< 詩篇 101 >

1 大衛的詩。 我要歌唱慈愛和公平; 耶和華啊,我要向你歌頌!
Abụ Ọma Devid. Aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị na ikpe gị ziri ezi; o Onyenwe anyị, ọ bụ gị ka m ga-abụku abụ otuto.
2 我要用智慧行完全的道。 你幾時到我這裏來呢? 我要存完全的心行在我家中。
Aga m enwe uche ị hụ na m biri ndụ na-enweghị ịta ụta ọbụla, olee mgbe ị ga-abịakwute m? Aga m ejikwa obi nke a na-agaghị ata ụta ọbụla jegharịa nʼime ụlọ m.
3 邪僻的事,我都不擺在我眼前; 悖逆人所做的事,我甚恨惡, 不容沾在我身上。
Agaghị m edo ihe jọgburu onwe ya nʼihu m. Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị. Agaghị m enwekwa oke nʼime ya.
4 彎曲的心思,我必遠離; 一切的惡人,我不認識。
Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso. Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla.
5 在暗中讒謗他鄰居的,我必將他滅絕; 眼目高傲、心裏驕縱的,我必不容他。
Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo, onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ; agaghị m anabata onye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga.
6 我眼要看國中的誠實人,叫他們與我同住; 行為完全的,他要伺候我。
Aga m elekwasị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼala a anya, ka mụ na ha biri; onye ahụ na-eje ije na-enweghị ịta ụta ọbụla ga-ejere m ozi.
7 行詭詐的,必不得住在我家裏; 說謊話的,必不得立在我眼前。
Onye ọbụla na-aghọ aghụghọ agaghị ebi nʼụlọ m; onye ọbụla na-ekwu okwu ụgha agaghị eguzokwa nʼihu m.
8 我每日早晨要滅絕國中所有的惡人, 好把一切作孽的從耶和華的城裏剪除。
Ụtụtụ niile ka m na-eme ka ha dere duu bụ ndị ajọ omume niile nọ nʼala a; Aga m ebipụ ndị niile na-eme ajọ ihe site nʼobodo Onyenwe anyị.

< 詩篇 101 >