disciples stood around him, he rose up, and entered into the city. On the next day he went out with Barnabas to Derbe.
Ma mgbe ndị na-eso ụzọ bịara gbaa ya gburugburu, o bilitere, laghachikwa nʼime obodo ahụ. Ma nʼechi ya, ya na Banabas sooro gaa Debi.
21 When they had preached the Good News to that city and had made many disciples, they returned to Lystra, Iconium, and Antioch,
Ha zisasịrị oziọma nʼime obodo ahụ, nke mere ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ha lọghachiri nʼobodo Listra site ya gaa Aikoniọm na Antiọk.
22 strengthening the souls of the disciples, exhorting them to continue in the faith, and that through many afflictions we must enter into God’s Kingdom.
Nʼebe ahụ ha gbara ndị na-eso ụzọ ume kasịekwa ha obi sị ha jidesie okwukwe ahụ ike. Ha sịrị, “Anyị ga-agabiga ọtụtụ mkpagbu dị iche iche tupu anyị abaa nʼalaeze Chineke.”
23 When they had appointed elders for them in every assembly, and had prayed with fasting, they commended them to the Lord on whom they had believed.
Mgbe ha họpụtachara ndị okenye nʼime nzukọ niile. Ha sitere nʼobubu ọnụ na ekpere tinye ha nʼaka Onyenwe anyị, bụ onye ha kwenyere na ya.
24 They passed through Pisidia and came to Pamphylia.
Ha sitere nʼakụkụ Pisidia garuo Pamfilia.
25 When they had spoken the word in Perga, they went down to Attalia.
Mgbe ha zisachara oziọma nʼobodo Pega, ha gbadara gaa Atalia.
26 From there they sailed to Antioch, from where they had been committed to the grace of God for the work which they had fulfilled.
Site nʼebe ahụ, ha sooro ụgbọ mmiri jeruo Antiọk bụ ebe a nọ nyefee ha nʼamara Chineke nʼihi ọrụ ndị a ha rụzuru.
27 When they had arrived and had gathered the assembly together, they reported all the things that God had done with them, and that he had opened a door of faith to the nations.
Mgbe ha bịaruru, ha kpọkọtara nzukọ kọwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee, na otu o siri meghe ọnụ ụzọ nke okwukwe nye ndị mba ọzọ.
28 They stayed there with the disciples for a long time.
Ha na ndị na-eso ụzọ nọgidere nʼebe ahụ ruo oge dị anya.

< Acts 14 >