< 诗篇 94 >

1 耶和华啊,你是伸冤的 神; 伸冤的 神啊,求你发出光来!
O Onyenwe anyị, Chineke onye na-abọ ọbọ, o Chineke, onye na-abọ ọbọ, zipụta onwe gị.
2 审判世界的主啊,求你挺身而立, 使骄傲人受应得的报应!
Bilie, o Onye Ikpe nke ụwa; kwụghachi ndị nganga ụgwọ ọrụ ruuru ha.
3 耶和华啊,恶人夸胜要到几时呢? 要到几时呢?
Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe? Ọ bụ ruo ole mgbe ka ndị na-eme ajọ omume ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ?
4 他们絮絮叨叨说傲慢的话; 一切作孽的人都自己夸张。
Ha na-ekwuwapụ okwu mpako; ndị niile na-eme ajọ ihe jupụtara nʼitu ọnụ.
5 耶和华啊,他们强压你的百姓, 苦害你的产业。
Ha na-azọpịa ndị gị, O Onyenwe anyị; ha na-emegbu ihe nketa gị.
6 他们杀死寡妇和寄居的, 又杀害孤儿。
Ha na-egbu ndị di ha nwụrụ na ndị ọbịa; ha na-egbu ndị na-enweghị nna.
7 他们说:耶和华必不看见; 雅各的 神必不思念。
Ha na-asị, “Onyenwe anyị anaghị ahụ ihe ndị a; Chineke Jekọb na-agba nkịtị.”
8 你们民间的畜类人当思想; 你们愚顽人到几时才有智慧呢?
Lezienụ anya, unu ndị amamihe kọrọ nʼetiti ndị m; unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-amụta ihe?
9 造耳朵的,难道自己不听见吗? 造眼睛的,难道自己不看见吗?
Ọ pụtara na onye kpụrụ ntị anaghị anụ ihe? Ọ pụtara na onye kere anya anaghị ahụ ụzọ?
10 管教列邦的,就是叫人得知识的, 难道自己不惩治人吗?
Ọ pụtara na onye na-adọ mba niile aka na ntị agaghị ata ha ahụhụ? Ọ pụtara na onye na-ezi mmadụ ihe enweghị ihe ọmụma?
11 耶和华知道人的意念是虚妄的。
Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ; ọ maara na ihe mmadụ na-eche nʼobi ya bụ naanị ihe na-enweghị isi.
12 耶和华啊,你所管教、 用律法所教训的人是有福的!
Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye ị na-adọ aka na ntị, O Onyenwe anyị, onye ahụ ị na-akụziri ihe site nʼiwu gị;
13 你使他在遭难的日子得享平安; 惟有恶人陷在所挖的坑中。
ị na-enye ya izuike site nʼụbọchị nsogbu; tutu ruo mgbe a ga-egwuru ndị ajọ omume olulu.
14 因为耶和华必不丢弃他的百姓, 也不离弃他的产业。
Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị ajụ ndị ya; ọ gaghị agbakụta ihe nketa ya azụ.
15 审判要转向公义; 心里正直的,必都随从。
Ezi omume ga-abụ ntọala ikpe ikpe niile; ndị niile ndị ziri ezi nʼobi ga-agbasokwa ya.
16 谁肯为我起来攻击作恶的? 谁肯为我站起抵挡作孽的?
Onye ga-ebiliri m imegide ndị ajọ omume? Onye ga-eguzo nʼọnọdụ m imegide ndị na-eme ajọ ihe?
17 若不是耶和华帮助我, 我就住在寂静之中了。
A sị na Onyenwe anyị abịaghị nyere m aka, agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ.
18 我正说我失了脚, 耶和华啊,那时你的慈爱扶助我。
Mgbe m kwuru sị, “Ụkwụ m na-agbuchapụ,” ọ bụ ịhụnanya gị, O Onyenwe anyị, kwagidere m.
19 我心里多忧多疑, 你安慰我,就使我欢乐。
Mgbe oke nchekasị obi batara nʼime m, nkasiobi gị wetara mkpụrụobi m ọṅụ.
20 那借着律例架弄残害、 在位上行奸恶的,岂能与你相交吗?
A ga-ejikọta gị na ocheeze ọchịchị ya rụrụ arụ, nke na-eweta mmekpa ahụ site nʼiwu ya?
21 他们大家聚集攻击义人, 将无辜的人定为死罪。
Ndị ajọ omume na-ejikọta onwe ha imegide ndị ezi omume na-amakwa ndị aka ha dị ọcha ikpe ọnwụ.
22 但耶和华向来作了我的高台; 我的 神作了我投靠的磐石。
Ma Onyenwe anyị a bụrụla ebe mgbaba e wusiri ike nye m, na Chineke m na oke nkume ebe m na-ezere ndụ.
23 他叫他们的罪孽归到他们身上。 他们正在行恶之中,他要剪除他们; 耶和华—我们的 神要把他们剪除。
Ọ ga-akwụghachi ha ụgwọ ọrụ kwesiri mmehie ha, lakwaa ha nʼiyi nʼihi ajọ omume ha; Onyenwe anyị Chineke anyị ga-ala ha nʼiyi.

< 诗篇 94 >