< 创世记 49 >

1 雅各叫了他的儿子们来,说:“你们都来聚集,我好把你们日后必遇的事告诉你们。
Mgbe ahụ, Jekọb kpọkọtara ụmụ ya ndị ikom niile nʼotu sị ha, “Zukọọnụ ka m gwa unu ihe ga-adakwasị unu nʼụbọchị dị nʼihu.
2 雅各的儿子们,你们要聚集而听, 要听你们父亲以色列的话。
“Zukọọnụ nụrụ, ụmụ ndị ikom Jekọb nụrụ okwu nna unu Izrel.
3 吕便哪,你是我的长子, 是我力量强壮的时候生的, 本当大有尊荣,权力超众。
“Ruben, ọkpara m ka ị bụ, ume m, ihe ngosi mbụ nke ike m, onye nsọpụrụ kwesiri, onye mbụ nʼịdị ike.
4 但你放纵情欲,滚沸如水, 必不得居首位; 因为你上了你父亲的床, 污秽了我的榻。
Onye na-agbanwe agbanwe dịka mmiri dị nʼiyi, ị gaghị abụkwa onye mbụ, nʼihi na ị banyere nʼihe ndina nna gị, i dinara nʼihe ndina m, merụọ ya.
5 西缅和利未是弟兄; 他们的刀剑是残忍的器具。
“Simiọn na Livayị bụ ụmụnne. Mma agha ha bụ ngwa ihe ike.
6 我的灵啊,不要与他们同谋; 我的心哪,不要与他们联络; 因为他们趁怒杀害人命, 任意砍断牛腿大筋。
Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha, ka m ghara isonye nʼọgbakọ ha, nʼihi na ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha, bipụkwa nkwonkwo ụkwụ ụmụ ehi na-echeghị echiche.
7 他们的怒气暴烈可咒; 他们的忿恨残忍可诅。 我要使他们分居在雅各家里, 散住在以色列地中。
Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ. Ọnụma ha, ọ jọbigara njọ oke. Aga m ekesa ha nʼetiti ụmụ Jekọb Kpasaa ha nʼetiti ndị Izrel.
8 犹大啊,你弟兄们必赞美你; 你手必掐住仇敌的颈项; 你父亲的儿子们必向你下拜。
“Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị. Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị. Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị.
9 犹大是个小狮子; 我儿啊,你抓了食便上去。 你屈下身去,卧如公狮, 蹲如母狮,谁敢惹你?
Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda, i si nʼịchụ nta lọta, nwa m. Dịka ọdụm, ọ na-amakpu, na-edina ala, dịka nne ọdụm, onye ga-anwa anwa kpọtee ya?
10 圭必不离犹大, 杖必不离他两脚之间, 直等细罗来到, 万民都必归顺。
Mkpanaka eze agaghị esite nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya, maọbụ mkpanaka onyendu esi nʼagbata ụkwụ ya pụọ, tutuu ruo mgbe eze ahụ nwe ya ga-abịa, irube isi nke mba niile ga-abụ nke ya.
11 犹大把小驴拴在葡萄树上, 把驴驹拴在美好的葡萄树上。 他在葡萄酒中洗了衣服, 在葡萄汁中洗了袍褂。
Ọ ga-ekenye ịnyịnya ibu ya nʼosisi vaịnị, nʼalaka kachasị mma ka ọ ga-ekenye nwa ịnyịnya ibu ya. Ọ ga-asakwa uwe ya na mmanya. Uwe mwụda ya ka ọ ga-asụkwa nʼọbara mkpụrụ vaịnị.
12 他的眼睛必因酒红润; 他的牙齿必因奶白亮。
Anya ya ga-acha uhie uhie karịa mmanya vaịnị. Eze ya ga-enwupụkwa ọcha karịa mmiri ara ehi.
13 西布伦必住在海口, 必成为停船的海口; 他的境界必延到西顿。
“Zebụlọn ga-ebi nʼakụkụ osimiri. Ọ ga-abụ ebe izuike nye ụgbọ mmiri. Oke ala ya ga-agbatịpụ ruo Saịdọn.
14 以萨迦是个强壮的驴, 卧在羊圈之中。
“Isaka dị ike dịka ịnyịnya ibu na-amakpu nʼetiti ọgba atụrụ.
15 他以安静为佳,以肥地为美, 便低肩背重,成为服苦的仆人。
Mgbe ọ hụrụ otu ebe izuike ya si dị mma, hụ otu ala ya si maa mma, ọ ga-ehudata isi ya ibu ibu arụ; were onwe ya nye ịrụ ọrụ ike.
16 但必判断他的民, 作以色列支派之一。
“Dan ga-eme ka ikpe ziri ezi rute ndị ya aka dịka otu nʼime ebo Izrel.
17 但必作道上的蛇,路中的虺, 咬伤马蹄,使骑马的坠落于后。
Dan ga-adị ka agwọ dị nʼakụkụ okporoụzọ, dịka ajụala dị nʼụzọ ọhịa, nke na-ata ịnyịnya nʼikiri ụkwụ, si otu a mee ka onye na-agba ịnyịnya dalaa azụ.
18 耶和华啊,我向来等候你的救恩。
“O Onyenwe anyị, ana m ele anya nnapụta gị.
19 迦得必被敌军追逼, 他却要追逼他们的脚跟。
“Gad bụ onye usuu ndị o-ji-egbe-aga ga-abịakwasị, ma ọ ga-alụso ha ọgụ, chụọkwa ha ọsọ.
20 亚设之地必出肥美的粮食, 且出君王的美味。
“Asha ga-esi nʼubi ya wepụta nri gbara abụba, nke na-adị ndị eze mma.
21 拿弗他利是被释放的母鹿; 他出嘉美的言语。
“Naftalị dịka nne ele a hapụrụ ahapụ, nke na-amụpụta ụmụ ele mara mma.
22 约瑟是多结果子的树枝, 是泉旁多结果的枝子; 他的枝条探出墙外。
“Dịka osisi vaịnị a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke alaka ya na-awasa rigoro nʼelu mgbidi, na nke na-amị ezi mkpụrụ, otu a ka Josef dị.
23 弓箭手将他苦害, 向他射箭,逼迫他。
Ndị na-agbata ụta sitere nʼobi ilu lụso ya agha, ha gbara ya àkụ site nʼịkpọ asị.
24 但他的弓仍旧坚硬; 他的手健壮敏捷。 这是因以色列的牧者,以色列的磐石— 就是雅各的大能者。
Ma aka o ji jide ụta nke ya adaghị mba, ike agwụghị ogwe aka ya, nʼihi aka Onye dị ike nke Jekọb, nʼihi Onye ọzụzụ atụrụ, Oke Nkume Izrel,
25 你父亲的 神必帮助你; 那全能者必将天上所有的福, 地里所藏的福,以及生产乳养的福,都赐给你。
nʼihi Chineke nna gị, onye na-enyere gị aka, nʼihi Onye pụrụ ime ihe niile, ka ọ gọzie gị, site na ngọzị nke eluigwe site nʼelu, ngọzị nke osimiri dị nʼokpuru ala, ngọzị nke ara na akpanwa.
26 你父亲所祝的福 胜过我祖先所祝的福, 如永世的山岭,至极的边界; 这些福必降在约瑟的头上, 临到那与弟兄迥别之人的顶上。
Ngọzị niile nke nna gị, dị ukwu karịa, ngọzị niile nke ugwu ukwu mgbe ochie, karịakwa ngọzị nke ugwu nta mgbe ochie, Ka ngọzị ndị a dị iche dịkwasị nʼisi Josef, dịkwasị nʼegedege ihu Josef, onye bụ onyendu nʼetiti ụmụnne ya.
27 便雅悯是个撕掠的狼, 早晨要吃他所抓的, 晚上要分他所夺的。”
“Benjamin dịka nkịta ọhịa nke na-adọgbu anụ. Nʼụtụtụ, ọ na-eri anụ ọ dọgburu. Nʼanyasị ọ na-ekesakwa ihe o gbutere.”
28 这一切是以色列的十二支派;这也是他们的父亲对他们所说的话,为他们所祝的福,都是按着各人的福分为他们祝福。
Ndị a bụ ebo iri na abụọ dị nʼIzrel. Ihe ndị a bụkwa ihe nna ha gwara ha mgbe ọ gọziri ha, nye onye ọbụla nʼime ha ngọzị nke ruuru ya.
29 他又嘱咐他们说:“我将要归到我列祖那里,你们要将我葬在赫人以弗 田间的洞里,与我祖我父在一处,
Emesịa, o nyere ha ndụmọdụ sị ha, “Nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, aga m anwụ. Unu aghaghị ili m nʼebe e liri nna m ha, nʼala Kenan, nʼime ọgba ahụ dị nʼọhịa Efrọn, onye Het.
30 就是在迦南地幔利前、麦比拉田间的洞;那洞和田是亚伯拉罕向赫人以弗 买来为业,作坟地的。
Nʼime ọgba dị nʼọhịa Makipela, nke dị nso na Mamre, nʼala Kenan, ọhịa Ebraham zụtara site nʼaka Efrọn onye Het, maka ili ozu.
31 他们在那里葬了亚伯拉罕和他妻子撒拉,又在那里葬了以撒和他的妻子利百加;我也在那里葬了利亚。
Nʼebe ahụ ka e liri Ebraham na Sera nwunye ya. Nʼebe ahụ kwa ka e liri Aịzik na Ribeka nwunye ya. Nʼebe ahụ ka m liri Lịa.
32 那块田和田间的洞原是向赫人买的。”
Ebraham nna nna m zụrụ ala ahụ na ọgba dị nʼime ya site nʼaka ụmụ Het.”
33 雅各嘱咐众子已毕,就把脚收在床上,气绝而死,归他列祖那里去了。
Mgbe Jekọb kwuchara okwu ndụmọdụ ikpeazụ ndị a nye ụmụ ya ndị ikom, ọ chịkọtara ụkwụ ya nʼelu akwa, kuo ume ikpeazụ. A chịkọtara ya na ndị ya.

< 创世记 49 >