< Ϯ⳰ⲀⲠⲞⲔⲀⲖⲨⳘⲮⲒⲤ 1 >

1 ⲁ̅ ϯⲁⲡⲟⲅⲁⲗⲩⲙⲯⲓⲥ ⳿ⲛⲧⲉ Ⲓⲏ̅ⲥ̅ Ⲡⲭ̅ⲥ̅ ⲑⲏ ⲉⲧⲁ ⲫϯ ⲧⲏⲓⲥ ⲛⲁϥ ⳿ⲉⲧⲁⲙⲉ ⲛⲉϥ⳿ⲉⲃⲓⲁⲓⲕ ⳿ⲉⲛⲏⲉⲧⲥⲉ⳿ⲙ⳿ⲡϣⲁ ⳿ⲛⲧⲟⲩϣⲱⲡⲓ ⳿ⲛⲭⲱⲗⲉⲙ ⲟⲩⲟϩ ⲁϥϯⲙⲏⲓⲛⲓ ⳿ⲉⲣⲱⲟⲩ ⳿ⲉⲁϥⲧⲁⲟⲩⲱⲟⲩ ⳿ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲟⲧϥ ⳿ⲙⲡⲉϥⲁⲅⲅⲉⲗⲟⲥ ⳿ⲙⲡⲉϥⲃⲱⲕ ⲓⲱⲁⲛⲛⲏⲥ.
Mkpughe banyere Jisọs Kraịst, nke Chineke nyere ya igosi ndị ohu ya, ime ka ha mata ihe ndị ahụ na-aga ime nʼoge na-adịghị anya. O mere ka amata nke a site na izite mmụọ ozi ya ka ọ bịakwute ohu ya Jọn,
2 ⲃ̅ ⲫⲏⲉⲧⲁϥⲉⲣⲙⲉⲑⲣⲉ ⳿ⲙⲡⲓⲥⲁϫⲓ ⳿ⲛⲧⲉ ⲫϯ ⲛⲉⲙ ϯⲙⲉⲧⲙⲉⲑⲣⲉ ⳿ⲛⲧⲉ Ⲓⲏ̅ⲥ̅ Ⲡⲭ̅ⲥ̅ ⳿ⲛⲛⲏⲉⲧⲁϥⲛⲁⲩ ⳿ⲉⲣⲱⲟⲩ.
onye a gbara ama banyere ihe niile ọ hụrụ, okwu Chineke, na ọgbụgba ama Jisọs Kraịst.
3 ⲅ̅ ⲱⲟⲩ⳿ⲛⲓⲁⲧⲟⲩ ⳿ⲛⲛⲏⲉⲧⲱϣ ⲛⲉⲙ ⲛⲏⲉⲧⲥⲱⲧⲉⲙ ⳿ⲉⲛⲓⲥⲁϫⲓ ⳿ⲛⲧⲉ ⲧⲁⲓ⳿ⲡⲣⲟⲫⲏⲧⲓ⳿ⲁ ⲟⲩⲟϩ ⲉⲧ⳿ⲁⲣⲉϩ ⲉⲛⲏⲉⲧ⳿ⲥϧⲏⲟⲩⲧ ϩⲓⲱⲧⲥ ⲡⲓⲥⲏⲟⲩ ⲅⲁⲣ ⲁϥϧⲱⲛⲧ.
Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-agụpụta okwu ndị a dị nʼamụma a. Ngọzị na-adịkwara ndị na-anụ ya, ma nabata ihe e dere nʼime ya nʼobi ha. Nʼihi na oge mmezu ha dị nso.
4 ⲇ̅ ⲓⲱⲁⲛⲛⲏⲥ ⳿ⲛϯⲍ̅ ⳿ⲛⲉⲕ⳿ⲕⲗⲏⲥⲓⲁ ⲛⲏⲉⲧⲭⲏ ϧⲉⲛ ϯⲁⲥⲓⲁ ⳿ⲡ⳿ϩⲙⲟⲧ ⲛⲱⲧⲉⲛ ⲛⲉⲙ ϯϩⲓⲣⲏⲛⲏ ⳿ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲟⲧϥ ⳿ⲙⲫⲏⲉⲧϣⲟⲡ ⲛⲉⲙ ⲫⲏ ⳿ⲉⲛⲁϥϣⲟⲡ ⲛⲉⲙ ⲡⲉⲑⲛⲏⲟⲩ ⲛⲉⲙ ⳿ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲉⲛ ⲡⲓⲍ̅ ⳿ⲙⲡ͞ⲛⲁ̅ ⲛⲏⲉⲧⲭⲏ ⳿ⲙⲡⲉ⳿ⲙⲑⲟ ⳿ⲙⲡⲓ⳿ⲑⲣⲟⲛⲟⲥ.
Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a, Na-edere ya nzukọ asaa dị na mpaghara Eshịa: Ka amara na udo nke sitere na Onye ahụ na-adị, Onye ahụ dịkwaarị, na Onye ahụ na-aga ịbịa dịrị unu, sitekwa nʼebe Mmụọ asaa ahụ na-eguzo nʼihu ocheeze ya,
5 ⲉ̅ ⲛⲉⲙ ⳿ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲉⲛ Ⲓⲏ̅ⲥ̅ Ⲡⲭ̅ⲥ̅ ⲡⲓⲙⲁⲣⲧⲩⲣⲟⲥ ⲡⲓⲡⲓⲥⲧⲟⲥ ⲡⲓϣⲁⲙⲓⲥⲓ ⳿ⲛⲧⲉ ⲛⲓⲣⲉϥⲙⲱⲟⲩⲧ ⲟⲩⲟϩ ⳿ⲡⲁⲣⲭⲱⲛ ⳿ⲛⲛⲓⲟⲩⲣⲱⲟⲩ ⲧⲏⲣⲟⲩ ⳿ⲛⲧⲉ ⳿ⲡⲕⲁϩⲓ ⲫⲏⲉⲧⲁϥⲙⲉⲛⲣⲓⲧⲉⲛ ⲟⲩⲟϩ ⲁϥϫⲟⲕⲙⲉⲛ ⳿ⲉⲃⲟⲗ ϧⲉⲛ ⲛⲉⲛⲛⲟⲃⲓ ⳿ⲛ⳿ϧⲣⲏⲓ ϧⲉⲛ ⲡⲉϥ⳿ⲥⲛⲟϥ.
sitekwa nʼaka Jisọs Kraịst, onye bụ onyeama kwesiri ntụkwasị obi, na onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilie, nakwa onye na-achị ndị eze niile nke ụwa. Nye onye ahụ hụrụ anyị nʼanya ma meekwa ka anyị site nʼọbara ya nwere onwe anyị pụọ na mmehie.
6 ⲋ̅ ⲟⲩⲟϩ ⲁϥⲑⲁⲙⲓⲟⲛ ⳿ⲛⲟⲩⲙⲉⲧⲟⲩⲣⲟ ⳿ⲙⲙⲉⲧⲟⲩⲏⲃ ⳿ⲙⲫϯ ⲡⲉϥⲓⲱⲧ ⲫⲏⲉⲧⲉⲫⲱϥ ⲡⲉ ⲡⲓⲱⲟⲩ ⲛⲉⲙ ⲡⲓⲁⲙⲁϩⲓ ϣⲁ ⲉⲛⲉϩ ⲁⲙⲏⲛ. (aiōn g165)
O mere ka anyị bụrụ alaeze, ndị nchụaja nye Nna ya bụ Chineke. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
7 ⲍ̅ ϩⲏⲡⲡⲉ ⳿ⲛⲑⲟϥ ⲡⲉⲑⲛⲏⲟⲩ ⲛⲉⲙ ⲛⲓϭⲏⲡⲓ ⲟⲩⲟϩ ⲉⲩ⳿ⲉⲛⲁⲩ ⳿ⲉⲣⲟϥ ⲧⲏⲣⲟⲩ ⳿ⲛϫⲉ ⲃⲁⲗ ⲛⲓⲃⲉⲛ ⲛⲉⲙ ⲛⲏⲉⲧⲁⲩⲑⲟⲕⲥϥ ⲟⲩⲟϩ ⲉⲩ⳿ⲉⲛⲁⲩ ⳿ⲉⲣⲟϥ ⲧⲏⲣⲟⲩ ⳿ⲛϫⲉ ⲛⲓⲫⲩⲗⲏ ⳿ⲛⲧⲉ ⳿ⲡⲕⲁϩⲓ ⲁⲙⲏⲛ.
“Lee, ọ na-abịa ya na igwe ojii. Anya niile ga-ahụkwa ya, ọ bụladị ndị ahụ niile mapuru ya ahụ, ha ga-ahụ ya.” Mmadụ niile nọ nʼụwa “ga-erukwa ụjụ nʼihi ya.”
8 ⲏ̅ ⳿ⲁⲛⲟⲕ ⲡⲉ ⲡⲓⲁⲗⲫⲁ ⲛⲉⲙ ⲡⲓⲱ ϯⲁⲣⲭⲏ ⲛⲉⲙ ⲡⲓϫⲱⲕ ⳿ⲉⲃⲟⲗ ⳿ϥϫⲱ ⳿ⲙⲙⲟⲥ ⳿ⲛϫⲉ Ⲡ⳪ ⲫϯ ⲫⲏⲉⲧϣⲟⲡ ⲫⲏ ⳿ⲉⲛⲁϥϣⲟⲡ ⲛⲉⲙ ⲫⲏⲉⲑⲛⲏⲟⲩ ⲡⲓⲡⲁⲛⲧⲟⲕⲣⲁⲧⲱⲣ.
Otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwuru, “Abụ m Alfa na Omega, onye na-adị, onye ahụ dịkwaarị, na onye ahụ na-aga ịbịa, bụ onye pụrụ ime ihe niile.”
9 ⲑ̅ ⳿ⲁⲛⲟⲕ ⲡⲉ ⲓⲱⲁⲛⲛⲏⲥ ⲡⲉⲧⲉⲛⲥⲟⲛ ⲟⲩⲟϩ ⲡⲉⲧⲉⲛ⳿ϣⲫⲏⲣ ϧⲉⲛ ⲛⲓϩⲟϫϩⲉϫ ϫⲉ ϯⲙⲉⲧⲟⲩⲣⲟ ⲛⲉⲙ ⲡⲓ⳿ⲁⲙⲟⲛⲓ ⳿ⲛⲧⲟⲧϥ ⲁⲩϧⲉⲛ Ⲓⲏ̅ⲥ̅ ⲁⲓϣⲱⲡⲓ ϧⲉⲛ ϯⲛⲏⲥⲟⲥ ⲑⲏ ⲉⲧⲟⲩⲙⲟⲩϯ ⳿ⲉⲣⲟⲥ ϫⲉ ⲡⲁⲑⲙⲱ ⲉⲑⲃⲉ ⲡⲓⲥⲁϫⲓ ⳿ⲛⲧⲉ ⲫϯ ⲛⲉⲙ ϯⲙⲉⲧⲙⲉⲑⲣⲉ ⳿ⲛⲧⲉ Ⲓⲏ̅ⲥ̅ Ⲡⲭ̅ⲥ̅.
Mụ onwe m, Jọn, nwanne unu nwoke, onye unu na ya na-enwekọ ahụhụ na nʼalaeze, na ntachiobi nke bụ oke anyị nʼime Jisọs. Anọ m nʼogbe ala ntakịrị mmiri gbara gburugburu a na-akpọ Patmọs nʼihi okwu Chineke na-agba ama banyere Kraịst.
10 ⲓ̅ ⲁⲓϣⲱⲡⲓ ϧⲉⲛ ⲟⲩⲡ͞ⲛⲁ̅ ϧⲉⲛ ⲡⲓ⳿ⲉϩⲟⲟⲩ ⳿ⲛⲧⲉ ϯⲕⲩⲣⲓⲁⲕⲏ ⲟⲩⲟϩ ⲁⲓⲥⲱⲧⲉⲙ ⳿ⲛⲥⲁⲙⲉⲛϩⲏⲓ ⳿ⲉⲟⲩⲛⲓϣϯ ⳿ⲛ⳿ⲥⲙⲏ ⳿ⲙ⳿ⲫⲣⲏϯ ⳿ⲛⲟⲩⲥⲁⲗⲡⲓⲅⲝ ⲉⲥϫⲱ ⳿ⲙⲙⲟⲥ ⲛⲏⲓ.
Nʼụbọchị Onyenwe anyị, anọ m nʼime Mmụọ ma nụ otu oke olu dara ụda dị ka opi ike nʼazụ m,
11 ⲓ̅ⲁ̅ ϫⲉ ⲛⲏⲉⲧⲉⲕⲛⲁⲥⲟⲑⲙⲟⲩ ⳿ⲥϧⲏⲧⲟⲩ ϩⲓ ⲟⲩϫⲱⲙ ⲟⲩⲟⲣⲡⲟⲩ ⳿ⲛϯⲍ̅ ⳿ⲛⲉⲕ⳿ⲕⲗⲏⲥⲓⲁ ⲉⲧϧⲉⲛ ϯⲁⲥⲓⲁ ⲉⲧⲉ ⲉⲫⲉⲥⲟⲥ ⲧⲉ ⲛⲉⲙ ⲥⲙⲩⲣⲛⲁ ⲛⲉⲙ ⲡⲉⲣⲅⲁⲙⲱⲛ ⲛⲉⲙ ⲑⲩⲁⲧⲏⲣⲁ ⲛⲉⲙ ⲥⲁⲣⲇⲓⲥ ⲛⲉⲙ ⲫⲓⲗⲁⲇⲉⲗⲫⲓⲁ ⲛⲉⲙ ⲗⲁⲟⲇⲓⲕⲓⲁ.
na-ekwu, “Dee ihe ị na-ahụ ugbu a nʼakwụkwọ zigara ya nzukọ asaa dị nʼEfesọs na Smyrna na Pegamọm na Tiatira na Sardis, na Filadelfia na Laodisia.”
12 ⲓ̅ⲃ̅ ⲟⲩⲟϩ ⲁⲓⲫⲟⲛϩⲧ ⲁⲓⲛⲁⲩ ⳿ⲉϯ⳿ⲥⲙⲏ ⲑⲏ ⳿ⲉⲛⲁⲥⲥⲁϫⲓ ⲛⲉⲙⲏⲓ ⲟⲩⲟϩ ⲉⲧⲁⲓⲫⲟⲛϩⲧ ⲁⲓⲛⲁⲩ ⳿ⲉⲍ̅ ⳿ⲛⲗⲩⲭⲛⲓⲁ ⳿ⲛⲛⲟⲩⲃ.
Mgbe m chigharịrị, lee anya ịhụ onye na-agwa m okwu, ahụrụ m ihe ịdọba oriọna asaa e ji ọlaedo kpụọ.
13 ⲓ̅ⲅ̅ ⲟⲩⲟϩ ϧⲉⲛ ⳿ⲑⲙⲏϯ ⳿ⲛⲛⲓⲗⲩⲭⲛⲓⲁ ⲟⲩ⳿ⲓⲛⲓ ⳿ⲛⲧⲉ ⲟⲩϣⲏⲣⲓ ⳿ⲛⲣⲱⲙⲓ ⳿ⲉⲟⲩⲟⲛ ⲟⲩⲡⲟⲧⲏⲣⲓⲟⲛ ⲧⲟⲓ ϩⲓⲱⲧϥ ⲟⲩⲟϩ ⲉϥⲙⲏⲣ ⳿ⲉϫⲉⲛ ⲛⲉϥⲙⲟϯ ⳿ⲛⲟⲩⲙⲟϫϧ ⳿ⲛⲛⲟⲩⲃ.
Nʼetiti ihe ịdọba oriọna ndị a, ahụrụ m otu onye yiri nwa nke mmadụ, ka o guzo. O yikwasịrị onwe ya uwe mwụda. Ma o nwere ihe okike na-acha ọlaedo e ji kee gburugburu obi ya.
14 ⲓ̅ⲇ̅ ⲧⲉϥⲁⲫⲉ ⲇⲉ ⲛⲉⲙ ⲡⲉϥϥⲱⲓ ⲉⲩⲟⲩⲟⲃϣ ⳿ⲙ⳿ⲫⲣⲏϯ ⳿ⲛⲟⲩⲥⲟⲣⲧ ⳿ⲛⲟⲩⲟⲃϣ ⲛⲉⲙ ⲟⲩⲭⲓⲱⲛ ⲟⲩⲟϩ ⲛⲉϥⲃⲁⲗ ⲥⲉⲟⲓ ⳿ⲙ⳿ⲫⲣⲏϯ ⳿ⲛⲟⲩϣⲁϩ ⳿ⲛ⳿ⲭⲣⲱⲙ.
Isi ya na agịrị isi ya na-acha vaa dịka ogho ọcha, dịka akụmmiri igwe. Anya ya abụọ yiri ire ọkụ na-enwusi ike.
15 ⲓ̅ⲉ̅ ⲟⲩⲟϩ ⲛⲉϥϭⲁⲗⲁⲩϫ ⳿ⲙ⳿ⲫⲣⲏϯ ⳿ⲛⲟⲩ ⲭⲁⲗⲕⲟⲗⲓⲃⲁⲛⲟⲥ ⲉϥⲫⲟⲥⲓ ϧⲉⲛ ⲟⲩ⳿ⲭⲣⲱⲙ ⲟⲩⲟϩ ⲧⲉϥ⳿ⲥⲙⲏ ⳿ⲙ⳿ⲫⲣⲏϯ ⳿ⲛ⳿ⲧ⳿ⲥⲙⲏ ⳿ⲛϩⲁⲛⲙⲏϣ ⳿ⲙⲙⲱⲟⲩ.
Ụkwụ ya abụọ dị ka bronz a nụchasịrị nnọọ nke ọma hichapụkwa ya. Olu okwu ya na-ada dị ka ụzụ mmiri na-achị achị.
16 ⲓ̅ⲋ̅ ⳿ⲉⲟⲩⲟⲛ ⲍ̅ ⳿ⲛⲥⲓⲟⲩ ϧⲉⲛ ⲧⲉϥϫⲓϫ ⳿ⲛⲟⲩ⳿ⲓⲛⲁⲙ ⲟⲩⲟϩ ⲟⲩⲥⲏϥⲓ ⲉⲥϩⲓⲟⲩ⳿ⲓ ⳿ⲛⲣⲟ ⲃ̅ ⲉⲥⲛⲏⲟⲩ ⳿ⲉⲃⲟⲗ ϧⲉⲛ ⲣⲱϥ ⲟⲩⲟϩ ⲡⲉϥϩⲟ ⲉϥⲉⲣⲟⲩⲱⲓⲛⲓ ⳿ⲙ⳿ⲫⲣⲏϯ ⳿ⲙ⳿ⲫⲣⲏ ϧⲉⲛ ⲧⲉϥϫⲟⲙ.
O jidere kpakpando asaa nʼaka nri ya, mma agha dị nkọ nwere ihu abụọ sikwa nʼọnụ ya na-apụta. Ihu ya na-egbu maramara dịka anyanwụ na-acha nʼike ya niile.
17 ⲓ̅ⲍ̅ ⲟⲩⲟϩ ϩⲟⲧⲉ ⲉⲧⲁⲓⲛⲁⲩ ⳿ⲉⲣⲟϥ ⲁⲓϩⲓⲧⲧ ⳿ⲉⲡⲉⲥⲏⲧ ϧⲁⲣⲁⲧⲟⲩ ⳿ⲛⲛⲉϥϭⲁⲗⲁⲩϫ ⲟⲩⲟϩ ⲁⲓⲉⲣ⳿ⲙ⳿ⲫⲣⲏϯ ⳿ⲛⲟⲩⲣⲉϥⲙⲱⲟⲩⲧ ⲟⲩⲟϩ ⲁϥⲧⲁⲗⲉ ⲧⲉϥϫⲓϫ ⳿ⲛⲟⲩ⳿ⲓⲛⲁⲙ ⳿ⲉϫⲱⲓ ⲉϥϫⲱ ⳿ⲙⲙⲟⲥ ϫⲉ ⳿ⲙⲡⲉⲣⲉⲣϩⲟϯ ⳿ⲁⲛⲟⲕ ⲡⲉ ⲡⲓϩⲟⲩⲓⲧ ⲛⲉⲙ ⲡⲓϧⲁ⳿ⲉ.
Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala nʼụkwụ ya dịka onye nwụrụ anwụ. Ma o weere aka nri ya metụ m nʼahụ na-ekwu sị, “Atụla egwu. Abụ m Mmalite na Ọgwụgwụ.
18 ⲓ̅ⲏ̅ ⲫⲏⲉⲧⲟⲛϧ ⲟⲩⲟϩ ⲁⲓⲙⲟⲩ ⲟⲩⲟϩ ϩⲏⲡⲡⲉ ϯⲱⲛϧ ϣⲁ ⲉⲛⲉϩ ⳿ⲛⲧⲉ ⲡⲓⲉⲛⲉϩ ⲟⲩⲟϩ ⲛⲓϣⲟϣⲧ ⳿ⲛⲧⲉ ⳿ⲫⲙⲟⲩ ⲛⲁⲩⲭⲏ ⳿ⲛⲧⲟⲧ ⲛⲉⲙ ⳿ⲁⲙⲉⲛϯ. (aiōn g165, Hadēs g86)
Abụ m onye ahụ na-adị ndụ. Anwụrụ m anwụ, ma lee, ana m adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ọ bụkwa m ji ọtụghe igodo nke ọnwụ na nke ọkụ ala mmụọ. (aiōn g165, Hadēs g86)
19 ⲓ̅ⲑ̅ ⳿ⲥϧⲁⲓ ⲟⲩⲛ ⳿ⲛⲛⲏⲉⲧⲉⲕⲛⲁⲛⲁⲩ ⳿ⲉⲣⲱⲟⲩ ⳿ⲛⲑⲱⲟⲩ ⲉⲑⲛⲁϣⲱⲡⲓ ⲙⲉⲛⲉⲛⲥⲁ ⲛⲁⲓ.
“Ya mere, detuo ihe niile ị hụrụla, ihe dị ugbu a na ihe gaje ime na mgbe na adịghị anya.
20 ⲕ̅ ⲡⲓⲙⲩⲥⲧⲏⲣⲓⲟⲛ ⳿ⲛⲧⲉ ⲡⲓⲍ̅ ⳿ⲛⲥⲓⲟⲩ ⲛⲏⲉⲧⲁⲕⲛⲁⲩ ⳿ⲉⲣⲱⲟⲩ ϩⲓ ⲧⲁϫⲓϫ ⳿ⲛⲟⲩ⳿ⲓⲛⲁⲙ ⲛⲉⲙ ϯⲍ̅ ⳿ⲛⲗⲩⲭⲛⲓⲁ ⳿ⲛⲛⲟⲩⲃ ⲡⲓⲍ̅ ⳿ⲛⲥⲓⲟⲩ ⲡⲓⲍ̅ ⳿ⲛⲁⲅⲅⲉⲗⲟⲥ ⳿ⲛⲧⲉ ϯⲍ̅ ⳿ⲛⲉⲕ⳿ⲕⲗⲏⲥⲓⲁ ⲟⲩⲟϩ ϯⲍ̅ ⳿ⲛⲗⲩⲭⲛⲓⲁ ⲉⲧⲁⲕⲛⲁⲩ ⳿ⲉⲣⲱⲟⲩ ⲍ̅ ⳿ⲛⲉⲕ⳿ⲕⲗⲏⲥⲓⲁ ⲛⲉ
Nke a bụ ihe omimi nke kpakpando asaa ahụ ị hụrụ nʼaka nri m, na ihe ịdọba oriọna asaa ndị ahụ pụtara. Kpakpando asaa ahụ bụ ndị mmụọ ozi ụlọ nzukọ asaa ahụ. Osisi oriọna asaa ahụ bụ ụlọ nzukọ ndị ahụ nʼonwe ha.

< Ϯ⳰ⲀⲠⲞⲔⲀⲖⲨⳘⲮⲒⲤ 1 >