< 以赛亚书 2 >

1 亚摩斯的儿子以赛亚得默示,论到犹大和耶路撒冷。
Nke a bụ ihe Aịzaya nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jerusalem.
2 末后的日子,耶和华殿的山必坚立, 超乎诸山,高举过于万岭; 万民都要流归这山。
Nʼụbọchị ikpeazụ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ga-abụ nke eguzobere dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile, a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile, mba niile dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi.
3 必有许多国的民前往,说: 来吧,我们登耶和华的山, 奔雅各 神的殿。 主必将他的道教训我们; 我们也要行他的路。 因为训诲必出于锡安; 耶和华的言语必出于耶路撒冷。
Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa, “Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị, ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb. Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya niile, ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.” Iwu ga-esi na Zayọn pụta, okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.
4 他必在列国中施行审判, 为许多国民断定是非。 他们要将刀打成犁头, 把枪打成镰刀。 这国不举刀攻击那国; 他们也不再学习战事。
Ọ ga-ekpe ikpe nʼetiti mba niile, doziekwa esemokwu dị nʼetiti ndị dị iche iche. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile mee ka ha bụrụ mma oge; kpụgharịkwa ùbe ha mee ya ka ọ ghọọ mma ịkwacha osisi. Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ, maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ.
5 雅各家啊,来吧! 我们在耶和华的光明中行走。
Unu ụlọ Jekọb, bịanụ ka anyị na-agbaso ìhè nke Onyenwe anyị anyị.
6 耶和华,你离弃了你百姓雅各家, 是因他们充满了东方的风俗, 作观兆的,像非利士人一样, 并与外邦人击掌。
Gị, bụ Onyenwe anyị, Ị gbakụtala ndị gị, bụ ụlọ Jekọb azụ. Nʼihi na ha jupụtara nʼikpere arụsị nke si nʼọwụwa anyanwụ. Ha na-ajụkwa ase dịka ndị Filistia. Ha na ndị na-ekpere arụsị na-ejikọkwa aka.
7 他们的国满了金银, 财宝也无穷; 他们的地满了马匹, 车辆也无数。
Ala ha jupụtara nʼọlaọcha na ọlaedo, ha bara ụba nke ukwuu. Ala ha jupụtara nʼịnyịnya. Ụgbọ agha ha dịkwa ukwuu.
8 他们的地满了偶像; 他们跪拜自己手所造的, 就是自己指头所做的。
Ala ha jupụtara nʼarụsị, ha na-akpọ isiala nye ihe ndị ahụ ha ji aka ha kpụọ, ihe ndị ahụ mkpịsịaka ha kpụrụ.
9 卑贱人屈膝; 尊贵人下跪; 所以不可饶恕他们。
Nʼihi ya, a ga-eme ka mmadụ bụrụ ihe e wedara nʼala, meekwa ka mmadụ niile bụrụ ndị e wedara nʼala. Ya mere, agbagharala ha.
10 你当进入岩穴,藏在土中, 躲避耶和华的惊吓和他威严的荣光。
Gaanụ nʼime nkume, zoonụ nʼime ala nʼihi ihe egwu si nʼebe Onyenwe anyị, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya.
11 到那日,眼目高傲的必降为卑; 性情狂傲的都必屈膝; 惟独耶和华被尊崇。
Anya nke onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ ka a ga-ewedakwa nʼala. Ọ bụ naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
12 必有万军耶和华降罚的一个日子, 要临到骄傲狂妄的; 一切自高的都必降为卑;
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwere ụbọchị ọ kwadooro nye ndị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu, nʼihi na ihe niile e buliri elu (ka a ga-eweda nʼala),
13 又临到黎巴嫩高大的香柏树和巴珊的橡树;
nye osisi sida niile topụrụ ogologo ma maa mma nke Lebanọn, na osisi ook niile nke Bashan,
14 又临到一切高山的峻岭;
nye ugwu ukwu niile nke dị elu, na ugwu nta niile e buliri elu,
15 又临到高台和坚固城墙;
nye ụlọ elu niile, na mgbidi niile e wusiri ike,
16 又临到他施的船只并一切可爱的美物。
nye ụgbọ mmiri niile e ji azụ ahịa, na ụgbọ mmiri ndị ọzọ niile buru ibu maa mma.
17 骄傲的必屈膝; 狂妄的必降卑。 在那日,惟独耶和华被尊崇;
Onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ niile ka a ga-eweda nʼala. Naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
18 偶像必全然废弃。
A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa.
19 耶和华兴起,使地大震动的时候, 人就进入石洞,进入土穴, 躲避耶和华的惊吓和他威严的荣光。
Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume, na nʼọnụ e gwuru nʼala, nʼihi egwu Onyenwe anyị, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa.
20 到那日,人必将为拜而造的金偶像、银偶像 抛给田鼠和蝙蝠。
Nʼụbọchị ndị ahụ, ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ, nke ha kpụrụ ma na-efe, hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ.
21 到耶和华兴起,使地大震动的时候, 人好进入磐石洞中和岩石穴里, 躲避耶和华的惊吓和他威严的荣光。
Mgbe ahụ, ha ga-ezo onwe ha nʼoghere niile dị nʼoke nkume, na nʼime ọgba niile nke oke nkume nʼihi ịgbanarị iwe ọkụ Onyenwe anyị, na ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe o biliri ịyọgharị ụwa.
22 你们休要倚靠世人。 他鼻孔里不过有气息; 他在一切事上可算什么呢?
Kwụsị ịtụkwasị mmadụ efu obi. O nweghị ihe ọ bụ karịa naanị nkuume ahụ dị ya nʼime, nʼihi gịnị ka e ji agụnye ya?

< 以赛亚书 2 >