< 诗篇 32 >

1 大卫的训诲诗。 得赦免其过、遮盖其罪的, 这人是有福的!
Abụ Ọma Devid. Abụ Maskil. Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye a gbaghaara ajọ omume ya niile, onye e kpuchikwaara mmehie ya niile.
2 凡心里没有诡诈、耶和华不算为有罪的, 这人是有福的!
Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya, onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya.
3 我闭口不认罪的时候, 因终日唉哼而骨头枯干。
Mgbe m gbachiri nkịtị, ọkpụkpụ m rere ure site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile.
4 黑夜白日,你的手在我身上沉重; 我的精液耗尽,如同夏天的干旱。 (细拉)
Ehihie niile na abalị niile, ị tara m ahụhụ, ume dị m nʼobi gwụchara, dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị. (Sela)
5 我向你陈明我的罪, 不隐瞒我的恶。 我说:我要向耶和华承认我的过犯, 你就赦免我的罪恶。 (细拉)
Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị, kwụsịkwa izo ha ezo. Agwara m onwe m okwu sị, “Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.” Ị gbaghakwaara m ikpe ọmụma nke mmehie m niile. (Sela)
6 为此,凡虔诚人都当趁你可寻找的时候祷告你; 大水泛溢的时候,必不能到他那里。
Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere mgbe e nwere ike ịchọta gị; nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa, ọ gaghị erute ha.
7 你是我藏身之处; 你必保佑我脱离苦难, 以得救的乐歌四面环绕我。 (细拉)
Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo; Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso. Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. (Sela)
8 我要教导你,指示你当行的路; 我要定睛在你身上劝戒你。
Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso; Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị.
9 你不可像那无知的骡马, 必用嚼环辔头勒住它; 不然,就不能驯服。
Adịkwala ka ịnyịnya maọbụ ịnyịnya ibu nke na-enweghị akọnuche, nke a na-aghaghị iji mkpụmkpụ igwe na eriri kechie ọnụ ya, ijide ya, ma emeghị otu a, ọ gaghị abịakwute gị.
10 恶人必多受苦楚; 惟独倚靠耶和华的必有慈爱四面环绕他。
Ọtụtụ ihe mgbu na-abịakwasị ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ịhụnanya Onyenwe anyị nke na-enweghị ọgwụgwụ, na-agba onye ahụ tụkwasịrị ya obi gburugburu.
11 你们义人应当靠耶和华欢喜快乐; 你们心里正直的人都当欢呼。
Ṅụrianụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume; bụọ abụ, unu ndị obi ha ziri ezi.

< 诗篇 32 >