< 彌迦書 5 >

1 成群的民哪,現在你要聚集成隊; 因為仇敵圍攻我們, 要用杖擊打以色列審判者的臉。
Ugbu a doo ndị agha gị nʼusoro, gị obodo nke usuu ndị agha, nʼihi na e jirila mgbidi gbaa gị gburugburu ibuso gị agha. Ha ga-eji mkpara tie onyendu Izrel na nti.
2 伯利恆的以法他啊, 你在猶大諸城中為小, 將來必有一位從你那裏出來, 在以色列中為我作掌權的; 他的根源從亙古,從太初就有。
“Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata, ọ bụ ezie na ị bụ obodo dị nta nʼetiti ndị ikwu Juda niile, ma onye ahụ ga-achị Izrel ga-esi na gị pụta, bụ onye ahụ mmalite ya sitere na mgbe ochie, sitekwa na mgbe ebighị ebi gara aga.”
3 耶和華必將以色列人交付敵人, 直等那生產的婦人生下子來。 那時掌權者其餘的弟兄 必歸到以色列人那裏。
Ya mere, a ga-arara ha nye tutu ruo mgbe onye ahụ ime na-eme mụpụtara nwa ya. Mgbe ahụ, ụmụnna ya niile ahụ fọdụrụ ga-alọghachikwuru ndị Izrel.
4 他必起來,倚靠耶和華的大能, 並耶和華-他上帝之名的威嚴, 牧養他的羊群。 他們要安然居住; 因為他必日見尊大,直到地極。
Ọ ga-eguzo zụọ igwe ewu na atụrụ ya, site nʼike nke Onyenwe anyị, na site nʼịdị ukwuu nke aha Onyenwe anyị Chineke ya. Ndị ya ga-anọkwa na-enweghị nsogbu, nʼihi na ịdị ukwuu ya ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa.
5 這位必作我們的平安。 當亞述人進入我們的地境, 踐踏宮殿的時候, 我們就立起七個牧者, 八個首領攻擊他。
Ọ ga-abụkwa udo anyị. Mgbe ndị Asịrịa ga-abata nʼala anyị nʼike, sikwa nʼebe niile e wusiri ike nke anyị na-agafe, anyị ga-ahọpụta ndị ọzụzụ atụrụ asaa, ọ bụladị ndịisi asatọ.
6 他們必用刀劍毀壞亞述地 和寧錄地的關口。 亞述人進入我們的地境踐踏的時候, 他必拯救我們。
Onye ga-eji mma agha chịa ala Asịrịa, jirikwa mma agha a mịpụtara amịpụta chịa ala Nimrọd. Ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị Asịrịa ahụ, mgbe ha ga-eji ike bata nʼala anyị, ma zọrọkwa ije gafee oke ala anyị.
7 雅各餘剩的人必在多國的民中, 如從耶和華那裏降下的露水, 又如甘霖降在草上; 不仗賴人力,也不等候世人之功。
Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb ga-adị nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ, dịka igirigi si nʼebe Onyenwe anyị nọ abịa, maọbụ dịka mmiri ozuzo ntakịrị na-ezokwasị ahịhịa, nke na-adịghị ele anya mmadụ maọbụ chere ụmụ mmadụ.
8 雅各餘剩的人必在多國多民中, 如林間百獸中的獅子, 又如少壯獅子在羊群中。 他若經過就必踐踏撕裂, 無人搭救。
Ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb ga-adịkwa nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ dị ka ọdụm nʼetiti anụ ọhịa niile dị iche iche, e, dịka nwa ọdụm nʼetiti igwe atụrụ, nke na-azọda na-adọkasị mgbe ọ na-agabiga, ma o nweghị onye ga-anapụta ya.
9 願你的手舉起,高過敵人! 願你的仇敵都被剪除!
Aka gị ga-adị elu na mmeri nke ndị iro ya, a ghakwaghị ịla ndị iro gị niile nʼiyi.
10 耶和華說:到那日, 我必從你中間剪除馬匹, 毀壞車輛,
“Nʼụbọchị ahụ kwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m ala ịnyịnya unu nʼiyi site nʼetiti unu, kụjisiekwa ụgbọala unu niile.
11 也必從你國中除滅城邑, 拆毀一切的保障,
Aga m ala obodo niile dị nʼala unu nʼiyi, dọdasịakwa ebe unu niile e wusiri ike.
12 又必除掉你手中的邪術; 你那裏也不再有占卜的。
Aga m ala mgbaasị unu nʼiyi, unu agaghị enwekwa ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase.
13 我必從你中間除滅雕刻的偶像和柱像, 你就不再跪拜自己手所造的。
Aga m ala arụsị a pịrị apị unu niile nʼiyi, ya na nkume nsọ ahụ niile dị nʼetiti unu. Unu agakwaghị akpọ isiala nye ihe unu ji aka unu kpụọ.
14 我必從你中間拔出木偶, 又毀滅你的城邑。
Aga m ehopu ogidi arụsị niile nke dị nʼetiti unu, mgbe m ga-akụdasị obodo unu niile
15 我也必在怒氣和忿怒中向那不聽從的列國施報。
Aga m esite nʼoke iwe m na ọnụma m bọọrọ onwe m ọbọ nʼahụ mba niile ndị ahụ jụrụ irubere m isi.”

< 彌迦書 5 >