< ⳘⲀⲦⲐⲈⲞⲚ 25 >

1 ⲁ̅ ⲧⲟⲧⲉ ⲥⲛⲁϣⲱⲡⲉ ⲉⲥⲧⲛⲧⲱⲛ ⲛϭⲓ ⲧⲙⲛⲧⲣⲣⲟ ⲛⲙⲡⲏⲩⲉ ⲉⲙⲏⲧⲉ ⲙⲡⲁⲣⲑⲉⲛⲟⲥ ⲛⲁⲓ ⲛⲧⲁⲩϫⲓ ⲛⲛⲉⲩⲗⲁⲙⲡⲁⲥ ⲁⲩⲉⲓ ⲉⲃⲟⲗ ⲉⲧⲱⲙⲛⲧ ⲉⲡⲁⲧϣⲉⲗⲉⲉⲧ
“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere oriọna ha pụta izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ.
2 ⲃ̅ ϯ ⲇⲉ ⲉⲃⲟⲗ ⲛϩⲏⲧⲟⲩ ⲛⲛⲉϩⲉⲛⲥⲟϭ ⲛⲉ ⲁⲩⲱ ϯⲛⲛⲉ ϩⲉⲛⲥⲁⲃⲉ ⲛⲉ
Ise nʼime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu.
3 ⲅ̅ ⲛⲥⲟϭ ⲅⲁⲣ ⲁⲩϫⲓ ⲛⲛⲉⲩⲗⲁⲙⲡⲁⲥ ⲙⲡⲟⲩϫⲓⲛⲉϩ ⲛⲙⲙⲁⲩ
Ise ndị nzuzu ahụ weere oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ.
4 ⲇ̅ ⲛⲥⲁⲃⲏ ⲇⲉ ⲁⲩϫⲓⲛⲉϩ ϩⲛ ⲛⲉⲩϩⲛⲁⲁⲩ ⲙⲛ ⲛⲉⲩⲗⲁⲙⲡⲁⲥ
Ise ndị maara ihe, wụjuru mmanụ ọkụ na karama, tinyekwa oriọna ha.
5 ⲉ̅ ⲛⲧⲉⲣⲉϥⲱⲥⲕ ⲇⲉ ⲛϭⲓ ⲡⲁⲧϣⲉⲗⲉⲉⲧ ⲁⲩϫⲓ ⲣⲉⲕⲣⲓⲕⲉ ⲧⲏⲣⲟⲩ ⲁⲩⲱ ⲁⲩⲛⲕⲟⲧⲕ
Mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ ahụ nọrọ ọdụ nʼọbịbịa ya, ụra tụwara ha, ha dinara ala rahụ ụra.
6 ⲋ̅ ϩⲛ ⲧⲡⲁϣⲉ ⲇⲉ ⲛⲧⲉⲩϣⲏ ⲉⲓⲥ ⲟⲩⲥⲙⲏ ⲁⲥϣⲱⲡⲉ ϫⲉ ⲉⲓⲥ ⲡⲁⲧϣⲉⲗⲉⲉⲧ ⲁⲙⲏⲓⲧⲛ ⲉⲃⲟⲗ ⲉⲧⲱⲙⲛⲧ ⲉⲣⲟϥ
“Nʼetiti abalị e tiri mkpu nʼoke olu sị, ‘Onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!’
7 ⲍ̅ ⲧⲟⲧⲉ ⲁⲩⲧⲱⲟⲩⲛⲟⲩ ⲛϭⲓ ⲙⲡⲁⲣⲑⲉⲛⲟⲥ ⲧⲏⲣⲟⲩ ⲉⲧⲙⲙⲁⲩ ⲁⲩⲧⲥⲁⲛⲟ ⲛⲛⲉⲩⲗⲁⲙⲡⲁⲥ
“Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ niile ahụbiliri mụnye oriọna ha.
8 ⲏ̅ ⲛⲥⲟϭ ⲇⲉ ⲡⲉϫⲁⲩ ⲛⲛⲥⲁⲃⲏ ϫⲉ ⲙⲁ ⲛⲁⲛ ⲉⲃⲟⲗ ϩⲙ ⲡⲉⲧⲛⲛⲉϩ ϫⲉ ⲛⲉⲛⲗⲁⲙⲡⲁⲥ ⲛⲁϫⲉⲛⲁ
Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, ‘Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nʼime mmanụ ọkụ unu, lee na oriọna anyị na-anyụ anyụ.’
9 ⲑ̅ ⲁⲩⲟⲩⲱϣⲃ ⲇⲉ ⲛϭⲓ ⲛⲥⲁⲃⲏ ⲉⲩϫⲱ ⲙⲙⲟⲥ ϫⲉ ⲙⲏⲡⲟⲧⲉ ⲛϥⲧⲙⲣⲱϣⲉ ⲉⲣⲟⲛ ⲛⲙⲙⲏⲧⲛ ⲃⲱⲕ ⲛⲧⲟϥ ⲛⲛⲁϩⲣⲛ ⲛⲉⲧϯ ⲉⲃⲟⲗ ⲛⲧⲉⲧⲛϣⲱⲡ ⲛⲏⲧⲛ
“Ndị maara ihe zara ha sị, ‘Mba! Ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ zuru nke unu nʼaka ndị na-ere ya.’
10 ⲓ̅ ⲉⲩⲛⲁⲃⲱⲕ ⲇⲉ ⲉϣⲱⲡ ⲁϥⲉⲓ ⲛϭⲓ ⲡⲁⲧϣⲉⲗⲉⲉⲧ ⲁⲩⲱ ⲛⲉⲧⲥⲃⲧⲱⲧ ⲁⲩⲃⲱⲕ ⲉϩⲟⲩⲛ ⲛⲙⲙⲁϥ ⲉⲡⲙⲁ ⲛϣⲉⲗⲉⲉⲧ ⲁⲩϣⲧⲁⲙ ⲙⲡⲣⲟ
“Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ.
11 ⲓ̅ⲁ̅ ⲙⲛⲛⲥⲱⲥ ⲇⲉ ⲁⲩⲉⲓ ⲛϭⲓ ⲡⲕⲉⲥⲉⲉⲡⲉ ⲙⲡⲁⲣⲑⲉⲛⲟⲥ ⲉⲩϫⲱ ⲙⲙⲟⲥ ϫⲉ ⲡϫⲟⲉⲓⲥ ⲁⲟⲩⲱⲛ ⲛⲁⲛ
“Emesịa, ise ndị nzuzu ahụlọghachiri na-ekwu sị, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, meghere anyị ụzọ!’
12 ⲓ̅ⲃ̅ ⲛⲧⲟϥ ⲇⲉ ⲁϥⲟⲩⲱϣⲃ ⲉϥϫⲱ ⲙⲙⲟⲥ ϫⲉ ϩⲁⲙⲏⲛ ϯϫⲱ ⲙⲙⲟⲥ ⲛⲏⲧⲛ ϫⲉ ⲛϯⲥⲟⲟⲩⲛ ⲙⲙⲱⲧⲛ ⲁⲛ
“Ma ọ zaghachiri ha sị, ‘Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, amaghị m ndị unu bụ.’
13 ⲓ̅ⲅ̅ ⲣⲟⲉⲓⲥ ϭⲉ ϫⲉ ⲛⲧⲉⲧⲛⲥⲟⲟⲩⲛ ⲁⲛ ⲙⲡⲉϩⲟⲟⲩ ⲟⲩⲧⲉ ⲧⲉⲩⲛⲟⲩ
“Ya mere, na-anọgidenụ na nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ.
14 ⲓ̅ⲇ̅ ⲛⲑⲉ ⲅⲁⲣ ⲛⲟⲩⲣⲱⲙⲉ ⲉϥⲛⲁⲁⲡⲟⲇⲏⲙⲉⲓ ⲁϥⲙⲟⲩⲧⲉ ⲉⲛⲉϥϩⲙϩⲁⲗ ⲁϥϯ ⲛⲁⲩ ⲛⲛⲉϥϩⲩⲡⲁⲣⲭⲟⲛⲧⲁ ⲧⲏⲣⲟⲩ
“Ọzọ, ọ ga-adị ka otu nwoke chọrọ ịga njem. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya niile nyefee ha akụnụba ya nʼaka.
15 ⲓ̅ⲉ̅ ⲟⲩⲁ ⲙⲉⲛ ⲁϥϯ ⲛⲁϥ ⲛϯⲟⲩ ⲛϭⲓ ⲛϭⲱⲣ ⲟⲩⲁ ⲇⲉ ⲁϥϯ ⲛⲁϥ ⲛⲥⲛⲁⲩ ⲟⲩⲁ ⲇⲉ ⲁϥϯ ⲛⲁϥ ⲛⲟⲩⲁ ⲡⲟⲩⲁ ⲡⲟⲩⲁ ⲕⲁⲧⲁⲧⲉϥϭⲟⲙ ⲁϥⲁⲡⲟⲇⲏⲙⲉⲓ
O nyere onye nke mbụ talenti ise, nke abụọ ka o nyere talenti abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu talenti. O nyere ha nʼotu nʼotu dị ka ike ha ha. Mgbe ahụ ọ hapụrụ ha gaa ije ya.
16 ⲓ̅ⲋ̅ ⲛⲧⲉⲩⲛⲟⲩ ⲇⲉ ⲁϥⲃⲱⲕ ⲛϭⲓ ⲡⲉⲛⲧⲁϥϫⲓ ⲙⲡϯⲟⲩ ⲛϭⲓ ⲛϭⲱⲣ ⲁϥⲣϩⲱⲃ ⲛϩⲏⲧⲟⲩ ⲁϥϯϩⲏⲩ ⲛⲕⲉϯⲟⲩ
Onye ahụ natara talenti ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o retara talenti ise ọzọ nʼuru.
17 ⲓ̅ⲍ̅ ϩⲟⲙⲟⲓⲱⲥ ⲡⲁⲡⲉⲥⲛⲁⲩ ⲁϥϯϩⲏⲩ ⲛⲕⲉⲥⲛⲁⲩ
Otu a kwa, onye nke e nyere talenti abụọ zụpụtakwara talenti abụọ ọzọ nʼuru.
18 ⲓ̅ⲏ̅ ⲡⲉⲛⲧⲁϥϫⲓ ⲇⲉ ⲙⲡⲟⲩⲁ ⲁϥⲃⲱⲕ ⲁϥϣⲓⲕⲉ ϩⲙ ⲡⲕⲁϩ ⲁϥⲧⲱⲙⲥ ⲙⲡϩⲁⲧ ⲙⲡⲉϥϫⲟⲉⲓⲥ
Ma onye ahụ natara otu talenti gara gwuo ala lie ego nna ya ukwu, nʼihi ichezi ya nke ọma.
19 ⲓ̅ⲑ̅ ⲙⲛⲛⲥⲁ ⲟⲩⲛⲟϭ ⲇⲉ ⲛⲟⲩⲟⲉⲓϣ ⲁϥⲉⲓ ⲛϭⲓ ⲡϫⲟⲉⲓⲥ ⲛⲛϩⲙϩⲁⲗ ⲉⲧⲙⲙⲁⲩ ⲁϥϥⲓⲱⲡ ⲛⲙⲙⲁⲩ
“Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu ndị ohu ahụ lọtara site nʼije ya. Ọ kpọkọtara ha niile ka ha gụzie akụ ya.
20 ⲕ̅ ⲁϥϯ ⲡⲉϥⲟⲩⲟⲓ ⲉⲣⲟϥ ⲛϭⲓ ⲡⲉⲛⲧⲁϥϫⲓ ⲙⲡϯⲟⲩ ⲛϭⲓ ⲛϭⲱⲣ ⲁϥⲉⲓⲛⲉ ⲛⲁϥ ⲛⲕⲉϯⲟⲩ ⲛϭⲓⲛϭⲱⲣ ⲉϥϫⲱ ⲙⲙⲟⲥ ϫⲉ ⲡϫⲟⲉⲓⲥ ϯⲟⲩ ⲛϭⲓ ⲛϭⲱⲣ ⲛⲉⲛⲧⲁⲕⲧⲁⲁⲩ ⲛⲁⲓ ⲉⲓⲥ ϩⲏⲏⲧⲉ ⲁⲓϫⲡⲟ ⲛⲕⲉϯⲟⲩ
Onye ahụ natara talenti ise batara wetakwa ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘Ị nyere m talenti ise, ma ugbu a azụpụtala m talenti ise ọzọ!’
21 ⲕ̅ⲁ̅ ⲡⲉϫⲁϥ ⲛⲁϥ ⲛϭⲓ ⲡⲉϥϫⲟⲉⲓⲥ ϫⲉ ⲕⲁⲗⲱⲥ ⲡϩⲙϩⲁⲗ ⲉⲧⲛⲁⲛⲟⲩϥ ⲁⲩⲱ ⲙⲡⲓⲥⲧⲓⲥ ⲉⲡⲉⲓⲇⲏ ⲛⲉⲕⲛϩⲟⲧ ⲛϩⲛⲕⲟⲩⲓ ϯⲛⲁⲕⲁⲑⲓⲥⲧⲁ ⲙⲙⲟⲕ ⲉϫⲛ ϩⲁϩ ⲃⲱⲕ ⲉϩⲟⲩⲛ ⲉⲡⲣⲁϣⲉ ⲙⲡⲉⲕϫⲟⲉⲓⲥ
“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’
22 ⲕ̅ⲃ̅ ⲁϥϯ ⲡⲉϥⲟⲩⲟⲓ ⲉⲣⲟϥ ⲛϭⲓ ⲡⲁⲡϭⲓⲛϭⲱⲣ ⲥⲛⲁⲩ ⲉϥϫⲱ ⲙⲙⲟⲥ ϫⲉ ⲡϫⲟⲉⲓⲥ ϭⲓⲛϭⲱⲣ ⲥⲛⲁⲩ ⲛⲉⲛⲧⲁⲕⲧⲁⲁⲩ ⲛⲁⲓ ⲉⲓⲥ ϩⲏⲏⲧⲉ ⲁⲓϯϩⲏⲩ ⲛⲕⲉⲥⲛⲁⲩ
“Onye nke e nyere talenti abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m talenti abụọ, ma lee, eritala m talenti abụọ ọzọ nʼuru.’
23 ⲕ̅ⲅ̅ ⲡⲉϫⲁϥ ⲛⲁϥ ⲛϭⲓ ⲡⲉϥϫⲟⲉⲓⲥ ϫⲉ ⲕⲁⲗⲱⲥ ⲡϩⲙϩⲁⲗ ⲉⲧⲛⲁⲛⲟⲩϥ ⲁⲩⲱ ⲙⲡⲓⲥⲧⲟⲥ ⲉⲡⲉⲓⲇⲏ ⲛⲉⲕⲛϩⲟⲧ ⲛϩⲛⲕⲟⲩⲓ ϯⲛⲁⲕⲁⲑⲓⲥⲧⲁ ⲙⲙⲟⲕ ⲉϫⲛ ϩⲁϩ ⲃⲱⲕ ⲉϩⲟⲩⲛ ⲉⲡⲣⲁϣⲉ ⲙⲡⲉⲕϫⲟⲉⲓⲥ
“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’
24 ⲕ̅ⲇ̅ ⲁϥϯ ⲙⲡⲉϥⲟⲩⲟⲓ ϩⲱⲱϥ ⲛϭⲓ ⲡⲉⲛⲧⲁϥϫⲓ ⲙⲡϭⲓⲛϭⲱⲣ ⲉϥϫⲱ ⲙⲙⲟⲥ ϫⲉ ⲡϫⲟⲉⲓⲥ ⲁⲓⲉⲓⲙⲉ ϫⲉ ⲛⲧⲕⲟⲩⲣⲱⲙⲉ ⲛⲥⲕⲗⲏⲣⲟⲥ ⲉⲕⲱϩⲥ ⲙⲡⲉⲧⲙⲡⲉⲕϫⲟϥ ⲁⲩⲱ ⲉⲕⲥⲱⲟⲩϩ ⲉϩⲟⲩⲛ ⲙⲡⲙⲁ ⲉⲧⲙⲡⲉⲕϫⲱⲱⲣⲉ ⲉⲣⲟϥ
“Onye e nyere otu talenti batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nʼebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nʼebe ị na-agbasaghị.
25 ⲕ̅ⲉ̅ ⲁⲓⲣ ϩⲟⲧⲉ ⲁⲓⲃⲱⲕ ⲁⲓϩⲱⲡ ⲙⲡⲉⲕϭⲓⲛϭⲱⲣ ϩⲙ ⲡⲕⲁϩ ⲉⲓⲥ ϩⲏⲏⲧⲉ ⲉⲓⲥ ϩⲏⲏⲧⲉ ⲉⲓⲥ ⲡⲉⲧⲉⲡⲱⲕ ⲡⲉ
Nʼihi nke a, atụrụ m egwu, a gara m liere gị ego talenti gị nʼala. Lee ihe gị werekwa.’
26 ⲕ̅ⲋ̅ ⲁϥⲟⲩⲱϣⲃ ⲇⲉ ⲛϭⲓ ⲡⲉϥϫⲟⲉⲓⲥ ⲉϥϫⲱ ⲙⲙⲟⲥ ⲛⲁϥ ϫⲉ ⲡϩⲙϩⲁⲗ ⲙⲡⲟⲛⲏⲣⲟⲥ ⲁⲩⲱ ⲛⲣⲉϥϫⲛⲁⲁⲩ ⲉϣϫⲉ ⲕⲥⲟⲟⲩⲛ ϫⲉ ϯⲱϩⲥ ⲙⲡⲙⲁ ⲉⲧⲙⲡⲉⲓϫⲟϥ ⲁⲩⲱ ϯⲥⲱⲟⲩϩ ⲉϩⲟⲩⲛ ⲙⲡⲙⲁ ⲉⲧⲙⲡⲉⲓϫⲱⲱⲣⲉ ⲉⲣⲟϥ
“Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ. Ị maara na m na-ewe ihe ubi nʼebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nʼebe m na-agbasaghị.
27 ⲕ̅ⲍ̅ ⲛⲉϣϣⲉ ϭⲉ ⲉⲣⲟⲕ ⲡⲉ ⲉⲛⲟⲩϫⲉ ⲙⲡⲁϩⲁⲧ ⲛⲛⲉⲧⲣⲁⲡⲉⲍⲓⲧⲏⲥ ⲁⲛⲟⲕ ⲇⲉ ⲛⲉⲓⲛⲁⲉⲓ ⲛⲧⲁϫⲓ ⲙⲡⲉⲧⲉⲡⲱⲓ ⲡⲉ ⲙⲛ ⲧⲉϥⲙⲏⲥⲉ
Ị gaara etinye ego m nʼaka ndị na-echekwa ego, ndị gaara akwụghachi ya na ọmụrụnwa ya, nke m gaara anata mgbe m lọghachiri.
28 ⲕ̅ⲏ̅ ϥⲓ ϭⲉ ⲛⲧⲟⲟⲧϥ ⲙⲡϭⲓⲛϭⲱⲣ ⲛⲧⲉⲧⲛⲧⲁⲁϥ ⲙⲡⲉⲧⲉⲟⲩⲛⲧⲁϥ ⲙⲙⲁⲩ ⲙⲡⲙⲏⲧ ⲛϭⲓⲛϭⲱⲣ
“‘Napụtanụ ya talenti ahụ o ji, were ya nye onye ji talenti iri.
29 ⲕ̅ⲑ̅ ⲟⲩⲟⲛ ⲅⲁⲣ ⲛⲓⲙ ⲉⲧⲉⲟⲩⲛⲧⲁϥ ⲥⲉⲛⲁϯ ⲛⲁϥ ⲁⲩⲱ ⲛϥⲣϩⲟⲩⲟ ⲡⲉⲧⲉⲙⲛⲧⲁϥ ⲇⲉ ⲡⲕⲉⲉⲧⲛⲧⲁϥ ⲥⲉⲛⲁϥⲓⲧϥ ⲛⲧⲟⲟⲧϥ
Nʼihi na onye ọbụla nwere ka a ga e tinyekwuru ka o nwebigakwa oke. Ma onye ahụ ọ na-adịghị nke o nwere, a ga-anapụ ya ọ bụladị nke nta o nwere.
30 ⲗ̅ ⲁⲩⲱ ⲡϩⲙϩⲁⲗ ⲛⲁⲧϣⲁⲩ ⲛⲧⲉⲧⲛⲛⲟⲩϫⲉ ⲙⲙⲟϥ ⲉⲃⲟⲗ ⲉⲡⲕⲁⲕⲉ ⲉⲧϩⲁⲃⲟⲗ ⲉϥⲛⲁϣⲱⲡⲉ ⲙⲙⲁⲩ ⲛϭⲓ ⲡⲣⲓⲙⲉ ⲁⲩⲱ ⲡϭⲁϩϭϩ ⲛⲛⲟⲃϩⲉ
Tụpụnụ ohu a na-abaghị uru nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’
31 ⲗ̅ⲁ̅ ϩⲟⲧⲁⲛ ⲇⲉ ⲉϥϣⲁⲛⲉⲓ ⲛϭⲓ ⲡϣⲏⲣⲉ ⲙⲡⲣⲱⲙⲉ ϩⲣⲁⲓ ϩⲙ ⲡⲉϥⲉⲟⲟⲩ ⲙⲛ ⲛⲉϥⲁⲅⲅⲉⲗⲟⲥ ⲧⲏⲣⲟⲩ ⲛⲙⲙⲁϥ ⲧⲟⲧⲉ ϥⲛⲁϩⲙⲟⲟⲥ ⲉϫⲙ ⲡⲉⲑⲣⲟⲛⲟⲥ ⲙⲡⲉϥⲉⲟⲟⲩ
“Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya.
32 ⲗ̅ⲃ̅ ⲛⲥⲉⲥⲱⲟⲩϩ ⲉϩⲟⲩⲛ ⲙⲡⲉϥⲙⲧⲟ ⲉⲃⲟⲗ ⲛⲛϩⲉⲑⲛⲟⲥ ⲧⲏⲣⲟⲩ ⲛϥⲡⲱⲣϫ ⲙⲙⲟⲟⲩ ⲉⲃⲟⲗ ⲛⲛⲉⲩⲉⲣⲏⲩ ⲛⲑⲉ ⲛⲟⲩϣⲱⲥ ⲛϣⲁϥⲡⲱⲣϫ ⲛⲛⲉⲥⲟⲟⲩ ⲉⲃⲟⲗ ⲛⲛⲃⲁⲁⲙⲡⲉ
Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu.
33 ⲗ̅ⲅ̅ ⲛⲉⲥⲟⲟⲩ ⲙⲉⲛ ⲛϥⲧⲁϩⲟⲟⲩ ⲉⲣⲁⲧⲟⲩ ϩⲓⲟⲩⲛⲁⲙ ⲙⲙⲟϥ ⲛⲃⲁⲁⲙⲡⲉ ⲇⲉ ϩⲓϩⲃⲟⲩⲣ ⲙⲙⲟϥ
Ọ ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya.
34 ⲗ̅ⲇ̅ ⲧⲟⲧⲉ ϥⲛⲁϫⲟⲟⲥ ⲛϭⲓ ⲡⲣⲣⲟ ⲛⲛⲉⲧϩⲓⲟⲩⲛⲁⲙ ⲙⲙⲟϥ ϫⲉ ⲁⲙⲏⲓⲧⲛ ⲛⲉⲧⲥⲙⲁⲙⲁⲁⲧ ⲛⲧⲉⲡⲁⲉⲓⲱⲧ ⲛⲧⲉⲧⲛⲕⲗⲏⲣⲟⲛⲟⲙⲉⲓ ⲛⲧⲙⲛⲧⲣⲣⲟ ⲛⲧⲁⲩⲥⲃⲧⲱⲧⲥ ⲛⲏⲧⲛ ϫⲓⲛⲉⲧⲕⲁⲧⲁⲃⲟⲗⲏ ⲙⲡⲕⲟⲥⲙⲟⲥ
“Mgbe ahụ, eze ga-asị ndị nọ nʼaka nri ya, ‘Batanụ nʼime alaeze, unu ndị Nna m gọziri agọzi, batanụ nʼime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa.
35 ⲗ̅ⲉ̅ ⲁⲓϩⲕⲟ ⲅⲁⲣ ⲁⲧⲉⲧⲛⲧⲙⲟⲓ ⲁⲓⲉⲓⲃⲉ ⲁⲧⲉⲧⲛⲧⲥⲟⲓ ⲛⲉⲓⲟ ⲛϣⲙⲙⲟ ⲡⲉ ⲁⲧⲉⲧⲛϣⲟⲡⲧ ⲉⲣⲱⲧⲛ
Nʼihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nri. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m ihe ọṅụṅụ. Mgbe m bụ ọbịa unu kpọbatara m.
36 ⲗ̅ⲋ̅ ⲛⲉⲓⲕⲏ ⲕⲁϩⲏⲩ ⲁⲧⲉⲧⲛϯ ϩⲓⲱⲱⲧ ⲛⲉⲓϣⲱⲛⲉ ⲁⲧⲉⲧⲛϭⲙ ⲡⲁϣⲓⲛⲉ ⲛⲉⲓϩⲙⲡⲉϣⲧⲉⲕⲟ ⲡⲉ ⲁⲧⲉⲧⲛⲉⲓ ϣⲁⲣⲟⲓ
Mgbe m gba ọtọ, unu zụtara uwe nye m. Mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nʼụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.’
37 ⲗ̅ⲍ̅ ⲧⲟⲧⲉ ⲥⲉⲛⲁⲟⲩⲱϣⲃ ⲛⲁϥ ⲛϭⲓ ⲛⲇⲓⲕⲁⲓⲟⲥ ⲉⲩϫⲱ ⲙⲙⲟⲥ ϫⲉ ⲡϫⲟⲉⲓⲥ ⲛⲧⲁⲛⲛⲁⲩ ⲉⲣⲟⲕ ⲧⲛⲁⲩ ⲉⲕϩⲕⲁⲉⲓⲧ ⲁⲛⲧⲙⲙⲟⲕ ⲏ ⲉⲕⲟⲃⲉ ⲁⲛⲧⲥⲟⲕ
“Mgbe ahụ ndị ezi omume ahụ ga-ajụ ya sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị?
38 ⲗ̅ⲏ̅ ⲛⲧⲁⲛⲛⲁⲩ ⲇⲉ ⲉⲣⲟⲕ ⲧⲛⲁⲩ ⲉⲕⲟ ⲛϣⲙⲙⲟ ⲁⲛϣⲟⲡⲕ ⲉⲣⲟⲛ ⲏ ⲉⲕⲕⲏ ⲕⲁϩⲏⲩ ⲁⲛϯ ϩⲓⲱⲱⲕ
Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị gba ọtọ anyị enye gị uwe?
39 ⲗ̅ⲑ̅ ⲛⲧⲁⲛⲛⲁⲩ ⲇⲉ ⲉⲣⲟⲕ ⲧⲛⲁⲩ ⲉⲕϣⲱⲛⲉ ⲏ ⲉⲕϩⲙ ⲡⲉϣⲧⲉⲕⲟ ⲁⲛⲉⲓ ϣⲁⲣⲟⲕ
Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nʼọrịa, maọbụ nʼụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’
40 ⲙ̅ ϥⲛⲁⲟⲩⲱϣⲃ ⲇⲉ ⲛϭⲓ ⲡⲣⲣⲟ ⲛϥϫⲟⲟⲥ ⲛⲁⲩ ϫⲉ ϩⲁⲙⲏⲛ ϯϫⲱ ⲙⲙⲟⲥ ⲛⲏⲧⲛ ϫⲉ ⲉⲫⲟⲥⲟⲛ ⲁⲧⲉⲧⲛⲁⲁⲥ ⲛⲟⲩⲁ ⲛⲛⲉⲓⲥⲛⲏⲩ ⲉⲧⲥⲟⲃⲕ ⲛⲧⲁⲧⲉⲧⲛⲁⲁⲥ ⲛⲁⲓ
“Eze ahụ ga-azaghachi ha sị, ‘Nʼezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nʼime ndị a dị nta nʼime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.’
41 ⲙ̅ⲁ̅ ⲧⲟⲧⲉ ϥⲛⲁⲟⲩⲱϣⲃ ⲛϥϫⲟⲟⲥ ⲛⲛⲕⲟⲟⲩⲉ ⲉⲧϩⲓϩⲃⲟⲩⲣ ⲙⲙⲟϥ ϫⲉ ⲥⲁϩⲉⲧⲏⲩⲧⲛ ⲉⲃⲟⲗ ⲙⲙⲟⲓ ⲛⲉⲧⲥϩⲟⲩⲟⲣⲧ ⲉⲧⲥⲁⲧⲉ ⲛϣⲁ ⲉⲛⲉϩ ⲛⲧⲁⲩⲥⲃⲧⲱⲧⲥ ⲙⲡⲇⲓⲁⲃⲟⲗⲟⲥ ⲙⲛ ⲛⲉϥⲁⲅⲅⲉⲗⲟⲥ (aiōnios g166)
“Mgbe ahụ ọ ga-asịkwa ndị nọ nʼaka ekpe ya, ‘Pụọnụ nʼihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nʼime ọdọ ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya. (aiōnios g166)
42 ⲙ̅ⲃ̅ ⲁⲓϩⲕⲟ ⲅⲁⲣ ⲙⲡⲉⲧⲛⲧⲙⲟⲓ ⲁⲓⲉⲓⲃⲉ ⲙⲡⲉⲧⲛⲧⲥⲟⲓ
Nʼihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọbụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ.
43 ⲙ̅ⲅ̅ ⲛⲉⲓⲟ ⲛϣⲙⲙⲟ ⲙⲡⲉⲧⲛϣⲟⲡⲧ ⲉⲣⲱⲧⲛ ⲛⲉⲓⲕⲏ ⲕⲁϩⲏⲩ ⲙⲡⲉⲧⲛϯ ϩⲓⲱⲱⲧ ⲛⲉⲓϣⲱⲛⲉ ⲁⲩⲱ ⲉⲓϩⲙⲡⲉϣⲧⲉⲕⲟ ⲙⲡⲉⲧⲛϭⲙⲡⲁϣⲓⲛⲉ
Mgbe m nọ dị ka ọbịa, unu akpọbataghị m nʼụlọ unu. Mgbe m gba ọtọ, unu enyeghị m uwe. Mgbe ahụ na-esighị m ike, unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nʼụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.’
44 ⲙ̅ⲇ̅ ⲧⲟⲧⲉ ⲥⲉⲛⲁⲟⲩⲱϣⲃ ϩⲱⲟⲩ ⲟⲛ ⲉⲩϫⲱ ⲙⲙⲟⲥ ϫⲉ ⲡϫⲟⲉⲓⲥ ⲛⲧⲁⲛⲛⲁⲩ ⲉⲣⲟⲕ ⲧⲛⲁⲩ ⲉⲕϩⲕⲁⲉⲓⲧ ⲏ ⲉⲕⲟⲃⲉ ⲏ ⲉⲕⲟ ⲛϣⲙⲙⲟ ⲏ ⲉⲕⲕⲏ ⲕⲁϩⲏⲩ ⲏ ⲉⲕϣⲱⲛⲉ ⲏ ⲉⲕϩⲙⲡⲉϣⲧⲉⲕⲟ ⲙⲡⲉⲛⲇⲓⲁⲕⲟⲛⲉⲓ ⲛⲁⲕ
“Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, maọbụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, maọbụ oge ị bụ onye ọbịa, maọbụ oge ị gba ọtọ, maọbụ oge ị nọ nʼọrịa, maọbụ ị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’
45 ⲙ̅ⲉ̅ ⲧⲟⲧⲉ ϥⲛⲁⲟⲩⲱϣⲃ ⲛⲁⲩ ⲉϥϫⲱ ⲙⲙⲟⲥ ϫⲉ ϩⲁⲙⲏⲛ ϯϫⲱ ⲙⲙⲟⲥ ⲛⲏⲧⲛ ϫⲉ ⲉⲫⲟⲥⲟⲛ ⲙⲡⲉⲧⲛⲁⲁⲥ ⲛⲟⲩⲁ ⲛⲛⲉⲓⲕⲟⲩⲓ ⲁⲛⲟⲕ ⲡⲉⲧⲙⲡⲉⲧⲛⲁⲁⲥ ⲛⲁⲓ
“Ọ ga-aza ha sị, ‘Eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nʼime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ i nyere aka.’
46 ⲙ̅ⲋ̅ ⲛⲁⲓ ⲙⲉⲛ ⲥⲉⲛⲁⲃⲱⲕ ⲉⲩⲕⲟⲗⲁⲥⲓⲥ ⲛϣⲁ ⲉⲛⲉϩ ⲛⲇⲓⲕⲁⲓⲟⲥ ⲇⲉ ⲛⲧⲟⲟⲩ ⲉⲩⲱⲛϩ ϣⲁ ⲉⲛⲉϩ (aiōnios g166)
“Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.” (aiōnios g166)

< ⳘⲀⲦⲐⲈⲞⲚ 25 >