< ܠܘܩܘܣ 17 >

ܘܐܡܪ ܗܘܐ ܝܫܘܥ ܠܬܠܡܝܕܘܗܝ ܠܐ ܡܫܟܚܐ ܕܠܐ ܢܐܬܘܢ ܡܟܫܘܠܐ ܘܝ ܕܝܢ ܠܗܘ ܕܒܐܝܕܗ ܢܐܬܘܢ 1
Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Ihe ndị nke na-eme ka mmadụ jehie aghaghị ịdị, ma ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla ọnọdụ ndị a ga-esi nʼaka ya bịa.
ܦܩܚ ܗܘܐ ܠܗ ܐܠܘ ܪܚܝܐ ܕܚܡܪܐ ܬܠܝܐ ܒܨܘܪܗ ܘܫܕܐ ܒܝܡܐ ܐܘ ܕܢܟܫܠ ܠܚܕ ܡܢ ܗܠܝܢ ܙܥܘܪܐ 2
Ọ ga-akara gị mma ka e kenye gị nkume igwe nri nʼolu, tụnye gị nʼime oke osimiri, karịa na ị ga-eduhie otu nʼime ụmụntakịrị ndị a ụzọ.
ܐܙܕܗܪܘ ܒܢܦܫܟܘܢ ܐܢ ܢܚܛܐ ܐܚܘܟ ܟܐܝ ܒܗ ܘܐܢ ܬܐܒ ܫܒܘܩ ܠܗ 3
Kpachapụrụnụ onwe unu anya! “Ọ bụrụ na nwanna gị e mejọọ gị, baara ya mba. Ọ bụrụ na o chegharịa, gbaghara ya.
ܘܐܢ ܫܒܥ ܙܒܢܝܢ ܒܝܘܡܐ ܢܤܟܠ ܒܟ ܘܫܒܥ ܙܒܢܝܢ ܒܝܘܡܐ ܢܬܦܢܐ ܠܘܬܟ ܘܢܐܡܪ ܕܬܐܒ ܐܢܐ ܫܒܘܩ ܠܗ 4
Ọ bụrụkwa na o mejọọ gị ugboro asaa nʼotu ụbọchị, rịọkwa gị ugboro asaa sị, ‘E chegharịala m,’ ị ghaghị ịgbaghara ya.”
ܘܐܡܪܘ ܫܠܝܚܐ ܠܡܪܢ ܐܘܤܦ ܠܢ ܗܝܡܢܘܬܐ 5
Ndị ozi ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, mee ka okwukwe anyị dị ukwuu!”
ܐܡܪ ܠܗܘܢ ܐܢ ܐܝܬ ܗܘܬ ܠܟܘܢ ܗܝܡܢܘܬܐ ܐܝܟ ܦܪܕܬܐ ܕܚܪܕܠܐ ܐܡܪܝܢ ܗܘܝܬܘܢ ܠܬܘܬܐ ܗܢܐ ܕܐܬܥܩܪ ܘܐܬܢܨܒ ܒܝܡܐ ܘܡܫܬܡܥ ܗܘܐ ܠܟܘܢ 6
Onyenwe anyị zara, “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke ha ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị osisi ukwu a, Ka e site na mgbọrọgwụ hopu gị ma kụọkwa gị nʼime oke osimiri, ọ ga-erubere unu isi.
ܡܢܘ ܕܝܢ ܡܢܟܘܢ ܕܐܝܬ ܠܗ ܥܒܕܐ ܕܕܒܪ ܦܕܢܐ ܐܘ ܕܪܥܐ ܥܢܐ ܘܐܢ ܢܐܬܐ ܡܢ ܚܩܠܐ ܐܡܪ ܠܗ ܡܚܕܐ ܥܒܪ ܐܤܬܡܟ 7
“Ọ bụ onye nʼime unu nke nwere ohu onye si ebe ọ gara rụọ ọrụ maọbụ ịzụ atụrụ lọbata, ga-asị ya, ‘Mee ngwangwa nọdụ ala rie nri’?
ܐܠܐ ܐܡܪ ܠܗ ܛܝܒ ܠܝ ܡܕܡ ܕܐܚܫܡ ܘܐܤܘܪ ܚܨܝܟ ܫܡܫܝܢܝ ܥܕܡܐ ܕܐܠܥܤ ܘܐܫܬܐ ܘܒܬܪܟܢ ܐܦ ܐܢܬ ܬܠܥܤ ܘܬܫܬܐ 8
Ọ gaghị asị ya, ‘Siere m nri ọsịịsọ, kwadoo onwe gị jere m ozi ka m na-eri na aṅụkwa ihe ọṅụṅụ; emesịa ị ga-eri nri ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ nke gị’?
ܠܡܐ ܛܝܒܘܬܗ ܡܩܒܠ ܕܗܘ ܥܒܕܐ ܕܥܒܕ ܡܕܡ ܕܐܬܦܩܕ ܠܗ ܠܐ ܤܒܪ ܐܢܐ 9
Ọ ga-ekele ohu ahụ nʼihi na ọ rụrụ ọrụ o kwesiri ịrụ?
ܗܟܢܐ ܐܦ ܐܢܬܘܢ ܡܐ ܕܥܒܕܬܘܢ ܟܠܗܝܢ ܐܝܠܝܢ ܕܦܩܝܕܢ ܠܟܘܢ ܐܡܪܘ ܕܥܒܕܐ ܚܢܢ ܒܛܝܠܐ ܕܡܕܡ ܕܚܝܒܝܢ ܗܘܝܢ ܠܡܥܒܕ ܥܒܕܢ 10
Nʼotu aka ahụ, mgbe unu rụchara ọrụ niile unu kwesiri ịrụ, ihe unu ga-ekwu bụ, ‘Anyị bụ ụmụ ohu na-ekwesighị ekwesi, anyị emeela ihe anyị kwesiri ime.’”
ܘܗܘܐ ܕܟܕ ܐܙܠ ܝܫܘܥ ܠܐܘܪܫܠܡ ܥܒܪ ܗܘܐ ܒܝܬ ܫܡܪܝܐ ܠܓܠܝܠܐ 11
Ka ọ na-aga Jerusalem, o sitere nʼụzọ dị nʼagbata Sameria na Galili.
ܘܟܕ ܩܪܝܒ ܠܡܥܠ ܠܩܪܝܬܐ ܚܕܐ ܐܪܥܘܗܝ ܥܤܪܐ ܐܢܫܝܢ ܓܪܒܐ ܘܩܡܘ ܡܢ ܪܘܚܩܐ 12
Mgbe ọ banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya.
ܘܐܪܝܡܘ ܩܠܗܘܢ ܘܐܡܪܝܢ ܪܒܢ ܝܫܘܥ ܐܬܪܚܡ ܥܠܝܢ 13
Ha tiri mkpu nʼoke olu sị, “Jisọs nna anyị ukwuu, mere anyị ebere.”
ܘܟܕ ܚܙܐ ܐܢܘܢ ܐܡܪ ܠܗܘܢ ܙܠܘ ܚܘܘ ܢܦܫܟܘܢ ܠܟܗܢܐ ܘܟܕ ܐܙܠܝܢ ܐܬܕܟܝܘ 14
Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha, “Gaanụ gosi ndị nchụaja onwe unu.” Dị ka ha na-aga, e mere ka ha dị ọcha.
ܚܕ ܕܝܢ ܡܢܗܘܢ ܟܕ ܚܙܐ ܕܐܬܕܟܝ ܗܦܟ ܠܗ ܘܒܩܠܐ ܪܡܐ ܡܫܒܚ ܗܘܐ ܠܐܠܗܐ 15
Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke.
ܘܢܦܠ ܥܠ ܐܦܘܗܝ ܩܕܡ ܪܓܠܘܗܝ ܕܝܫܘܥ ܟܕ ܡܘܕܐ ܠܗ ܘܗܘ ܗܢܐ ܫܡܪܝܐ ܗܘܐ 16
Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. Ọ bụ onye Sameria.
ܥܢܐ ܕܝܢ ܝܫܘܥ ܘܐܡܪ ܠܐ ܗܘܐ ܥܤܪܐ ܗܘܝܢ ܗܠܝܢ ܕܐܬܕܟܝܘ ܐܝܟܐ ܐܢܘܢ ܬܫܥܐ 17
Jisọs jụrụ sị, “Ọ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha, ebeekwanụ ka itoolu ndị ọzọ nọ?
ܠܡܐ ܦܪܫܘ ܕܢܐܬܘܢ ܢܬܠܘܢ ܬܫܒܘܚܬܐ ܠܐܠܗܐ ܐܠܐ ܗܢܐ ܕܡܢ ܥܡܐ ܗܘ ܢܘܟܪܝܐ 18
Ọ bu naanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?”
ܘܐܡܪ ܠܗ ܩܘܡ ܙܠ ܗܝܡܢܘܬܟ ܐܚܝܬܟ 19
Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Bilie, laa, okwukwe gị agwọọla gị.”
ܘܟܕ ܫܐܠܘܗܝ ܠܝܫܘܥ ܡܢ ܦܪܝܫܐ ܐܡܬܝ ܐܬܝܐ ܡܠܟܘܬܗ ܕܐܠܗܐ ܥܢܐ ܘܐܡܪ ܠܗܘܢ ܠܐ ܐܬܝܐ ܡܠܟܘܬܗ ܕܐܠܗܐ ܒܢܛܘܪܬܐ 20
Ma mgbe ndị Farisii jụrụ ya sị, Olee mgbe alaeze Chineke ga-abịa? O kwuru, “Ọbịbịa alaeze Chineke agaghị a bụ nʼụzọ a ga-eji anya efu hụ ya.
ܘܠܐ ܐܡܪܝܢ ܗܐ ܗܪܟܐ ܗܝ ܘܗܐ ܗܪ ܬܡܢ ܗܝ ܗܐ ܓܝܪ ܡܠܟܘܬܗ ܕܐܠܗܐ ܠܓܘ ܡܢܟܘܢ ܗܝ 21
Ha agaghịkwa asị, ‘Lee, ọ nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘nʼebe ahụ,’ nʼihi nʼezie, alaeze Chineke nọ nʼetiti unu.”
ܘܐܡܪ ܠܬܠܡܝܕܘܗܝ ܢܐܬܘܢ ܝܘܡܬܐ ܕܬܬܪܓܪܓܘܢ ܠܡܚܙܐ ܚܕ ܡܢ ܝܘܡܬܐ ܕܒܪܗ ܕܐܢܫܐ ܘܠܐ ܬܚܙܘܢ 22
Mgbe ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Oge na-abịa mgbe ọ ga-agụsi unu agụụ ike ịhụ otu nʼime ụbọchị nke Nwa nke Mmadụ, ma unu agaghị ahụ ya.
ܘܐܢ ܢܐܡܪܘܢ ܠܟܘܢ ܗܐ ܗܪܟܐ ܗܘ ܘܗܐ ܗܪ ܬܡܢ ܗܘ ܠܐ ܬܐܙܠܘܢ 23
Ha ga-asị unu, ‘Lee, nʼebe ahụ,’ maọbụ, ‘Lee, nʼebe a,’ unu agala, unu esokwala ha.
ܐܝܟܢܐ ܓܝܪ ܕܒܪܩܐ ܒܪܩ ܡܢ ܫܡܝܐ ܘܟܠܗ ܬܚܝܬ ܫܡܝܐ ܡܢܗܪ ܗܟܢܐ ܢܗܘܐ ܒܪܗ ܕܐܢܫܐ ܒܝܘܡܗ 24
Nʼihi na Nwa nke Mmadụ nʼụbọchị ya ga-adị ka amụma nke eluigwe nke na-enye ìhè na mbara eluigwe site nʼotu ebe ruo nʼebe nke ọzọ.
ܠܘܩܕܡ ܕܝܢ ܥܬܝܕ ܗܘ ܕܢܚܫ ܤܓܝܐܬܐ ܘܢܤܬܠܐ ܡܢ ܫܪܒܬܐ ܗܕܐ 25
Ma ọ ghaghị ibu ụzọ hụọ ọtụtụ ahụhụ, ọgbọ a ga-ajụkwa ya.
ܘܐܝܟܢܐ ܕܗܘܐ ܒܝܘܡܬܗ ܕܢܘܚ ܗܟܢܐ ܢܗܘܐ ܒܝܘܡܬܗ ܕܒܪܗ ܕܐܢܫܐ 26
“Dị ka ọ dị nʼụbọchị Noa, otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị Nwa nke Mmadụ.
ܕܐܟܠܝܢ ܗܘܘ ܘܫܬܝܢ ܘܢܤܒܝܢ ܢܫܐ ܘܝܗܒܝܢ ܠܓܒܪܐ ܥܕܡܐ ܠܝܘܡܐ ܕܥܠ ܢܘܚ ܠܟܘܝܠܐ ܘܐܬܐ ܛܘܦܢܐ ܘܐܘܒܕ ܠܟܠ ܐܢܫ 27
Ha nọ na-eri na-aṅụ, na-alụ nwunye na-ekekwa ụmụ ha di, ruo mgbe Noa banyere nʼụgbọ mmiri. Oke iju mmiri ahụ bịakwara laa ha nʼiyi.
ܘܐܝܟܢܐ ܬܘܒ ܕܗܘܐ ܒܝܘܡܬܗ ܕܠܘܛ ܕܐܟܠܝܢ ܗܘܘ ܘܫܬܝܢ ܘܙܒܢܝܢ ܘܡܙܒܢܝܢ ܘܢܨܒܝܢ ܗܘܘ ܘܒܢܝܢ 28
“Otu a ka ọ dịkwa nʼoge Lọt. Ha nọ na-eri, na-aṅụ, na-azụrịtakwa ahịa, na-akụ mkpụrụ, na-arụkwa ụlọ.
ܒܝܘܡܐ ܕܝܢ ܕܢܦܩ ܠܘܛ ܡܢ ܤܕܘܡ ܐܡܛܪ ܡܪܝܐ ܢܘܪܐ ܘܟܒܪܝܬܐ ܡܢ ܫܡܝܐ ܘܐܘܒܕ ܠܟܠܗܘܢ 29
Ma nʼụbọchị ahụ Lọt si nʼobodo Sọdọm pụta, ọkụ na nkume dị ọkụ sitere nʼeluigwe zoo ka mmiri, laa ha niile nʼiyi.
ܗܟܢܐ ܢܗܘܐ ܒܝܘܡܐ ܕܡܬܓܠܐ ܒܪܗ ܕܐܢܫܐ 30
“Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị a ga-eme ka Nwa nke Mmadụ pụta ìhè.
ܒܗܘ ܝܘܡܐ ܡܢ ܕܒܐܓܪܐ ܗܘ ܘܡܐܢܘܗܝ ܒܒܝܬܐ ܠܐ ܢܚܘܬ ܕܢܫܩܘܠ ܐܢܘܢ ܘܡܢ ܕܒܚܩܠܐ ܗܘ ܠܐ ܢܬܗܦܟ ܠܒܤܬܪܗ 31
Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ, ma ihe ya dị nʼime ụlọ, arịtukwala ịba nʼime ụlọ iburu ngwongwo ndị ahụ. Nʼotu aka ahụ, onye ọbụla nọ nʼubi, ya ghara ịlọghachita.
ܐܬܕܟܪܘ ܠܐܢܬܬܗ ܕܠܘܛ 32
Chetakwanụ nwunye Lọt.
ܡܢ ܕܨܒܐ ܕܢܚܐ ܢܦܫܗ ܢܘܒܕܝܗ ܘܡܢ ܕܢܘܒܕ ܢܦܫܗ ܢܚܝܗ 33
Onye ọbụla chọrọ iche ndụ ya nche ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla na-atụfu ndụ ya ga-echebe ya.
ܐܡܪ ܐܢܐ ܠܟܘܢ ܕܒܗܘ ܠܠܝܐ ܬܪܝܢ ܢܗܘܘܢ ܒܚܕܐ ܥܪܤܐ ܚܕ ܢܬܕܒܪ ܘܐܚܪܢܐ ܢܫܬܒܩ 34
Asị m unu, nʼanyasị ahụ mmadụ abụọ ga-edina nʼotu akwa, a ga-ewepụ otu nʼime ha hapụ onye nke ọzọ.
ܬܪܬܝܢ ܢܗܘܝܢ ܛܚܢܢ ܐܟܚܕܐ ܚܕܐ ܬܬܕܒܪ ܘܐܚܪܬܐ ܬܫܬܒܩ 35
Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ ọka nʼotu ebe, a ga-ewere otu ma hapụ nke ọzọ.”
ܬܪܝܢ ܢܗܘܘܢ ܒܚܩܠܐ ܚܕ ܢܬܕܒܪ ܘܐܚܪܢܐ ܢܫܬܒܩ 36
Ụmụ nwoke abụọ ga-anọ nʼubi, a ga-ewere otu onye hapụ nke ọzọ.
ܥܢܘ ܘܐܡܪܝܢ ܠܗ ܠܐܝܟܐ ܡܪܢ ܐܡܪ ܠܗܘܢ ܐܝܟܐ ܕܦܓܪܐ ܬܡܢ ܢܬܟܢܫܘܢ ܢܫܪܐ 37
Ha jụrụ ya sị, “Olee ebe, Onyenwe anyị?” Ọ sịrị ha, “Ebe ọbụla ozu dị, ka udele na-ezukọta.”

< ܠܘܩܘܣ 17 >