Aionian Verses

Genesis 37:35 (Jenesis 37:35)
(parallel missing)
Ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom niile bịara ịkasị ya obi, ma ọ jụrụ ịnabata nkasiobi ọbụla. Ọ sịrị, “Aga m alakwuru nwa m nʼala mmụọ site nʼiru ụjụ.” Nna ya kwagidere akwa nʼihi ya. (Sheol h7585)
Genesis 42:38 (Jenesis 42:38)
(parallel missing)
Ma Jekọb sịrị, “Nwa m agaghị eso unu gaa. Nʼihi na nwanne ya anwụọla, ọ bụkwa naanị ya ka ọ fọdụrụ. Ọ bụrụ na nsogbu ezute ya nʼụzọ nʼije a, unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ mwute.” (Sheol h7585)
Genesis 44:29 (Jenesis 44:29)
(parallel missing)
Ọ bụrụ na unu anapụkwa m onye nke a, si otu a mee ka ihe ọjọọ zute ya, ọ pụtara na unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ obi ọjọọ?’ (Sheol h7585)
Genesis 44:31 (Jenesis 44:31)
(parallel missing)
mgbe ọ ga-ahụ na nwantakịrị a esoghị anyị, ọ ga-anwụ. Mgbe ahụ, anyị bụ ndị ohu gị, ga-eme ka nna anyị jiri isi awọ laa nʼili nʼọnọdụ obi ọjọọ. (Sheol h7585)
Numbers 16:30 (Ọnụọgụgụ 16:30)
(parallel missing)
Ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị emee ihe ọhụrụ dị iche, mee ka ala meghee ọnụ ya, lodaa ndị a niile, na ihe niile bụ nke ha, si otu a mee ka ha rịda nʼala ili na ndụ, mgbe ahụ, unu ga-amata na ndị ikom ndị a eledala Onyenwe anyị anya.” (Sheol h7585)
Numbers 16:33 (Ọnụọgụgụ 16:33)
(parallel missing)
Ha niile rịdaruru nʼala ndị nwụrụ anwụ na ndụ. Ala ahụ kpuchikwara ha niile, si otu a mee ka ha laa nʼiyi. (Sheol h7585)
Deuteronomy 32:22 (Diuteronomi 32:22)
(parallel missing)
Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m, ọkụ ga-enwu ruo ala mmụọ nʼokpuru ụwa. Ọ ga-erepịa ụwa na mkpụrụobi niile, ọ ga-amụnye ọkụ na ntọala ugwu ukwu niile. (Sheol h7585)
1 Samuel 2:6
(parallel missing)
“Onyenwe anyị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ, ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ. (Sheol h7585)
2 Samuel 22:6
(parallel missing)
Ụdọ niile nke ili kere m agbụ, Ọnya nke ọnwụ guzogidere m. (Sheol h7585)
1 Kings 2:6 (1 Ndị Eze 2:6)
(parallel missing)
Ị bụ nwoke maara ihe, ị makwaara ihe ị ga-eme. Ekwela ka Joab, nʼagbanyeghị isi awọ ya, nwụọ nʼudo. (Sheol h7585)
1 Kings 2:9 (1 Ndị Eze 2:9)
(parallel missing)
Ma achọghị m ka ị hapụ ya dịka onye ikpe na-amaghị. Ị bụ nwoke maara ihe. Ị makwaara ihe ị ga-eme ya. Mee ka o jiri isi awọ ọbara juru baa nʼili.” (Sheol h7585)
Job 7:9
(parallel missing)
Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa, otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa. (Sheol h7585)
Job 11:8
(parallel missing)
Ha dị elu karịa eluigwe, gịnị ka ị pụrụ ime? Ha dị ogbu karịa ala ili, gịnị ka ị pụrụ ịma? (Sheol h7585)
Job 14:13
(parallel missing)
“A sị na ị ga-ezo m nʼala mmụọ, na ị ga-ezobe m tutu ruo mgbe iwe gị gabigara. A sị na ị ga-akanyere m oge ma mesịa cheta m. (Sheol h7585)
Job 17:13
(parallel missing)
Ọ bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili, ọ bụrụ na m agbasaa ihe ndina m nʼelu ọchịchịrị, (Sheol h7585)
Job 17:16
(parallel missing)
Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ? Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?” (Sheol h7585)
Job 21:13
(parallel missing)
Ha na-anọ ụbọchị ndụ ha niile nʼọganihu, ha na-arịdakwa nʼili ha nʼudo. (Sheol h7585)
Job 24:19
(parallel missing)
Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee, otu a ka ala ili si ewere ndị mehiere nʼike. (Sheol h7585)
Job 26:6
(parallel missing)
Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke; mbibi tọgbọkwara na-enweghị ihe kpuchiri ya. (Sheol h7585)
Psalms 6:5 (Abụ Ọma 6:5)
(parallel missing)
Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị. O nwere onye na-eto gị site nʼala ili? (Sheol h7585)
Psalms 9:17 (Abụ Ọma 9:17)
(parallel missing)
Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili; nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke. (Sheol h7585)
Psalms 16:10 (Abụ Ọma 16:10)
(parallel missing)
Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ, ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi hụ ire ure. (Sheol h7585)
Psalms 18:5 (Abụ Ọma 18:5)
(parallel missing)
Ụdọ nke ili kere m gburugburu, ọnya nke ọnwụ guzogidere m. (Sheol h7585)
Psalms 30:3 (Abụ Ọma 30:3)
(parallel missing)
O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ. (Sheol h7585)
Psalms 31:17 (Abụ Ọma 31:17)
(parallel missing)
O Onyenwe anyị, ekwela ka ihere mee m, nʼihi na akpọkuola m gị; kama mee ka ihere mee ndị na-eme ihe ọjọọ, ka ha tọgbọrọ nʼala mmụọ debe ọnụ ha duu. (Sheol h7585)
Psalms 49:14 (Abụ Ọma 49:14)
(parallel missing)
Dịka atụrụ, ọ bụ ala mmụọ ka a kwadooro ha, ọnwụ ga-abụ onye na-azụ ha dịka atụrụ, ma ndị na-eme ihe ziri ezi ga-emeri ha nʼụtụtụ. Ozu ha ga-erekasị nʼime ili nʼebe dị anya site nʼụlọeze ha. (Sheol h7585)
Psalms 49:15 (Abụ Ọma 49:15)
(parallel missing)
Ma Chineke ga-agbapụta ndụ m site nʼili, nʼezie, ọ ga-akpọrọ m nye onwe ya. (Sela) (Sheol h7585)
Psalms 55:15 (Abụ Ọma 55:15)
(parallel missing)
Ka ọnwụ bịakwasị ndị iro m na mberede; ka ha rịdaa ala mmụọ na ndụ, nʼihi na ihe ọjọọ na-achọta ebe ọnọdụ nʼetiti ha. (Sheol h7585)
Psalms 86:13 (Abụ Ọma 86:13)
(parallel missing)
Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu; i sitela nʼomimi nke dị ala site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m. (Sheol h7585)
Psalms 88:3 (Abụ Ọma 88:3)
(parallel missing)
Nʼihi na ọtụtụ nsogbu ejupụtala mkpụrụobi m, anọ m nso nʼọnụ ụzọ ọnwụ. (Sheol h7585)
Psalms 89:48 (Abụ Ọma 89:48)
(parallel missing)
Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya, maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili? (Sela) (Sheol h7585)
Psalms 116:3 (Abụ Ọma 116:3)
(parallel missing)
Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m, oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m; nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m. (Sheol h7585)
Psalms 139:8 (Abụ Ọma 139:8)
(parallel missing)
Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ. Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ. (Sheol h7585)
Psalms 141:7 (Abụ Ọma 141:7)
(parallel missing)
Ha ga-ekwu sị, “Dịka mmadụ na-egburi, na-akọgharị ala, otu a ka a ghasasịrị ọkpụkpụ anyị nʼọnụ ili.” (Sheol h7585)
Proverbs 1:12 (Ilu 1:12)
(parallel missing)
Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili, loo ha kpamkpam dịka ndị na-arịda nʼolulu. (Sheol h7585)
Proverbs 5:5 (Ilu 5:5)
(parallel missing)
Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ, nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ. (Sheol h7585)
Proverbs 7:27 (Ilu 7:27)
(parallel missing)
Ụlọ ya bụ okporoụzọ nke na-eduba nʼili, nke na-edubakwa nʼala ọnwụ. (Sheol h7585)
Proverbs 9:18 (Ilu 9:18)
(parallel missing)
Ma ha adịghị aghọta na ndị nʼadịghị ndụ nọ nʼebe ahụ, na ndị ọ kpọrọ oku nri aghọọlarị ndị nọ nʼala mmụọ. (Sheol h7585)
Proverbs 15:11 (Ilu 15:11)
(parallel missing)
Onyenwe anyị mazuru ihe omimi niile nke ọnwụ na ọkụ ala mmụọ; ọ ga-esikwa aṅaa ghara ịma obi ụmụ mmadụ? (Sheol h7585)
Proverbs 15:24 (Ilu 15:24)
(parallel missing)
Ụzọ ndụ na-agbago elu nye onye nwere uche, iwezuga ha site na-ịgbada nʼala mmụọ dị nʼokpuru. (Sheol h7585)
Proverbs 23:14 (Ilu 23:14)
(parallel missing)
Jiri mkpara tie ya ihe ma zọpụta ndụ ya site nʼọnwụ. (Sheol h7585)
Proverbs 27:20 (Ilu 27:20)
(parallel missing)
Dịka afọ adịghị eju ọnwụ na mbibi, otu a ihe na-agụ anya mmadụ adịghị agwụ agwụ. (Sheol h7585)
Proverbs 30:16 (Ilu 30:16)
(parallel missing)
Ala ili, akpanwa nwanyị na-adịghị atụ ime, ala nke mmiri na-adịghị eju afọ, na ọkụ nke na-adịghị asị, ‘O zuola.’ (Sheol h7585)
Ecclesiastes 9:10 (Ekiliziastis 9:10)
(parallel missing)
Ihe ọbụla ị na-eme, were ike gị niile mee ya, nʼihi na ịrụ ọrụ maọbụ iche echiche, maọbụ ihe ọmụma, maọbụ amamihe adịghị nʼala ndị nwụrụ anwụ. Ebe ahụ kwa ka ị na-aga. (Sheol h7585)
Song of Solomon 8:6 (Abụ nke Abụ 8:6)
(parallel missing)
Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi, dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ, ekworo ya dịkwa ike dịka ala mmụọ. Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere, dịka ọkụ nke dị ukwu. (Sheol h7585)
Isaiah 5:14 (Aịzaya 5:14)
(parallel missing)
Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara, ọ na-asaghebigakwa ọnụ ya oke; ndị ukwu na ndị nta bi nʼime ala a ka ọ ga-elo, tinyere ndị na-emebiga mkpọtụ oke, na ndị na-egwuribiga egwu ọṅụ oke. (Sheol h7585)
Isaiah 7:11 (Aịzaya 7:11)
(parallel missing)
“Jụọ m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.” (Sheol h7585)
Isaiah 14:9 (Aịzaya 14:9)
(parallel missing)
Ala mmụọ na-eme mkpọtụ, na-eche izute gị nʼọbịbịa gị; ọ na-akpọte mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ịbịa kelee gị, bụ ndị niile bụburịị ndị ndu nʼụwa, ọ na-eme ka ha si nʼocheeze ha niile bilie bụ ndị niile ahụ bụ eze na mba niile dị iche iche. (Sheol h7585)
Isaiah 14:11 (Aịzaya 14:11)
(parallel missing)
Nganga ịbụ eze gị niile, na oke ụzụ ụbọ akwara gị, ka a na-elikọta nʼaja. Ikpuru ga-aghọrọ anụ ahụ gị ebe ndina; ọ bụkwa ikpuru ga-aghọ ihe mkpuchi ahụ gị. (Sheol h7585)
Isaiah 14:15 (Aịzaya 14:15)
(parallel missing)
Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili, ruo na nsọtụ ala mmụọ. (Sheol h7585)
Isaiah 28:15 (Aịzaya 28:15)
(parallel missing)
Nʼihi na unu ekwuola sị, “Anyị na ọnwụ agbaala ndụ, anyị na ala mmụọ enwekọọkwala otu mkpebi. Mgbe ịla nʼiyi ahụ dị ukwuu ga-esi nʼebe anyị nọ gafee, ọ gaghị erute anyị, nʼihi na anyị emeela ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị; ọ bụkwa nʼime okwu ụgha ka anyị na-ezo onwe anyị.” (Sheol h7585)
Isaiah 28:18 (Aịzaya 28:18)
(parallel missing)
Mgbe ahụ, a ga-akagbu ọgbụgba ndụ ahụ unu na ọnwụ gbara; mkpebi unu na ala mmụọ agaghị eguzokwa. Mgbe oke ịla nʼiyi ahụ si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-azọda unu. (Sheol h7585)
Isaiah 38:10 (Aịzaya 38:10)
(parallel missing)
Asịrị m, “Ọ bụ nʼoge m bụ okorobịa ka m ga-agabiga nʼọnụ ụzọ nke ọnwụ, bụrụ onye anapụrụ oge ndụ m nke fọdụrụ afọdụ?” (Sheol h7585)
Isaiah 38:18 (Aịzaya 38:18)
(parallel missing)
Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị, ọnwụ agakwaghị abụku gị abụ otuto. Ndị na-arịda nʼolulu agaghị ele anya ikwesi ntụkwasị obi gị. (Sheol h7585)
Isaiah 57:9 (Aịzaya 57:9)
(parallel missing)
Ị were mmanụ jekwuru Molek meekwa ka mmanụ otite gị na-esi isi ụtọ baa ụba. Ị zipụrụ ndị nnọchite anya gị gaa na mba dị anya; ị gbadara ruo nʼime ime ala mmụọ. (Sheol h7585)
Ezekiel 31:15 (Izikiel 31:15)
(parallel missing)
“‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ e mere ka ọ rịdaruo nʼala mmụọ, a kwụsịrị m ogbu mmiri niile were ha kpuchie ya. A kwụsịrị nsọgharị nke mmiri, meekwa ka ịba ụba nke mmiri ya niile kwụsị. Nʼihi ya, eyinyere m Lebanọn uwe mkpe, osisi niile nke ọhịa kpọnwụkwara nʼihi ya. (Sheol h7585)
Ezekiel 31:16 (Izikiel 31:16)
(parallel missing)
Emere m ka mba niile maa jijiji nʼegwu nʼihi ọdịda ya, mgbe m tụnyere ya na ndị ahụ na-aga nʼolulu nʼime ala mmụọ. Mgbe ahụ, a kasịrị osisi niile mara mma obi, bụ osisi ndị ahụ dị nʼogige Iden, na osisi ọma niile nke Lebanọn, ndị nke mgbọrọgwụ ha na-enweta mmiri nke ọma. (Sheol h7585)
Ezekiel 31:17 (Izikiel 31:17)
(parallel missing)
Ha onwe ha kwa, dịka sida ukwuu ahụ, sokwaara gbadaruo nʼala mmụọ, gakwuru ndị niile eji mma agha gbuo, ha na ndị ikom ji mma agha bụ ndị biri nʼokpuru ndo ya nʼetiti mba dị iche iche. (Sheol h7585)
Ezekiel 32:21 (Izikiel 32:21)
(parallel missing)
Ndị dike nke ndị ndu dike ga-esite nʼala mmụọ kwuo banyere Ijipt na ndị niile ha na ya dị na mma, ‘Ha arịdatala, ha na-edina ala ha na ndị a na-ebighị ugwu, nakwa ndị niile ahụ e ji mma agha gbuo.’ (Sheol h7585)
Ezekiel 32:27 (Izikiel 32:27)
(parallel missing)
Ugbu a, e likọọla ha na ndị a na-ebighị ugwu, bụ ndị dike nʼagha, ndị nwụrụ anwụ, ndị ji ngwa agha ha gbadaa nʼime ili ha, ndị e hinyere ngwa agha ha nʼokpuru isi ha, ebe ọta ha dịkwasịrị nʼọkpụkpụ mgbe e tinyere ha nʼili. Ma nʼezie, ndị a bụ dike nʼagha mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ. (Sheol h7585)
Hosea 13:14 (Hosiya 13:14)
(parallel missing)
“Aga m anapụta ha site nʼike nke Ala mmụọ. Aga m agbapụta ha site nʼọnwụ. Gị ọnwụ, olee ebe ajọọ ọrịa gị niile na-efe efe dị? Gị ala mmụọ, olee ebe ike ịla nʼiyi gị dị? “Agaghị m enwe ọmịiko ọbụla, (Sheol h7585)
Amos 9:2 (Emọs 9:2)
(parallel missing)
Ọ bụrụ na ha egwuo ala ruo nʼala mmụọ, site nʼebe ahụ ka aka m ga-esi dọlie ha, ọ bụrụkwa na ha arịgoruo ime eluigwe, site nʼebe ahụ ka m ga-esi wedata ha nʼala. (Sheol h7585)
Jonah 2:2 (Jona 2:2)
(parallel missing)
Ọ sịrị, “Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị, ọ zakwara m. Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị, ị nụkwara olu akwa m. (Sheol h7585)
Habakkuk 2:5 (Habakuk 2:5)
(parallel missing)
Nʼezie, mmanya na-eduhie ya ụzọ, onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike. Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ, ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ. Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya, ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha. (Sheol h7585)
Matthew 5:22 (Matiu 5:22)
(parallel missing)
Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘Raka,’ ya bụ Onye iberiibe, ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya, ‘Onye nzuzu,’na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ. (Geenna g1067)
Matthew 5:29 (Matiu 5:29)
(parallel missing)
Nʼihi nke a, ọ bụrụ na anya aka nri gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị baa nʼalaeze karịa na i ji ahụ zuruoke baa nʼọkụ ala mmụọ. (Geenna g1067)
Matthew 5:30 (Matiu 5:30)
(parallel missing)
Ọ bụrụ na aka nri gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị ma baa nʼalaeze eluigwe, karịa na i ji ahụ zuruoke ma baa nʼọkụ ala mmụọ. (Geenna g1067)
Matthew 10:28 (Matiu 10:28)
(parallel missing)
Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu naanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụobi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Onye ahụ nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụobi, tụbakwa ha nʼọkụ ala mmụọ. (Geenna g1067)
Matthew 11:23 (Matiu 11:23)
(parallel missing)
Ma gị Kapanọm bụ obodo a na-asọpụrụ, a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba, ị ga-arịdaru ọkụ ala mmụọ. Nʼihi na a sị na a rụrụ ọrụ ebube m rụrụ nʼime gị nʼobodo Sọdọm, a garaghị ala ya nʼiyi. Ọ gaara adịrị ruo taa. (Hadēs g86)
Matthew 12:32 (Matiu 12:32)
(parallel missing)
Onye ọbụla nke ga-ekwu okwu megide Nwa nke Mmadụ, a ga-agbaghara ya, ma onye ọbụla na-ekwu megide Mmụọ Nsọ, agaghị agbaghara ya, nʼọgbọ a maọbụ nʼọgbọ nke na-abịa. (aiōn g165)
Matthew 13:22 (Matiu 13:22)
(parallel missing)
Mkpụrụ nke dara nʼala ahụ ogwu ogwu dị nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, ma ọchịchọ nke ụwa a, ya na itinye obi nʼakụ nke ụwa a, kpagidere okwu dị nʼime ya, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ. (aiōn g165)
Matthew 13:39 (Matiu 13:39)
(parallel missing)
Onye iro ahụ gara kụọ mkpụrụ puru ahịhịa bụ ekwensu. Owuwe ihe ubi nọchiri anya ọgwụgwụ oge. Ndị owuwe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi. (aiōn g165)
Matthew 13:40 (Matiu 13:40)
(parallel missing)
“Dị ka e siri fopụtasịa ahịhịa ahụ kpọọ ha ọkụ, otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ. (aiōn g165)
Matthew 13:49 (Matiu 13:49)
(parallel missing)
Otu a ka ọ ga-adị nʼọgwụgwụ oge. Ndị mmụọ ozi ga-abịa kewapụ ndị ọjọọ site nʼetiti ndị ezi omume, (aiōn g165)
Matthew 16:18 (Matiu 16:18)
(parallel missing)
Ma mụ onwe m na-agwa gị, na gị onwe gị bụ Pita. Ọ bụkwa nʼelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike niile nke ọkụ ala mmụọ apụghịkwa iguzo megide ya. (Hadēs g86)
Matthew 18:8 (Matiu 18:8)
(parallel missing)
Nʼihi nke a, ọ bụrụ na aka gị maọbụ ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufukwaa ya. Ọ kaara gị mma inwe ọrụsị maọbụ daa ngwụrọ baa na ndụ, karịa na ị ga-enwe aka abụọ maọbụ ụkwụ abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Matthew 18:9 (Matiu 18:9)
(parallel missing)
Ọzọ, ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa na ndụ, karịa inwe anya abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ. (Geenna g1067)
Matthew 19:16 (Matiu 19:16)
(parallel missing)
Otu onye bịakwutere ya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, olee ezi ihe m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” (aiōnios g166)
Matthew 19:29 (Matiu 19:29)
(parallel missing)
Onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, na ụmụnne ya nwoke, na ụmụnne ya nwanyị, na nne ya na nna ya, na ụmụntakịrị ya, maọbụ ala o nwere, soro m, ga-anata dị ka ụgwọ ọrụ okpukpu narị ihe ọ hapụrụ, natakwa alaeze. Ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Matthew 21:19 (Matiu 21:19)
(parallel missing)
Ọ hụrụ otu osisi fiig nke dị nʼakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere nʼukwu ya, ọ hụghị ihe ọbụla nʼelu ya karịa naanị akwụkwọ ndụ. Ya mere, ọ sịrị ya, “Malite taa gaa nʼihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ. (aiōn g165)
Matthew 23:15 (Matiu 23:15)
(parallel missing)
“Ahụhụ ga-adakwasị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-agafe oke osimiri na mba dị iche iche, ime ka otu onye chegharịa, bụrụ onye na-eso ụzọ unu. Ma mgbe unu mesịrị nke a, unu na-alaghachi mee ya okpukpu abụọ ka ọ bụrụ nwa ọkụ ala mmụọ karịa onwe unu. (Geenna g1067)
Matthew 23:33 (Matiu 23:33)
(parallel missing)
“Ụmụ agwọ! Ụmụ ajụala! Unu si aṅaa chee na unu ga-agbanarị ikpe nke ịba nʼọkụ ala mmụọ? (Geenna g1067)
Matthew 24:3 (Matiu 24:3)
(parallel missing)
Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya iche, sị, “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama nke oge i ji alọghachi na nke ọgwụgwụ ụwa a?” (aiōn g165)
Matthew 25:41 (Matiu 25:41)
(parallel missing)
“Mgbe ahụ ọ ga-asịkwa ndị nọ nʼaka ekpe ya, ‘Pụọnụ nʼihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nʼime ọdọ ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya. (aiōnios g166)
Matthew 25:46 (Matiu 25:46)
(parallel missing)
“Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.” (aiōnios g166)
Matthew 28:20 (Matiu 28:20)
(parallel missing)
Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge.” (aiōn g165)
Mark 3:29 (Mak 3:29)
(parallel missing)
Ma onye ọbụla ga-ekwulu Mmụọ Nsọ, enweghị ike ịgbaghara ya. Ọ bụ onye ikpe mmehie ebighị ebi mara.” (aiōn g165, aiōnios g166)
Mark 4:19 (Mak 4:19)
(parallel missing)
ma nchekasị nke ndụ a, na nghọgbu nke akụnụba, na oke ọchịchọ, nakwa ihe ndị ọzọ na-abata, kpagbuo okwu ahụ, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ. (aiōn g165)
Mark 9:43 (Mak 9:43)
(parallel missing)
Ọ bụrụ na aka gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya. Ọ ga-akara gị mma inwe ọrụsị baa na ndụ karịa inwe aka abụọ banye nʼọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ ya na-adịghị anyụ anyụ; (Geenna g1067)
Mark 9:45 (Mak 9:45)
(parallel missing)
Ọ bụrụ na ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya, tufukwaa ya, nʼihi na ọ ga-akara gị mma ịba na ndụ na ngwụrọ karịa inwe ụkwụ abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ; (Geenna g1067)
Mark 9:47 (Mak 9:47)
(parallel missing)
Ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa nʼalaeze Chineke, karịa inwe anya abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ, (Geenna g1067)
Mark 10:17 (Mak 10:17)
(parallel missing)
Mgbe ọ na-ebili njem, otu nwoke gbaara ọsọ bịa gbuo ikpere nʼihu ya. Ọ jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi ọma, gịnị ka m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” (aiōnios g166)
Mark 10:30 (Mak 10:30)
(parallel missing)
nke na-agaghị anataghachikwa nʼụwa a, ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwanyị, nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa ihe niile nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nʼụwa ọzọ. (aiōn g165, aiōnios g166)
Mark 11:14 (Mak 11:14)
(parallel missing)
Mgbe ahụ, ọ gwara osisi ahụ sị, “Ka mmadụ ọbụla ghara iri mkpụrụ sitere na gị ruo ebighị ebi.” Ndị na-eso ụzọ ya nụrụ mgbe o kwuru okwu a. (aiōn g165)
y sinará Crallis deltó andré o quer de Jacob. Y desquero chim na terelará anda. (aiōn g165)
Ọ ga-achị ụlọ Jekọb ruo ebighị ebi, alaeze ya agaghị enwekwa ọgwụgwụ.” (aiōn g165)
Andiar sasta penó á amáres batuces, á Abraham y á sus chaborés deltó. (aiōn g165)
Dị ka ọ gwara nna nna anyị ha, nye Ebraham na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn g165)
Como penó por mui de sus majarés Prophetas, andré os sarés gresés. (aiōn g165)
(Dị ka o kwuru na mgbe ochie, site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ). (aiōn g165)
Y le manguelaban, que na os bichabase al butron. (Abyssos g12)
Ha rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara inye ha iwu ka ha banye nʼAbis. (Abyssos g12)
Y tucue, Capharnaúm, ardiñado disde o Charos, disde o butrón sinarás chibado ostely. (Hadēs g86)
Ma gị Kapanọm! Ị na-eche na a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba! Ị ga-arịda nʼala mmụọ! (Hadēs g86)
Y se ardiñó yeque Chande de la Eschastra, y le penó somia pesquilarle: ¿Duquendio, que quereláre somia terelar chipen deltó? (aiōnios g166)
Otu ụbọchị, otu onye ozizi iwu biliri ịnwale ya. Ọ jụrụ ya, “Onye ozizi, gịnị ka m kwesiri ime ka m keta ndụ ebighị ebi?” (aiōnios g166)
Tami menda penaré sangue á coin jomte terelar dal: Terelad dal á ocola, sos despues de nicobar a chipen, terela ezor de bucharar al butron: andiar sangue penelo, a ocona terelad dal. (Geenna g1067)
Ma aga m ezi unu onye unu ga-atụ egwu. Tụọnụ egwu Onye ahụ nwere ikike igbu anụ ahụ ma tụbakwa ya nʼọkụ ala mmụọ. E, asị m unu tụọnụ ya egwu. (Geenna g1067)
Y loó ó erañó al queresquero choro, presas queró saro cuerdamente: presas os chai de ocona gré chanelan butér andré su beda, que os chai e dut. (aiōn g165)
“Nna ya ukwu toro onyeisi ọrụ ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihi na ọ kpara agwa dị ka onye nwere uche. Nʼihi na ụmụ, nke ọgbọ a, ji akọnuche na-eso ndị ọgbọ ha karịa ụmụ nke ìhè. (aiōn g165)
Menda sangue penelo: Que quereleis monres es manchines e choripen; somia que pur perareis, ustilelen sangue andré eternos querés. (aiōnios g166)
Agwa m unu, jirinụ akụnụba nke ajọ omume metara onwe unu ndị enyi, ka ọ ga-abụ na mgbe ọ na-adịghịkwa akụ unu nwere, ha ga-anabata unu nʼụlọ obibi ha ebighị ebi. (aiōnios g166)
Y ardiñelando as aquias, pur sinaba andré os jacháres, diqueló de muy dur á Abraham, y á Lazaro andré desquero chepo: (Hadēs g86)
Nʼọkụ ala mmụọ ebe onye ọgaranya ahụ nọ nʼoke ihe mgbu, ọ hụrụ Ebraham ka ọ nọ nʼebe dị anya, hụkwa Lazarọs nʼakụkụ ya. (Hadēs g86)
Y le puchabó yeque tintin baro, penando: Duquendio lacho, ¿qué querelaré somia alachar a chipen que na marela? (aiōnios g166)
Otu onye ọchịchị jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi, ọ bụ gịnị ka m ga-eme keta ndụ ebighị ebi.” (aiōnios g166)
Sos na terele de alachar baribu butér andré ocona chiros; y andré o chim que abillele a chipen que na marela. (aiōn g165, aiōnios g166)
nke na-agaghị anata ihe ndị a nʼọgbọ a, nwekwa ndụ ebighị ebi nʼọgbọ nke na-abịa.” (aiōn g165, aiōnios g166)
Y Jesus les penó: Os chabores de ocona sueti se romandiñelan, y sinelan diñados en romandiñipen: (aiōn g165)
Jisọs gwara ha, “Ndị nke ọgbọ a na-alụ nwunye, ma na-enyekwa ụmụ ha ka a lụrụ ha. (aiōn g165)
Tami junos sos sinarán juzgados cabalicos de ocola sueti, y e resurreccion es mulés, na se romandiñarán, ni sinarán diñados en romandiñipen. (aiōn g165)
Ma ndị ahụ a gụrụ dị ka ndị kwesiri isoro keta oke nʼọgbọ ahụ, nakwa na mbilite nʼọnwụ agaghị alụ di na nwunye. (aiōn g165)
John 3:16 (Jọn 3:16)
(parallel missing)
Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
John 3:36 (Jọn 3:36)
(parallel missing)
Onye ọbụla kwere nʼỌkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi, ma onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ nʼihi na iwe Chineke ga-adịrị ya.” (aiōnios g166)
John 4:14 (Jọn 4:14)
(parallel missing)
Ma onye ọbụla ga-aṅụ mmiri ahụ m nyere ya, akpịrị agaghị akpọkwa ya nkụ ọzọ. Nʼeziokwu, mmiri ahụ m nyere ya ga-aghọrọ ya isi iyi nke na-asọpụtara ya ndụ ebighị ebi.” (aiōn g165, aiōnios g166)
John 4:36 (Jọn 4:36)
(parallel missing)
Ọ bụladị ugbu a, onye na-aghọ mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ, ọ na-achịkọta mkpụrụ ahụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye ghara mkpụrụ na onye ghọrọ ya nwee ike ịṅụrịkọta ọṅụ. (aiōnios g166)
John 5:24 (Jọn 5:24)
(parallel missing)
“Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, ọ gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ. (aiōnios g166)
John 5:39 (Jọn 5:39)
(parallel missing)
Unu na-enyocha akwụkwọ nsọ nʼihi na unu chere na unu ga-esite na ha nwee ndụ ebighị ebi maọbụ ha na-agba ama banyere m. (aiōnios g166)
John 6:27 (Jọn 6:27)
(parallel missing)
Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.” (aiōnios g166)
John 6:40 (Jọn 6:40)
(parallel missing)
Nke a bụ uche nke Nna m, na onye ọbụla lere Ọkpara ahụ anya, kwerekwa na ya ga-enweta ndụ ebighị ebi, m ga-emekwa ka o bilie nʼụbọchị ikpeazụ.” (aiōnios g166)
John 6:47 (Jọn 6:47)
(parallel missing)
Nʼeze, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla kwerenụ nwere ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
John 6:51 (Jọn 6:51)
(parallel missing)
Abụ m achịcha dị ndụ nke siri nʼeluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo ebighị ebi. Nri a bụ anụ ahụ m, nke m ga-enye maka ndụ nke ụwa.” (aiōn g165)
John 6:54 (Jọn 6:54)
(parallel missing)
Onye ọbụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. A ga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ ahụ. (aiōnios g166)
John 6:58 (Jọn 6:58)
(parallel missing)
Nke a bụ achịcha ahụ si nʼeluigwe bịa. Nna nna unu ha riri mánà ma nwụkwaa, ma onye ọbụla na-eri achịcha a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn g165)
John 6:68 (Jọn 6:68)
(parallel missing)
Saimọn Pita zara ya sị, “Onyenwe anyị, onye ka anyị ga-agakwuru? Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
John 8:35 (Jọn 8:35)
(parallel missing)
Ohu enwekwaghị ọnọdụ mgbe ọbụla nʼezinaụlọ, ma ọkpara nwere ọnọdụ ruo ebighị ebi. (aiōn g165)
John 8:51 (Jọn 8:51)
(parallel missing)
Nʼezie, nʼezie, agwa unu, onye ọbụla na-edebe okwu m agaghị anwụ ọzọ.” (aiōn g165)
John 8:52 (Jọn 8:52)
(parallel missing)
Mgbe ahụ ndị Juu sịrị ya, “Anyị maara ugbu a na mmụọ ọjọọ bi nʼime gị. Ebraham nwụrụ anwụ ya na ndị amụma, ma gị onwe gị na-asị na onye ọbụla kwere na gị agaghị anwụ ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165)
John 9:32 (Jọn 9:32)
(parallel missing)
Site na mgbe e kere ụwa, ọ dịbeghị onye a nụrụ na o meghere anya onye kpuru ìsì. (aiōn g165)
John 10:28 (Jọn 10:28)
(parallel missing)
Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka m. (aiōn g165, aiōnios g166)
John 11:26 (Jọn 11:26)
(parallel missing)
Ma onye ọbụla dị ndụ nke na-ekwere na m agaghị anwụ. Ị kwere nke a?” (aiōn g165)
John 12:25 (Jọn 12:25)
(parallel missing)
Ndị ọbụla hụrụ ndụ ha nʼanya ga-atụfu ya, ebe ndị ọbụla kpọrọ ndụ ha asị nʼụwa a, ga-edebe ya ruo mgbe ebighị ebi. (aiōnios g166)
John 12:34 (Jọn 12:34)
(parallel missing)
Igwe mmadụ ahụ zara ya, “Anyị anụla site nʼakwụkwọ iwu na Kraịst ahụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma gịnị mere i ji asị na, ‘A ghaghị iweli Nwa nke Mmadụ elu’? Onye bụ ‘Nwa nke mmadụ a’?” (aiōn g165)
John 12:50 (Jọn 12:50)
(parallel missing)
Ama m na iwu ya bụ ndụ ebighị ebi, nʼihi ya, ihe ọbụla Nna gwara m ka m na-ekwu.” (aiōnios g166)
John 13:8 (Jọn 13:8)
(parallel missing)
Pita sịrị ya, “Ị gaghị asaa m ụkwụ ma ọlị.” Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na m asachaghị gị ụkwụ, mụ na gị enweghị oke ọbụla.” (aiōn g165)
John 14:16 (Jọn 14:16)
(parallel missing)
Aga m arịọ Nna m, ọ ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ, onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi. (aiōn g165)
John 17:2 (Jọn 17:2)
(parallel missing)
I nyela ya ikike nʼebe mmadụ niile nọ, na ike inye ndị niile i nyere ya ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
John 17:3 (Jọn 17:3)
(parallel missing)
Nke a bụkwa ndụ ebighị ebi ahụ. Ka ha mata na naanị gị bụ Chineke nʼezie, matakwa Jisọs Kraịst onye ahụ i zitere nʼụwa. (aiōnios g166)
Acts 2:27 (Ọrụ Ndị Ozi 2:27)
(parallel missing)
nʼihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụobi m nʼala mmụọ, ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure. (Hadēs g86)
Acts 2:31 (Ọrụ Ndị Ozi 2:31)
(parallel missing)
Ebe o buuru ụzọ hụ ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu, o kwuru banyere mbilite nʼọnwụ nke Kraịst, mgbe ọ sịrị, a hapụghị ya nʼala mmụọ; anụ ahụ ya ahụghịkwa ire ure. (Hadēs g86)
Acts 3:21 (Ọrụ Ndị Ozi 3:21)
(parallel missing)
Onye eluigwe na-aghaghị ịnabata tutu ruo oge ahụ Chineke ga-eweghachi ihe niile nʼọnọdụ ha, dịka o kwere na nkwa nʼogologo oge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ. (aiōn g165)
Acts 13:46 (Ọrụ Ndị Ozi 13:46)
(parallel missing)
Ma Pọl na Banabas kwuru okwu na-asọghị anya sị, “Ọ dị mkpa na anyị buuru ụzọ gwa unu okwu nke Chineke, ma ebe ọ bụ na unu jụrụ ịnabata ya, na-echekwa na unu ekwesighị inweta ndụ ebighị ebi, lee, anyị ga-agakwuru ndị mba ọzọ. (aiōnios g166)
Acts 13:48 (Ọrụ Ndị Ozi 13:48)
(parallel missing)
Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ ihe ndị a, obi tọrọ ha ụtọ, ha sọpụkwara okwu nke Onyenwe anyị. Ya mere ndị niile a họpụtara inweta ndụ ebighị ebi bụ ndị kwenyerenụ. (aiōnios g166)
Acts 15:18 (Ọrụ Ndị Ozi 15:18)
(parallel missing)
Nke a amaara site na mgbe ochie. (aiōn g165)
Romans 1:20 (Ndị Rom 1:20)
(parallel missing)
Nʼihi na site nʼoge Chineke kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya, ụdịdị ya nke a na-apụghị ịhụ anya na ike nke ebighị ebi ya na ụdịdị ịdị nsọ ya ka e mere ka ọ pụta ìhè nye ụmụ mmadụ. Ụmụ mmadụ na-aghọta ihe ndị a site nʼihe ndị e kere eke. Nʼihi nke a ụmụ mmadụ enwekwaghị ngọpụ. (aïdios g126)
Romans 1:25 (Ndị Rom 1:25)
(parallel missing)
Ha were okwu ụgha dochie nʼọnọdụ eziokwu banyere Chineke. Ha na-asọpụrụ, na-efekwa ihe e kere eke, ma hapụ Onye okike, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Romans 2:7 (Ndị Rom 2:7)
(parallel missing)
Chineke ga-enye ndị niile sitere na ntachiobi na ezi ọrụ na-achọ otuto na nsọpụrụ na ndụ ahụ na-adịgide adịgide bụ ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Romans 5:21 (Ndị Rom 5:21)
(parallel missing)
Ya mere, dịka mmehie si bụrụ eze nʼọnwụ, otu a kwa ka amara ga-esi bụrụ eze site nʼezi omume iweta ndụ ebighị ebi site nʼaka Jisọs Kraịst, Onyenwe anyị. (aiōnios g166)
Romans 6:22 (Ndị Rom 6:22)
(parallel missing)
Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie. Unu aghọọla ndị ohu Chineke. Uru unu na-erita bụ ịdị nsọ, ọgwụgwụ ya bụkwa ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Romans 6:23 (Ndị Rom 6:23)
(parallel missing)
Nʼihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nʼefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị. (aiōnios g166)
Romans 9:5 (Ndị Rom 9:5)
(parallel missing)
Ha si nʼagbụrụ nna nna anyị ochie ha. Kraịst nʼonwe ya, nʼụdịdị mmadụ, sikwa nʼagbụrụ ha pụta, onye bụ Chineke nke ihe niile, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Romans 10:7 (Ndị Rom 10:7)
(parallel missing)
“maọbụ, ‘Onye ga-arịda nʼime ili?’” (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ). (Abyssos g12)
Romans 11:32 (Ndị Rom 11:32)
(parallel missing)
Nʼihi na Chineke enyefeela onye ọbụla nʼaka nnupu isi, ka o si otu a gosi mmadụ niile obi ebere ya. (eleēsē g1653)
Romans 11:36 (Ndị Rom 11:36)
(parallel missing)
Nʼihi na ihe niile sitere nʼime ya, sitekwa nʼaka ya, dịkwara ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi! Amen. (aiōn g165)
Romans 12:2 (Ndị Rom 12:2)
(parallel missing)
Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke. (aiōn g165)
Romans 16:25 (Ndị Rom 16:25)
(parallel missing)
Ana m enyefe unu nʼaka onye ahụ pụrụ ime ka unu guzosie ike site nʼoziọma m kwusaara unu, nakwa nkwupụta nke Jisọs Kraịst, dịka mkpughe nke ihe omimi ahụ e zoro ezo kemgbe ọtụtụ ọgbọ ndị gara aga siri dị. (aiōnios g166)
Romans 16:26 (Ndị Rom 16:26)
(parallel missing)
Ma ugbu a, e kpugheela ya, mee ka ọ pụta ìhè site nʼihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ, ka ndị mba ọzọ niile maara ya dịka ihe Chineke ebighị ebi nyere nʼiwu ya si dị, ka ha mụta irube isi nke na-esite nʼokwukwe. (aiōnios g166)
Romans 16:27 (Ndị Rom 16:27)
(parallel missing)
Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke, onye naanị ya bụ onye amamihe, ruo mgbe ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst. Amen. (aiōn g165)
1-Corinthians 1:20 (1 Ndị Kọrint 1:20)
(parallel missing)
Olee ebe ndị oke amamihe nọ? Olee ebe ndị ode akwụkwọ nọ? Olee ebe ndị oke ịrụ ụka nke oge a nọ? Chineke o mebeghị ka amamihe nke ụwa a bụrụ ihe efu? (aiōn g165)
1-Corinthians 2:6 (1 Ndị Kọrint 2:6)
(parallel missing)
Ma otu ọ dị, anyị na-ekwu okwu amamihe nʼebe ndị tozuru oke nọ. Ma ọ bụghị amamihe nke oge a, maọbụ nke ndị na-achị ụwa taa, bụ ndị na-aghaghị ịla nʼiyi. (aiōn g165)
1-Corinthians 2:7 (1 Ndị Kọrint 2:7)
(parallel missing)
Kama anyị na-ekwu okwu amamihe nke Chineke nʼụzọ dị omimi, bụ amamihe Chineke zonarịrị ụmụ mmadụ site na mbụ, nke Chineke kara aka tupu e kee ụwa na a ga-ekpughe ya nʼoge a maka iwetara anyị otuto. (aiōn g165)
1-Corinthians 2:8 (1 Ndị Kọrint 2:8)
(parallel missing)
O nweghị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị nke ọgbọ a ghọtara ihe banyere nzube a. Nʼihi na ọ bụrụ na ha maara ya, ha agaraghị akpọgbu Onyenwe otuto ahụ nʼobe. (aiōn g165)
1-Corinthians 3:18 (1 Ndị Kọrint 3:18)
(parallel missing)
Ka onye o bụla ghara ịghọgbu onwe ya, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu na-eche nʼobi ya na ya bụ onye maara ihe, dịka ihe ọmụma nke ụwa si dị, ọ ga-akara onye ahụ mma ime onwe ya onye nzuzu, ka o nwe ike bụrụ onye maara ihe. (aiōn g165)
1-Corinthians 8:13 (1 Ndị Kọrint 8:13)
(parallel missing)
Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ihe oriri ga-eme ka nwanna m mee mmehie, agaghị m eri anụ ọzọ, ka m ghara ime ka nwanna m maa nʼọnya. (aiōn g165)
1-Corinthians 10:11 (1 Ndị Kọrint 10:11)
(parallel missing)
Ihe ndị a niile dakwasịrị ha ka ọ bụrụ ihe ilere anya nye anyị. E dekwara ha nʼakwụkwọ ka ha bụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị nʼihi na anyị bi nʼoge a mgbe ọgwụgwụ ihe niile dị nso. (aiōn g165)
1-Corinthians 15:55 (1 Ndị Kọrint 15:55)
(parallel missing)
“Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ, olee ebe ihe ụfụ gị dị?” (Hadēs g86)
2-Corinthians 4:4 (2 Ndị Kọrint 4:4)
(parallel missing)
Nʼebe ha nọ, chi nke ụwa a ekpuchiela uche ndị na-ekweghị ekwe iji gbochie ha ịhụ ìhè nke oziọma ahụ na-ezipụta ebube Kraịst, onye dị nʼụdị Chineke nʼonwe ya. (aiōn g165)
2-Corinthians 4:17 (2 Ndị Kọrint 4:17)
(parallel missing)
Nwantịntị ahụhụ nke anyị na-ata ugbu a, nke na-adị nwa oge, na-akwadoro anyị otuto ebighị ebi dị ukwuu. (aiōnios g166)
2-Corinthians 4:18 (2 Ndị Kọrint 4:18)
(parallel missing)
Nʼihi na anyị adịghị ele ihe anya nwere ike ịhụ, kama anyị na-ele anya nʼihe ahụ anya na-adịghị ahụ. Nʼihi na ihe ahụ anya na-ahụ na-adị naanị nwa oge, ma ihe ahụ anya na-adịghị ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi. (aiōnios g166)
2-Corinthians 5:1 (2 Ndị Kọrint 5:1)
(parallel missing)
Nʼihi na anyị ma nke ọma na mgbe e mebiri ụlọ ikwu nke anyị bi nʼime ya, bụ ụlọ nke ụwa a, anyị nwere ụlọ nke sitere na Chineke, ụlọ nke ejighị aka wuo, ga-adị ebighị ebi nʼeluigwe. (aiōnios g166)
2-Corinthians 9:9 (2 Ndị Kọrint 9:9)
(parallel missing)
Dịka e dere ya, “Ọ gbasara onyinye ya ebe niile nye ndị ogbenye; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn g165)
2-Corinthians 11:31 (2 Ndị Kọrint 11:31)
(parallel missing)
Chineke, na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs, onye e kwesiri ito aha ya ruo mgbe ebighị ebi, maara na ihe ndị a niile m na-ekwu bụ eziokwu. (aiōn g165)
Galatians 1:4 (Ndị Galeshịa 1:4)
(parallel missing)
Onye nyere onwe ya nʼihi mmehie anyị niile dị ka nzube Chineke bụ Nna anyị si dị, ịzọpụta anyị site nʼoge ọjọọ a nke anyị bi nʼime ya. (aiōn g165)
Galatians 1:5 (Ndị Galeshịa 1:5)
(parallel missing)
Onye otuto dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Galatians 6:8 (Ndị Galeshịa 6:8)
(parallel missing)
Ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke anụ ahụ, ọ ga-esikwa nʼanụ ahụ ghọta mmebi, ma ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke Mmụọ, ọ ga-esitekwa na Mmụọ ghọta ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Ephesians 1:21 (Ndị Efesọs 1:21)
(parallel missing)
Ọnọdụ ya dị elu karịa ọchịchị niile, na ikike ọchịchị niile, na ike niile na ịchị isi niile, na aha ọkwa ọchịchị nke e nwere ike inye mmadụ, ọ bụghị naanị nʼọgbọ a, kama ma nʼọgbọ ọzọ na-abịa. (aiōn g165)
Ephesians 2:2 (Ndị Efesọs 2:2)
(parallel missing)
Nke unu biri ndụ nʼime ha mgbe unu na-agbaso ụzọ niile nke ụwa a, na ụzọ onye ọchịchị nke alaeze ikuku, bụ mmụọ ahụ na-arụ ọrụ ugbu a na ndụ ndị ahụ na-enupu isi. (aiōn g165)
Ephesians 2:7 (Ndị Efesọs 2:7)
(parallel missing)
O mere nke a igosi ọgbọ nke na-abịa, ịdị ukwuu nke akụ amara ya, nke o sitere nʼobiọma ya gosi anyị nʼime Kraịst Jisọs. (aiōn g165)
Ephesians 3:9 (Ndị Efesọs 3:9)
(parallel missing)
meekwa ka mmadụ niile hụ ihe bụ atụmatụ nke ihe omimi e zoro nʼime Chineke onye kere ihe niile, ọtụtụ afọ. (aiōn g165)
Ephesians 3:11 (Ndị Efesọs 3:11)
(parallel missing)
Nke a bụ nʼusoro nke atụmatụ ya dị ebighị ebi, nke e mezuru nʼime Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, (aiōn g165)
Ephesians 3:21 (Ndị Efesọs 3:21)
(parallel missing)
ọ bụ ya ka otuto dịrị nʼime chọọchị na nʼime Kraịst Jisọs ruo ọgbọ niile nke mgbe niile, ebighị ebi ruo ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Ephesians 6:12 (Ndị Efesọs 6:12)
(parallel missing)
Nʼihi na ndị anyị na-alụso ọgụ abụghị ndị mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ megide ndịisi ha niile, megide ịchị isi niile, megide ike usuu mmụọ ọjọọ nke ike ụwa ọchịchịrị a, megidekwa mmụọ ajọ ihe niile nọ nʼebe dị elu nke eluigwe. (aiōn g165)
Philippians 4:20 (Ndị Filipai 4:20)
(parallel missing)
Ka otuto dịrị Chineke anyị, bụ Nna anyị, ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Colossians 1:26 (Ndị Kọlọsị 1:26)
(parallel missing)
Nke bụ ihe omimi ahụ, nke e zoro ezo site nʼoge ahụ nakwa ọgbọ niile ndị a gara aga, ma ugbu a e mekwara ka ọ pụta ìhè nye ndị nsọ Chineke. (aiōn g165)
2-Thessalonians 1:9 (2 Ndị Tesalonaịka 1:9)
(parallel missing)
Ndị a ga-ata ahụhụ mbibi ruo ebighị ebi, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya, (aiōnios g166)
2-Thessalonians 2:16 (2 Ndị Tesalonaịka 2:16)
(parallel missing)
Ka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nʼonwe ya, na Chineke Nna anyị, onye hụrụ anyị nʼanya, site nʼamara ya nye anyị agbamume dị ebighị ebi na ezi olileanya, (aiōnios g166)
1-Timothy 1:16 (1 Timoti 1:16)
(parallel missing)
Ọ bụ nʼihi nke a ka e ji gosi m ebere, ka Kraịst Jisọs site nʼime m, bụ onye kachasị dị njọ, gosi enweghị ọgwụgwụ nke ntachiobi ya, ka m bụrụ ihe nlere anya nye ndị ahụ niile ga-ekwere na ya, ma nata ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
1-Timothy 1:17 (1 Timoti 1:17)
(parallel missing)
Ugbu a, ka enye Eze ahụ na-adị ruo mgbe niile, Onye na-adịghị anwụ anwụ, Onye a na-adịghị ahụ anya, Onye naanị ya bụ Chineke, nsọpụrụ na otuto ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
1-Timothy 6:12 (1 Timoti 6:12)
(parallel missing)
Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe gị ike, jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ aka ike bụ nke a kpọrọ gị oku maka ya mgbe i mere ezi nkwupụta gị nʼihu ọtụtụ ndị akaebe. (aiōnios g166)
1-Timothy 6:16 (1 Timoti 6:16)
(parallel missing)
Onye naanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebikwa nʼime ìhè nke mmadụ ọbụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọbụla na-ahụbeghị anya mgbe ọbụla, onye a na-apụghịkwa ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amen. (aiōnios g166)
1-Timothy 6:17 (1 Timoti 6:17)
(parallel missing)
Nye ndị bụ ọgaranya nʼoge ugbu a iwu ka ha ghara ịnya isi, maọbụ tụkwasị obi ha nʼakụnụba, nke a na-ejighị aka. Kama ka ntụkwasị obi ha dịrị na Chineke onye na-enyezu anyị ihe niile site nʼakụ ya nʼihi ime anyị obi ụtọ. (aiōn g165)
2-Timothy 1:9 (2 Timoti 1:9)
(parallel missing)
Ọ zọpụtara anyị, kpọbata anyị na ndụ dị nsọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị kwesiri ka a kpọọ anyị, kama, ọ bụ nʼihi nzube ya na amara ya. E nyere anyị amara nʼime Kraịst Jisọs tupu a tọọ ntọala ụwa a. (aiōnios g166)
2-Timothy 2:10 (2 Timoti 2:10)
(parallel missing)
Ya mere, ana m anagide ihe niile nʼihi ndị a họpụtara, ka ha bụrụkwa ndị ga-anata nzọpụta dị nʼime Kraịst Jisọs, na ebube ebighị ebi. (aiōnios g166)
2-Timothy 4:10 (2 Timoti 4:10)
(parallel missing)
nʼihi na Dimas onye hụrụ ihe ndụ a nʼanya ahapụla m gaa Tesalonaịka. Kresens agaala Galeshịa, Taịtọs agakwaala Dalmetia. (aiōn g165)
2-Timothy 4:18 (2 Timoti 4:18)
(parallel missing)
Onyenwe anyị ga-azọpụtakwa m site nʼihe ọjọọ niile ọbụla, kpọbata m nʼudo baa nʼalaeze eluigwe ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Titus 1:2 (Taịtọs 1:2)
(parallel missing)
nke a dabere nʼolileanya maka ndụ ebighị ebi, nke Chineke onye na-adịghị agha ụgha kwerelarị na nkwa tupu mmalite nke oge. (aiōnios g166)
Titus 2:12 (Taịtọs 2:12)
(parallel missing)
Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị ka anyị jụ ndụ asọpụrụghị Chineke na nke ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nʼụwa, kama ka anyị bie ndụ dị ka ndịisi zuruoke na ndụ ezi omume, nakwa ịtụ egwu Chineke nʼọgbọ nke oge a. (aiōn g165)
Titus 3:7 (Taịtọs 3:7)
(parallel missing)
ka ọ bụrụ na ebe e sitere nʼamara gụọ anyị dịka ndị ezi omume, anyị ga-abụ ndị nketa, ndị nwere olileanya ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Philemon 1:15 (Fịlịmọn 1:15)
(parallel missing)
Ma eleghị anya, ọ bụ nʼihi nke a ka eji kewapụ ya nwa oge nta site nʼebe ị nọ, bụ ka i mesịa nweghachi ya ebighị ebi. (aiōnios g166)
Hebrews 1:2 (Ndị Hibru 1:2)
(parallel missing)
Ma nʼoge ikpeazụ ndị a, ọ gwala anyị okwu site nʼọnụ Ọkpara ya, onye o nyefere ihe niile nʼaka. Ọ bụ site nʼaka ya ka o siri kee ụwa niile na ihe dị nʼime ya. (aiōn g165)
Hebrews 1:8 (Ndị Hibru 1:8)
(parallel missing)
Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị, “Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ. (aiōn g165)
Hebrews 5:6 (Ndị Hibru 5:6)
(parallel missing)
Nʼebe ọzọ, o kwuru, “Dị ka usoro Melkizedek si dị, ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn g165)
Hebrews 5:9 (Ndị Hibru 5:9)
(parallel missing)
Ma mgbe e mere ka o zuo oke, ọ ghọrọ isi nke nzọpụta ebighị ebi nye ndị niile na-erubere ya isi. (aiōnios g166)
Hebrews 6:2 (Ndị Hibru 6:2)
(parallel missing)
na-akụzi banyere ime baptizim na ibikwasị aka nʼisi na onyinye nke Mmụọ Nsọ, na mbilite nʼọnwụ na ikpe ebighị ebi. (aiōnios g166)
Hebrews 6:5 (Ndị Hibru 6:5)
(parallel missing)
ndị detụkwara ịdị mma nke okwu Chineke ahụ ire na ike nke ụwa na-abịa, (aiōn g165)
Hebrews 6:20 (Ndị Hibru 6:20)
(parallel missing)
ebe Jisọs onye buru anyị ụzọ, abanyela nʼihi anyị; ọ ghọlara anyị onyeisi nchụaja ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị. (aiōn g165)
Hebrews 7:17 (Ndị Hibru 7:17)
(parallel missing)
Nʼihi na-agbara akaebe banyere ya, sị, “Gị onwe gị, bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, dị ka usoro Melkizedek si dị.” (aiōn g165)
Hebrews 7:21 (Ndị Hibru 7:21)
(parallel missing)
Ma onye nke a ghọrọ onye nchụaja site nʼịṅụ iyi mgbe onye ahụ gwara ya, “Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe obi ya, ‘Ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.’” (aiōn g165)
Hebrews 7:24 (Ndị Hibru 7:24)
(parallel missing)
Ya mere, ebe ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ na-abụkwa onyeisi nchụaja mgbe niile. (aiōn g165)
Hebrews 7:28 (Ndị Hibru 7:28)
(parallel missing)
Nʼihi na iwu na-ahọpụta dị ka ndịisi nchụaja ndị mmadụ na-adịghị ike. Ma okwu nke ịṅụ iyi ahụ, nke na-eso iwu nʼazụ, họpụtara Ọkpara, onye e mere ka o zuo oke ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165)
Hebrews 9:12 (Ndị Hibru 9:12)
(parallel missing)
o jighị ọbara ụmụ ewu na nke ụmụ ehi banye nʼebe ahụ, kama o ji ọbara nke ya onwe ya banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ naanị otu mgbe, jiri ya wetara anyị niile mgbapụta ebighị ebi. (aiōnios g166)
Hebrews 9:14 (Ndị Hibru 9:14)
(parallel missing)
Ọbara Kraịst onye sitere na Mmụọ dị ebighị ebi were onwe ya chụọrọ Chineke aja nʼenweghị ntụpọ ọbụla, ọ ga-esi aṅaa ghara ịsachapụ omume ruru unyi nke akọnuche anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke dị ndụ. (aiōnios g166)
Hebrews 9:15 (Ndị Hibru 9:15)
(parallel missing)
Nʼihi nke a, ọ bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ndị a kpọrọ site na ya nata ihe nketa ebighị ebi ahụ bụ nke e kwere ha na nkwa. A pụrụ ime nke a nʼihi ọ nwụọla ọnwụ gbapụta ụmụ mmadụ site nʼikpe ọmụma nke mmehie ha mere nʼokpuru ọgbụgba ndụ nke mbụ ahụ. (aiōnios g166)
Hebrews 9:26 (Ndị Hibru 9:26)
(parallel missing)
Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ gaara abụ onye na-ahụ ahụhụ mgbe kemgbe e kere ụwa. Ma, dị ka o si dị, ọ bịara naanị otu ugboro nʼọgwụgwụ oge ndị a, iwezuga mmehie site nʼiji onwe ya chụọ aja. (aiōn g165)
Hebrews 11:3 (Ndị Hibru 11:3)
(parallel missing)
Ọ bụ site nʼokwukwe ka anyị ji ghọta na e mere ụwa na ihe niile anyị na-ahụ anya site nʼokwu Chineke. Nʼihi nke a, ihe anyị na-ahụ anya ugbu a bụ ihe e mere site nʼihe anyị na-adịghị ahụ anya. (aiōn g165)
Hebrews 13:8 (Ndị Hibru 13:8)
(parallel missing)
Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165)
Hebrews 13:20 (Ndị Hibru 13:20)
(parallel missing)
Ugbu a ka Chineke nke udo, onye ahụ sitere nʼọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs, Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ, site nʼọnwụ, (aiōnios g166)
Hebrews 13:21 (Ndị Hibru 13:21)
(parallel missing)
mee ka unu zuo oke nʼezi ihe ọma niile ọbụla, nke ga-enyere unu aka ime ihe ọ na-achọ. Ka ọ rụpụta nʼetiti anyị ihe ndị ahụ niile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst, onye otuto niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
James 3:6 (Jemis 3:6)
(parallel missing)
Ire anyị bụ ọkụ. E debere ire nʼetiti akụkụ anụ ahụ ndị ọzọ dịka ụwa ajọ omume. Ọ na-emerụ ahụ niile, na-amụnye ọkụ nʼusoro ndụ mmadụ. Ya onwe ya bụkwa ihe ọkụ ala mmụọ na-amụnye ọkụ. (Geenna g1067)
1-Peter 1:23 (1 Pita 1:23)
(parallel missing)
Nʼihi na amụọla unu ọzọ ugbu a, ọ bụghị site na mkpụrụ nke na-emebi emebi, kama site na nke na-apụghị imebi emebi, site nʼokwu Chineke nke dị ndụ ma na-adịgidekwa. (aiōn g165)
1-Peter 1:25 (1 Pita 1:25)
(parallel missing)
ma okwu Onyenwe anyị na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Okwu ahụ bụkwa oziọma ahụ e zisaara unu. (aiōn g165)
1-Peter 4:11 (1 Pita 4:11)
(parallel missing)
Onye na-ekwu okwu ya kwuo ya dị ka ọ bụ nnọọ okwu Chineke ka ọ na-ekwu. Onye na-eje ozi ya jee ya site nʼike ahụ Chineke na-enye. Nʼime ihe niile ka otuto dịrị Chineke site na Jisọs Kraịst. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
1-Peter 5:10 (1 Pita 5:10)
(parallel missing)
Chineke onye nwe amara niile, onye kpọbatara unu na ebube ebighị ebi ya nʼime Kraịst, mgbe unu hụrụ ahụhụ ndị a nwa oge, ya onwe ya ga-eweghachi unu nʼọnọdụ unu, mee ka unu dị nnọọ ike, ndị guzo chịm ma kwesikwa ntụkwasị obi. (aiōnios g166)
1-Peter 5:11 (1 Pita 5:11)
(parallel missing)
Ọ bụ ya nwe ike niile ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
2-Peter 1:11 (2 Pita 1:11)
(parallel missing)
Nʼụzọ dị otu a, a ga-enye unu ohere dị ukwuu iji bata nʼalaeze ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst. (aiōnios g166)
2-Peter 2:4 (2 Pita 2:4)
(parallel missing)
Ọ bụrụ na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama o weere ha kpọchie nʼime ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ na-eche ụbọchị ikpe ahụ. (Tartaroō g5020)
2-Peter 3:18 (2 Pita 3:18)
(parallel missing)
Bụrụnụ ndị na-eto eto nʼime amara. Bụrụkwanụ ndị na-aga nʼihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma. Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
1-John 1:2 (1 Jọn 1:2)
(parallel missing)
Ndụ ahụ pụtara ihe. Anyị ahụla ya ma gbaakwa ama banyere ya. Ya mere, ihe anyị na-ekwu okwu ya, na ihe anyị na-akọrọ unu bụ banyere ndụ ebighị ebi ahụ nke ya na Nna nọ na mbụ; nke e mere ka ọ pụta ìhè nye anyị. (aiōnios g166)
1-John 2:17 (1 Jọn 2:17)
(parallel missing)
Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165)
1-John 2:25 (1 Jọn 2:25)
(parallel missing)
Ihe o kwere anyị na nkwa bụ nke a, ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
1-John 3:15 (1 Jọn 3:15)
(parallel missing)
Onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu matakwara na o nweghị onye ọbụla bụ ogbu mmadụ nwere ndụ ebighị ebi nʼime ya. (aiōnios g166)
1-John 5:11 (1 Jọn 5:11)
(parallel missing)
Ama ahụ bụkwa nke a, na Chineke enyela anyị ndụ ebighị ebi, ndụ a dịkwa nʼime Ọkpara ya. (aiōnios g166)
1-John 5:13 (1 Jọn 5:13)
(parallel missing)
Ana m edere unu ihe ndị a unu ndị kweere nʼaha Ọkpara Chineke, ime ka unu mata na unu nwere ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
1-John 5:20 (1 Jọn 5:20)
(parallel missing)
Anyị matakwara na Ọkpara Chineke abịala, nyekwa anyị nghọta ka anyị mara ya, onye bụ eziokwu. Anyị nọ nʼime onye ahụ bụ eziokwu, ọ bụladị nʼime Ọkpara ya, bụ Jisọs Kraịst. Ya onwe ya bụ ezi Chineke bụrụkwa ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
2-John 1:2 (2 Jọn 1:2)
(parallel missing)
Nʼihi eziokwu ahụ nke dị nʼime anyị, nke ga-adịgidekwa nʼime anyị ruo mgbe ebighị ebi: (aiōn g165)
Jude 1:6 (Jud 1:6)
(parallel missing)
Ndị mmụọ ozi nupuru isi, ndị na-anọgideghị nʼọnọdụ e nyere ha, kama ha si nʼebe obibi ha gbapụ. O jirila igwe kee ha agbụ ebighị ebi, debe ha nʼọchịchịrị nʼime ala, ebe ha ga-anọ ruo ụbọchị ikpe ahụ dị egwu. (aïdios g126)
Jude 1:7 (Jud 1:7)
(parallel missing)
Otu a kwa, Sọdọm na Gọmọra na obodo niile gbara ha gburugburu, bụ ndị nyefere onwe ha na ndụ ịkwa iko nakwa omume ibi ndụ ọjọọ dị iche iche nke anụ ahụ, bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị mmadụ site nʼahụhụ ha tara nʼihi mmehie nʼime ọkụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Jude 1:13 (Jud 1:13)
(parallel missing)
Ha bụ ebili mmiri na-amagharị nʼosimiri, nke na-asọpụta ihere ha dịka ụfụfụ, kpakpando na-awagharị awagharị, bụ ndị nke a kwadooro ebe kachasị ịgba ọchịchịrị ruo ebighị ebi. (aiōn g165)
Jude 1:21 (Jud 1:21)
(parallel missing)
Doonụ onwe unu nʼokpuru ịhụnanya Chineke, dịka unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nke na-eduba na ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Jude 1:25 (Jud 1:25)
(parallel missing)
ka otuto, na ịdị ukwuu, na ike, na ikike ọchịchị; dịrị Onye naanị ya bụ Chineke, Onye nzọpụta anyị, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, tupu nʼọgbọ niile ebido, ka ọ dịrị ya ugbu a, na mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Revelation 1:6 (Mkpughe 1:6)
(parallel missing)
O mere ka anyị bụrụ alaeze, ndị nchụaja nye Nna ya bụ Chineke. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Revelation 1:18 (Mkpughe 1:18)
(parallel missing)
Abụ m onye ahụ na-adị ndụ. Anwụrụ m anwụ, ma lee, ana m adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ọ bụkwa m ji ọtụghe igodo nke ọnwụ na nke ọkụ ala mmụọ. (aiōn g165, Hadēs g86)
Revelation 4:9 (Mkpughe 4:9)
(parallel missing)
Mgbe ọbụla anụ ndị ahụ dị ndụ na-enye onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi otuto na nsọpụrụ na ekele, (aiōn g165)
Revelation 4:10 (Mkpughe 4:10)
(parallel missing)
iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-adakwa nʼala nʼihu onye ahụ nọ nʼocheeze na-efe ya ofufe, bụ onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ha niile nʼotu nʼotu na-atụda okpueze ha nʼihu ya na-abụ abụ na-asị, (aiōn g165)
Revelation 5:13 (Mkpughe 5:13)
(parallel missing)
Mgbe ahụ, anụrụ m ka ihe niile nọ nʼeluigwe na ndị nọ nʼụwa na ndị nọ nʼokpuru ụwa, na ndị nọ nʼokpuru oke osimiri na-eti mkpu abụ na-asị, “Ka ngọzị, na nsọpụrụ niile, na otuto niile, na ike niile dịrị onye ahụ na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, na Nwa Atụrụ ahụ (aiōn g165)
Revelation 6:8 (Mkpughe 6:8)
(parallel missing)
Elere m anya ma hụ ịnyịnya na-acha ntụntụ nʼihu m. Aha onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ Ọnwụ na Ọkụ ala mmụọ na-esokwa ya nʼazụ. E nyere ha ike nʼebe otu ụzọ nʼụzọ anọ nke ụwa dị ka ha jiri mma agha na ụnwụ, na ọrịa ọjọọ na anụ ọhịa gbuchapụ ndị bi nʼime ha. (Hadēs g86)
Revelation 7:12 (Mkpughe 7:12)
(parallel missing)
na-asị, “Amen! Ngọzị niile na otuto niile, na amamihe niile na ekele niile na nsọpụrụ niile na ike niile na ume niile, dịrị Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.” (aiōn g165)
Revelation 9:1 (Mkpughe 9:1)
(parallel missing)
Mgbe mmụọ ozi nke ise ahụ fụrụ opi ike ya, ahụrụ m otu kpakpando si nʼeluigwe daa nʼala. E nyere ya ihe ọtụghe igodo nke e ji atụghe olulu nke Abis ahụ. (Abyssos g12)
Revelation 9:2 (Mkpughe 9:2)
(parallel missing)
Mgbe o meghere olulu Abis ahụ, anwụrụ ọkụ dị ukwu sitere nʼime ya pụta dịka anwụrụ ọkụ si nʼọkụ icheku ọkụ ya dị ukwuu, mee ka oke ọchịchịrị kpuchie ihu anyanwụ na mbara eluigwe. (Abyssos g12)
Revelation 9:11 (Mkpughe 9:11)
(parallel missing)
Ha nwere mmụọ ozi nke Abis, onye na-achịkọta ha dịka eze. Aha ya nʼasụsụ Hibru bụ Abadọn, ma nʼasụsụ Griik ọ bụ Apolion. (Abyssos g12)
Revelation 10:6 (Mkpughe 10:6)
(parallel missing)
were onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi. Ya bụ onye ahụ kere eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha, na oke osimiri, na ndị niile bi nʼime ha, sị na oge ezuola. Na o kwesikwaghị ka a tufuo oge ọbụla. (aiōn g165)
Revelation 11:7 (Mkpughe 11:7)
(parallel missing)
Mgbe ha gbazuru ama ha, anụ ọhịa ahụ, nke na-esite nʼime olulu Abis ahụ ga-ebuso ha agha merie ha, gbukwaa ha. (Abyssos g12)
Revelation 11:15 (Mkpughe 11:15)
(parallel missing)
Ka mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ike ya, oke olu dị iche iche dara ike ike nʼeluigwe, na-asị, “Alaeze niile nke ụwa abụrụla alaeze Onyenwe anyị, na nke Kraịst ya. Ya onwe ya ga-achịkwa ruo mgbe niile ebighị ebi.” (aiōn g165)
Revelation 14:6 (Mkpughe 14:6)
(parallel missing)
Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe. O ji oziọma nke ebighị ebi ahụ nʼaka, nke ọ na-aga ikwusara mba niile, na ebo niile, na asụsụ niile na mmadụ niile nọ nʼụwa. (aiōnios g166)
Revelation 14:11 (Mkpughe 14:11)
(parallel missing)
Anwụrụ ọkụ si nʼebe a na-emekpa ha ahụ apụta na-arịgo elu ruo mgbe niile ebighị ebi. Izuike agaghị adịrị ha ehihie na abalị bụ ndị ahụ kpọrọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, kwerekwa ka a kakwasị ha akara nke aha ya. (aiōn g165)
Revelation 15:7 (Mkpughe 15:7)
(parallel missing)
Otu nʼime anụ anọ ndị ahụ dị ndụ bunyere mmụọ ozi asaa ndị ahụ efere ọlaedo asaa a gbajuru ọnụma Chineke, bụ onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi. (aiōn g165)
Revelation 17:8 (Mkpughe 17:8)
(parallel missing)
Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ, nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị. Ma ọ ga-esi nʼolulu Abis ahụ pụta banye na mbibi. Ma nlọghachi ya ga-eju ndị ahụ a na-edeghị aha ha nʼime akwụkwọ ndụ ahụ site nʼoge e kere ụwa anya. Nʼihi na e nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị, ma ọ ga-emesi bịa. (Abyssos g12)
Revelation 19:3 (Mkpughe 19:3)
(parallel missing)
Ọzọkwa, ha tiri mkpu, “Haleluya! Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn g165)
Revelation 19:20 (Mkpughe 19:20)
(parallel missing)
Ma e jidere anụ ọhịa ahụ, ya na onye amụma ụgha ahụ onye nke nọọrọ nʼihu ya gosi ihe ịrịbama nke o jiri duhie ndị niile natara akara nke anụ ọhịa ahụ, ya na ndị kpọọrọ ihe oyiyi ya isiala. A tụnyere anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ya na ndụ nʼime ọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. (Limnē Pyr g3041 g4442)
Revelation 20:1 (Mkpughe 20:1)
(parallel missing)
Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nʼeluigwe na-arịdata, o ji mkpisi igodo e ji atụghe olulu Abis ahụ. O jikwa eriri igwe dị ukwuu nʼaka ya. (Abyssos g12)
Revelation 20:3 (Mkpughe 20:3)
(parallel missing)
Emesịa, a tụnyere ya nʼime olulu Abis ahụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nʼelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba niile dị nʼụwa ọzọ tutu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya ka ọ gagharịa nwantịntị oge. (Abyssos g12)
Revelation 20:10 (Mkpughe 20:10)
(parallel missing)
Mgbe ahụ, ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nʼọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nʼọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165, Limnē Pyr g3041 g4442)
Revelation 20:13 (Mkpughe 20:13)
(parallel missing)
Oke osimiri niile nyeghachiri ndị niile nwụrụ nọ nʼime ha. Otu a kwa, ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nʼime ha. E kpekwara onye ọbụla ikpe dịka ọrụ ya si dị. (Hadēs g86)
Revelation 20:14 (Mkpughe 20:14)
(parallel missing)
Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nʼime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ nke bụ ọdọ ọkụ. (Hadēs g86, Limnē Pyr g3041 g4442)
Revelation 20:15 (Mkpughe 20:15)
(parallel missing)
Onye ọbụla a na-achọtaghị ebe e dere aha ya nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, ka a tụnyere nʼime ọdọ ọkụ ahụ. (Limnē Pyr g3041 g4442)
Revelation 21:8 (Mkpughe 21:8)
(parallel missing)
Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-ekweghị ekwe, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha niile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nʼime olulu ahụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye ọkụ. Nke bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.” (Limnē Pyr g3041 g4442)
Revelation 22:5 (Mkpughe 22:5)
(parallel missing)
Abalị agaghị adịkwa ọzọ, ịmụnye oriọna agaghị adịkwa mkpa. Mkpa ìhè anwụ na-enye agaghị adịkwa nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ga-abụ ìhè ha, ha ga-achịkwa achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165)

CAL > Aionian Verses: 14
IGB > Aionian Verses: 263