< 诗篇 35 >

1 大卫的诗。 耶和华啊,与我相争的,求你与他们相争! 与我相战的,求你与他们相战!
Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, lụso ha ọgụ bụ ndị na-alụso m ọgụ; buso ha agha bụ ndị na-ebuso m agha.
2 拿着大小的盾牌, 起来帮助我。
Yikwasị uwe agha gị, werekwa ọta gị; bilie bịa nyere m aka.
3 抽出枪来,挡住那追赶我的; 求你对我的灵魂说:我是拯救你的。
Sepụta ùbe gị na anyụike agha gị; bịa zute ndị na-achụ m ọsọ. Gwa mkpụrụobi m, “Abụ m nzọpụta gị.”
4 愿那寻索我命的,蒙羞受辱! 愿那谋害我的,退后羞愧!
Mee ka ihere mee ndị niile na-agbalịsị ike igbu m. Ka ndị na-agba izuzu igbu m bụrụkwa ndị a chụghachiri azụ, na ndị ihere mere.
5 愿他们像风前的糠, 有耶和华的使者赶逐他们。
Ka ha dịka igbugbo ọka mgbe oke ifufe na-efe, ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụfu ha.
6 愿他们的道路又暗又滑, 有耶和华的使者追赶他们。
Mee ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, bụrụkwa ebe na-amị amị; ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụ ha ọsọ.
7 因他们无故地为我暗设网罗, 无故地挖坑,要害我的性命。
Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ha, ma ha siere m ọnya, gwukwaara m olulu nʼụzọ m.
8 愿灾祸忽然临到他身上! 愿他暗设的网缠住自己! 愿他落在其中遭灾祸!
Ka mbibi bịakwasị ha na mberede, ka ụgbụ ha zobeere m kee ha; ka ha lakwaa nʼiyi site nʼidaba nʼolulu ahụ ha gwuru.
9 我的心必靠耶和华快乐, 靠他的救恩高兴。
Mgbe ahụ, mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ na Onyenwe anyị, ọ ga-enwekwa obi ụtọ nʼime nzọpụta ya.
10 我的骨头都要说: 耶和华啊,谁能像你 救护困苦人脱离那比他强壮的, 救护困苦穷乏人脱离那抢夺他的?
Ihe niile dị nʼime m ga-eti mkpu sị, “O Onyenwe anyị, ọ bụ onye dịka gị? Ị na-agbapụta ndị na-adịghị ike site nʼaka ndị dị ike karịa ha, ma na-anapụta ndị ogbenye ndị chọrọ enyemaka site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ha nwere nʼike.”
11 凶恶的见证人起来, 盘问我所不知道的事。
Ndị akaebe, ndị kwara obi nʼazụ na-apụkwute m; ha na-ebo m ebubo ihe ndị m na-anụbeghị ihe banyere ha na mbụ.
12 他们向我以恶报善, 使我的灵魂孤苦。
Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ. Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ.
13 至于我,当他们有病的时候, 我便穿麻衣,禁食,刻苦己心; 我所求的都归到自己的怀中。
Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe, site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala. Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa,
14 我这样行,好像他是我的朋友,我的弟兄; 我屈身悲哀,如同人为母亲哀痛。
ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m, jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asị na ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ.
15 我在患难中,他们却欢喜,大家聚集。 我所不认识的那些下流人聚集攻击我; 他们不住地把我撕裂。
Ma mgbe m dahiere, ha zukọtara na-aṅụrị ọṅụ; mgbe m na-adịghị ele anya, ha biliri imegide m. Ha na-ekwulu m na-esepụghị aka.
16 他们如同席上好嬉笑的狂妄人向我咬牙。
Dịka ndị ajọ omume, ha na-akwa m emo nʼiwe, na-atakwara m ikikere eze ha.
17 主啊,你看着不理要到几时呢? 求你救我的灵魂脱离他们的残害! 救我的生命脱离少壮狮子!
O Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-ele ihe na-eme? Gbapụta ndụ m site na mbibi ha niile, site nʼaka ụmụ ọdụm ndị a, gbapụta ndụ m dị oke ọnụahịa.
18 我在大会中要称谢你, 在众民中要赞美你。
Aga m enye gị ekele nʼihu ọha mmadụ dị ukwuu, nʼetiti ọha kachasị ibe ya dị ukwuu, ka m ga-anọ too gị.
19 求你不容那无理与我为仇的向我夸耀! 不容那无故恨我的向我挤眼!
Ekwekwala ka ndị ahụ bụ ndị iro m, mgbe o nweghị ihe m mere ha, chịa m ọchị; ekwekwala ka ndị ahụ kpọrọ m asị nʼihi iro, mgbe o nweghị ihe m mere ha nwee izuike.
20 因为他们不说和平话, 倒想出诡诈的言语害地上的安静人。
Nʼihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu, kama ha na-echepụta ebubo ụgha dị iche iche megide ndị ahụ na-anọrọ onwe ha jụụ nʼime ala ahụ.
21 他们大大张口攻击我,说: 阿哈,阿哈,我们的眼已经看见了!
Nʼiju anya, ha na-ele m anya na-eti mkpu na-asị, “Ewoo! Ewoo! Anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ya.”
22 耶和华啊,你已经看见了,求你不要闭口! 主啊,求你不要远离我!
O Onyenwe anyị, ị hụla nke a, agbakwala nkịtị; anọkwala m nʼebe dị anya, O Onyenwe anyị.
23 我的 神我的主啊,求你奋兴醒起, 判清我的事,伸明我的冤!
Teta, bilie bụụrụ m onye mkpepụta m. Kpechitere m ọnụ m, Chineke m na onyenwe m.
24 耶和华—我的 神啊,求你按你的公义判断我, 不容他们向我夸耀!
O Onyenwe anyị Chineke m, kpepụta m nʼihi ezi omume gị; ekwekwala ka ha chịa m ọchị.
25 不容他们心里说:阿哈,遂我们的心愿了! 不容他们说:我们已经把他吞了!
Ekwekwala ka ha sị, “Ahaa, ọ dị ka anyị tụrụ anya ya!” Maọbụ sị, “Anyị eloola ya!”
26 愿那喜欢我遭难的一同抱愧蒙羞! 愿那向我妄自尊大的披惭愧,蒙羞辱!
Mee ka ihere na ọgbaaghara bụrụ nke ndị na-achị m ọchị nʼime mkpagbu m; were ihere na nweda nʼala yinye ha dịka uwe, bụ ndị niile na-ebuli onwe ha elu imegide m.
27 愿那喜悦我冤屈得伸的欢呼快乐; 愿他们常说:当尊耶和华为大! 耶和华喜悦他的仆人平安。
Ka ndị niile mkpepụta m dị mma were obi ụtọ tie mkpu ọṅụ; ka ha na-asị mgbe niile, “Ka e bulie Onyenwe anyị elu, onye ọdịmma nke ohu ya na-amasị.”
28 我的舌头要终日论说你的公义, 时常赞美你。
Ire m ga-ekwu banyere ezi omume gị na otuto gị niile ogologo ụbọchị niile.

< 诗篇 35 >