< Luke 24 >

1 Ni bwu mble, ni vi mumla wu Sati'a, ba ye ni bubu ibe'a nda nji nnye wu bwa ni kmo, wandi bana ti'a.
Nʼụbọchị mbụ nke izu ụka, nʼezigbo isi ụtụtụ, ha weere mmanụ otite ahụ ha tinyere ọtụtụ ụda nke ha kwadoro gawa nʼili ahụ.
2 Ba to ndi ba nyi kikle tita wa ka nyu ibe rju.
Ha chọpụtara na e nupụla nkume e ji dochie nʼọnụ ili ahụ.
3 Ba ri nimi nda toh ndi k'mo Bachi Yesu na he na.
Ma mgbe ha banyere nʼime ya, ha ahụghị ahụ Onyenwe anyị Jisọs.
4 A hye niki, ba ri he ni tsishishi ni tu kpe yi, ndji ha ba rju kri ni ba ni inklon wa zan pri me.
Dị ka ha nọ na mgbagwoju anya banyere nke a, nʼotu ntabi anya, ha hụrụ mmadụ abụọ yi uwe na-egbu ka amụma guzo ha nso.
5 Niki mba-ba ba ti sissri nda kukru ni shishi mba ni meme, i ba tre ni mba-ba ndi, “Ngye du yi ni wa ndji wu vrhi nimi biwa ba qu ye'a?”
Ha kpudoro ihu ha nʼala nʼihi oke egwu, ma mmadụ abụọ ahụ gwara ha, “Gịnị mere unu ji na-achọ onye dị ndụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ?
6 Ana he ni wayi na, ba nzu lunde ye. Rhimre ni tre ma niwa a rhi he ni Galili,
Ọ nọkwaghị nʼebe a, o biliela nʼọnwụ, chetakwanụ ihe ọ gwara unu mgbe unu na ya nọ na Galili sị,
7 ndi ba guchi vu Vren Ndji nu ndji bi lah tre, ba gran ni kunkro, ni vi wu tra ani la lunde.
‘A ghaghị inyefe Nwa nke Mmadụ nʼaka ndị mmehie, a ga-akpọgidekwa ya nʼobe ma nʼụbọchị nke atọ ọ ga-esi nʼọnwụ bilie.’”
8 Imba ba ba tika itre ma,
Mgbe ahụ ha chetara okwu ya.
9 nda kma don bubu ibe'a nda bla ni wlon don ri'a baba mbru ndji bari, wawu ikpi biyi ba
Mgbe ha sitere nʼili ahụ lọghachi, ha kọọrọ mmadụ iri na otu ahụ na ndị ọzọ niile ihe ndị a.
10 Niki, Maryamu Magdalin, Joanna, Maryamu iyi Yakubu, ni mba ba rima, mle, baka vu bla ni manzani ba.
Ọ bụ Meri Magdalin, na Joana, na Meri nne Jemis na ụmụ nwanyị ndị ọzọ so ha kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya ihe a.
11 Ama itre wa a bla bawu a rju choloncho ni manzani ba, i bana kpanyime ni mba-ba na.
Ma ha ekweghị ihe ha gwara ha, nʼihi na okwu ha dị ha ka ọ bụ ihe efu.
12 I Bitrus a lu kri vu tsu hi ni bubu be'a, nda ku dran nda ya mima. A to ba pri nklon wu kpa ma ba shii zini kosan. Bitrus a kma hi ni koh ma, nda ni rhimre ikpi wa ba he'a
Ma otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ ruo nʼili ahụ, hulata ala hụ ka akwa ozu ndị ahụ tọgbọọrọ onwe ha; ọ lara na-atụgharị uche nʼime onwe ya ihe ihe ndị a pụtara.
13 Ni vi baki, ndji ha ni mimba ba vu nko tayi ni vi gbu Emmawus, wandi a mili ttamgba ni mbru rji ni Urushelima.
Nʼotu ụbọchị ahụ, mmadụ abụọ nʼime ha gaje nʼobodo nta a na-akpọ Emaus, nke dị ihe ruru kilomita iri na abụọ site na Jerusalem.
14 Ba si tre ni kpamba nitu ikpi biwa ba si zren'a.
Ha na-ekwurịta nʼetiti onwe ha banyere ihe niile mere.
15 Niwa basi tre nda ni mye kpamba, Yesu kima a ye nda si zren ni ba.
Dị ka ha na-ekwu na-akparịta ụka banyere ihe ndị a, Jisọs nʼonwe ya bịara soro ha na-aga ije.
16 Shishi mba ana bwu du ba mla toh ka ahi nha na.
Ma e mechiri anya ha ịmata na ọ bụ ya.
17 Yesu a hla bawu ndi, Bi ki zren nini tre nitu ngye, hambiwu ni ton nkoh? Ba kma kuki nda kri ngbonme.
Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-ekwurịta nʼetiti onwe unu dị ka unu na-aga nʼụzọ.” Ha kwụsịrị ebe ahụ, gbarụọ ihu ha.
18 Iri mba, ni nde Cleopas a sa niwu ndi, “Wu nklen me yi ni gbu Urushelima wuna toh ikpi wa basi zren ni vivi yi na?
Otu onye nʼime ha a na-akpọ Kleopas, sịrị ya, “Ị bụ onye ọbịa na Jerusalem nke mere na ị maghị ihe mere nʼime ya nʼụbọchị ndị a?”
19 Yesu a mye ba ndi, “ikpi bi rime?” Ba sa wu ndi, “Ikpi nitu Yesu wu Nazarat wandi ana Anabi kikle ni ndu, mba lan tre ni shishi Irji mba ni ndji wawu'u,
Ọ sịrị ha, “Gịnị bụ ihe mere?” Ha sịrị ya, “Banyere Jisọs onye Nazaret! Ọ bụ onye amụma bụrụkwa onye dị ike, ma nʼokwu ma nʼomume nʼihu Chineke na mmadụ niile.
20 Wawu yi kikle Prist, baba bi ninkon wu gbu'a ba vu nu du ba lo u wu qu nda klo ni giciye.
Na otu ndịisi nchụaja na ndị ọchịchị anyị nyefere ya ka a maa ya ikpe ọnwụ, ma kpọgbukwaa ya nʼobe.
21 Kina yo suron ndi wawu yi ni ye kpa Israila chuwo. E, nha ni kima, a vi tra zizan wa ikpi biyi ba he.
Anyị nwererịị olileanya na ọ bụ ya ga-agbapụta Izrel. Nke ka nke, taa mere ya abalị atọ kemgbe ihe ndị a mere.
22 Ngari, mba bari, nimi mbu ba rju ni tre wa anuta sissri, nitu hi mba ni bubu ibe ni bwubwu mble.
Tụkwasị ihe ndị a, ụfọdụ ụmụ nwanyị anyị mere ka anyị nwee ihe ịtụnanya. Ha gara nʼili ahụ nʼisi ụtụtụ a.
23 Ba hi ka toh ndi kmo ma na he na, nda kma ye si tre baka toh Maleka wa a hla bawu ndi a he ni sissren.
Ma ha ahụghị ahụ ya. Ha bịara kọrọ anyị na ha hụrụ ọhụ nke ndị mmụọ ozi, bụ ndị gwara ha na ọ dị ndụ.
24 Ndji mbu bari ba hi ni bubu ibe nda ka to tsra ni kpe wa mbaba ba hla'a. Ama bana to'o na.
Ya mere ụfọdụ nʼime ndị otu anyị gara nʼili ahụ chọpụta na ihe niile ụmụ nwanyị a kwuru mere otu ahụ ha siri kwuo ya. Ma ha ahụkwaghị ya.”
25 Yesu a hla bawu ndi, “Bi ruru ndji, bi si sron kpanyime ni kpe wa anabawa ba tre!
Ọ sịrị ha, “Unu bụ nnọọ ndị nzuzu! Leenụ ka o si siere unu ike ikwere ihe niile ndị amụma kwuru.
26 Ana bi zan du Kristi sha ya ikpe biyi rhi nda ri ni nzuhon ma na?”
Ọ bụ na o kwesighị ka Kraịst taa ahụhụ ndị a tupu ọ banye nʼebube ya?”
27 Niki rji ni Musa, zu ni anabawa wawu, Yesu a mla bla ni bawu ikpi nitu kpama nimi nvunvu tre Irji.
Ya mere, ọ kọwaara ha ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ banyere ya onwe ya malite na nke Mosis ruo na ndị amụma niile.
28 Ni ba tie whiwhre ni vi gbu wa bata hi niwu'a, Yesu a ti to ani zren hi guchi.
Mgbe ha na-eru obodo nta ahụ ha na-aga, o mere dị ka ọ na-aga nʼihu na njem ya.
29 Mle ba bre u ndi, “Son nita, yalu si tie, i ivi'a ti wiewiere wu kle ye. Mle Yesu a kpanyime nda ka son niba.
Ma ha rịọ ya nʼebe ọ dị ukwuu sị, “Nọnyerenụ anyị nʼihi na chi ebidola iji, ụbọchị agamiekwala ugbu a.” Nʼihi ya ọ banyere ịga nọnyere ha.
30 Niwa a kuson nda ni rhi niba, a ban bredi'a, yo lulu niwu, nda nziga nu ba.
Mgbe ya na ha nọdụrụ na tebul iri nri, o were achịcha, kelee Chineke ekele, nyawaa ya were ya nye ha.
31 Shishi mba a kri bwu i baka mla toh wu, wa kri kado ni shishi mba.
Mgbe ahụ, e meghere anya ha, ha amata onye ọ bụ, ha ahụkwaghị ya anya ọzọ.
32 Ba hla ni kpamba, “Suron mbu ana si'a gon ni mi-mbu niwa a si tre ni nkon, nda tsro ta nimi nvunvu tre Irji na?”
Mgbe ahụ, ha gwara onwe ha sị, “Ọ bụ na ọ dịghị ka ọkụ ọ na-enwu nʼobi anyị mgbe anyị na ya nọ nʼụzọ, ya na-ekpughere anyị akwụkwọ nsọ?”
33 Ba kri lunde ni ton kima nda vu nkon kma hi ni Urushelima. Ba ka ri ni wlon don ri ba, nda toh ba baba bi wa bana he ni ba'a,
Ha biliri ngwangwa laghachi Jerusalem. Ebe ahụ, ha hụrụ mmadụ iri na otu ahụ na ndị so ha ka ha nọkọtara nʼotu ebe,
34 nda hla ndi “A njanji, Bachi mbu lunde, nda tsro tuma ni Siman,”
na-asị, “Ọ bụ eziokwu, Onyenwe anyị ebiliela, o gosila Saimọn onwe ya.”
35 Niki ba vu kpi wa ba toh ninkon mba wa ba mla toh Yesu ni andi a ban bredi si ga nuba a.
Mgbe ahụ, ha kọọrọ ha ihe mere nʼụzọ, ya na otu ha siri mata ya mgbe ọ nyawara achịcha.
36 Niwa basi tre kpi biyi, Yesu kima, a rju kri ni mimba nda tre ndi, “Si suron son niyi.”
Mgbe ha ka na-ekwu banyere nke a, ya onwe ya guzooro nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.”
37 Ba ti gbri me i sissri a vu ba. Ba ban ndi ba toh ibrji ma mu.
Oke egwu tụrụ ha, obi lọkwara ha mmiri nʼihi na ha chere na ha ahụla mmụọ.
38 Yesu a hla bawu ndi, “A ngye du yi ni tie sissri? A hi ngye ni lo yi ni suron?
Ma ọ sịrị ha, “Gịnị mere ụjọ ji atụ unu, gịnị mere unu ji nwee obi abụọ?
39 Toh iwo mba iza mu. A hi me kimu. Sa wo nitu mu ni toh. Ibrji na he ni nma kpa mba ququ na wandi bisi to mi he niwu na.”
Leenụ m anya nʼaka na nʼụkwụ. Ọ bụ mụ onwe m! Metụnụ m aka ka unu hụrụ, nʼihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ na ọkpụkpụ dị ka unu hụrụ m nwere.”
40 Niwa a kle tre toyi a tsro ba iwo mba iza ma.
Mgbe o kwuchara nke a, o gosiri ha aka ya na ụkwụ ya.
41 Niki me, bana kpanyime na, nitu ngyiri ni sissri. Yesu a mye ba ndi, “Bi he ni ikpe wu rhi?”
Ma dị ka o siiri ha ike ikwere nʼihi ọṅụ na oke mgbagwoju anya, ọ sịrị ha, “Ọ dị ihe oriri unu nwere ebe a?”
42 Ba nu vi lambe wa ba sron'a.
Ha nyere ya otu ntakịrị azụ a mịkpọrọ amịkpọ.
43 Akpa nda rhi ni shishi mba.
Ma ọ naara ya rie ya nʼihu ha.
44 A hla bawu ndi, “Biyi yi ba lan tre mu, wandi mi hla ni yiwu niwa mi he ni yi, ndi ikpi wa ba nha ba ni nvunvu doka Musa baba anabawa ni Zabura ba wrhu he toki.
Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu nọ, na ihe niile e dere nʼiwu Mosis na ndị Amụma na nʼAbụ Ọma banyere m ga-emezucha.”
45 Alu bwu mre suron mba du ba mla to nvunvu tre Irji.
Mgbe ahụ, o meghere akọnuche ha ka ha ghọta akwụkwọ nsọ.
46 A hla bawu ndi, toki ba nha ndi Kristi ni shaya nda lunde rji ni qu ni vi wu tra.
Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ihe e dere na, Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ ma sitekwa nʼọnwụ bilienʼụbọchị nke atọ.
47 Kma suron wrhu ni la tre ni kpa wrehle lah tre ma. Hi bla ni ndi kagon ngbungblu rhi ni Urushelima, ni ndema.
Na a ga-ekwusa nchegharị na mgbaghara mmehie site nʼaha ya nye mba niile, malite na Jerusalem.
48 Bi toh ikpi biyi ni shishi-mbi.
Unu bụ ndị akaebe nke ihe ndị a.
49 Ya, mi si ton yi nitu ikpe wa Timu a rhentse ni tuma. Bi gben ni mi gbuyi nitu ba kayi ni nklon gbengblen rji ni shulu ri.
Ma lee, agaje m izitere unu ihe ahụ Nna m kwere na nkwa. Ya mere, nọrọnụ nʼime obodo ruo mgbe a ga-eyikwasị unu ike nke si nʼelu.”
50 Niki Yesu a wrhu ni ba nda hi wiewiere ni Betani, nda nzu wo ma nda yo lulu ni bawu.
O duuru ha garuo na Betani, chilie aka ya abụọ elu gọzie ha.
51 Ni wa a ta yo lulu ni bawu, ba kri ban'u hi ni shulu.
Dị ka ọ na-agọzi ha, ọ sitere nʼebe ha nọ pụọ, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe.
52 Mle ba ku nzu ndema, nda k'ma yi ni Urushelima kikle ngyiri.
Mgbe ahụ, ha fere ya ofufe jiri oke ọṅụ laghachi na Jerusalem.
53 Ba si'a ki chachu ni tra Irji nda ni tie lulu niwu.
Ha nọgidere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-eto Chineke oge niile.

< Luke 24 >