< ⲚⲒⲢⲰⳘⲈⲞⲤ 15 >

1 ⲁ̅ ⳿ⲥⲉⲙ⳿ⲡϣⲁ ⲇⲉ ⲛⲁⲛ ⳿ⲁⲛⲟⲛ ϧⲁ ⲛⲏⲉⲧⲉ ⲟⲩⲟⲛ ⳿ϣϫⲟⲙ ⳿ⲙⲙⲱⲟⲩ ⳿ⲛⲧⲉⲛϥⲁⲓ ϧⲁ ⲛⲓϣⲱⲛⲓ ⳿ⲛⲧⲉ ⲛⲓⲁⲧϫⲟⲙ ⲟⲩⲟϩ ⳿ⲛⲧⲉⲛ⳿ϣⲧⲉⲙⲣⲁⲛⲁⲛ ⳿ⲙⲙⲁⲩⲁⲧⲉⲛ.
Anyị onwe anyị bụ ndị dị ike kwesiri ịnagide mgbe ndị na-adịghị ike mejọrọ anyị, ọ bụghị ime ihe ga-atọ anyị ụtọ.
2 ⲃ̅ ⲡⲓⲟⲩⲁⲓ ⲡⲓⲟⲩⲁⲓ ⳿ⲙⲙⲱⲧⲉⲛ ⲙⲁⲣⲉϥⲣⲁⲛⲁϥ ⳿ⲙⲡⲉϥ⳿ϣⲫⲏⲣ ϧⲉⲛ ⲡⲓⲡⲉⲑⲛⲁⲛⲉϥ ⲉⲩⲕⲱⲧ.
Ka onye ọbụla nʼime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbataobi ya ụtọ maka ọdịmma ha, ka o wulie ha elu.
3 ⲅ̅ ⲕⲉ ⲅⲁⲣ Ⲡⲭ̅ⲥ̅ ⲛⲉⲧⲁϥⲣⲁⲛⲁϥ ⳿ⲙⲙⲁⲩⲁⲧϥ ⲁⲛ ⲁⲗⲗⲁ ⲕⲁⲧⲁ⳿ⲫⲣⲏϯ ⲉⲧ⳿ⲥϧⲏⲟⲩⲧ ϫⲉ ⲛⲓϣⲱϣ ⳿ⲛⲧⲉ ⲛⲏⲉⲧϯ⳿ϣⲫⲓⲧ ⲛⲁⲕ ⲁⲩ⳿ⲓ ⳿ⲉ⳿ϩⲣⲏⲓ ⳿ⲉϫⲱⲓ.
Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya emeghị ihe tọrọ ya ụtọ, kama dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Mkparị niile nke ndị na-akparị gị dakwasịrị m!”
4 ⲇ̅ ϩⲱⲃ ⲅⲁⲣ ⲛⲓⲃⲉⲛ ⲉⲧⲁⲩⲉⲣϣⲟⲣⲡ ⳿ⲛ⳿ⲥϧⲏ ⲧⲟⲩ ⲁⲩ⳿ⲥϧⲏⲧⲟⲩ ⳿ⲉⲧⲉⲛ⳿ⲥⲃⲱ ϩⲓⲛⲁ ⳿ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲉⲛ ϯϩⲩⲡⲟⲙⲟⲛⲏ ⲛⲉⲙ ϯⲙⲉⲧⲣⲉϥϯⲛⲟⲙϯ ⳿ⲛⲧⲉ ⲛⲓ⳿ⲅⲣⲁⲫⲏ ⳿ⲛⲧⲉ ϯϩⲉⲗⲡⲓⲥ ϣⲱⲡⲓ ⲛⲁⲛ.
Nʼihi na ihe niile edere nʼoge gara aga bụ iji kuziere anyị ihe, ka anyị nwee ike isite na ntachiobi nakwa nkasiobi, nke dị nʼakwụkwọ nsọ nwee olileanya.
5 ⲉ̅ ⲫϯ ⲇⲉ ⳿ⲛⲧⲉ ϯϩⲓⲣⲏⲛⲏ ⲛⲉⲙ ϯⲡⲁⲣⲁⲕⲗⲏ ⲥⲓⲥ ⲉϥ⳿ⲉϯ ⲛⲟⲩⲙⲉⲩⲓ ⳿ⲛⲟⲩⲱⲧ ⲛⲱⲧⲉⲛ ⳿ⲉⲛⲉⲧⲉⲛⲉⲣⲏ ⲟⲩ ⲕⲁⲧⲁ Ⲓⲏ̅ⲥ̅ Ⲡⲭ̅ⲥ̅.
Ka Chineke ahụ na-enye agbamume na ntachiobi nye unu mmụọ nke ịdị nʼotu nʼetiti onwe unu, dịka Kraịst Jisọs nwere.
6 ⲋ̅ ϩⲓⲛⲁ ϧⲉⲛ ⲟⲩϩⲏⲧ ⳿ⲛⲟⲩⲱⲧ ⲛⲉⲙ ⲟⲩⲣⲱ ⳿ⲛⲟⲩⲱⲧ ⳿ⲛⲧⲉⲧⲉⲛϯⲱⲟⲩ ⳿ⲙⲫϯ ⳿ⲫⲓⲱⲧ ⳿ⲙⲡⲉⲛϭ̅ ⲥ̅ Ⲓⲏ̅ⲥ̅ Ⲡⲭ̅ⲥ̅.
Nʼihi na nke a ga-eme ka unu niile jikọtaa obi unu, na olu unu nʼotu, inye Chineke na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst otuto.
7 ⲍ̅ ⲉⲑⲃⲉ ⲫⲁⲓ ϣⲉⲡ ⲛⲉⲧⲉⲛⲉⲣⲏⲟⲩ ⳿ⲉⲣⲱⲧⲉⲛ ⲕⲁⲧⲁ⳿ⲫⲣⲏϯ ϩⲱϥ ⲉⲧⲁ Ⲡⲭ̅ⲥ̅ ϣⲉⲡ ⲑⲏⲛⲟⲩ ⳿ⲉⲣⲟϥ ⲉⲩⲱⲟⲩ ⳿ⲙⲫϯ.
Nʼihi ya, nabatanụ onwe unu dị ka Kraịst nabatara unu, iji wetara Chineke otuto.
8 ⲏ̅ ϯϫⲱ ⲅⲁⲣ ⳿ⲙⲙⲟⲥ ϫⲉ Ⲡⲭ̅ⲥ̅ ⲁϥϣⲱⲡⲓ ⳿ⲛⲟⲩⲇⲓ⳿ⲁⲕⲱⲛ ⳿ⲛⲧⲉ ⳿ⲡⲥⲉⲃⲓ ⳿ⲉϫⲉⲛ ϯⲙⲉⲑⲛⲏⲓ ⳿ⲛⲧⲉ ⲫϯ ϫⲉⲭⲁⲥ ⲉϥ⳿ⲉⲧⲁϫⲣⲉ ⲛⲓⲱϣ ⳿ⲛⲧⲉ ⲛⲓⲓⲟϯ.
Ma ana m agwa unu na Kraịst aghọọla onye na-ejere ndị e biri ugwu ozi nʼihi eziokwu nke Chineke, iji mee ka nkwa e kwere ndị bụ nna nna anyị ochie guzozie.
9 ⲑ̅ ⲛⲓⲉⲑⲛⲟⲥ ⲇⲉ ⲉⲑⲃⲉ ⲟⲩⲛⲁⲓ ⳿ⲉϯⲱⲟⲩ ⳿ⲙⲫϯ ⲕⲁⲧⲁ⳿ⲫⲣⲏϯ ⲉⲧ⳿ⲥϧⲏⲟⲩⲧ ϫⲉ ⲉⲑⲃⲉ ⲫⲁⲓ ϯⲛⲁⲟⲩⲱⲛϩ ⲛⲁⲕ ⳿ⲉⲃⲟⲗ ϧⲉⲛ ⲛⲓⲉⲑⲛⲟⲥ ⲟⲩⲟϩ ϯⲛⲁⲉⲣⲯⲁⲗⲓⲛ ⳿ⲉⲡⲉⲕⲣⲁⲛ.
Ka ndị mba ọzọ nwe ike inye Chineke otuto maka ebere ya, dịka e dere ya, “Nʼihi nke a, aga m eto gị nʼetiti ndị mba ọzọ, aga m abụ abụ nye aha gị.”
10 ⲓ̅ ⲟⲩⲟϩ ⳿ϥϫⲱ ⳿ⲙⲙⲟⲥ ⲟⲛ ϫⲉ ⲟⲩⲛⲟϥ ⳿ⲙⲙⲱⲧⲉⲛ ⲛⲓⲉⲑⲛⲟⲥ ⲛⲉⲙ ⲡⲉϥⲗⲁⲟⲥ.
O kwukwara ọzọ sị, “Soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ unu ndị mba ọzọ.”
11 ⲓ̅ⲁ̅ ⲟⲩⲟϩ ⳿ϥϫⲱ ⳿ⲙⲙⲟⲥ ⲟⲛ ϫⲉ ⲛⲓⲉⲑⲛⲟⲥ ⲧⲏⲣⲟⲩ ⳿ⲥⲙⲟⲩ ⳿ⲉⲠ⳪ ⲙⲁⲣⲟⲩ⳿ⲥⲙⲟⲩ ⳿ⲉⲣⲟϥ ⳿ⲛϫⲉ ⲛⲓⲗⲁⲟⲥ ⲧⲏⲣⲟⲩ.
Ọzọkwa, “Toonu Onyenwe anyị unu ndị mba ọzọ niile, ka ndị niile dị iche iche jaakwa ya mma.”
12 ⲓ̅ⲃ̅ ⲟⲩⲟϩ ⳿ϥϫⲱ ⳿ⲙⲙⲟⲥ ⲟⲛ ⳿ⲛϫⲉ ⲏⲥⲁⲏⲁⲥ ϫⲉ ⲉⲥ⳿ⲉϣⲱⲡⲓ ⳿ⲛϫⲉ ⳿ⲑⲛⲟⲩⲛⲓ ⳿ⲛⲓⲉⲥⲥⲉ ⲛⲉⲙ ⲫⲏⲉⲑⲛⲁⲧⲱⲛϥ ⳿ⲉⲉⲣⲁⲣⲭⲱⲛ ⳿ⲉⲛⲓⲉⲑⲛⲟⲥ ⲉⲩ⳿ⲉⲉⲣϩⲉⲗⲡⲓⲥ ⳿ⲉⲣⲟϥ ⳿ⲛϫⲉ ⲛⲓⲉⲑⲛⲟⲥ.
Ọzọkwa, Aịzaya na-asị, “Mgbọrọgwụ Jesi ga-epulite ọzọ, onye nke ga-ebili ịchị mba niile, ndị mba ọzọ ga-enwekwa olileanya nʼime ya.”
13 ⲓ̅ⲅ̅ ⲫϯ ⲇⲉ ⳿ⲛⲧⲉ ϯϩⲉⲗⲡⲓⲥ ⲉϥ⳿ⲉⲙⲁϩ ⲑⲏⲛⲟⲩ ⳿ⲛⲣⲁϣⲓ ⲛⲓⲃⲉⲛ ⲛⲉⲙ ϯϩⲓⲣⲏⲛⲏ ϧⲉⲛ ⳿ⲡϫⲓⲛ⳿ⲑⲣⲉⲧⲉⲛⲛⲁϩϯ ⲉⲣⲉⲧⲉⲛⲉⲣϩⲟⲩ⳿ⲟ ϧⲉⲛ ϯ ϩⲉⲗⲡⲓⲥ ϧⲉⲛ ϯϫⲟⲙ ⳿ⲛⲧⲉ ⲡⲓⲡ͞ⲛⲁ̅ ⲉⲑⲟⲩⲁⲃ.
Ka Chineke onye bụ isi olileanya mejupụta unu nʼoke ọṅụ na udo dịka unu na-atụkwasị ya obi, ka unu si otu a bụrụ ndị olileanya ha jubigara oke site nʼike nke Mmụọ Nsọ.
14 ⲓ̅ⲇ̅ ⳿ⲁⲛⲟⲕ ϩⲱ ⲛⲁ⳿ⲥⲛⲏⲟⲩ ⲡⲁϩⲏⲧ ⲑⲏⲧ ⳿ⲉϫⲉⲛ ⲑⲏⲛⲟⲩ ϫⲉ ⳿ⲛⲑⲱⲧⲉⲛ ϩⲱⲧⲉⲛ ⲧⲉⲧⲉⲛⲙⲉϩ ϧⲉⲛ ϩⲱⲃ ⲛⲓⲃⲉⲛ ⳿ⲛⲁⲅⲁⲑⲟⲛ ⲉⲣⲉⲧⲉⲛⲙⲉϩ ϧⲉⲛ ⳿ⲉⲙⲓ ⲛⲓⲃⲉⲛ ⳿ⲉⲟⲩⲟⲛ ⳿ϣϫⲟⲙ ⳿ⲙⲙⲱⲧⲉⲛ ⳿ⲉϯ⳿ⲥⲃⲱ ⳿ⲛⲛⲉⲧⲉⲛⲉⲣⲏⲟⲩ.
Ụmụnna m, o doro m anya na unu onwe unu jupụtara nʼịdị mma, bụrụkwa ndị tozuru etozu nʼihe ọmụma ruo na unu nwere ike izirịta onwe unu ihe.
15 ⲓ̅ⲉ̅ ϧⲉⲛ ⲟⲩⲙⲉⲧⲧⲟⲗⲙⲉⲣⲟⲥ ⲇⲉ ⲁⲓ⳿ⲥϧⲁⲓ ⲛⲱⲧⲉⲛ ⳿ⲛⲟⲩ⳿ⲁⲡⲟⲙⲉⲣⲟⲥ ϩⲱⲥ ⲉⲓϯ ⳿ⲙ⳿ⲫⲙⲉⲩⲓ ⲛⲱⲧⲉⲛ ⲉⲑⲃⲉ ⲡⲓ⳿ϩⲙⲟⲧ ⲉⲧⲁⲩⲧⲏⲓϥ ⲛⲏⲓ ⳿ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲉⲛ ⲫϯ.
Ma otu ọ dị, edepụtala m ụfọdụ isi okwu nʼebe o doro anya nye unu, iji chetara unu ha ọzọ, nʼihi amara Chineke nyere m,
16 ⲓ̅ⲋ̅ ⲉⲑⲣⲓϣⲱⲡⲓ ⲉⲓⲟⲓ ⳿ⲛⲣⲉϥⲫⲱϣⲉⲛ ⳿ⲛⲧⲉ Ⲓⲏ̅ⲥ̅ Ⲡⲭ̅ⲥ̅ ⳿ⲉⲛⲓⲉⲑⲛⲟⲥ ⲉⲓⲉⲣϩⲱⲃ ϧⲉⲛ ⲟⲩⲙⲉⲧⲟⲩⲏ ⲃ ⳿ⲉⲡⲓⲉⲩⲁⲅⲅⲉⲗⲓⲟⲛ ⳿ⲛⲧⲉ ⲫϯ ϩⲓⲛⲁ ⳿ⲛⲧⲉ ϯ⳿ⲡⲣⲟⲥⲫⲱⲣⲁ ⳿ⲛⲧⲉ ⲛⲓⲉⲑⲛⲟⲥ ϣⲱⲡⲓ ⲉⲥϣⲏⲡ ⲟⲩⲟϩ ⲉⲥⲧⲟⲩⲃⲏⲟⲩⲧ ϧⲉⲛ ⲟⲩⲡ͞ⲛⲁ̅ ⲉϥⲟⲩⲁⲃ.
abụ m onyeozi Kraịst Jisọs, ana m arụkwa ọrụ onye nchụaja nʼizisa oziọma Chineke, ka ofufe ndị mba ọzọ bụrụ aja Chineke ga-anara nke ọma, nke Mmụọ Nsọ dokwara nsọ.
17 ⲓ̅ⲍ̅ ⲟⲩⲟⲛⲧⲏⲓ ⳿ⲙⲙⲁⲩ ⳿ⲛⲟⲩϣⲟⲩϣⲟⲩ ϧⲉⲛ Ⲡⲭ̅ⲥ̅ Ⲓⲏ̅ⲥ̅ ϩⲁ ⲫϯ.
Nʼihi ya, ana m anya isi nʼime Kraịst Jisọs banyere ọrụ m na-arụrụ Chineke.
18 ⲓ̅ⲏ̅ ⲟⲩ ⲅⲁⲣ ⳿ⲛⲛⲁⲉⲣⲧⲟⲗⲙⲁⲛ ⳿ⲉϫⲉ ⲟⲩⲥⲁϫⲓ ϧⲉⲛ ⲛⲏⲉⲧⲉ ⳿ⲙⲡⲉ Ⲡⲭ̅ⲥ̅ ⲉⲣϩⲱⲃ ⳿ⲛϧⲏ ⲧⲟⲩ ⳿ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲟⲧ ⲉⲩⲥⲱⲧⲉⲙ ⳿ⲛⲧⲉ ⲛⲓⲉⲑⲛⲟⲥ ϧⲉⲛ ⳿ⲡⲥⲁϫⲓ ϧⲉⲛ ⳿ⲡϩⲱⲃ.
Agaghị m anwa anwa kwuo okwu banyere ihe ọzọ karịakwa ihe ndị ahụ Kraịst rụpụtara site nʼaka m, bụ idubata ndị mba ọzọ, ime ka ha rube isi nye Chineke, site nʼokwu ọnụ m na ihe m rụrụ,
19 ⲓ̅ⲑ̅ ϧⲉⲛ ⳿ⲧϫⲟⲙ ⳿ⲛⲧⲉ ϩⲁⲛⲙⲏⲓⲛⲓ ⲛⲉⲙ ϩⲁⲛ⳿ϣⲫⲏⲣⲓ ϧⲉⲛ ⲟⲩϫⲟⲙ ⳿ⲛⲧⲉ ⲟⲩⲡ͞ⲛⲁ̅ ⲉϥⲟⲩⲁⲃ ϩⲱⲥⲧⲉ ⲓⲥϫⲉⲛ ⳿ⲓⲗ̅ⲏ̅ⲙ̅ ⲛⲉⲙ ⲡⲉⲥⲕⲱϯ ϣⲁ ⳿ⲉ⳿ϩⲣⲏⲓ ⳿ⲉⲡⲓ⳿ⲁⲗⲗⲩⲣⲓⲕⲟⲛ ⳿ⲛⲧⲁⲙⲁϩⲟⲩ ⳿ⲉⲡⲓⲉⲩⲁⲅⲅⲉⲗⲓⲟⲛ ⳿ⲛⲧⲉ Ⲡⲭ̅ⲥ̅.
nke pụtara ihe nʼọrụ ebube na ihe ịrịbama site nʼike nke Mmụọ nke Chineke. Ya mere, site na Jerusalem ruo Ilirikom, ekwusaala m nʼụzọ zuru ezu, oziọma Kraịst.
20 ⲕ̅ ⲡⲁⲓⲣⲏϯ ⲇⲉ ⲛⲁⲓⲙⲉⲓ ⳿ⲛϩⲓϣⲉⲛⲛⲟⲩϥⲓ ⲡⲉ ⳿ⲉ⳿ⲫⲙⲁ ⲁⲛ ⲉⲧⲁⲩϫⲉ ⳿ⲫⲣⲁⲛ ⳿ⲙⲠⲭ̅ⲥ̅ ⳿ⲙⲙⲟϥ ϩⲓⲛⲁ ⳿ⲛⲧⲁ⳿ϣⲧⲉⲙⲕⲱⲧ ⳿ⲉϫⲉⲛ ⲟⲩⲥⲉⲛϯ ⳿ⲛϣⲉⲙⲙⲟ.
Ọchịchọ obi m mgbe niile bụ ikwusa oziọma ahụ nʼebe ọbụla ndị mmadụ na-anụtụbeghị ihe banyere Kraịst, ka m ghara ịbụ onye na-ewukwasị ihe nʼelu ntọala nke onye ọzọ tọrọ,
21 ⲕ̅ⲁ̅ ⲁⲗⲗⲁ ⲕⲁⲧⲁ⳿ⲫⲣⲏϯ ⲉⲧ⳿ⲥϧⲏⲟⲩⲧ ϫⲉ ⲉⲩ⳿ⲉⲛⲁⲩ ⳿ⲛϫⲉ ⲛⲏⲉⲧⲉ ⳿ⲙⲡⲟⲩⲧⲁⲙⲱⲟⲩ ⲉⲑⲃⲏ ⲧϥ ⲟⲩⲟϩ ⲛⲏⲉⲧⲉ ⳿ⲙⲡⲟⲩⲥⲱⲧⲉⲙ ⲉⲩ⳿ⲉⲕⲁϯ.
ma dịka e dere ya, “Ndị a na-agwaghị ihe banyere ya ga-ahụ, ndị a ka anụbeghị, ga-aghọtakwa.”
22 ⲕ̅ⲃ̅ ⲉⲑⲃⲉ ⲫⲁⲓ ⲁⲓⲧⲁϩⲛⲟ ⳿ⲛⲟⲩⲙⲏϣ ⳿ⲛⲥⲟⲡ ⳿ⲉ⳿ⲓ ϩⲁⲣⲱⲧⲉⲛ.
Nʼezie, nke a bụ ihe mere m na-ejibeghị nwee ohere ịbịakwute unu.
23 ⲕ̅ⲅ̅ ϯⲛⲟⲩ ⲇⲉ ⳿ⲙⲙⲟⲛϯ ⲙⲁ ϧⲉⲛ ⲛⲁⲓⲥⲁ ⲟⲩⲟⲛ ⲟⲩⲙⲉⲓ ⳿ⲛϩⲟⲩ⳿ⲟ ⲇⲉ ϣⲟⲡ ⳿ⲛϧⲏⲧ ⳿ⲉ⳿ⲓ ϩⲁⲣⲱⲧⲉⲛ ⲓⲥ ⲟⲩⲙⲏϣ ⳿ⲛⲣⲟⲙⲡⲓ.
Nʼihi na ọ dịla ọtụtụ afọ kemgbe m bidoro na-enwe mmasị m ga-abịa hụ unu anya, ma ugbu a, ọrụ m nwere nʼakụkụ a agwụla, oge eruola mgbe m ji ahapụ ebe a.
24 ⲕ̅ⲇ̅ ϩⲱⲥ ⲉⲓⲛⲁϣⲉⲛⲏⲓ ⳿ⲉϯ⳿ⲥⲡⲁⲛⲓ⳿ⲁ ϯⲉⲣϩⲉⲗⲡⲓⲥ ⲅⲁⲣ ⳿ⲉⲛⲁⲩ ⳿ⲉⲣⲱⲧⲉⲛ ⲉⲓⲛⲁϣⲉ ⲛⲏⲓ ⳿ⲉⲙⲁⲩ ⲟⲩⲟϩ ⳿ⲛⲧⲉⲧⲉⲛ⳿ⲧⲫⲟⲓ ⳿ⲛⲑⲱⲧⲉⲛ ⳿ⲉⲙⲁⲩ ⲉϣⲱⲡ ⲁⲓϣⲁⲛⲥⲓ ⳿ⲙⲙⲱⲧⲉⲛ ϧⲉⲛ ⲟⲩ⳿ⲁⲡⲟⲙⲉⲣⲟⲥ.
Nʼihi na nzube m bụ ijeru obodo Spen. Mgbe ọbụla m ga-agakwa, aga m akwụsị ịhụ unu na elekwa anya na unu ga-edupụ m nʼije m, mgbe mụ na unu jiri ọṅụ nọrọtụ nwa mgbe nta.
25 ⲕ̅ⲉ̅ ϯⲛⲟⲩ ⲇⲉ ϯⲛⲁϣⲉ ⲛⲏⲓ ⳿ⲉ⳿ⲓⲗ̅ⲏ̅ⲙ̅ ⳿ⲉϣⲉⲙϣⲓ ⳿ⲛⲛⲏⲉⲑⲟⲩⲁⲃ.
Ma ugbu a, ana m aga Jerusalem ebe m na-ejere ndị nsọ ozi.
26 ⲕ̅ⲋ̅ ⲁⲩϯⲙⲁϯ ⲅⲁⲣ ⳿ⲛϫⲉ ⲛⲁ⳿ⲑⲙⲁⲕⲉⲇⲟⲛⲓ⳿ⲁ ⲛⲉⲙ ⲁⲭⲁⲓ⳿ⲁ ⲉ⳿ⲓⲣⲓ ⳿ⲛⲟⲩⲙⲉⲧ⳿ϣⲫⲏⲣ ⳿ⲉⲛⲓϩⲏⲕⲓ ⳿ⲛⲧⲉ ⲛⲏⲉⲑⲟⲩⲁⲃ ⲛⲏⲉⲧϧⲉⲛ ⳿ⲓⲗ̅ⲏ̅ⲙ̅.
Nʼihi na ọ dị ndị Masidonia na Akaịa ezi mma iwere nʼụfọdụ nʼihe ha nwere nyere ndị ogbenye nọ nʼetiti ndị nsọ nọ na Jerusalem aka.
27 ⲕ̅ⲍ̅ ⲁⲩϯⲙⲁϯ ⲅⲁⲣ ⲟⲩⲟϩ ⲟⲩⲟⲛ ⳿ⲉⲣⲱⲟⲩ ⳿ⲛⲧⲱⲟⲩ ⲓⲥϫⲉ ⲅⲁⲣ ⲛⲓⲉⲑⲛⲟⲥ ⲉⲣ⳿ϣⲫⲏⲣ ⳿ⲉⲣⲱⲟⲩ ϧⲉⲛ ⲟⲩⲡ͞ⲛⲁ̅ⲧⲓⲕⲟⲛ ⲥⲉ⳿ⲙ⳿ⲡϣⲁ ⳿ⲛⲥⲉϣⲉⲙϣⲏⲧⲟⲩ ϧⲉⲛ ⲛⲓⲕⲉⲥⲁⲣⲕⲓⲕⲟⲛ.
Ha ji ọṅụ mee nke a, nʼezie ha ji ha ụgwọ i mere ha otu a. Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ so ha keta oke na ngọzị nke Mmụọ Nsọ, ha ji ụgwọ isite nʼakụnụba ha nwere kenye ha.
28 ⲕ̅ⲏ̅ ⲫⲁⲓ ⲟⲩⲛ ⲁⲓϣⲁⲛϫⲟⲕϥ ⳿ⲉⲃⲟⲗ ⳿ⲛⲧⲁⲉⲣ⳿ⲥ⳿ⲫⲣⲁⲅⲓⲍⲓⲛ ⳿ⲙⲡⲁⲓⲟⲩⲧⲁϩ ⲛⲱⲟⲩ ⲉⲓ⳿ⲉϣⲉ ⲛⲏⲓ ⳿ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲉⲛ ⲑⲏⲛⲟⲩ ⳿ⲉϯ⳿ⲥⲡⲁⲛⲓ⳿ⲁ.
Ya mere, mgbe m mezuru nke a, hụkwa na ha anatala onyinye ahụ a tụkọtara ha, aga m abata ịhụ unu mgbe m na-aga Spen.
29 ⲕ̅ⲑ̅ ϯⲥⲱⲟⲩⲛ ⲇⲉ ϫⲉ ⲁⲓⲛⲏⲟⲩ ϩⲁⲣⲱⲧⲉⲛ ⲁⲓⲛⲏⲟⲩ ϧⲉⲛ ⲟⲩⲙⲟϩ ⳿ⲛ⳿ⲥⲙⲟⲩ ⳿ⲛⲧⲉ Ⲡⲭ̅ⲥ̅.
Amaara m na mgbe m ga-abịakwute unu, aga m abịa nʼime ozuzu oke ngọzị nke Kraịst.
30 ⲗ̅ ϯϯϩⲟ ⲟⲩⲛ ⳿ⲉⲣⲱⲧⲉⲛ ⲛⲁ⳿ⲥⲛⲏⲟⲩ ⳿ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲉⲛ ⲡⲉⲛ⳪ Ⲓⲏ̅ⲥ̅ Ⲡⲭ̅ⲥ̅ ⲛⲉⲙ ⳿ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲉⲛ ϯ⳿ⲁⲅⲁⲡⲏ ⳿ⲛⲧⲉ ⲡⲓⲡ͞ⲛⲁ̅ ⳿ⲉ⳿ⲑⲣⲉⲧⲉⲛⲉⲣ⳿ⲁⲅⲱⲛⲓⲍⲉⲥⲑⲉ ⲛⲉⲙⲏⲓ ϧⲉⲛ ⲛⲉⲧⲉⲛ⳿ⲡⲣⲟⲥⲉⲩⲭⲏ ⳿ⲉ⳿ϩⲣⲏⲓ ⳿ⲉϫⲱⲓ ϩⲁ ⲫϯ.
Esi m nʼaka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya anyị nwere nʼime Mmụọ Nsọ na-arịọ unu, ụmụnna m, ka unu soro m na-ekpe ekpere, na-echetanụ m nʼekpere unu nʼihu Chineke.
31 ⲗ̅ⲁ̅ ϩⲓⲛⲁ ⳿ⲛⲧⲁⲛⲟϩⲉⲙ ⳿ⲉⲃⲟⲗ ϩⲁ ⲛⲏⲉⲧⲟⲓ ⳿ⲛⲁⲧⲥⲱⲧⲉⲙ ϧⲉⲛ ϯⲓⲟⲩⲇⲉ⳿ⲁ ⲟⲩⲟϩ ⲧⲁⲇⲓ⳿ⲁⲕⲟⲛⲓ⳿ⲁ ⳿ⲉ⳿ⲓⲗ̅ⲏ̅ⲙ̅ ⳿ⲛⲧⲉⲥϣⲱⲡⲓ ⲉⲥϣⲏⲡ ⳿ⲉⲛⲓⲁⲅⲓⲟⲥ.
Ka a dọpụta m nʼaka ndị na-ekweghị ekwe nọ na Judịa. Ka ọrụ m maka Jerusalem bụrụ ihe ndị nsọ nọ ebe ahụ ga-anabata.
32 ⲗ̅ⲃ̅ ϩⲓⲛⲁ ⲁⲓϣⲁⲛ⳿ⲓ ϩⲁⲣⲱⲧⲉⲛ ϧⲉⲛ ⲟⲩⲣⲁϣⲓ ⳿ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲉⲛ ⲡⲉⲧⲉϩⲛⲉ ⲫϯ ⲟⲩⲟϩ ⳿ⲛⲧⲁ⳿ⲙⲧⲟⲛ ⳿ⲙⲙⲟⲓ ⲛⲉⲙⲱⲧⲉⲛ.
Ka ọ ga-abụ site nʼuche Chineke, aga m abịakwute unu nʼọṅụ kurukwa ume ndụ na nnọkọ mụ na unu.
33 ⲗ̅ⲅ̅ ⲫϯ ⲇⲉ ⳿ⲛⲧⲉ ϯϩⲓⲣⲏⲛⲏ ⳿ϥⲭⲏ ⲛⲉⲙⲱⲧⲉⲛ ⲧⲏⲣⲟⲩ ⲁⲙⲏⲛ
Ka Chineke ahụ na-enye udo, nọnyere unu niile. Amen.

< ⲚⲒⲢⲰⳘⲈⲞⲤ 15 >