< 撒迦利亞書 5 >

1 我又舉目觀看,見有一飛行的書卷。
Ọzọkwa, eleliri m anya elu, ma hụ akwụkwọ a fụkọrọ afụkọ nke na-efegharị efegharị.
2 他問我說:「你看見甚麼?」我回答說:「我看見一飛行的書卷,長二十肘,寬十肘。」
Ọ sịrị m, “Gịnị ka ị na-ahụ?” Azara m, “Ahụrụ m akwụkwọ a fụkọrọ afụkọ nke na-efegharị efegharị. Ogologo ya dị mita iri, obosara ya dịkwa mita ise.”
3 他對我說:「這是發出行在遍地上的咒詛。凡偷竊的必按卷上這面的話除滅;凡起假誓的必按卷上那面的話除滅。
Ọ gwara m, “Nke a bụ ọbụbụ ọnụ nke na-apụ na-ejezu nʼala ahụ niile. Nʼihi na dịka e si detuo ya, nʼotu akụkụ ya, a ga-esi nʼala a chụpụ ndị na-ezu ohi. Dịka e si deekwa ya nʼakụkụ nke ọzọ ya, onye ọ bụla na-aṅụ iyi ụgha ka a ga-esitekwa nʼala ahụ chụpụ.
4 萬軍之耶和華說:我必使這書卷出去,進入偷竊人的家和指我名起假誓人的家,必常在他家裏,連房屋帶木石都毀滅了。」
Ezipụla m ya, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, ‘Ọ ga-abanye nʼụlọ onye ọ bụla na-ezu ohi, na nʼụlọ ndị ji aha m na-aṅụ iyi ụgha. Ọ ga-anọgide nʼụlọ ahụ mebie ya kpamkpam. Ọ ga-emebi osisi na nkume niile e ji wuo ụlọ ahụ.’”
5 與我說話的天使出來,對我說:「你要舉目觀看,見所出來的是甚麼?」
Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu bịakwutere m sị, “Lelie anya gị elu hụrụ ihe na-aga ịpụta ìhè.”
6 我說:「這是甚麼呢?」他說:「這出來的是量器。」他又說:「這是惡人在遍地的形狀。」
Asịrị m, “Gịnị ka ọ bụ?” Ọ sịrị, “Ọ bụ nkata.” O kwukwara, “Nke a bụ mmehie nke ndị niile bi nʼala a.”
7 (我見有一片圓鉛被舉起來。)這坐在量器中的是個婦人。
Ngwangwa, e kpughepụrụ okwuchi nkata ahụ, ma lee, ahụrụ m otu nwanyị nọdụrụ ọdụ nʼime ya.
8 天使說:「這是罪惡。」他就把婦人扔在量器中,將那片圓鉛扔在量器的口上。
Ọ sịrị, “Nke a bụ ajọ omume.” O nughachiri ya azụ nʼime nkata ahụ werekwa okwuchi nkata ahụ kpuchie ya.
9 我又舉目觀看,見有兩個婦人出來,在她們翅膀中有風,飛得甚快,翅膀如同鸛鳥的翅膀。她們將量器抬起來,懸在天地中間。
Mgbe ahụ, eleliri m anya hụ ụmụ nwanyị abụọ ọzọ, ndị ikuku na-efe nku ha. Ha nwere nku dịka nku ụgbala. Ha buliri nkata ahụ elu nʼetiti eluigwe na ala.
10 我問與我說話的天使說:「她們要將量器抬到哪裏去呢?」
Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, “Ebee ka ha bu nkata ahụ na-aga?”
11 他對我說:「要往示拿地去,為它蓋造房屋;等房屋齊備,就把它安置在自己的地方。」
Ọ gwara m, “Ha bu ya na-aga Babilọn ebe ha ga-ewuru ya ụlọ. Mgbe ha wuchara ụlọ ahụ, ha ga-adọba nkata ahụ nʼelu ihe ndọkwasị.”

< 撒迦利亞書 5 >