< 撒母耳记下 8 >

1 此后,大卫攻打非利士人,把他们治服,从他们手下夺取了京城的权柄;
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia. Mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Meteg-Amaa site nʼọchịchị ndị Filistia.
2 又攻打摩押人,使他们躺卧在地上,用绳量一量:量二绳的杀了,量一绳的存留。摩押人就归服大卫,给他进贡。
Devid merikwara ndị Moab. O mere ka ha dinaa nʼala. O jikwa ụdọ ọtụtụ tụa ha. Ọtụtụ abụọ ọbụla nʼime ha ka egburu. Ọtụtụ nke atọ ka a hapụrụ ka ha dịrị ndụ. Ya mere, ndị Moab ghọrọ ndị ohu Devid, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla.
3 琐巴王利合的儿子哈大底谢往大河去,要夺回他的国权。大卫就攻打他,
Devid merikwara Hadadeza nwa Rehob, eze Zoba. Mgbe ọ gara inweghachita ogidi e jiri mara ya, nʼakụkụ osimiri Yufretis.
4 擒拿了他的马兵一千七百,步兵二万,将拉战车的马砍断蹄筋,但留下一百辆车的马。
Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya.
5 大马士革的亚兰人来帮助琐巴王哈大底谢,大卫就杀了亚兰人二万二千。
Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha.
6 于是大卫在大马士革的亚兰地设立防营,亚兰人就归服他,给他进贡。大卫无论往哪里去,耶和华都使他得胜。
O wuru ogige ndị agha nʼalaeze ndị Aram nke Damaskọs. Ndị Aram ghọrọ ndị ohu Devid, na-ewetakwa ụtụ ịnata ihuọma. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
7 他夺了哈大底谢臣仆所拿的金盾牌,带到耶路撒冷。
Devid chịkọtara ọta ọlaedo ndịisi agha Hadadeza ji lụọ agha webata ha na Jerusalem.
8 大卫王又从属哈大底谢的比他和比罗他城中夺取了许多的铜。
Site na Teba nakwa Beirotai, bụ obodo Hadadeza na-achị. Eze Devid weere ọtụtụ bronz dị ukwuu.
9 哈马王陀以听见大卫杀败哈大底谢的全军,
Mgbe Tou, eze Hamat, nụrụ na Devid emeriela ndị agha Hadadeza niile,
10 就打发他儿子约兰去见大卫王,问他的安,为他祝福,因为他杀败了哈大底谢(原来陀以与哈大底谢常常争战)。约兰带了金银铜的器皿来,
o zipụrụ Joram, nwa ya nwoke, ka ọ gaa kelee Devid, nʼihi mmeri o meriri Hadadeza nʼagha, bụ onye ya na Tou nọ nʼagha. Joram ji ọtụtụ akụrụngwa nke ọlaọcha, nke ọlaedo na nke bronz bịa.
11 大卫王将这些器皿和他治服各国所得来的金银都分别为圣,献给耶和华,
Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye Onyenwe anyị, dịka o si mee ọlaọcha na ọlaedo si na mba niile ndị ọ lụgburu.
12 就是从亚兰、摩押、亚扪、非利士、亚玛力人所得来的,以及从琐巴王利合的儿子哈大底谢所掠之物。
Mba ndị a bụ: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek. O dokwara nsọ nye Onyenwe anyị ihe ọ kwatara nʼagha site nʼaka Hadadeza nwa Rehob, bụ eze Zoba.
13 大卫在盐谷击杀了亚兰一万八千人回来,就得了大名;
Devid meere onwe ya aha, mgbe o si nʼitigbu puku ndị ikom Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu lọghachite.
14 又在以东全地设立防营,以东人就都归服大卫。大卫无论往哪里去,耶和华都使他得胜。
O wuru ogige ndị agha nʼala Edọm niile, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
15 大卫作以色列众人的王,又向众民秉公行义。
Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi. O mesokwaghị onye ọbụla mmeso ọjọọ.
16 洗鲁雅的儿子约押作元帅;亚希律的儿子约沙法作史官;
Onyeisi ndị agha ya bụ Joab nwa Zeruaya; ode akwụkwọ obodo bụ Jehoshafat, nwa Ahilud.
17 亚希突的儿子撒督和亚比亚他的儿子亚希米勒作祭司长;西莱雅作书记;
Zadọk nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja; Seraya bụ ode akwụkwọ eze.
18 耶何耶大的儿子比拿雅统辖基利提人和比利提人。大卫的众子都作领袖。
Benaya, nwa Jehoiada, bụ onyeisi ndị Keret na Pelet. Ụmụ ndị ikom Devid bụkwa ndị nchụaja.

< 撒母耳记下 8 >