< 以赛亚书 20 >

1 亚述王撒珥根打发他珥探到亚实突的那年,他珥探就攻打亚实突,将城攻取。
Nʼafọ ahụ, Sagọn, eze Asịrịa, zipụrụ ọchịagha onye ọkwa ya kasị ukwuu, ka ọ gaa buso Ashdọd agha. Ọ gara meriekwa ya nʼagha.
2 那时,耶和华晓谕亚摩斯的儿子以赛亚说:“你去解掉你腰间的麻布,脱下你脚上的鞋。”以赛亚就这样做,露身赤脚行走。
Nʼoge ahụ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ Aịzaya nwa Emọz. Ọ sịrị ya, “Yipụ uwe mkpe iyi nʼahụ, ya na akpụkpọụkwụ dị gị nʼụkwụ.” O mere otu a, ọ gbaara ọtọ, jegharịakwa nʼụkwụ efu.
3 耶和华说:“我仆人以赛亚怎样露身赤脚行走三年,作为关乎埃及和古实的预兆奇迹。
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Dị ka ohu m Aịzaya si gbara ọtọ jegharịa nʼụkwụ efu afọ atọ ndị a niile, ọ bụ ihe ama na ihe ịdọ aka na ntị na-egosi ihe gaje ịbịakwasị ndị Ijipt na ndị Kush.
4 照样,亚述王也必掳去埃及人,掠去古实人,无论老少,都露身赤脚,现出下体,使埃及蒙羞。
Nʼihi na otu a ka eze Asịrịa ga-esi kpụrụ ndị Ijipt na ndị Kush ọ dọtara nʼagha. Ha ga-agba ọtọ na-ejegharị nʼụkwụ efu, ma nwantakịrị ma okenye. Otule ha gba ọtọ ga-abụrụ Ijipt ihe ihere.
5 以色列人必因所仰望的古实,所夸耀的埃及,惊惶羞愧。
Egwu ga-ejide ndị ahụ niile nwere nchekwube nʼike Kush, na ndị ahụ niile jiri Ijipt nyaa isi ga-ada mba. Ihere ga-emekwa ha.
6 “那时,这沿海一带的居民必说:‘看哪,我们素所仰望的,就是我们为脱离亚述王逃往求救的,不过是如此!我们怎能逃脱呢?’”
Nʼụbọchị ahụ, ndị ahụ dịnyeere ha, bụ ndị bi nʼọnụ mmiri ha ga-asị, ‘Ọ bụrụ na ihe dị otu a dakwasịrị ndị Ijipt anyị tụkwasịrị obi inyere anyị aka, na ịnapụta anyị site nʼaka eze Asịrịa, ebeekwanụ ka anyị ga-agbaga?’”

< 以赛亚书 20 >