< 1 Samuel 30 >

1 When David and his men had come to Ziklag on the third day, the Amalekites had made a raid on the South and on Ziklag, and had struck Ziklag and burned it with fire,
Mgbe Devid na ndị ikom ya rutere obodo Ziklag nʼụbọchị nke atọ, ha hụrụ na ndị Amalek abịala wakporo bi nʼakụkụ ndịda Negev na Ziklag. Ha buru agha megide Ziklag, gbaa obodo ahụ ọkụ,
2 and had taken captive the women and all who were in it, both small and great. They did not kill any, but carried them off and went their way.
dọtakwa ndị inyom na ndị niile bi nʼime ya nʼagha, ma okenye ma ụmụntakịrị. Ha egbughị ha egbu, kama ha buuru ha laa.
3 When David and his men came to the city, behold, it was burned with fire; and their wives, their sons, and their daughters were taken captive.
Mgbe Devid na ndị ikom ya ruru Ziklag, ha hụrụ na-esuola ya ọkụ, dọkpụrụ ndị inyom ha, na ụmụ ndị ikom na ndị inyom nʼagha.
4 Then David and the people who were with him lifted up their voice and wept until they had no more power to weep.
Ya mere, Devid na ndị ikom ya kwara akwa ruo mgbe ike akwa gwụrụ ha.
5 David’s two wives were taken captive, Ahinoam the Jezreelitess, and Abigail the wife of Nabal the Carmelite.
Ndị inyom abụọ Devid, Ahinoam onye Jezril na Abigel, nwunye ochie Nebal onye Kamel, sokwa na ndị a dọtara nʼagha ahụ.
6 David was greatly distressed, for the people spoke of stoning him, because the souls of all the people were grieved, every man for his sons and for his daughters; but David strengthened himself in the LORD his God.
Ihe a wetaara Devid oke nsogbu, nʼihi na ndị ikom ya nọ na-ekwu okwu iji nkume tugbuo ya; ha niile nọ nʼobi ilu nʼihi ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Ma Devid chọtara ike nʼime Onyenwe anyị Chineke ya.
7 David said to Abiathar the priest, the son of Ahimelech, “Please bring the ephod here to me.” Abiathar brought the ephod to David.
Devid sịrị Abịata, bụ onye nchụaja, nwa Ahimelek, “Chịtara m efọọd ahụ.” Ya mere, Abịata chịtara ya nye ya
8 David inquired of the LORD, saying, “If I pursue after this troop, will I overtake them?” He answered him, “Pursue, for you will surely overtake them, and will without fail recover all.”
Mgbe ahụ, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m chụso ndị a na-apụnara ndị mmadụ ihe? Ọ bụrụ na m achụso ha, aga m ejide ha?” Onyenwe anyị zara, “E, chụso ha ọsọ, ị ga-achụkwute ha, ma nataghachikwa ihe niile ha were.”
9 So David went, he and the six hundred men who were with him, and came to the brook Besor, where those who were left behind stayed.
Mgbe ahụ, Devid na narị ndị agha isii ya bịarutere nʼọdọ mmiri Beso, ebe ha hapụrụ ụfọdụ ndị
10 But David pursued, he and four hundred men; for two hundred stayed behind, who were so faint that they could not go over the brook Besor.
narị ndị ikom abụọ nʼime ha enwekwaghị ike ịgafe ndagwurugwu Beso nʼihi ike ọgwụgwụ, ma Devid na narị anọ ndị ọzọ chụsoro ha.
11 They found an Egyptian in the field, and brought him to David, and gave him bread, and he ate; and they gave him water to drink.
Ha hụrụ otu nwokorobịa onye Ijipt nʼọhịa, duuru ya bịakwute Devid. Ha nyere ya mmiri ka ọ ṅụọ, nyekwa ya nri ka o rie.
12 They gave him a piece of a cake of figs and two clusters of raisins. When he had eaten, his spirit came again to him; for he had eaten no bread, and drank no water for three days and three nights.
Ihe ha nyere ya bụ achịcha fiig, na ụyọkọ mkpụrụ vaịnị abụọ nke a mịkpọrọ amịkpọ. Mgbe o richara ha, o nweghachiri onwe ya, nʼihi na o ribeghị nri ọbụla, maọbụ ṅụọ mmiri ọbụla ụbọchị atọ, ehihie na nʼabalị.
13 David asked him, “To whom do you belong? Where are you from?” He said, “I am a young man of Egypt, servant to an Amalekite; and my master left me, because three days ago I got sick.
Mgbe ahụ, Devid jụrụ ya sị, “Ị bụ onye? Ebeekwa ka i si bịa?” Ọ zara Devid sị, “Abụ m onye Ijipt, bụrụkwa ohu onye Amalek. Onyenwe m hapụrụ m nʼebe a abalị atọ gara aga nʼihi na ahụ adịghị m ike.
14 We made a raid on the South of the Cherethites, and on that which belongs to Judah, and on the South of Caleb; and we burned Ziklag with fire.”
Anyị si obodo ebe anyị gara lụọ agha na-alọghachi mgbe ha hapụrụ m nʼebe a. Anyị gara lụgbuo obodo ndị Keret, nke dị nʼime Negeb, na obodo dị na ndịda ala Juda na ala Kaleb. Anyị gbakwara obodo Ziklag ọkụ.”
15 David said to him, “Will you bring me down to this troop?” He said, “Swear to me by God that you will not kill me and not deliver me up into the hands of my master, and I will bring you down to this troop.”
Devid jụrụ ya sị, “I nwere ike duru m gaa ebe ha nọ.” Nwokorobịa ahụ zara ya sị, “Ọ bụrụ na ị ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke na ị gaghị egbu m maọbụ were m nyeghachi onyenwe m, aga m eduru gị gaa ebe ha nọ.”
16 When he had brought him down, behold, they were spread around over all the ground, eating, drinking, and dancing, because of all the great plunder that they had taken out of the land of the Philistines, and out of the land of Judah.
O duuru ha jee nʼebe ndị Amalek nọ. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha hụrụ ha ebe ha tụsara onwe ha nʼala na-eri na-aṅụ, na-etekwa egwu ọṅụ, nʼihi ihe dị ukwuu ha kwatara nʼagha site nʼala ndị Filistia, na nʼala Juda.
17 David struck them from the twilight even to the evening of the next day. Not a man of them escaped from there, except four hundred young men who rode on camels and fled.
Devid na ndị agha ya bịakwasịrị ha na mberede gbuo ha site nʼabalị ahụ ruo anyasị echi ya. Ọ dịkwaghị otu nwoke nʼime ha fọdụrụ ndụ ma ọ bụghị narị ndị ikom anọ makwasịrị nʼelu ịnyịnya kamel ha gbalaga.
18 David recovered all that the Amalekites had taken, and David rescued his two wives.
Devid nwetaghachiri ihe niile ndị Amalek kwatara nʼagha, tinyere ndị inyom ya abụọ.
19 There was nothing lacking to them, neither small nor great, neither sons nor daughters, neither plunder, nor anything that they had taken. David brought them all back.
O nweghị ihe furu efu, ma nke ukwu ma nke nta, ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, ihe a kwatara nʼagha, maọbụ ihe ọbụla ọzọ ndị Amalek dọtara nʼagha. Devid nwetaghachiri ihe niile.
20 David took all the flocks and the herds, which they drove before those other livestock, and said, “This is David’s plunder.”
Ọzọkwa, Devid chịkọtara igwe ehi na igwe ewu na atụrụ. Ndị ikom ya chịịrị ha, tinyere anụ ụlọ ndị ọzọ, na-aga, na-asị, “Ndị a bụ ihe Devid kwatara nʼagha.”
21 David came to the two hundred men, who were so faint that they could not follow David, whom also they had made to stay at the brook Besor; and they went out to meet David, and to meet the people who were with him. When David came near to the people, he greeted them.
Emesịa, Devid bịarutere ebe narị ndị ikom abụọ ndị ahụ nọ na Ndagwurugwu Beso. Ndị a bụ ndị ahụ na-enweghị ike iso Devid nʼihi na ike gwụrụ ha. Ha pụtara zute Devid na ndị so ya. Mgbe Devid na ndị ikom ya bịara ha nso, ọ jụrụ ha otu ha mere.
22 Then all the wicked men and worthless fellows of those who went with David answered and said, “Because they did not go with us, we will not give them anything of the plunder that we have recovered, except to every man his wife and his children, that he may lead them away and depart.”
Ma ndị ikom ọjọọ ahụ niile, na ndị okwu na ụka nọ nʼetiti ndị na-eso Devid sịrị, “Nʼihi na ndị a esoghị anyị jee, ya mere ha agaghị eso anyị keta ihe ndị a anyị kwatara nʼagha. Nyeghachi ha naanị nwunye ha na ụmụ ha; gwakwa ha ka ha laa.”
23 Then David said, “Do not do so, my brothers, with that which the LORD has given to us, who has preserved us, and delivered the troop that came against us into our hand.
Ma Devid sịrị, “Mba, ụmụnna m, unu ekwesighị isi otu a kee ihe ndị ahụ Onyenwe anyị nyere anyị. O chebere anyị, nyefee nʼaka anyị ndị agha ahụ niile bịara imegide anyị.
24 Who will listen to you in this matter? For as his share is who goes down to the battle, so shall his share be who stays with the baggage. They shall share alike.”
Unu chere na ọ dị onye ga-ege unu ntị mgbe unu na-ekwu okwu dị otu a? Anyị niile ga-eketa oke; oke ndị jere agha na ndị chebere ihe anyị ga-abụ otu.”
25 It was so from that day forward that he made it a statute and an ordinance for Israel to this day.
Site nʼụbọchị ahụ, Devid mere ka nke a bụrụ iwu nye ndị Izrel niile ruo taa.
26 When David came to Ziklag, he sent some of the plunder to the elders of Judah, even to his friends, saying, “Behold, a present for you from the plunder of the LORD’s enemies.”
Mgbe ha rutere Ziklag, Devid weere ụfọdụ ihe ha kwatara nʼagha zigara ndị okenye Juda, ndị bụ ndị enyi ya, na-asị, “Lee onyinye ewetaara unu site nʼụfọdụ nʼime ihe anyị kwatara site nʼaka ndị iro Onyenwe anyị.”
27 He sent it to those who were in Bethel, to those who were in Ramoth of the South, to those who were in Jattir,
O zigara ha nye ndị bi na Betel, Ramọt Negev na Jatịa,
28 to those who were in Aroer, to those who were in Siphmoth, to those who were in Eshtemoa,
nyekwa ndị nọ Aroea, Sifmot, Eshtemoa
29 to those who were in Racal, to those who were in the cities of the Jerahmeelites, to those who were in the cities of the Kenites,
na Rakal, nyekwa ndị bi nʼobodo ndị Jerameel na nke ndị Ken,
30 to those who were in Hormah, to those who were in Borashan, to those who were in Athach,
nyekwa ndị bi na Homa, Bo Ashan, Atak
31 to those who were in Hebron, and to all the places where David himself and his men used to stay.
na Hebrọn na ndị nọ nʼebe niile ndị ahụ ebe Devid na ndị ya wagharịrị.

< 1 Samuel 30 >