< 民数记 13 >

1 耶和华晓谕摩西说:
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 “你打发人去窥探我所赐给以色列人的迦南地,他们每支派中要打发一个人,都要作首领的。”
“Ziga ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa legharịa anya nʼala Kenan, ala ahụ m na-enye Izrel. Ziga mmadụ iri na abụọ, otu onyendu site nʼebo Izrel ọbụla.”
3 摩西就照耶和华的吩咐从巴兰的旷野打发他们去;他们都是以色列人的族长。
Ya mere, dịka iwu Onyenwe anyị nyere ya si dị, Mosis zipụrụ ha site nʼọzara Paran. Ha niile bụ ndị ndu nʼetiti ụmụ Izrel.
4 他们的名字:属吕便支派的有撒刻的儿子沙母亚。
Nke a bụ aha ha: Site nʼebo Ruben, Shamua nwa Zakua,
5 属西缅支派的有何利的儿子沙法。
Shafat nwa Hori, onye si nʼebo Simiọn.
6 属犹大支派的有耶孚尼的儿子迦勒。
Kaleb nwa Jefune, onye si nʼebo Juda.
7 属以萨迦支派的有约色的儿子以迦。
Igal nwa Josef, onye si nʼebo Isaka.
8 属以法莲支派的有嫩的儿子何希阿。
Hoshea nwa Nun, onye si nʼebo Ifrem
9 属便雅悯支派的有拉孚的儿子帕提。
Palti nwa Rafu, onye si nʼebo Benjamin.
10 属西布伦支派的有梭底的儿子迦叠。
Gadiel nwa Sodi, onye si nʼebo Zebụlọn.
11 约瑟的子孙,属玛拿西支派的有稣西的儿子迦底。
Gadi nwa Susi, onye sitere nʼebo Manase (ya bụ ebo Josef).
12 属但支派的有基玛利的儿子亚米利。
Amiel nwa Gemali, onye si nʼebo Dan.
13 属亚设支派的有米迦勒的儿子西帖。
Setua nwa Maikel, onye si nʼebo Asha.
14 属拿弗他利支派的有缚西的儿子拿比。
Nabi nwa Vofusi, onye si nʼebo Naftalị.
15 属迦得支派的有玛基的儿子臼利。
Geuel nwa Maki, onye si nʼebo Gad.
16 这就是摩西所打发、窥探那地之人的名字。摩西就称嫩的儿子何希阿为约书亚。
Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ Mosis zipụrụ inyocha ala ahụ. (Ọ bụ nʼoge a ka Mosis gbanwere aha Hoshea nwa Nun, ka ọ bụrụ Joshua.)
17 摩西打发他们去窥探迦南地,说:“你们从南地上山地去,
Mosis zipụrụ ha ịga ledoo ala Kenan, ọ sịrị, “Gbagoonụ site nʼụzọ Negev gakwanụ nʼala ugwu ugwu.
18 看那地如何,其中所住的民是强是弱,是多是少,
Letanụ otu ala ahụ dị. Chọpụtanụ ụdị ndị bi nʼime ya, ma ha dị ike ma ha bụ ndị na-adịghị ike, ma ha dị ọtụtụ ma ha dị ole na ole.
19 所住之地是好是歹,所住之处是营盘是坚城。
Letanụ ụdị ala ha bi nʼime ya, ma ọ dị mma ma ọ jọrọ njọ. Chọpụtanụ ụdị obodo dị nʼebe ahụ, ma ha bụ obodo mgbidi na-adịghị gburugburu ha, ma ha bụ obodo e wusiri ike.
20 又看那地土是肥美是瘠薄,其中有树木没有。你们要放开胆量,把那地的果子带些来。”(那时正是葡萄初熟的时候。)
Letanụ otu ala ahụ dị. Ọ na-epupụta ihe ka ọ bụ ala ụkpa? Letanụ ma ha nwere ọtụtụ osisi ka ọ bụ na osisi adịghị nʼime ya. Gbalịanụ ka unu weta ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi dị nʼala ahụ.” (Ọ bụ oge mkpụrụ mbụ nke osisi vaịnị.)
21 他们上去窥探那地,从寻的旷野到利合,直到哈马口。
Ya mere ndị a gara ledoo ala ahụ anya site nʼọzara Zin ruo na Rehob, nke dị nso na Lebo Hamat.
22 他们从南地上去,到了希伯 ;在那里有亚衲族人亚希幔、示筛、挞买。(原来希伯 城被建造比埃及的锁安城早七年。)
Ha gara site na Negev rute Hebrọn, ebe Ahiman na Sheshai na Talmai, ụmụ ụmụ Anak bi. (Ma ewuru Hebrọn afọ asaa tupu e wuo obodo Zoan dị nʼIjipt.)
23 他们到了以实各谷,从那里砍了葡萄树的一枝,上头有一挂葡萄,两个人用杠抬着,又带了些石榴和无花果来。(
Mgbe ha rutere Ndagwurugwu Eshkọl, ha gbutere otu alaka osisi vaịnị nke nwere ụyọkọ mkpụrụ vaịnị. Mmadụ abụọ butere ya nʼosisi tinyere ụfọdụ mkpụrụ osisi pomegranet na fiig.
24 因为以色列人从那里砍来的那挂葡萄,所以那地方叫做以实各谷。)
A kpọrọ ebe ahụ Ndagwurugwu Eshkọl, nʼihi ụyọkọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị Izrel gbutere nʼebe ahụ.
25 过了四十天,他们窥探那地才回来,
Mgbe iri abalị anọ gasịrị, ndị nledo a sitere nʼije ha lọghachi.
26 到了巴兰旷野的加低斯,见摩西、亚伦,并以色列的全会众,回报摩西、亚伦,并全会众,又把那地的果子给他们看;
Ha lọtara bịakwute Mosis na Erọn na nzukọ niile nke ụmụ Izrel, na Kadesh nke dị nʼọzara Paran. Ndị nledo ahụ kọrọ akụkọ otu ha si gaa nʼọgbakọ ụmụ Izrel niile. Gosikwa mkpụrụ osisi si nʼala ahụ.
27 又告诉摩西说:“我们到了你所打发我们去的那地,果然是流奶与蜜之地;这就是那地的果子。
Nke a bụ akụkọ ha kọọrọ Mosis, “Anyị ruru nʼala ahụ ị sị anyị gaa leta. Ọ bụkwa ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ndị a bụ mkpụrụ osisi si nʼala ahụ.
28 然而住那地的民强壮,城邑也坚固宽大,并且我们在那里看见了亚衲族的人。
Ma ndị bi nʼobodo ahụ siri ike. Obodo ha buru ibu bụrụkwa nke e wusiri ike. Anyị hụkwara ụmụ ụmụ Anak nʼebe ahụ.
29 亚玛力人住在南地;赫人、耶布斯人、亚摩利人住在山地;迦南人住在海边并约旦河旁。”
Ndị Amalek bi na Negev, ndị Het na ndị Jebus na ndị Amọrait bi nʼala ugwu ugwu. Ma nʼakụkụ osimiri Mediterenịan na ndagwurugwu mmiri Jọdan ka ndị Kenan bi.”
30 迦勒在摩西面前安抚百姓,说:“我们立刻上去得那地吧!我们足能得胜。”
Ma Kaleb kwuru okwu mere ka obi sie ndị Izrel ike nʼoge a ha guzoro nʼihu Mosis sị ha, “Ka anyị gaanụ otu ihu nweta ala ahụ. Nʼihi na anyị nwere ike imeri ha.”
31 但那些和他同去的人说:“我们不能上去攻击那民,因为他们比我们强壮。”
Ma ndị nledo ahụ soro ya gaa zara sị, “Anyị enweghị ike ibu agha megide ndị a; ha dị ike karịa anyị.”
32 探子中有人论到所窥探之地,向以色列人报恶信,说:“我们所窥探、经过之地是吞吃居民之地,我们在那里所看见的人民都身量高大。
Ndị a gbasara akụkọ ọjọọ nʼetiti ụmụ Izrel banyere ala ahụ ha gara ledoo. Ha sịrị, “Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala na-eripịa ndị bi nʼime ya. Ndị niile anyị hụrụ nʼebe ahụ gbara nnọọ dimkpa
33 我们在那里看见亚衲族人,就是伟人;他们是伟人的后裔。据我们看,自己就如蚱蜢一样;据他们看,我们也是如此。”
Anyị hụrụ ndị Nefilim nʼebe ahụ (ndị bụ ụmụ ụmụ Anak, ndị sitere na ndị Nefilim). Nʼanya anyị, anyị dịka ụkpana nʼebe ha nọ, otu a ka anyị dịkwa nʼanya ha.”

< 民数记 13 >